'A Tribe Called Judah' abụrụla ihe onyonyo Nollywood kachasị dọbata ego

Akụkọ kpuchiri ihe niile mere n'ọnwa ịkpeazụ afọ a bụ ọnwa Disemba na Naịjirịa nakwa na mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chimezie UcheAgbo and Ikechukwu Kalu

  1. E bugaala udu mmanụ agbidi otu nde n'ụlọọrụ Dangote ebe a na-esipụta ya

    Ụlọorụ ebe a na-esipụta mmanụ agbidi nke Dangote

    Ebe foto si, Nigeria Presidency

    Ibuga otu nde udu mmanụ agbidi n’ụlọọrụ ebe a na-esipụta mmanụ ọhụrụ bụ nke na-egosi mbọ Naịjirịa ha na-agba ịbụ mba ga na-eshipụta mmanụ ụgbọala nke ha.

    Kemgbe ọtụtụ afọ, Naịjirịa nwere mmanụ n’uju enwebeghị ike isipụta ya n’onwe ya.

    Ịtụbata mmanụ ndị e sipụtara eshipụta na mba ofesi emeela Naịjirịa mefuo ọtụtụ ego.

    O dobeghị anya mgbe nnukwu ụlọọrụ na-esipụta mmanụ nke Dangote ga-amalite ọrụ mana ngwangwa nke ahụ mere, ọ ga-abụ oke nzọpụ njem n’ime ka Naịjirịa kwụrụ na nke onwe ya n’ihe banyere mmanụ.

    Ya bụrụ ma e bugachaa otu nde barrel mmanụ nke mbụ a, ihe ga-esochi ya bụ nde barrel mmanụ ise ọzọ bụ nke ga-eme ka ụlọọrụ ahụ malite isipụta mmanụ ụgbọala.

    Mgbe ọ malitere ọrụ n’uju, akụrụngwa ahụ dị ijeri dọla 19 ($19bn/£15bn) nke a rụnyere n’ogbe azụmaahịa Steeti Lagos bụ nke a na-atụ anya isipụta udu mmanụ dị 650,000 kwa ụbọchị.

    Ọ ga-amalite isipụta mmanụ diesel, mmanụ ụgbọelụ na mmanụ gaasị (LPG) tupu ya ọ gbagoo n’isipụta mmanụ ụgbọala.

    Nwoke kasị baa ọgaranya na mba Afrịka ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Dangote Group bụ Aliko Dangote kwuru n’ụbọchị Fraịde na “ebe anyị ga-elekwasa anya n’ime ọnwa ndị na-abịa n’ihu bụ ịrụchapụ ya bụ ụlọọrụ a n-esipụta mmanụ ka ọ malite ọrụ n’uju.

    Ana m atụ anya ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ anyị ga-azọbanye ụkwụ nke ga-abụ ikesaara ahịa ndị e nwere na Naịjirịa ngwaahịa mbụ anyị ga-emepụta.”

    Ụlọọrụ ahụ na-etu ọnụ na ya ga-enwe ike ịrọpụtara ụmụafọ Naịjirịa pasenti 100 ngwa mmanụ niile ha chọrọ ma nwekwaa ọmụrụnwa ha ga-atụga mba ndị ọzọ.

  2. A tọhapụla Fada ụka Katọlik a tọọrọ n’Imo Steeti kamgbe otu izuụka

    Ụkọchukwu Kingsley Eze

    Ebe foto si, Francis U. Ezeh/Facebook

    A tọhapụla Fada Kingsley Eze nke ụlọụka St. Michaels Katọlik dị n’obodo Umuekebi nke okpuruọchịchị Isiala Mbano, Imo Steeti bụ onye a tọọrọ kamgbe otu izuụka.

    Ndị ojiegbe tọọrọ ụkọchukwu a na onye ọkwọ ụgbọala ya n’ụbọchị Tọzde 30 Nọvemba ya n’ebe a kpọrọ 'Orie ama Junction mgbe ọ kụrụ elekere asatọ nke abalị.

    Mana n’ụbọchị Fraịde 8 Disemba, ndị ụlọụka ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na a ụkọchukwu ha na ọkwọ ụgbọala ya e nwerela onwe ha n’ụbọchị Tọzde 7 Disemba 2023.

    O dobeghi anya ma o nwere ụgwọ a kwụrụ n’isi ụkọchukwu a na ọkwọ ụgbọala ya tupu a tọhapụ ha.

    Otu onye obodo ahụ gbakwara ama na Ụkọchukwu na onye a tọọrọ ya na ya nọ n’ụlọ ugbua, na obi dị ha ụtọ maka nke a.

    Cheta na ndị a tọọrọ Ụkọchukwu a kpọrọ ezinaụlọ onye ọkwọ ụgbọala ya ma sị ka a kwụọ ha ụgwọ tupu a tọhapụ ga mana o doghi anya ma ha mechara kwụọ ụgwọ ahụ.

    Ndị uweojii Imo Steeti ekwubeghi ihe ọbụla banyere ntọrọ na ntọhapụ ụkọchukwu kamgbe ahụ tupu akụkọ a apụta.

  3. Etu ndị ojiegbe si wakpoo ụgbọala otu egwu bọọlụ Sunshine Stars

    A wakporo ụgbọala otu egwu bọọlụ Sunshine Stars

    Ebe foto si, Sunshine Stars

    Ndị ojiegbe nọọrọ n’ụbọchị Tọzde 7 Disemba wakpoo otu egwu bọọlụ na-agba asọmpi 'Nigerian Professional Football League (NPFL)' bụ Sunshine Stars n’okporoụzọ awarawa si Ore gawa Benin na Steeti Edo.

    Otu egwu bọọlụ ahụ ji Akure isi obodo Steeti Ondo mere isi ọnọdụ, zutere ihe ọdachi ahụ n’oge ha nọ n’ụzọ na-aga Benin maka asọmpi ga-adị na-etiti ha na Bendel Insurance na ngwụcha izuụka a.

    Ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru otu egwu bọọlụ ahụ bụ Michael Akintunde na-akọwa na a gbara otu n’ime obere ụmụaka ndị otu egwu bọọlụ ha egbe, ebe ndị ọrụ ya ndị ọzọ nwetara ihe mmerụ ahụ.

    “Ọ na-ewute anyị n’obi ime ka ụmụafọ Naịjirịa tụmadị ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n’anya mata na a wakporo otu egwu bọọlụ anyị nkeji ole na ole gara aga n’okporoụzọ awarawa si Ore gawa Benin n’oge anyị nọ n’ụzọ na-aga izute Bendel Insurance maka asọmpi anyị na ha nwee ngwụcha izuụka a. A gbara obere nwata nwoke onye otu anyị egbe.

    "Onye nlekọta otu egwu bọọlụ anyị na ndị ọrụ ya ndị ọzọ tinyekwara ndị na-agba bọọlụ nwetara nnukwu ihe mmerụahụ."

    Otu egwu bọọlụ ahụ gbakwunyere na ndị ọrụ eje-alọ n'okporoụzọ bụ FRSC n'ịchafụ nyere aka napụta ndị ahụ nwetara ihe mmerụahụ nakwa obere nwata nwoke ahụ a gbara egbe ma kpọga ha n’ụlọọgwụ dị nso.

    Odeakwụkwọ ego ngalaba 'Sports Writers Association of Nigeria ngalaba Ondo Steeti bụ Femi Atolagbe kpọkuru gọọmenti etiti ka o kechikwuo nchekwa n’okporoụzọ niile e nwere n’ala Naịjirịa dịka ọ kpọrọ ndị uweojii oku ka ha nwụchie ndị omekoome ahụ wakporo otu egwu bọọlụ Sunshine Stars.

    N’aka nke ọzọ, otu jikọtara ndị nwere otu egwu bọọlụ na-agba na NPFL katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na ọ bụ n’ihi ọnọdụ enweghị ezi nchekwa n’okporoụzọ Naịjirịa butere ya.

    Onyeisioche otu ahụ bụ Okey Kpalukwu kọwara mwakpo ahụ dịka nke na-ewute n’obi.

    O kwuru na “ozi banyere mwakpo e mere otu egwu bọọlụ Sunshine Stars bịara dịka ihe ịtụnanya mana anyị na-ekele Chineke na e nweghị onye ọbụla n’ime ha tụfuru ndụ ya.

    Ọnọdụ a egosipụtakwala ọzọ ya bụ ọnọdụ enweghi ezi nchekwa zuru Naịjirịa ọnụ.

    Gọọmenti kwesịrị ime ihe ngwa ngwa tụmadị n’ime oge a anyị nọ na ya. Ekpere anyị bụ ka ndị ahụ nwere mmerụahụ gbakee ọsịsọ.”

  4. A nwụchiela mmadụ 133 a na-eche na a tụrụ mgbere na Saụt Afrịka

    Ndị uweojii mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, AFP

    Ndị uweojii Limpopo nke dị na mpaghara North-East mba South Africa akpachiela mmadụ 133 a na-atụ anya na ha bụ ndị danyere n’aka ndị na-atụ mgbere mmadụ.

    Dịka ọ na-arụtụ aka n’ihe ndị uweojii kwuru, ụlọọrụ mgbasaozi SABC News sịrị na ndị ahụ, nke ihe mejupụtara ha bụ ụmụntakịrị na ndị okenye, bụ ndị e bu n’obere ụgbọala bus 10.

    “Anyị akpọọla ụlọọrụ niile nwere akaoke n’okwu ahụ oku nke gụnyere ụlọọrụ na-ahụ maka ihe na-eme n’ala anyị iji chọpụta ebe ha si were na-abịa.

    N’ụdị ọnọdụ dị etu a, anyị ga-akpọghachi ha n’obodo ha,” ya ka ọnụ na-ekwuru mpaghara ahụ bụ Hlulani Mashaba gwara SABC News.

    Nke a bụ ugboro atọ a na-amapụ ụdị ọkwa dị etu ahụ kemgbe izuụka gara aga.

    N’ụbọchị Sọnde, ndị ọchịchị Limpopo nke ya na mba Zimbabwe nwere okeala, kwuru na ha kpachiri ihe karịrị obere ụmụaka 400 na-enweghị ndị so ha bụ ndị e sitere mba Zimbabwe kpọbata.

    Ndị ọchịchị mba Zimbabwe a nọrọọla kemgbe gọọ aka na ụkwụ ha n’akụkọ ahụ, dịka ha kwuru na ọ bụ naanị ụmụaka 124.

    Otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ 'Save the Children' nọkwara gbaghaa okwu ahụ South Africa kwuru na ụmụaka ndị ahụ bụ ndị e rere ere, ma kwuo na a kpọbataghị ha na mba South Africa maka mmetọ.

    Ndị uweojii makwara ọkwa banyere mmadụ 33 ha napụtara n’aka ndị na-atụ mgbere mmadụ n’usoro ọrụ dị iche ha mere na mpaghara Gauteng.

  5. Aka akparala Dọkịnta a na-enyo gburu nwaanyị dị ime ma ree nwa ya

    Afọ nwaanyị dị ime

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uwe ọjii na Rivers Steeti anwụchiela Dokinta aha ya bu Happiness Iheukumere maka onwu nwanyi di ime aha ya bu Rachael Sampson.

    A na-ebo ya ebubo na o gburu ma ree nwa nwaanyị ahụ dịka ọ wachara ya ahụ.

    Akụkọ kwuru na Sampson dị afọ 20 nwụrụ n'aka dọkinta Happiness Iheukumere mgbe owala ya afọ na ụlọ ọgwu ya akpọrọ Hagi Medical Centre .

    Nwanne Rachael bu Ruth Sampson kwuru na ha chọrọ ima ebe nwa e weputara nwanne ya na afọ maka na nne na nna ha ama mbe-akwa arịrị maka nwa ha dị ịme nwuru awu makwa be akwa na ha amaghị ebe nwa ewepụrụ ya n´ afọ nọ.

    Ihe nke a na-eme na ime onwa abuọ kamgbe ndị uwe ojii wuchịrị Dokinta Happiness maka ịre nwa.

    Ndị uweojii e jidekwa ya ọzọ maka ebubọ ịgbụ Rachael Sampson dị ịme, ma ree nwa ya.

    Ọnu na ekwuru ndị uwe Ojii na Rivers state Command, SP Grace Iringe-Koko gwara BBC na Dọkịnta Happiness nọ na ọbị ha ma kwọ na akụkọ ahụ ruru ha ntị.

    Kemgbe a nwuchịri Dokịnta Happiness, ndị Nigeria Medical Association na Rivers steetị nke onye ịsị ha bu Dr. Robinson Ebbi kwuru na ha chọputara na Dokịnta Happiness edebenyịhị aha na akwụkwọ ha dịka dọkịnta.

  6. Hunter Biden: E bola nwa Joe Biden ebubo mpụ

    Hunter Biden na nna ya bụ onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị na-ekpe ikpe na mba Amerịka ebola nwa onyeisiala mba ahụ bụ Hunter Biden ebubo mpụ ọzọ.

    Akwụkwọ ahụ agbara ya kwuru na ọ kpara nkata ịgbahapụ ịkwụ ego ruru $1.4m n'ụgwọ ụtụ isi gọọmentị etiti.

    Iwu ndị a sị na ọ dara gụnyere akwụghị ụgwọ ụtụ isi, ịze nyocha nakwa ịwepụta ụtụ isi adịgboroja.

    Cheta na agbaburu Biden dị afọ 53 akwụkwọ n'ọnwa Sepụtemba maka ijigharị egbe na steeti Delwaware mba ahụ.

    Mana ọkaiwu ya kwuru na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe mere eji agba ya akwụkwọ ndị a.

    Akpọghị aha onyeisiala Joe Biden na ya bụ akwụkwọ a gbara ma rue ugbua, ụlọorụ ya bụ White House ekwubeghi ihe ọbụla maka ya.

    Ọ bụrụ na ikpe maa ya, Hunter nwereike ịga ụlọ mkpọrọ ihe ruru afọ 17.

  7. E mechiela ụlọọgwụ ise n’Ebonyi maka ahịa ọgwụ adigboroja

    Ọtu esiri mechie ulọogwụ isee n'Ebonyi steet maka ahia ọgwụ adigboloja

    Ebe foto si, AFP

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru emechiela ụlọọgwụ ịse n’Ebonyi steeti n’ihi ịzụ ọgwụ adigboroja nakwa ihe ndi ọzọ ha na-eme na-ekwesighị.

    Ụlọogwụ ndị e mechiri gụnyere Eleri Hospital dị n’Afikpo, Party Hospital dị n'Ugbodo, Homeopathic Specialist Hospital di n'Igbeagu, St. Patrick Hospital dị n'Iboko nakwa Alexander Hospital dị n'Umuezeoka nke Ebonyi steeti.

    Gọvanọ Nwifuru gbara ama nke a mgbe ọ gụpụtara bọjetị Ebonyi steeti nke afọ 2024 nke ọ kpọro ‘’Budget of innovations and Sucess’’ n’ụlọomeiwu steetị ahụ.

    Nwifuru gwara ndi Ebonyi steeti na site na-enyemaka NAFDAC, awụchiela ndi a ma ama atọ na-azụ ahịa ọgwụ adigboroja n’ime steetị ahụ, ebe ndị otu ha ruru mmadu 107 kwuputara ma debanye aka n’akwukwọ na ha agaghị etinye aka n’ihe gbasara ahia ọgwu adigboroja ọzo.

  8. Ndị uweojii anwụchiela ndị ekperima 15 na-akpa ike n'Imo Steeti

    Ndị ekperima a nwụchiri n'Imo Steeti

    Ebe foto si, Nigerian Police

    Ndị ụweojii awụchịela ndi ekperima iri na ise(15) ebe ha zọro n’ime oke ọhịa di na okpụrụochichi Ngor Okpala Imo steeti.

    Ihe ndi ha hụru n’aka ha bụ Egbe AK 47 juputara na mgbọ egbe 21, ọgwụ ike, otu ọkuku e jiri gwo ọgwu,otu ịgwe POS, ego ndi ha napụrụ ndị mmadu n’ike nawa ego Biafra dị ịcheịche.

    Ọnu na-ekwụru ndị uweojii Imo steeti bụ Aboki Danjuma, n'okwu ya mgbe ọ na-agba ndi Ekperima ahu n'anwụ gwara ndi Imo na-akwado ịlọta emume ekeresimesi ka ha atụla ụjọ ma kwe ha nkwa nchekwa Imo steeti.

    Danjuma kọwara na ihe nyeere ha aka na nwụchị mmadu iri na ịse ahụ bụ ọsịsa ndi a na-enyocha bụ ndi otu ESN/IPOB a nwụchiri n’ụbọchị ole na ole gara aga, ma kwuo na a ga-akpọpụ ha n'ulọikpe ma e mechaa nyocha banyere ha.

    Ọ gwara ndi Imo ka ha atụla ujo, na onweghi ihe na-eme n’Ịmo, ọ gwara ha tinye anya n'ala ma na-akwado ndi uweojii dika ha na-aru ọru nchekwa obodo.

  9. Ụmụakwụkwọ Mahadum Lafia emeela ngagharịiwe maka ihe ndị ntọrị na-eme ha

    Ụmụakwụkwọ Mahadum Lafia

    Njem ngagharị iwe atọpụla ọgọdọ gbara ọtọ n’isi obodo Nasarawa Steeti bụ Lafia dịka ndị ojiegbe wakporo otu mahadum tọrọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ.

    Akụkọ banyere ụmụakwụkwọ asaa a tọọrọ na mahadum etiti bụ nke anyị nụrụ n’ụbọchị Tọzdee.

    Mwakpo ahụ e mere n’abalị Wenezde butere obi iko n’elu n’etiti ụmụakwụkwọ, bụ ndị pụtara mee ngagharịiwe megide nke ahụ.

    Ụmụakwụkwọ Mahadum Lafia, Nasarawa Steeti

    Ndị uweojii Nasarawa Steeti na-ekwu na ha enwetabeghị ozi ọbụla banyere nke ahụ.

    “E nwere ihe mere na Wenezde n’otu ebe a na-aṅụ mmanya na Gandu, mana ozi banyere ndị nwetara ihe ọdachị ahụ edochaghị anya.

    Ya mere agaghị m ekwu ihe ọbụla ruo mgbe m nwetara ozi rijuru afọ site n’aka ndị ọrụ anyị nọ na mpaghara ahụ,” ya ka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Rahman Nansel kwuru.

    Mahadum Lafia Nasarawa Steeti

    Ebe foto si, FULAFIA

    Onye ndu otu ụmụakwụkwọ na mahadum ahụ bụ Ibrahim Ismaila kwuru na mwakpo ahụ mere mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 11 nke abalị Wenezde n’ime obodo Gandu.

    Ismaila gwara BBC na ihe banyere ntọrọmmadụ abụrụla “chi bọọ a nụ ọzọ” na mpaghara ahụ e nwere ya bụ ụlọakwụkwọ dịka ụmụakwụkwọ na-adịghịkwa emegharị ahụ ọzọ.

    Onye ndu ụmụakwụkwọ ahụ, onye kwuru ka e si mee ya bụ mwakpo sịrị na ụfọdụ ndị ekperima na-eyija ụfọdụ ụmụakwụkwọ ma na-anapụkwa ndị mmadụ ekwentị ha na mpaghara “Confidence Lodge.”

    “Anyị na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa so gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ, anyị kpọkwara ndịagha ha eburu ụgbọala atọ wụchie mana tupu anyị e ruo, ndị ojiegbe ahụ e riela mbọmbọ."

    “Ma n’abalị, e nwetara m ozi na ndị ojiegbe abanyela na Gandu tọrọ ihe dịka ụmụakwụkwọ asaa n’ebe ahụ. Ụmụakwụkwọ abụọ ndị gbanahụrụ mwakpo ahụ gara zoo onwe ha n’elu ụlọ” ka onye ndu ụmụakwụkwọ ahụ kwuru.

    Ụmụakwụkwọ Mahadum Lafia

    “Ụdị ihe a na-eme kwa mgbe kwa mgbe na mahadum a. Ọ bụladị aka na-achị Steeti anyị (Abdullahi Sule) bịara leta anyị n'izuụka ole na ole gara aga dịkwa ka o kwuru ọtụtụ ihe ọ ga-eme iji kwụsị ọnọdụ enweghị nchekwa na mahadum anyị. O kwuru ihe ndị dị mma o, mana enwebeghị ihe anyị hụrụ kemgbe ahụ, ebe ọnọdụ ọjọọ ahụ ka na-agakwa n’ihu.”

    “Mmiri juru awọ ọnụ n’ihi na okwu a akarịala onyeisi ụlọakwụkwọ anyị, ya bụ nwa nza a gbaala ọbara etu ike kwere ya. Ọ bụladị ndịagha na-abịa kwa mgbe kwa mgbe, mana ha bụ ndị ntọ a matala mgbe ha ga-eji na-eme mwakpo nakwa okporoụzọ ndị ha ga-esi rie mbọmbọ.”

  10. PDP, NNPP, SDP na ndị ọzọ ehiwela otu ga-ama ọchịchị APC aka

    Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị

    Ebe foto si, PDP/NNPP/SDP

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị asaa gụnyere Peoples Democratic Party (PDP) na New Nigeria Peoples Party (NNPP) ejikọọla onwe ha ọnụ hiwe otu a kpọrọ Coalition of Concerned Political Parties (CCPP).

    Ise ndị ọzọ bụ African Democratic Congress (ADC), Allied Peoples Movement (APM), Social Democratic Party (SDP), Young Progressives Party (YPP) na Zenith Labour Party (ZLP).

    N’ozi ha wepụtara, otu ndọrọndọrọ ọchịchị asaa ahụ kpebiri itikọta isi ọnụ nke ebumnobi ya bụ ịrọpụta otu ụkwụ siri ike n'ala ga-ama gọọmenti aka n’ihu, ma wetakwa ogbugbo nyere atụmatụ gọọmenti dị iche iche.

    Otu PDP, NNPP, ADC, APM, SDP, YPP na ZLP mere ka o doo ọhanaeze anya na nkwekọrịta ha nwere n’etiti ha apụtaghị na ha bụzi ofu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Otu a bụ CCPP n'ịchafụ bụ nke e hiwere n’Abuja n’otu nzukọ ndị ndu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ahụ haziri n’isiụlọọrụ otu Social Democratic Party (SPD).

    Dịka otu ahụ na-egosipụta oke echiche banyere ọnọdụ ala adịghị mma zuru Naịjirịa ọnụ, ọ gbara ngalaba ikpe ziri ezi ume ka ọ zọpụta ọchịchị ọhakarasị Naịjirịa ma hụkwa na ọ bụghị ụlọọrụ onyeisiala maọbụ ndị omeiwu ga na-atụrụ ya ihe ọ na-eme.

    Onye bụbu Osote onyeisiala Naịjirịa ma jirikwa aha PDP zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 bụ Atiku Abubakar kpọrọ oku n'ọnwa Nọvemba ka pati ndị na-anọghị n'ọchịchị gbakọta aka na-apụta ọchịchị n'aka All Progressives Congress (APC).

    Dịka o kwuru mgbe ọ haziri ọgbakọ n'etiti ndị kọmitii nke Inter-Party Advisory Council (IPAC) n'ụbọchị 14 Nọvemba, Atiku dọrọ aka na ntị megide ụdị ọnọdụ ebe e nwere ike ịhụta Naịjirịa dika mba naanị otu otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị eze, nke mere o ji dị mkpa na pati ndị ọzọ na-anọghị n'ọchịchị ga-ebili n’ụra.

    Labour Pati na NNPP nọọrọ n'oge ahụ kwuo na ọkpụkpọ oku ahụ Atiku kpọrọ kwesịrị ka e lebara ya anya mana ugbua NNPP mechara sonye ebe LP esoghi ha.

  11. Ngozi Okonjo-Iweala na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kachasị n'ụwa nọ na Forbes 100

    Rihanna, Mo Abudu na Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ngozi Okonjo-Iweala, Rihanna na Mo Abudu

    E wepụtala aha ụmụnwaanyị ndị kachasị kpaa ike ma mepụta ihe gbara ọkpụrụkpụ n'ụwa nke afọ 2023 nke ụlọọrụ Forbes.

    Ụmụnwaanyị ndị a si mba dị icheiche n'ụwa mana ọrụ ha nwere ịrịba ama n'ụwa niile ma metụta ndụ ndị mmadụ.

    Ụmụnwaanyị amalitela iwere oche dị icheiche n'ụwa nke na-akpalite mmụọ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị imepụta ihe gbara ọkpụrụkpụ n'obodo ha.

    N'afọ a, ụmụnwaanyị ndị a họpụtara ruru mmadụ 100 si ngalaba dị icheiche gụnyere ndọrọndọrọ, azụmahịa, teknụzụ, mkpakọ na mmefu wdgz.

    Otu n'ime onye a ma ama aha ya banyere na ndị ahụ nke afọ a bụ otiegwu Rihanna nọ n'ogo 74 n'ime mmadụ 100 ahụ.

    A ma nwata nwaanyị ahụ dị afọ 35 ama n'ụwa niile.

    One of di popular person wey make di list na di popular female pop-star Rihanna wey sit for number 74 of di list.

    Na Naịjirịa, ndị aha ha banyere n'akwụkwọ ahụ bụ onyeisi ụlọọrụ World Trade Organisation bụkwa onye Igbo bụ Ngozi Okonjo-Iweala na nwaanyị a ma dịka onye welitere isi na ngalaba ime ejije aha ya bụ mo Abudu.

    Ngozi Okonjo-Iweala nọ n'ogo 87 ebe Mo Abudu nọ n'ogo 98.

  12. Lee ndị ọkaikpe a họpụtara maka mbuli n'ọkwa 'Supreme Court'

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa

    Ebe foto si, Supreme Court

    Ngalaba National Judicial Council atụọla arọ ka e bugoo ndị ọkaikpe iri na otu n’ọkwa ọkaikpe n’ụlọikpe kachasị na Naịjirịa bụ ‘Supreme Court’.

    Ozi si n’ọnụ na-ekwuru ụlọikpe kachasị bụ Soji Oye kwuru na a tụrụ arọ a na nzukọ nke ugboro 104 ngalaba a mere n’Abuja n’ụbọchị Wenesde.

    A ga-edu mmadụ iri na otu a n’iyi ọrụ ma ọ bụrụ Onyeisiala Tinubu na ndị ụlọomeiwu ukwu (Sịnetị) kwadochaa nhọpụta ha.

    Site na nhọpụta ndị a ụlọikpe kachasị ga-enwezu ọnụọgụgụ ndị ọkaikpe bụ iri abụọ na otu dịka iwu siri dị.

    Ndị a họpụtara gụnyere;

    Ọkaikpe Jummai Hannatu Sankey, OFR

    Ọkaikpe Chidiebere Nwaoma Uwa

    Ọkaikpe Chioma Egondu Nwosu-Iheme

    Ọkaikpe Haruna Simon Tsammani

    Ọkaikpe Moore Aseimo A. Adumein

    Ọkaikpe Obande Festus Ogbuinya

    Ọkaikpe Stephen Jonah Adah

    Ọkaikpe Habeeb Adewale O. Abiru

    Ọkaikpe Jamilu Yammama Tukur

    Ọkaikpe Abubakar Sadiq Umar

    Ọkaikpe Mohammed Baba Idris

  13. Ụkọ ego naira amalitela ọzọ?

    Ndị kwụ na-ahịrị n'ụlọakụ

    Ụkọ ego naira amalitela ọzọ n'isi obodo Imo steeti bụ Owerri dịka ndị ụlọakụ weturu ego ha na-enye ndị mmadụ rue naanị puku naira iri ise.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'obodo ahụ hụrụ na igwe ego dị icheiche bụ ATM anaghị eweputa ego.

    Otu onye ọrụ ụlọakụ achọghị ka akpọọ aha ya gbaara ya ama na ha na-edokwa ego obere ha ka nwere enwe.

    "Anyị enwezughi ego ga-ezuru mmadụ niile etu ahụ. Ya mere e ji tinye iwu anyị enyela ndị mmadụ karịa puku naira iri ise kwa ụbọchị." ka onye ahụ kwuru.

    Otu onye ọrụ POS na-ebe arịrị na-ekwu na ọ gara ụloakụ atọ tupu ọ chọta ebe nyere ya puku naira iri ise.

    "Gịnị mere ụkọ ego ji dị ugbua?, Kedu ihe mere ha ji achọ ịhụ ndị mmadụ ebe ha na-ata ahụhụ? Kedụ ihe o ji bụrụ ugbua ekeresimesi ruru ka nke a ji eme?" ka ọ na-ajụ.

    Cheta na ụlọakụ etiti eweputabuola ozi n'izuụka olamaole gara aga na-ekwu na o nweghi ụkọ ego ọbụla dị n'ala Naịjirịa ma na-akasi ndị mmadụ obi na ha ekesaala ego zuruoke n'ụlọakụ dị icheiche.

    Mana n'agbanyeghi nke a, kepu kepu ụkọ ego na-arị ibe ya elu n'owụwa anyanwụ, na Kano nakwa na Legọs dị na Naịjirịa.

  14. Ọrụ amalitela n’uju n'akwammiri New Artisan dara ada n'Enugwu

    Akwammiri New Artisan dị n'Enugwu

    Ndị ọrụ ngo ebidola ọrụ ugbua n’kwammiri New Artisan dị n'Enugwu nke dara ada n’ike n'ụbọchi 25 Sepụtemba 2023.

    Tupu ọrụ amalite, gọọmentị ji ogbunigwe 'dynamite' gbarie akwammiri ahụ nke dafọrọ adafọ iji mepee ụzọ ka ndị ọrụ bido.

    Cheta na minista na-ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ David Umahi bịara njem nleta mgbe akwammiri ahụ dara, bụ ebe ọ nọ kwee nkwa na ọrụ ga-amalite ngwa ngwa.

    Kamgbe ọdachi ahụ mere, ndi njem na-atakụta ya aja n’Enugwu Steeti site n'ịkwụ n'ahịrị n'ahịrị ọtụtụ awa iji gbaa ọzụ ọzọ maka ọdịda akwammiri ahụ.

  15. Ihe mere WHO jiri kwuo ka e bulie ụtụisi mmanya na-aba n’anya

    Mmanya na-aba n'anya

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na mmadụ nde abụọ na ụma (2.6million) na-anwụ site n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya kwa afọ ọbụla.

    Ha kwukwara na mmadụ karịrị nde asatọ (8million) na-anwụ site n’iri ndị nri ndị na-adịghị mma.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi ha wepụtara na websaịt ha ma kwuo na ihe kpatara nke a bụ na ụtụisi dị na mmanya ndị a nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ka ji na-azụ ma na-aṅụ ha.

    Ha tụrụ arọ na ọ bụrụ na gọọmentị mba niile dị n’ụwa bulie ego ụtụisi dị na mmanya ndị na-aba n’anya nakwa ihe ọtọbịrịbịrị ndị ọzọ, na ọ ga-enye aka ibelata ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.

    Ha kwuru na ụfọdụ mba na-etinye ụtụisi na mmanya ọtọbịrị nakwa mmiri bụ nke ọṅụṅụ bụ nke megidere iwu WHO.

    Ha gara n’ihu kwuo na nyocha e mere n’afọ 2017 gosiri na ọ bụrụ na e were ihe dịka pasentị 50 bulie ụtụisi mmanya na-aba n’anya na ọ ga-ebelata ọnwụ mmadụ nde 21 (21 million) n’ime afọ 50 ma mụta ego nwete ruru tarị dọla iri na asaa ($17trillion).

    “Itinye ụtụisi na nri ndị na-adịghị mma n’ahụ ga-eme ka ahụike ọtụtụ ndị mmadụ dị mma. Ọ ga-amụta ihe dị mma n’ụwa gbaa gburugburu - ọ ga-ebelata ọrịa na ọnwụ ma mụtara gọọmenti ọtụtụ ego ha ji a rụrụ ọhanaeze ọrụ. Itinye ya na mma na-aba n’anya ga-ebelata tigbuo-zọgbuo na ihe mberede okporoụzọ,” ka dọkịta Rudiger Krech, Diretọ na-ahụ maka mwulite ahụike na WHO kwuru.

    O kwuru na ajụjụ ngalaba ha na ụlọorụ ndị ọzọ mere gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ kwadoro ka etinye ụtụisi na mmanya nakwa nri ndị a. Ya mere ngalaba WHO sị na ha na-ekwusi ike ka e tinye ụtụisi na mmanya ndị na-aba n’anya nakwa nri ndị ọtọbịrịbịrị ndị ọzọ.

  16. Etu anyị si nwụchie ndị otu anyị anọ tọọrọ nwoke, na-ana ego isi ya- Ndị uweojii

    Olatunji Disu, Kọmishọna ndị uweojii, Rivas Steeti

    Ebe foto si, Rivers State Police Command

    Ndị uweojii Imo steeti akọwapụtala etu aka si kpara ndị otu ha mmadụ anọ aka ha dị ntọrọ otu onye ọrụ ụlọnkwarị, naa ezinaụlọ ego.

    Ndị uweojii ahụ nwuchiri nwa amadị ahụ a kpọrọ 'Darlington' n'ebe Elekere Asatọ nke abalị na nso Choba dị n'okpuru Ọchịchị Obio/Akpor dị na Pọtakọt Rịvas Steeti.

    Dịka akụkọ siri kwuo, ha nyochara ekwentị ya ma hụ na nwa amadi ahụ na-arụ n'ụlọnkwari nwere agba na Potakọt.

    Ndị uweojii ha kpụrụ ya baa ọhịa dị n'Aluu n' Ikwerre ma yie ya egwu sị na ha ga-egbu ya, tunye ya na mmiri ma bo ya ebubo ya na ọ bụ onye ntọ ma ọ bụrụ na ọ kwụghị ha otu nde naira (N1m).

    Ha nyere ohere ịkpọ ndị ezinaụlọ ya nakwa onye nwe ụlọnkwarị ahụ ka oka ha kwụta ụgwọ.

    Oge nwa amadi ahụ kpọrọ nna ya ukwu bụ onye nwe ụlọnkwarị ebe ọ na-arụ ọrụ, nwoke ahụ kpọrọ onyeisi ogige ndị uweojii ọzọ(DPO).

    DP mere ka ọ bụ ya bụ nna onye ndị uweojii jichiri ma na-akpa maka etu a ga-esi wetara ha ego.

    N'ụbọchị Satode, n'ebe Elekere Mbụ nke ụzọ ụtụtụ, kpọọrọ ndị ọrụ ya gaa n'ọhịa n'ụdị na ha gara iwegara ndị uweojii ahụ ego isi onye ha ji, were napụ ha ngwa ọgụ ha ji ma nwuchie ha.

    Dịka Ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ihe mere, Disu kwuru na "ọ bụ na n'ihi na ndị mmadụ wetara ha ozi ka e ji nwee ike ịnwụchi ndị ọrụ ya mere ihe."

    "Nchekwa bụ ọrụ dịị anyị nile."

    Ka anyị na-ewetara andị uweojii mkpesa ma ihe mee."

  17. Igbo, mma mma

    Igbo mma mmanụ o!

    Soro anyị ebe taa maka akụkọ dị mkpa taa.

  18. Ndị uweojii awakpoola ogige ndị ESN ma gbuo otu onye

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndi uweojii awakpọọla ogige ndi ekperima ana-enyocha gbụru onyeisi ndi uweojii n’Ahiazu Mbaise.

    Nke a na-eme ka otu ekperima ana-enyocha maobu onye otu IPOB/ESN, sachara asịsa etu ha siri gbụ onyeisi uweojii n’Ahiazu Mbaise Imo steeti.

    Ngalaba uweojii Imo steeti ana-akpo ‘’Anti Kidnapping sqaud’’ nke onyeisi ha bụ Oladimeji Odeyeyiwa duru ndị ọrụ ya ga wakpo ọgige ndi ekperima ahu ama ndi ịsi ha dịka Ebube Virus nakwa Ishaka n’ubochi anọ nime onwa Decemba 2023.

    Dịka nke a na-eme, ndị uweojii na onyeịsị otu ekperima ahu bidoro gbaba egbe, ụfodu ndi otu ha gbara ọsọ ebe ufodu merụrụ ahụ, emechara hụ mgbo egbe AK 47 ịri na ịtolu n’ogige ha.

    Ọrụ na-aga n’ihu ị nwụchị ndi otu ekperima gbara ọsọ ma nye ha ọpịpe luru ha dịka ịwu ala sịrị kwụ. Kọmịshọna uweojii Imo steeti bụ CP Aboki Danjuma kelere ndi uweojii maka ọru oma ha na-aru.

    N'okwu ya, ọ gwara ndị Imo ka ha jisike na-akwado ndi uweojii n’ọru nchekwa ha na-aru. Ọ gwara ndi ụlọọgwụ ha gbaara ndi uweojii ama mgbe ọbụla ha hụ onye ọbụla bụ apa mgbọ egbe n’ahụ.

  19. Imo State 2019 Governorship Election: Ụlọikpe Kachasị akụpụla akwụkwọ Ihediọha gbara

    Emeka Ihedioha

    Ebe foto si, Emeka Ihedioha/BBC

    Akwụkwọ PDP na Emeka Ihedịoha gbara ka e wepu Hope Uzodinmma dịka Govenọ Imo state amaala afọ n'ala n' Ụlọịkpe Kachasị.

    N'akwụkwọ ọ gbara, Ihedioha rịọrọ ụlọikpe ka ha gwa Inec ka ha napụ Uzodimma ikịke dịka gọvanọọ ma nye ya Ihedioha.

    Mgbe ọ na-agu akwụkwọ ikpe ahụ na ubochị Tuzdee, Ọkaịkpe Jọstịs Tijjani Abubakar, kwuru na akwụkwọ PDP na Emeka Ịhedioha gbara enweghị ịsị na ịhụ iwu na-achị obodo.

    Abubakar mechekwara nye onye ọkaịwụ bu Mike Ozekhome SAN ntara m ahụhụ nde naira anọ (N40m) maka iweta ya bu ikpe n' ulọikpe.

  20. Etu nwataakwụkwọ mahadum Ebonyi siri nwuọ ka ndị uweojii na-achụ ya ọsọ

    Ndị uweojii nọ n'okporoụzọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii Naịjirịa na-akwụsịkarị ụgbọala enyocha ya n'ụzọ

    Ọnwụ otu nwataakwụkwọ mahadum Ebonyi Steeti, EBSU, ebutela ihe iru uju na mgbawa obi nye ndị Abakaliki na steeti ahụ.

    Akụkọ kwuru na nwamadị ahụ e kwuru na aha ya bụ Evans Ayogu nwụrụ n'ihe mberede okporoụzo dịka ọ na-agbara ndị uweojii na-akwụsị ụgbọala ọsọ n'Oriuzo mpaghara Ezaa Nọt na steeti ahụ.

    Otu onye hụrụ ka ihe ahụ siri mee bụ Wisdom Nwadene kwuru na nwamadị Ayogu bụ nwataakwụkwọ nọ n'afọ atọ na-agụ 'sociology' na EBSU.

    Nwandene kọwara na dịka nwamadị Ayogu ahụ nwụrụ anwụ na-achọ ịgbalarị ndị uweojii na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala, ndị uweojii malitere ịchụ ya ọsọ o wee dabanye n'ihe mberede okporoụzọ.

    N'okwu ya, Nwadene kọwara na e buru nwamadị Ayogu gaa n'ụlọọgwụ kwamgbe ihe mberede ahụ mere mana o mechara nwụọ. Nwandene bokwara ebubo na ndị uweojii ahụ na-achụ Ayogu ọsọ gbafuru ozugbo Ayogu dabara n;ihe mberede mana ha mechara lọghachite gaa buru ụgbọala ya.

    Ndị uweojii kwuru na agwa nwata nwoke ahụ kpara bụ nke mere e jiri na-enyo ya enyo butere ndị uweojii jiri chụwa ya ọsọ.

    N'akwụkwọ ozi onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Onome Onovewakpoyeya zipụtara, o kwuru na oge nwamadaị Ayogu hụrụ ndị uweojii na-akwụsị ụgbọala eme nyocha, ọ tụgharịrị n'ike ma gbapụ ọsọ nke mere ndị uweojii jiri chụwa ya ọsọ.

    N'okwu ya; "Ọ kwụsịghị ruo mgbe o nwere ihe mberede okporoụzọ n'ụzọ Oriuzo nke mechara taa isi ya".

    Onyeisi uweojii na steeti ahụ rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwado ndị uweojii ka ha na-arụ ọrụ ha ichekwa obodo.