Ndị uweojii anapụtara ụmụaka anọ a tọọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndịuwe ojii na Anambara steeti ekwuola na ha azọputala ụmụaka anọ otu nne jị bu ndị a na-enyo enyo na bụ ndị na achu ehị tọọrọ.
Ndị a na-eny na ha bụ ndị ọchịehi tọọrọ ụmụaka atọ otu nne ji dị agbata afọ 13 na afọ 21 gụnyere ejima n'Achalla nke dị n' Enugwu Agidi n'Okpuru Ọchịchị Njikọka nke Anambara steeti na nsonso a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga bụ onye gbara ama na a zọpụtala ụmụaka ahụ n'akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Satọde.
Ikenga kwuru sị, “N'abalị ubọchị iri na ise n'ọnwa Disemba afọ 2023, ndiuweojii nọ n'Abagana nwetara ozi site n' ekwentị ndịuweojii na-eche na ndị na-achị ehi tọọrọ ụmụaka anọ n'otu ezinaụlọ n'Achalla nke dị n' Enugwu Agidi n'Okpuru Ọchịchị Njikọka nke Anambara steeti.
Ọ gbakwụnyere na mgbe kọmishọna ndịuweojii na steeti ahụ bụ Aderemi Adeoye, nụrụ ihe mere, o nye iwu ozugbo ka a kpọkọta ndịuweojii ka ha sochie ndị ntọrị ahu ma napụta ụmụaka ahụ.
O kwuru na umụaka anọ ahụ dị afọ 13, 14, 21 na 21; mana ugbu a ha a ndị mụrụ ha nọzị ebe ndị tọrọ 'obodo ndị agbata obi.
























