Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha gbapụtara mmadụ 12 ndị ntọ tọọrọ ma nwuchie ndị a na-enyo na ha bụ ndị omekome mmadụ 487 na steeti ahụ.
Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Augustina Ogbodo kwuru nke dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Fraide n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti.
"Kemgbe ọnwa Julai m batara n'ọkwa rue taa, e wetarala m okwu dị 300, anwụchiela ndị omekome 487, ma kpụpụ 187 n'ime ha ụlọikpe, 1 tụọla 15 n'ime ha mkpọrọ."
"Anyị enwetala ụgbọala 12 e zuru ezu., egbe dị iche iche dị 20, ngwa ọgụ dị iche iche 350, ma zọpụta ndị ntọ tọọrọ dị 12 ma nye ndị omekome ọsọ site n'akwụ ha dị ebe dị iche iche na steeti a."
Ogbodo, onye kwuru na ọnọdụ nchekwa akawanyela mma kemgbe ọ bara n'ọkwa kwere ndị mmadụ nkwa na nchekwa ga-adị iji nye ndị mmadụ obi ruru ala ịgba Ekeresimesi na afọ ọhụrụ n'udo.
Onye nnyocha pụrụ iche eboola onye bụbụ onyeisi ụlọakụ etiti bụ ebubo ebubo nrụrụaka oge ọ nọ n'ọkwa.
Akwụkwọ nnyocha nke Jim Obazee bụ onye onyeisiala Bola Ahmed Tinubu họpụtara ka o nyochaa Godwin Emefiele wepụtara gbara ama ihe ndị a chọpụtara na nnyocha e mere nke gụnyere:
1. Akpaego 593 n'ụlọakụ na Briten,Amerịka na Chaina
2. Iwepụ ego dị nde dọla isii na ụma( 6.23m million) n'akpa CBN na anataghị Onyeisiala ikike nke ọ gwụrụ ndị akaebe ntuliaka si mba ọzọ
3 Ịkwụ ụlọọụ mba Briten narị puku paụns abụọ na puku ise(£205,000) iji hazigharịa akara dị n'ego ọhụrụ e biri.
4. Buhari amaghị maka imezigharị naira, nke ọ na nye CBN ikike imezighari ego N1000, N500 nakwa N200.
5. Ọ bụ nwanne Buhari a na-akpọ Tunde Sabiu bụ onye gwara Buhari maka ibigharị ego Naira ma gwa Emefiele ka e bido ibighari Naira.
6. Godwin Emefiele na Tunde Yusuf bu ihe kpara nkata ibighari ego Naira.
7. Emefiele nyere ụlọọrụ 'Nigerian Security Printing and Minting plc' ịkịke ibigharị ego n'abalị 31 nke ọnwa Ọktọba, 2022 tupu ọ gwa ndị isi CBN na Disemba 15, 2022.
Ụlọọbaego Etiti nke Naịjirịa bụ 'Central Bank of Nigeria' (CBN)
ekwuola na ya ga-enye ụlọọbaego na ndị PoS a chọpụtara n' aka ha dị n’ụkọ
akwụkwọ ego Naịra dị ugbua ntaramaahụhụ.
N’ozi CBN wepụtara n’ụbọchị Tọzde, ọ gwara ọha na eze ka ha
nye mkpesa na ngalaba ụlọọbaego CBN ọbụla dị ha nso banyere ụlọakụ maọbụ ndị PoS ọbụla na-akpachi ego.
Ozi ahụ nke onye na-arụgodu ọrụ ka Director of Corporate
Communications bụ Odz. Hakama Sidi-Ali kwuru na “ụlọọbaego Central Bank of
Nigeria (CBN) enwetala ozi banyere ebubo ịkpa nkata ọjọọ dị n’etiti ụlọọbaego
ndị e nwere na Naịjirịa na ndị ọrụ Point of Sale (PoS) bụ nke na-emetụta nkesa
akwụkwọ ego Naịra.
“CBN na-agbarụ ihu nyere omume dị etu ahụ ụfọdụ ụmụ amaala
Naịjirịa na-akpa dịka ọ na-eme nnyocha banyere mkpesa ndị e nwetara bụ ndị pụrụ
ịkụnye ụkwụ n’ọnọdụ akụnaụba."
“N’ihi nke a, CBN na-adọ ụlọọbaego na ndị ọrụ PoS aka na ntị
ka ha wepụ aka n’ụdị omume dị etu ahụ n’ihi na ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị ka a
ga-enye onye ọ bụla nupụrụ isi n’iwu a.”
CBN gara n’ihu nye ọhanaeze ndụmọdụ ka ha gbasoo ụkpụrụ ndị ọzọ
esi eji ego eme ihe ma hụkwa na ha nyere mkpesa banyere ụlọọbaego maọbụ ndị ọrụ
PoS ọ bụla na-akpachi ego.
Ụlọelu adaala dakwasa mmadụ atọ na Legọs
Ebe foto si, Lagos Fire& Rescue Service
Ndị ọrụ gbatagbata steeti Legọs bụ 'Lagos State Fire and Rescue
Service' nọ ọrụ gbatagbata na 122 Herbert Macaulay Way, Lagos
Bus Stop, Ebutte Meta, Steeti Legọs, bụ ebe ụlọelu otu ogogo okpukpo na “penthouse”
dara.
Ozi sitere n’aka onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Margaret Adeseye kwuru na njinji ahụ bụ nke e nwetara mkpesa
ya n’Elekere Itoolu nke ụtụtụ taa bụ n’ụbọchị Fraịde, 22 Disemba, afọ 2023 dịka ọ sịrị na ụlọ
ahụ dakwasara ụmụnwaanyị abụọ na obere nwata.
Ka o sila dị, o kwuru na a napụtala otu n’ime ụmụnwaanyị ahụ na
ndụ dịka a malitere ọrụ nnapụta n’uju.
Ebe foto si, Lagos Fire& Rescue Service
Ndeewonu!
Igbo ndị ọma anyị ji biri, ndewoonụ!
A gbagbuola mmadụ 15 dịka a kwara mgbọ na mahadum
Ebe foto si, EPA
Ihe karịrị mmadụ 15 anwụọla, ebe mmadụ 24 merụrụ ahụ dịka a kwara mgbọ na mahadum 'Charles University' dị n'etiti Prague, na mba Czech, dịka ndị uweojii si kwuo.
Onye gbara egbe ahụ bụ nwaakwụkwọ mahadum ahụ nọ na ngalaba nka(Faculty of Arts).
E mechara hụ ozu nwa amadi ahụ gbara afọ 24.
A hụburu ozu nna nwata ahụ a na-enyo maka mkpamkpa ahụ kpara.
Ihe onyonyo ndị na-agafe agafe setara gosiri ebe igwe ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ .
Nke a bụ mgbọ a wụrụ kachasị mebie ihe kemgbe afọ 30 mba Czech ji nweta nnwereonwe.
Onyeisiala Czech bụ Petr Pavel sirị na ya bụ ihe @gbagwojuru" ya anya dịka o zipuru ozi iti aka n'obi nye ndị o metụtara.
DR Congo Election: Mmadụ anọ na-azọ ọkwa akpọọla oku ka akagbuo ntuliaka a
Ebe foto si, Reuters
Mmadụ anọ na-azọ ọkwa onyeisiala na Kongo ekwuola ka akagbuo ya bụ ntuliaka e mere n'ụbọchị Wenzde.
Otu n'ime ha kwuru na ihe mere na ntuliaka ahụ bụ nsogbu dịka e nwere gbagharịa na ya bụ ihe.
Mmadụ anọ ahụ bụ Martin Fayulu, Denis Mukwege, Floribet Anzuluni nakwa Theodore Ngoy bụkwa ndị na-azọ ọkwa onyeisiala ahụ n'aka onyeisiala Felix Tshisekedi.
N'ozi ha wepụtara n'isi obodo Kinshasa ebe ha kwuru na ha gbadoro ụkwụ na nsogbu niile pụtara n'ihe e mere gụnyere ogbugbu oge, e nweghi ngwa ọrụ, e nweghi akụrụngwa na-arụ ọrụ.
Akụkọ kwuru na ụfọdụ ọgbọ ntuliaka emepeghi chaa chaa ebe ndị ọzọ emepeghi n'oge nke butere iwe n'obi ndị mmadụ.
Ụfọdụ mmadụ mekwara nzogbu nzogbu ma kwasasia ngwa ntuliaka iji gosi iwe ha maka etu e si hibe ya bụ atụmatụ itụ vootu.
N'aka nke ọzọ gọọmentị mba Congo kelere ndị mmadụ maka etu ha si mee ntuliaka n'agbanyeghi na ndị na-eme nyocha kwuru na ihe ruru pasentị iri na isii n'ọgbọ ntuliaka emepeghi n'oge.
Ndị ojiegbe atọrọọla onye ọkaikpe n'Akwa Ibom
Ebe foto si, Nigerian Bar Association
Ndị uweojii na-ekwu na ndị ojiegbe atọrọọla onye ọkaikpe nke ụlọikpe ukwu Naịjirịa ma gbuo onye nche ya na mpaghara ndịda Steeti Akwa Ibom.
Ọkaikpe ziri ezi Joy Uwana bụ onye a tọọrọ n’okporoụzọ siri Uyo gawa Okoboin nke dị n’Oron n’abalị Mọnde n’oge ọ na-ala dịka o nwechara nnọkọ ụlọikpe.
Ndị ọkpaegbe ahụ gbara egbe aghara aghara ma gbagbuo onye uweojii na-echekwa ya tupu ha adọkpụrụ Uwana na onye ọkwọụgbọala ya n’ike.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Steeti Akwa Ibom bụ Odiko Macdon kọwara njinji ahụ dịka “nke na-ewute n’obi” ma gbakwunye na ndị ọrụ nchekwa na-eme nnyocha banyere okwu ahụ ka ọ dị ugbua.
Enwebeghị ndị kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ mana ntọrọmmadụ iji napụ ndị nwe ha ego bụ nke a na-ahụta kwa mgbe kwa mgbe n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
Tinubu egbubiela ego ụgbọala ọkara maka Ekeresimesi
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Tinubu egbubiela ego ụgbọala ọkara maka Ekeresimesi
Onyeisiala Bola Tinubu enyela ịwụ ka e jiri pasent 50(50%) sepụ ihe n’ego a na-akwụ maka njem ụgbọala na mpahara Naijirịa niile.
Tinubu kwuru na bido n’abalị 21 Dịsemba afọ 2023 ruo 4 Jenuwarị nke afọ 2024, a ga na-aba ugbooloko n’efu.
Mịnịsta na-ahụ maka ọnatarachi dị n’ala bụ Dele Alake ziri ozị a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ ụlọ steetị n’ụlọ onyeisiala nke dị n’Abuja ubochị Wenesde.
Alake kwuru na Gọọmentị Etiti na ndị ọrụ ụgbọala ga-ejikọta aka ịhụ na atụmatụ a biara na mmezụ.
'O nweghi ihe m na-agaghị eme maka udo' - Siminalayi Fubara
Ebe foto si, Fubara/Facebook
Aka na-achị Steeti Rivas bụ Siminalayi
Fubara ekwuola na enweghị ihe ọ na-apụghị ime iji hụ na e nwere udo na Steeti
ahụ.
Fubara mere ka a mata nke a n’oge ọ na-agwa
ọhanaeze okwu na mmemme ndị gụchara akwụkwọ nke mahadum Pamo University of
Medical Sciences, ebe ọ nọọrọ kwe nkwa ịdabere na nkwekọrịta udo onyeisiala bụ
Bola Tinubu wetara.
Nsogbu ya na Nyesom Wike butere ọgbaaghara
n’ụlọnzụkọ omeiwu Steeti ahụ dịka ndị omeiwu 27 hapụrụ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị
Peoples Democratic Party (PDP) gafee n’otu All Progressives Congress (APC), nke
bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Wike na-agara ozi ugbua dịka mịnịsta.
Nsogbu ahụ mekwara ka ndị kọmịshọna 9 ha na
ya so arụ ọrụ gbaa arụkwaghịm.
“Ka m gwa Steeti mụ m hụrụ n’anya nke a.”
“A na m akpọ gị Steeti mụ m hụrụ n’anya
n’ihi na nkwado ị nyere m n’ime oge ndị a bụ nke ọnụ na-apụghị ịkọ,” ya ka
Fubara kwuru.
“I lezie ya anya, ndị a bụ ndị m amaghị ma
ya fọdụzie na mụ na ha na-enwe mmekọ mana ha nọnyeere m.”
“E nweghị ọnụego ọ bụla dị ukwuu mmadụ pụrụ
ịkwụ maka udo.”
“A ga m aga n’ihu na-akwụ ya.”Fubara mere ka a mata nke a n’oge ọ na-agwa
ọhanaeze okwu na mmemme ndị gụchara akwụkwọ nke mahadum Pamo University of
Medical Sciences, ebe ọ nọọrọ kwe nkwa ịdabere na nkwekọrịta udo onyeisiala bụ
Bola Tinubu wetara.
Nsogbu ya na Nyesom Wike butere ọgbaaghara
n’ụlọnzụkọ omeiwu Steeti ahụ dịka ndị omeiwu 27 hapụrụ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị
Peoples Democratic Party (PDP) gafee n’otu All Progressives Congress (APC), nke
bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Wike na-agara ozi ugbua dịka mịnịsta.
Nsogbu ahụ mekwara ka ndị kọmịshọna 9 ha na
ya so arụ ọrụ gbaa arụkwaghịm.
“Ka m gwa Steeti mụ m hụrụ n’anya nke a.”
“A na m akpọ gị Steeti mụ m hụrụ n’anya
n’ihi na nkwado ị nyere m n’ime oge ndị a bụ nke ọnụ na-apụghị ịkọ,” ya ka
Fubara kwuru.
“I lezie ya anya, ndị a bụ ndị m amaghị ma
ya fọdụzie na mụ na ha na-enwe mmekọ mana ha nọnyeere m.”
“E nweghị ọnụego ọ bụla dị ukwuu mmadụ pụrụ
ịkwụ maka udo.”
“A ga m aga n’ihu na-akwụ ya.”
Ntuliaka amalitela na Kongo n'etiti egwu na nsogbu nwereike ịdapụta
Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru mmadụ nde 44 ga-enweta ohere ịhọrọ onye ga-achị ha dịka onyeisiala na mba Demokratik Rịpọblik nke Kongo.
Mmadụ iri na itoolu na-asụkọrịta mpi na ntuliaka ahụ na-eme ụbọchị Wenezde nke ọnọdụ nchekwa n'ụfọdụ mpaghara mba ahụ na-enweghi ikike a ga-eji buru ngwaọrụ ntuliaka na-ebute nsogbu megide ya.
Ụwa niile na-enyoba anya na ntuliaka a ma na-etinyekwa uche na mba ahụ maka na DR Kongo bụ mba kacha nwee ọnatarachi a kpọrọ kọbọltụ na mbaụwa niile. Ọnatarachi kobọltụ ahụ bụ ihe e ji emepụta ihe dịka 'battery' nke a na-atụ enye ga-enye aka maka ichekwa gburugburu megide mmanụ agbidi.
Etu ntuliaka a siri gaa ga-ekwu ma udo a ga-adị na mba ahụ ka ọ gaghị adị, a na-ele anya na ntuliaka ahụ gaa nke ọma, ọ ga-eweta ịda jụụ ma mekwa ka e tu ndi mbaụwa si egwupụta igwe kobọlụtụ ahụ bụ nke ga-abara mba Kongo n'uru.
Onyeisiala Felix Tshisekedi chọrọ ịbanye ọchịchị nke ugboro abụọ mana ndị ya na ya na-azọ ọchịchị ahụ gụnhere Moïse Katumbi bu ide ego na-egwupụta ọnatarachi nakwa Martin Fayulu na-azụbu ahịa mmanụ agbidi bụ onye kwekwara na ya meriri ntuliaka afọ 2018 bụ nke mbaụwa na-enyo mpụtara ya enyo.
Texas etinyela iwu ọhụrụ nke ga-eme ka isite n’obodo ọzọ banye na Steeti ahụ bụrụ ịda iwu nke ntaramaahụhụ ya bụ ịga mkpọrọ.
Dịka nke ahụ bụ otu iwu tara akpụ karịsịa Steeti dị na mba Amerịka na-eme banyere ndị mbịarambịa na nso nso a.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Greg Abbott, onye otu Republican sịrị na nke ahụ “ga-akwụsị nnubata n’igwe ụmụ mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi na Texas.”
Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị njem si n’ụzọ na-ezighị ezi abanye na Steeti ahụ nakwa mmetụta ọhanaeze nwere banyere ụzọ onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden si elekọta okeala mba ahụ.
Atụmatụ a Texas wepụtara ọhụrụ bụ nke na-eko achịcha n’otu ụzọ n’ihi na ụlọikpe ndị e nwere na mba Amerịka anọrọọla na mgbe gara aga kpebie na ọ bụ naanị gọọmenti etiti nwere ikikere itinye iwu ndị mbịarambịa n’ọrụ.
Ịbanye n’okeala mba ahụ n’ụzọ iwu megidere abụrụlarị ịda iwu, dịka ụdị mmebi iwu ahụ bụ nke ụlọikpe na-ahụ maka ndị njem na-elebara anya.
SB4 bụ nke e kwesịrị itinye n’ọrụ n’ime ọnwa Maachị agafeela na ngalaba ụlọnzụkọ omeiwu abụọ nke Texas ndị otu Republican nọ n’isi ya n’ime ọnwa Nọvemba.
Ọ bụrụ ma e tinye ya n’ọrụ, iwu ahụ ga-enye ndị uweojii ime obodo na ndị nke Steeti ikikere ịnwụchi onye ọ bụla a na-enyo enyo ịgafe okeala Steeti ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi ewezuga n’ụlọakwụkwọ maọbụ n’ụlọọgwụ.
Ntaramaahụhụ a ga-enye mmadụ ọbụla dara iwu ahụ bụ nke gụnyere ịga mkpọrọ maọbụ ịkwụ nha ruru $2,000 (£1,580).
Etu ndị uweojii siri nwụchie di na nwuye tọọrọ nwa ọhụrụ n'Anambra Steeti
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Etu ndị uweojii sirị nwụchie di na nwunye tọọrọ nwa ọhụrụ n'Anambra Steeti
Aka ndị uweojii Steeti Anambra
akparaala otu di na nwunye bụ ndị si Legọs tụọ mgbere obere nwata a mụrụ ọhụrụ.
Ọ bụ n’abalị 17 nke ọnwa Disemba, 2023 ka a
nnwuchirị ha na ‘Bridgehead’ Ọnịcha.
Ozi anyị nwetara n’aka ọnụ
na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Steeti Anambra bụ Tochukwu Ikenga kọwara na di na
nwunye ahụ na-eme njem n’otu ụgbọala ‘Luxury bus’ oge otu n’ime ndị njem
chọpụtara na nwaanyị ahụ anaghị enye obere nwa o ku n'aka ara na-agbanyeghị akwa ọ
na-ebe n’ihi agụrụ, ya mere o jiri kpọọ ndị uweojii n’ekwentị.
O kwuru na “ndị uweojii chebiiri
ụgbọala ahụ ha nwetara ozi ya ma wakpọ ya n’abalị.”
N’oge a gbara di na nwunye ahụ
ajụjụ, ha kwetara na ha zụtara obere nwa ahụ n’aka nne ya n’Ajah nke Steeti Legọs
n’ọnụego N30,000.
Etu osiladị, kọmishọna ndị
uweojii Steeti Anambra bụ Aderemi Adeoye ekeleela ezi nwa amaala ahụ gbara ama
na ndị ọrụ uweojii maka mbọ niile ha gbara ịhụ na anwụchiri di na nwunye ahụ ma
napụta ya bụ obere nwa.
O nyekwara ntụziaka ka enyefee
di na nwunye ahụ n’aka ụlọọrụ na-ebu agha megide ịtụ mgbere mmadụ bụ National
Agency for Prohibition in Trafficking of Persons (NAPTIP) maka nnyocha nakwa
ikpe ha ikpe.
Ka ọ
dị ugbua, enyefeela obere nwata ahụ n’aka mịnịstrị na-ahụ maka okwu ndị metụtara
ụmụnwaanyị maka ezi nlekọta anya gọọmentị.
Ihe Wike na Fubara kwekọrịtara na nzụkọ ha na Tinubu
Kemgbe otu izuụka, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị welite isi na Steeti Rịvas na-ekwukọrịta mpi n'ọgụ onye ga-aka ibe ya mana. Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Siminalayi Fubara na mịnịsta na-ahụ maka Abuja, Nyesom Wike bụ ndị na-agba egwu 'sọ mụ bụ eze ga-akwụ ọtọ'. Mana n'ụbọchị Monde, onyeisiala Naịjịrịa, Bola Tinubu na ha nwere
nzuko iji kpee udo n'etiti ha abụọ.
Ndi
ọzọ nọ na nzụkọ ahụ gụnyere aka chịburu Steeti Rịvas bụ, Peter Odili na ụfọdụ ndị eze ọdịnala
sitere na Rivas steeti. Osote onyeisiala Kashim Shettima na onyeisi ndị ọrụ
na Naịjịrịa, Femi Gbajabiamila sokwa nọ na nzukọ ahụ.
Nsogbu ndị a e nwere na steeti ahụ mere ka ụlọomeiwu kewaa ụzọ abụọ, a na-eme nzụkọ dị icheiche. Mmadụ 27 n'ie ndị omewiu pụkwara kwuo na ha na-awụfezi na pati APC, a gbalịrị ịchutu gavọnọ Fubara n'oche ebe ọtụtụ ndị kọmịshọna kwunyere Wike gbara arụkwaghịm aghara aghara.
Mana onyeisiala Tinubu tinyeburu ọnụ n'okwu ahụ ikpe udo mana ọ dabaghị.
Ebe foto si, Fubara Facebook
Lee Mkpebi Fubara na Wike Nwere Na Abuja
Mana ka nzụkọ ụbọchị Mọnde gasịrị, ndị okwu ahụ gbasara kwekọrịtara ụfọdụ ihe dị icheiche ga-ebute udo. Ha bụ:
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị a na-alụ ọgụ kwekọrịtara na a ga-ewepụ okwu niile Fubara na ndị otu ya guzobere n'ụlọ ikpe ozugbo.
Ndi otu Wike kwekọrịtakwara na ha ga-ewepụ usoro nchụpụ niile nke ụlọ omebeiwu Rivas steeti malitere megide gọvanọ ozugbo.
Ndị otu Wike na Fubara kpebiri na ha ga-anabata Martin Amaewhule dika onyeisi ụlọomeiwu Rivas steeti, ma sị na Edison Ehie abughị onyeịsị.
Ndi otu abụọ a kwekọrịtara ịnabata Amaewhule na ndị otu ya dị iri abụọ na isii bụ ndị hapụrụ PDP banye na APC nso nso a.
A ga-eweghachite ụgwọ ọrụ na ụgwọ ọnwa ndị niile nọ n'ụlọ omebe iwu steeti ahụ na ndị ọrụ ha ozugbo, ma gbakwunye na Gọvanọ Rịvas steeti agaghị etinye aka n'ego nke ụlọ omebe iwu Rivers steeti.
Ụlọ omebe iwu Rivers steeti ga-ahọrọ ebe ha chọrọ ịnọdụ ma na-eme nzuko iwu ha na-enweghị mgbochi sịtere na aka Gọvanọ.
Gọvanọ Rivers steeti, Fubara ga-eweghachite mmefu ego steeti ahụ nke afọ 2024 n’ụlọomeiwu nke onye ọbụla nọ n'ịme ya na-enwenghị nkewa.
A ga-eweghachita aha ndị kọmishịọna niile gbara arụkwaghịm n'ihi nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti ahụ n'ụlọ omebe iwu maka nkwado ka ha nweike ịgaghachị n'ọru.
E kwesịghị inwe kọmitii na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na steeti Rivers. Nchụpụ ndị isị na okpuru ọchịchị ndị ahu bụ ihe ag aghị anabata.
Ndị binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịtara ahụ bụ Fubara, Amaewhule na ndị ọzọ.
Pope ekwuola na ndị Fada nwereike igozi ndị na-alụ otu ụdị ekere ha
Onyeịsị ụlọụka Katọlịk bụ Pope Francis e kwuola na ndi fada ga-amalite ị gọzị ndị na-alụ otu ụdi ekere ha na ufodu ọnọdụ ndị dị aṅaa.
O kwuru na ogbochighi ya ị hụta alum di na nwunye ka ihe dị na-etiti nwoke na nwaanyị, atụmatụ a bụ ịji gosi na chukwu nabatara mmadu niile.
Pope bianyere aka n'atụmatụ a n'ubochi Monde i ji maa ọkwa ya bu mgbanwe, mana akwụkwo ahu kwuru na ndi ụkọchukwu ga-enweriri mkpebi dabere dịka ọnọdụ siri di.
Cardinal Víctor Manuel Fernández, onye nhazị ụlọụka kwuru na atụmatụ a gbakwasara ụkwụ n'usoro ụlọụka hiwere n'ihe gbasara alụ m dị na nwụnye.
Ọ kọwara na ịji kwado atụmatụ Pope nke gbadoro ụkwụ na nnabata mmadụ niile, ndị ụkọchukwu ga-aga n'ihụ na-agozị agbamaakwụkwọ mmadu ndi bụ otu ụdị ekere nke bụ 'same sex marriage' n'asụsụ Bekee.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Pope ekwuola na ndị Fada nwereike igozi ndị na-alụ otu ụdị ekere ha
A maala nwoke na-arụpụta mkpụrụmmiri na Legọs steetị ikpe ma napụ ya ụlọ ya dara oke ọnụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, A maala nwoke na-arụpụta mkpụrụmmiri na Legọs steetị ikpe ma napụ ya ụlọ ya dara oke ọnụ
Gọọmenti etiti anapụla otu eze ọgwụike a mara ikpe bụ Okenwa Chris Nzewi ụlọ ya dara oke ọnụahịa ọ rụrụ na K-5A/2 Road 14, Victoria Garden City (VGC) estate, Lekki nke Steeti Legọs.
Nzewi tụfuru ụlọ ahu, bụ nke o jiri mere ụlọ nnyocha laboratory ebe ana-arụpụta mkpụrụmmiri (mathamphetamine) n'ihi ikpe a mara ya n'uloikpe nke si na-aka ụlọoru na-ahu maka ahia ogwu n'Naịjirịa bụ NDEA.
Nsogbu ọkenwa malitere n’oge a nwụchiri ya na onye otu ya bụ Sunny Okeh n’abalị 30 nke ọnwa Julaị, 2022.
E mechara kpọpụ ya n’ụlọikpe ukwu etiti dị na Legọs ebe a nọọrọ kpee ya ikpe n’ihi ụzọ ebubo anọ nke akara ya bụ FHC/527C/2022.
Okenwa na onye otu ya kwetara na aka ha adịghị ọcha n’abalị 17 nke ọnwa Julaị, 2023 dịka a mara ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ afọ anọ na afọ atọ n’otu n’otu ma nyekwa ha ohere ịkwụ nha nde Naịra anọ (N4m) na nde Naịra atọ (N3m) n’otu n’otu, tinyekwara ịgaara ọha obodo ozi izuụka anọ na izuụka atọ n’otu n’otu.
Gọọmenti etiti napụkwara ya ụgbọala ya nke akara ejirimara ya bụ EKY 496 DJ.
Iji hụ na e mere ka ọ ghara irite uru ndị sitere n’akụ o jiri ụzọ aghụghọ kpaa, NDLEA gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu etiti dị na Legọs ka a napụ ya ụlọ ahụ o ji mere ebe nrụpụta mkụrụmmiri.
Ụlọikpe ahụ nyere iwu ka ejichie ụlọ ahụ nwaobere oge bụ nke kụụrụ ọnụ n’abalị 6 nke ọnwa Dizemba tupu ya enyezie iwu ka ejichie ya kpamkpam n’abalị 7 nke ọnwa Dizemba, 2023.
N’oge ọ na-ekwu okwu banyere nke ahụ n’ụbọchị Sọnde, onyeisioche NDLEA bụ Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa toro ndị ọrụ nke Directorate of Prosecution and Legal Services maka mgbasiike ha ma gbaa ha ume ka ha gaa n’ihu ihụ na e nweghị onye omekoome ọ bụla ga-ala na nkịtị.
Mmiri eriela ụmụafọ Naịjirịa na ụmụafọ mba Afrịka ndi ọzọ karịrị 60
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Mmiri eriela ụmụafọ Naịjirịa na ụmụafọ mba Afrịka ndi ọzọ karịri 60
Ozi sitere n’aka otu International Organization for Migration (IOM) na-ekwu na ndị mbịarambịa karịrị mmadụ 60 erugbuola site n’otu ụgbọmmiri kpuru na mpụga osimiri mba Libya.
Ọ sịrị na ebuli mmiri mikpuru ụgbọmmiri ahụ nke mere ka ndị mbịarambịa 61 nke gụnyere obere ụmụaka bụrụ ndị a na-achọ achọ dịka a na-atụ anya na ha anwụọla.
Libya so n’ime ụzọ ọpụpụ gbapụtara ihe maka ndị njem, bụ ndị na-agba mbọ ịgafe osimiri Mediterranean banye mba Europe.
Otu IOM na-ekwu na ọ na-atụ anya na ihe karịrị mmadụ 2,200 erugbuola dịka ha na-agba mbọ ịgafe ya bụ osimiri naanị n’ime afọ a, nke mere ka ọ bụrụ ụzọ njem kachasị njọ gburugburu ụwa.
Ngalaba ụlọọrụ ahụ na-ekwu na ọtụtụ n’ime ndị zutere ihe ọdachị ahụ mere na nso nso a bụ ụmụafọ Naịjirịa, Gambịa na mba Afrịka ndị ọzọ dị iche iche, nke ahụ bụ dịka ozi e nwetara n’aka AFP News Agency siri kwuo.
O kwukwara na a kpọgaala mmadụ 25 ndị nyara ndụ n’ụlọ njichi mba Lybia dịka ndị ọrụ ahụike na-enye ha ezi nlekọta.
N’ozi ọ gbasara na X bụbuTwitter n’oge mbụ, ọnụ na-ekwuru IOM kọwara ọnụọgụ ndị nwụrụ n’afọ a dịka “ọnụọgụ na-amapụ obi nke na-egosi na anaghị eme ihe dịka o siri kwesị ịzọ ndụ ụmụ mmadụ n’osimiri.”
Aka akparala mama nnukwu na-ere ọgwụike
Ebe foto si, NDLEA
Ndị ọrụ ngalaba na-alụso ọgwụike agha na Naịjirịa bụ NDLEA n'ịchafụ anwụchiela otu mama nnukwu aha ya bụ Sekinat Soremekun n'Oshodi dị na Legọs steeti.
Mgbe a nwụchiri ya, a hụrụ akpa kwuru akpa igbo nakwa ọgwụ akpọrọ Codeine n'aka ya.
Mana Sekinat gọrọ isi onwe ya na-ekwu na ọ bụ nwa ya nwoke akpọrọ Segun bụ onye bunyere ya bụ ihe ka ọ na-ere.
Ahụbeghi Segun dịka ọ gbapụrụ ọsọ ụkwụ eru ala mana a ka na-achọ ya rue ugbua.
N'akụkọ yiri ya, ndị ọrụ NDLEA anwụchiela otu nwoke akpọrọ Isaac Okoh dịka ha hụrụ akpa Cocaine e zoro n'ime okpu nnabuihe si Legọs a ga Pọtakọt.