Unu abọọla chi?
O ruola ngwụcha izuụka ọzọ!
Nọnyere anyị maka akụkọ ndị dị mkpa taa na mba ụwa niile.
Nke a bụ nchịkọta akụkọ niile dị mkpa site na mbido ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba 2023.
O ruola ngwụcha izuụka ọzọ!
Nọnyere anyị maka akụkọ ndị dị mkpa taa na mba ụwa niile.

Ebe foto si, Anambra State Police
Ndị uweojii Anambra Steeti akatọọla atụmatụ igbu mmadụ nke mere mgbe a gbara mmadụ abụọ ọkụ n'Onicha na steeti ahụ.
Komishona ha bụ Aderemi Adeoye kwụsịrị ike na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ ga kpesa n'aka ndị uweojii ma o nwee ekperima ha jidere.
Cheta na a gbara mmadụ abụọ ọkụ n'ahia 'main market' dị n'Onitsha nke ihe onyonyo ya na-efegharị na soshal midia.
Akụkọ kwuru na ha bụ ụmụnne abụọ na-agba ndị ahịa ụgwọ ụtụisi n'ike mana ndị uweojii kwuru na ha so n'otu ndị ohi nke onyeisi ha bụ onye a kpọrọ Itanda.
E nyere aha ndị abụọ ahụ dịka Omaume na Monday.
Ndị uweojii kwuru na a ma ha ama dịka ndị na-ezukaarị ndị ahịa ohi.
A malitela nyocha banyere ọnwụ ha dịka Komishona ndị uweojii si kwuo.

Ebe foto si, House of Representatives
Ndị ụlọmeiwu nta nke Naịjirịa ewepụla ijeri naịra ise (N5bn) ahụ amawapụtara maka ịzụrụ onyeisiala ụgbọmmiri ‘yacht’ s’ite n’akwụkwọ mkpa na mmefu.
Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka mkpata na mmefu n’ụlọomeiwu nta bụ Abubakar Bichi kwuru nke a n’ụbọchị Tọzde dịka ha tinyechara aka n’akwụkwọ mkpata na mmefu nke mgbakwụnye ọnụ ego ya dị tarịị naịra abụọ na ụma (N2.17trn).
Bichi kwuru na kọmitii a wepụrụ ego ahụ ma tinye ya n’ego a ga-ebinye ụmụakwụkwọ ka ọ bụrụzie ijeri naịra iri (N10bn).
Arọ a tụrụ ịzụrụ onyeisiala ụgbọmmiri a bọlitere ọtụtụ okwu na Naịjirịa nke mere ọtụtụ ndị Naịjirịa jiri katọọ ya bụ atụmatụ.
O kwuru na e werela ego e kwesịrị iji zụọ ụgbọmmiri ahụ tinye n’ego a ga-ebinye ụmụakwụkwọ.
“Anyị achọghizi ụgbọmmiri onyeisiala, anyị etinyela ego ahụ n’ego mbinye ụmụakwụkwọ.”
“Ọ bụrụ na ị ga-echeta, ego mbinye ụmụakwụkwọ dibu ijeri naịra ise mana ugbua anyị emeela ka ọ bụrụ ijeri naịra iri.”
Ego ịzụrụ onyeisiala ụgbọmmiri dịbu n’akwụkwọ mkpata na mmefu nke ndịagha ụgbọmmiri.
Ndị Sineti nọọrọ na Tọzde tinye aka n’akwụkwọ mkpata na mmefu nke mgbakwụnye n’afọ 2023 nke dị ọnụego tarịị naịra abụọ na ụma (N2.17trn) bụ nke onyeisiala Tinubu tụrụ arọ ya.
Mana o doghi anya ma ha tinyere mgbanwe ahụ ndị ụlọomeiwu nta mere banyere iwepu ego ụgbọmmiri ahụ.
Onyeisi ndị Sinetị bụ Godswill Akpabio kwupụtara nke a dịka ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị Sịnetọ kwadochara akwụkwọ mkpata na mmefu ahụ.

Ebe foto si, AFP
Gọọmenti mba Zambia ewepula ihe nrite ezumike nka niile e nyeburu aka chịburu ha bụ Edgar Lungu dịka o si ezumike nka pụta ma banye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Lungu bụ onye Hakainde Hichilema meriri na ntuliaka n'afọ 2021 pụtara kwuo na ọ ga-ala ezumike nka.
Mgbe ọ rituru n'ọkwa dịka ọ chịchara afọ isii, mba ya bụ mba kachasị jide ụgwọ na mpaghara Afrịka niile ma nọrọ kwa n'ọnọdụ akụnụba ọjọọ.
Ọnụ na-ekwuru gọọmenti mba ahụ bụ Cornelius Mweetwa ekwuola na agwala onyeisiala ochie ahụ na ihe nrite ezumike nka ya niile akwusila kpam kpam.
Akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ ka anyị wetara gị taa.
Gbado anya

Ndị ndu ndị na-ere ehi n’ahịa Lokpanta dị n’Umunneochi nke Abia Steetiagọọla na aka ha adịghị n’ime mpụ na ntọrị ndị mmadụ na gburu gburu ahịa ahụ.
Nke a na-abịa dịka gọvanọ Alec Otti nke steeti kwuru na a hụrụ ozu mmadụ asatọ na gburu gburu ahịa ahụ n’ihi oke mpụ na ntọrị mmadụ na-eme n’ebe ahụ ma nye iwu ka ọ bụrụ ahịa a ga-anazụ mgbe ihe dị na-abụghị ndị mmadụ ibi n’ahịa ahụ.
Otu n’ime ndị ndu n’ahịa ahụ bụ Alhaji Buba Abdulahi Kademure kwuru na ọ bụghị eziokwu na aka ndị otu ya dị n’ịtọrị ndị mmadụ nakwa mpụ ndị ọzo.

Kademure gakwara n’ihu gọọ na o nweghi ozu ndị mmadụ na-ere ere a hụrụ n’ahịa ahụ.
O gbakwụnyere “ Ọ bụrụ na ha kwuru na a hụrụ ozu ndị mmadụ na-ere oge ha wakporo gburu gburu ahịa ahụ anyị ahụghị nke ọbụla, ma kedụ ụmụnne ndị a hụrụ ozu ha?”
O kwuru na ọ ga-ara ahụ ndị na-ere ahịa ebe ahụ na ezinaụlọ ha karịrị 15,000 ịhapụ ebe ahụ ga na-achọ ebe obibi n’ime obodo, na obodo ndị nọ nso ebe ahụ agaghị aba ha.
Ọ rịọrọ ka biko hapụ ha ka ha nọrọ kama na ha ga-enwe aka chekwaa gburu gburu ebe ahụ.

Ebe foto si, Women affairs ministry Anambra
Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị n’Anambra Steeti bụ Ify Obinabo ekwuola na ha azọpụtala ụmụ agbọghọ iri abụọ dị n’agba afọ 14 ruo 25 n’otu ụlọ ndina dị n’Oba nke Idemili South nke steeti ahụ.
N’ozi si n’akara Facebook, o kwuru na ha na ndị uweojii Anambra Steeti gbakọtara aka mee nke site n’ama a gbaara ha.
O kwuru na mmadụ abụo n’ime ndị a ka bụ ezigbote ụmụaka na-ekwesighi ime ihe ụwa na-akọ, na a edugaala ha ụlọọgwụ maka nyocha ahụ.
Obinabo kwuru na nyocha e mere tupu mwakpo ụlọ ndina ahụ gosiri na ndị nwee ụlọ ndina ahụ na-atụ mgbere ụmụagbọghọ n’ọtụtụ dị na Naịjirịa ma kpọta ha maka ọrụ ịgba akwụna.
O kwuru na gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa aṅụọla iyi ikpachapụ ịgba akwụna nakwa ịtụ ụmụagbọghọ mgbere n’Anambra Steeti.
“Ụfọdụ ụmụagbọghọ a zọpụtara sị na ọ bụ ndị enyi ha gwara ha na ọ bụ ịrụ ọrụ n’ụlọ ndina ka ha bịara ịrụ na-amaghị na ọ bụ ịgba akwụna.
“Ha kwuru na ha na-enwete ego dị puku anọ ruo puku iri n’otu ụbọchị n’ụbọchị ụkpọrọ n’izuụka mana na ngwụcha izuụka ọ na-erucha puku iri na ise maọbụ puku iri atọ.
Ha kwuru na ndịisi ha na-anara ha ekwentị ha na ngwo ngwo ha ruo mgbe ha ga-akwụzu ụgwọ dị n’isi ha.
Ndị a zọpụtara kwuru na ha na-edina ihe ruru ụmụnwoke iri n’otu ụbọchị iji nwete ego a tụrụ anya n’aka ha ma ọ bụghị ya a ga-eti ha ihe.
Obinabo kwuru na ndị a nwụchiri a na-enyo enyo nọ n’aka ndị uweojii ugbua na a ga-agba ha n’anwụ n’ụlọikpe na-ebu agha megide mmetọ ụmụaka nakwa mkpagbu ndị ụmụnwaanyị dị n’Awka.
Nke a abụghị mbụ a na-azọpụta ụmụagbọghọ e ji agba akwụna n’Anambra Steeti, n’ọnwa ole ma ole gara aga, a zọpụtara ụfọdụ n’otu ụlọ ndina dị n’Awka isi obodo Anambra.

Ebe foto si, Nigeria Police/NLC
Ndị uweojii Imo Steeti agọọla ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na ha nwụchiri onyeisi ndị Nigeria Labour Congress bụ Joe Ajaero dịka akụkọ si na-efegharị.
Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti n’ozi o wepụtara na mgbede Wenezde kwuru na ha zọpụtara Ajaero n’aka ndị agboro na-eti ya ihe ma kpọga ya n’isiụlọọrụ ha dị n’Owerri iji chekwaa ndụ ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na kọmishọna uweojii bụ Muhammed Berde mechara nye iwu sị ka a kpọrọ Ajaero gawa n’ụlọọgwụ ndị uweojii dị n’Owerri maka inyocha ya ahụ.
O kwuru na ọgbaghara dapụtara mgbe Ajaero na ndị otu na-akwado ime ngagharịiwe n’Imo steeti iji gbachie ọtụtụ ụlọọrụ ebe ahụ mana nke a adịghị ụfọdụ ndị mma n’obi nke mere ha jiri na-enwe nghọtahie n’etiti ha nke butere ọgụ nakwa iti onyeisi NLC ihe.
Okoye kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi ahụ na ndị uweojii ji ọsọ gbaga n’ebe ahụ ma zọpụta Ajaero ka ndị ahụ ghara itigbu ya.
O kwuru na ọ bụ mgbe ahụ ka kọmishọna ndị uweojii jiri nye iwu sị ka kpọgaa onyeisi ndị NLC n’ụlọọgwụ ndị uweojii maka nyocha ahụ ya.
Okoye gbakwụnyere na ọ dị mkpa ka a mara na ụlọikpe na-ahụ maka nrụpụta ihe bụ ‘Industrial court’ adịla mbụ nye ndị NLC iwu ka ha emela ngagharịiwe maọbụ abụbụọrụ megide gọọmentị Imo steeti.

Ebe foto si, Nigeria Labour Cngress
Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela Joe Ajaero bụ onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress n’Owerri.
A nwụchiri Ajaero n’ụlọọrụ ngalaba ndị NLC dị n’Owerri ma duru ya gawa ebe a na-amabeghi.
Onyeisi mgbasaozi otu a bụ Benson Uper kwuru nke n’ozi o zigaara ọtụtụ ndị ntaakụkọ.
“A nwuchiri onyeisi Nigeria Labour Congress bụ Joe Ajaero n’isiụlọọrụ anyị nke ngalaba Owerri, Imo Steeti, ndị uweojii bucha ọtụtụ ngwa ọgụ buuru ya gawa ebe anyị amabeghi.”
Nke a na-abịa dịka NLC na-eme ngagharịiwe na abụbụọrụ n’Owerri megide gọomentị Imo Steeti maka ihe ha kpọrọ mkpagbu ọtụtụ ndị ọrụ bekee, akwụghị ha ụgwọọnwa nakwa ihe ndị ọzọ.
N’ozi Ajaero wepụtara na Sọnde, o boro gọvanọ Hope Uzodimma ebubo imebi ikike dịịrị ndị ọrụ na steeti ahụ.
O kwuru na gọvanọ Uzodimma achọghị ọdịmma ndị ọrụ Bekee bụ nke merela ka ọtụtụ n’ime ha nwụọ n’ihi akwụghị ụgwọ ọnwa.

Ebe foto si, AFP
Ndị mba Kenya akatọọla atụmatụ gọọmentị ha tinyere iji napụ ụgwọ ụtụisi n'elu ngwa ọbụla ndị njem ji abata ala ha nke gafere ego dọlla narị ise.
Ngalaba mba ahụ na-elekọta akụnaụba bụ KRA kwuru na ndị mmadụ ga-akwụ ụgwọ ndị a n'agbanyeghi ma ihe ha zụrụ a dị ochie ma ọ dị ọhụrụ.
Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu mba ahụ na-ekwu na ndị ọrụ KRA jizi ohere ahụ amaja ndị njem nakwa ndị bịara ịlegharị anya na Kenya.
Ọ kachasị Minista nke na-ahụ maka nlegharị anya na ezumike bụ Alfred Mutua onye kwuru na ụdịrị atụmatụ a so n'ihe mere ọnụọgụgụ ndị njem nlegharị anya ji ada.
Nke a so n'ụfọdụ ụtụisi ọhụrụ nke onyeisiala William Ruto tinyere nke ndị mmadụ na-ata ụta na-ekwu na o mere ka ọnọdụ obibi kawanye njọ.