Ndị uweojii egbuola ndị ekperima karịrị 50 na Taraba Steeti

Nke a bụ nchịkọta akụkọ niile dị mkpa site na mbido ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. NLC na TUC egbochiela ụgbọelu ifebata n'ọdọụgbọelu Imo Steeti

    Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na ogbo ha bụ Trade Union Congress (TUC) akwụchiela ụzọ e si abanye ọdọụgbọelu dị n’Abuja.

    He na-eme nke n’isi ihe maka onyeisi NLC bụ Joe Ajaero bụ onye e tiri ihe n’Owerri, Imo Steeti n’izuụka abụọ gara aga.

    Ihe malitere dịk nsogbu steeti abụrụla ihe metụtara mba niile ahụ dịka ndị na-eme ngagharịiwe wuchiri n’ọdọụgbọelu ahụ n’isi ụtụtụ ma gbochie ndị njem ịbanye.

    Ha mere nke iji mee ka ndị ọrụ njem ụgbọelu kwụsị ụgbọelu isi Abuja gawa Owerri bụ isiobodo Imo Steeti.

    Ngagharịiwe na-abịa dịka otu NLC na gọọmentị sọkọtara isi n’Owerri nke ha boro ndị uweojii ebubo ịkụ onyeisi ha ise.

    Ndị uweojii adịla na mbụ kwuo na ọ bụghị ha tiri Ajaero ihe kama na ọ bụ nzọpụta ka ha zọpụtara ya n’aka ndị ekperima.

    N'ihi ihe ahụ e tiri Ajaero ndị ọrụ Bekee malitere ịgba abụbụọrụ n'Imo steeti nke mere ọkụ latrik adịghị kamgbe otu izuụka.

    Ọzọkwa bụ na ha ṅụrụ iyi na o nweghi ụgbọelu ga-esi obodo ọzọ na Naịjirịa bata n'ọdọụgbọelu Imo steeti dịka a na-atụ anya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-abata n'Imo maka ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-adị na Satọde 11 Nọvemba 2023.

    Ha kwuru na ha agaghị akwụsị ruo mgbe gọọmentị Imo steeti ga-arịọ ha arịrịọ ma chụọ ndị uweojii ahụ tiri Ajaero ihe n'ọrụ.

  2. Dibia agbagbuola otu nwoke ebe ha na-anwa ọgwụ odeshi

    Otu nwoke na-achụ aja

    Ebe foto si, AFP

    Ndị uweojii Bauchi steeti anwụchiela otu dibia gbagburu nwoke mgbe ha abụo na-anwa ike ọgwụ odeshi ọ rụụrụ nwoke ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ Ahmed Wakil kwuru na anwụchiri dibia ahụ na mmadụ abụọ ọzọ ebe ndị ọzọ gbapụrụ ọsọ.

    Ha kwuru na ndị uweojii nụrụ ụda egbe were jiri ọsọ gbaga ebe ahụ buga nwoke agbara ebe ụlọọgwụ mana ndị ụlọọgwụ kpebiri na ọ nwụọla tupu e bute ya.

    E nyere aha nwoke egbe gbagburu dịka Muhammad Ali onye otu obodo dị na steeti ahụ.

    Wakil dọrọ ndị mmadụ aka ha enyezina onwe ha iji bụrụ ndị e ji anwa ọgwụ dị icheiche. O kwukwara na a ga-akpụpụ ndị ahụ anwụchiri ụlọikpe ma emechaa nyocha.

    Nke a abụghị mbụ mmadụ na-anwụ n'ịnwa odeshi dịka ndị mpaghara Naịjirịa nwere okwukwe na o nwere ụdịrị ọgwụ na-azọ mmadụ n'ebe mgbọ dị.

  3. Ụlọikpe enyela iwu ka atọghapụ Godwin Emefiele

    Godwin Emefiele

    Ọkaikpe Olukayode Adeniyi n'ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja enyela iwu ka atọhapụ onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirị bụ Godwin Emefiele.

    O kwuru ka enye ya n'aka ndị ọkaiwu ya bụ ndị e nyere ọrụ pụrụiche ịhụ na ọ bịara ụlọikpe maka ikpe ya n'izu na-abịa maọbụ ụbọchị ọbụla.

    Okaikpe ahụ kwukwara ka Emefiele nye ụlọikpe ahụ akwụkwọ njem ya niile tupu amalite ikpe gbasara ebubo ndị e boro ya.

    E tinyere ụbọchị 17 nke ọnwa Nọvemba dịka ụbochị a ga-anụrụ ikpe metụtara ebubo e boro ya.

    Cheta na ụlọikpe enyebuola iwu ka atọghapụ Emefiela n'aka ndị DSS bu ụzọ nwuchie ya mana EFCC nwụchikwara ya dịka atọghapụrụ ya.

  4. NLC amanyela abụbụ ọrụ malite n'ụbọchị Novemba 14

    Ndị ọrụ NLC

    Ndị isi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC na TUC amanyela abụbụ ọrụ zuru ala Naịjirịa niile bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Novemba.

    Otu abụọ a ruru mkpebi a dịka ha mechara nzụkọ pụrụiche n'ụbọchị Tusde n'Abuja.

    Ha kwuru na ndị otu ha niile adịla nkwadobe maka ya bụ abụbụ ọrụ ozugbo ozugbo.

    Ha mere nke a n'ihi mmegbu nke onyeisi ha bụ Joe Ajero gabigara n'izu gara aga n'Imo steeti.

    Ha gbarụrụ ihu maka mmegbu ahụ ma bo Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Mohammed Barde ebubo iso kpa nkata nwụchi na mmegbu Ajero nke mere n'Owere.

    Cheta na otu ahụ nyere gọọmentị abalị ise ịwepu ma gbanwee Kọmịshọna ndị uweojii ahụ dịka ha na-atụ Gọvanọ Hope Uzodimma aka na o so na nwụchi ahụ nke Uzodimma gọkwara n'onwe ya.

    Ha dọkwara aka na ntị na ha ga-amanye abụbụọrụ n'ala Naịjirịa niile maọbụrụ na anwụchighi ma kpụpụ ụfọdụ ndị ọrụ gọvanọ ha sị na aka ha dị na nwụchi ahụ ụlọikpe.

    Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ebugaala Barde n'ọkwa ọzọ ka ihe si kwụrụ ugbua.

  5. Canadian Embassy fire: Etu ọkụ si gbagbuo mmadụ abụọ n'ụlọnnọciteanya mba Canada

    Ụlọnnọchiteanya mba Kanada n'Abuja

    Ebe foto si, FCT Emegency Management Agency

    Ụlọọrụ Gbatgbata nke Abụta bụ FCT Emegency Management Agency akọwaala na ọ bụ udu e ji edowe manụ dizụl gbara buteere ọkụ gbara ụlọnnchiteanya mba Kanada n'Abuja n'ụbọchị Monde.

    Ọkụ ọgbụgba dapụtara n'ụlọnnochiteanya mba Kanada, n'ụtụtụ Monde tara isi, ebe e bugarara mmadụ abụọ ndị ọzọ merụrụ aghụ n'ụlọọgwụ National Hospital Trauma Centre' dịkwa n'Abuja maka nleta.

    Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Bola Tinubu ezigarala ụlọọrụ agụ ozi iti aka n'obi.

  6. Supreme Court Court ruling:Peter Obi , Ụlọọrụ Onyeisiala na-eme ntụmsara

    Bola Tinubu, Peter Obi

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Getty Images

    Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n'aha otu 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere maka Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023 akpụọla n'ala ntụkwasịobi ụmụafọ Naijiria nwere na ngalaba ikpe nke Naijiria.

    N'izu ole na ole gara aga, Ụlọikpe Kachasị kwụgidere na mkpebi nke Ụlọikpe puru iche e hiwere maka ntuliaka nyere nke kwuru na ọ bụ Bola Tinubu nke APC meriri na Ntuliaka 2023 dịka Inec si kpọpụta ya.

    Mana Ụlọọrụ Onyeisiala gwara Obi ka ọ gaa chọrọ ọrụ ọzọ, kwụsị ịkpalite okwu asị megide ọchịchị Bola Tinubu.

    N'ozi ya mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Monde n'Abuja, Obi sịrị na Ụlọikpe Kachasị gosiri na ha ejighị echiche ọha ụmụ Naijiria kpọrọ ihe.

    "Ụlọikpe Kachasị gosiri na ha jighị echiche ọha ndị mmadụ kpọrọ ihe dịka mkpebi ha megidere ihe akaebe gosiri wuruwuru e mere na ntuliaka; asị a tụrụ sị na e nwere ọgbatauhie n' igwe e ji achịkọta mpụtara ntuliaka; Inec agbasoghi iwu ha jiri aka ha tinye'; asị, asambodo adigboroja na ihe ndị ọzọ a gbara n'anwụ na ntuliaka ahụ."

    " Na-eleghị anya n'ihu, mkpebi ahụ kpụrụ n'ala mkpamkpam ntụkwasịobi ụmụ Naijira nwere na ngalaba ikpe anyị."

    " O gosiri na e ji ike napụ ụmụ Naijiria ikike Iwu Naijiria nyere ha."

    Obi gara n'ihu kwuo na otu 'Labour Party' na ndị 'Obidient agaghị achịsa ọwa, kama ha ga-aga n'ihu n' ịgbasa oziọma banyere olileanya na ezi ọchịchị n'ahịa, ọdọụgbọala ụlọakwụkwọ nakwa mpaghara dị iche iche na Naaijira.

    N'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ Bola Onanuga kwuru na kama Obi ga-ezigara Onyeisiala Tinubu ekel maka imeri na ntuliaka," ọ na-ebogharị ebubo ụgha, na-atụpụ okwu dị agha".

    "Obi kweslrị izigara Bola Tinubu ekele maka mmeri ya ma kwee ya nkwa ịkwado ya kama ọ na-ekpolite okwu ihe Ụlọikppe kwesịrị ile anya were kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka."

    Onanuga, onye kwuru na o nweghị ihe Obi mepụtara dịka Gọvanọ Anambara steeti, ma ya fọdu inwe ihe a ga-eji eme ya Onyeisiala, nyere Obi ndụmọdụ sị ya gaa kwadowe maka afọ 2027 sị: " Anyị na-ele anya n' oge ahụ na ọ ga-agbado ụkwụ n'ihe ndị dị mkpa, ọ bụghị ịkpalite okwu okpukperechi na agbụrụ dịka o mere n'achụmnta vootu o mere n'ikpeazụ a."

    "Ndụmọdụ anyị na-enye Peter Obi bụ ya gaa chọrọ ọrụ ọzọ, dịka ọtụtụ ụmụ Naijiria ndị ahụghị ya dịka onye tozuru idu ha, jụrụ ya ajụ."

    Cheta na Inec kpọpụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri na Ntuliaka Onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Peter Obi nke 'Labour Party' na Atiku Abubakar nke PDP wegara mkpesa n'Ụloikpe Pụrụ Iche maka Ntuliaka iji gbagha mpụtara ntuliaka ahụ dịka Inec si kpọpụta ya.

    Ụlọikpe ahụ nyere Tinubu mmeri nke mere ka Obi na Atiku were ikpe ahụ gaa n'Ụlọikpe Kachasị.

    Mana Ụlọikpe Kachasị kpụpụrụ mkpesa ha ma kwụgide na mkpebi nke Ụlọikpe puru iche e hiwere maka ntuliaka nyere.

  7. Ndewoonu!

    Igbo ndị ọma , anyị ekelee ụnụ!

    Ndewoonu!

  8. Guinea Jailbreak:A chụọla ọtụtụ ndịagha Guinea n'ọrụ n'ihi mgbapụ Capt Camara na nga

    Capt Moussa Dadis Camara

    Ebe foto si, AFP

    Gọọmentị mba Gini achụọla ndịagha na ndị ọrụ ụlọmkpọrọ karịrị 60 n'ọrụ maka mgbapụ na mkpọrọ nke onye bụbu onye ndu ọchịchị ndịagha mba ahụ bụ Capt Moussa Dadis Camara na mmadụ abụọ ndị ọzọ.

    A nwuchigharịrị Capt Camara na ndị nga abụọ ọzọ ka o mechara awa ole ma ole ndị ji ngwaagha batara n'ụlọmkpọrọ tọhapụ ya n'ụzọ ụtụtụ Satode.

    A na-ekpe ha ikpe maka ọnwụ mmadụ karịrị 150 bụ ndị nwụrụ na ngagharịiwe e mere n'isiobodo mba ahụ bụ Conakryn'afọ 2009.

    Ọkaiwu Capt Camara gwara BBC na e ji nwa madi ahụ megide ebumnauche ya , na Camara enweghị mgbe ọ chọrọ isis ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ dịka o nwere ntụwkwasa obi na usoro ikpe nke mba ahụ..

    Onyeisi Ọchịchịagha mba ahụ ugbua bụ Col Mamady Doumbouya chụụ ndịagha na ndị ọrụ mkpọrọ ahụ n'ọrụ n'Ụbọchịụka maka "ịda iwu ọrụ ha nakwa agwa ọjọọ". dịka ụlọ mgbasaozi steeti ahụ , RTGNdị agha a chụrụ n'ọrụ gunnyere Claude Pivi, Moussa Thiegboro Camara na Blaise Goumou.

    Gọọmentị ka na-achọ Pivi, bụ onye bụbụ Minista na-ahụ maka nchekwa Onyeisisal n'ọchịchị Camara bụ onye gbafuru agbafu.

    Gini bụ otu mba nọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrika nke ndị Fransi chịburu. Ha E nweela mweghara ọchịchị n'ike ọtụtụ ugboro n'ime afọ atọ gara aga.

  9. Onyeisi ndị uweojii ewepụla kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti

    Onyeisi ndị uweojii ewepụla kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Olukayode Egbetokun bụ onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii na Naịjirịa

    N'akwụkọ ozi, ACP Olumuyiwa Adejobi, bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii agwala ọha niile na onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii ewepụla Mohammed Barde bụ kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti.

    Adejobi gara n'ihu kwuo na o nwere ọrụ pụrụiche ọzọ ha chọrọ izi Mohammed Barde ka o mee.

    Egbetokun bụ onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ya mere nke a iji gosi na o nweghi onye ọbụla ndị uweojii na-akwado iche n'ime ndị niile so azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti. O kwukwara sị na o nweghị ihe jikọrọ mwepụ a na ihe ndị mere n'Imo steeti na nsonso a, mana e wepụrụ ya bụ kọmishọna maka na etu a ka ha chọrọ iji hazigharị nchekwa maka ntuliaka na-abịa n'Imo steeti n'ụbọchị 11 Novemba afọ 2023. Egbetokun kwupụtara ihe ndị a n'ụbọchị Sọnde, n'ọgbakọ nke ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV haziri maka ọnọdụ nchekwa n'oge ntuliaka. Ọ sị, "ahụla m ọtụtụ ebubo ndị mmadụ na-ebo na soshal midia. N'ihi nke a, maka ntuliaka Imo Steeti na ndị ọzọ, anyị ga-agbanwe Kọmishọna uweojii nke Imo steeti".

  10. Ndị ụlọọrụ NDLEA amachiela ụmụnwoke atọ kpuruisi so ebu ọgwụike

    Ndị ụlọọrụ NDLEA amachiela ụmụnwoke atọ kpuruisi so ebu ọgwụike

    Ebe foto si, NDLEA/Facebook

    Nkọwa foto, Ndị ụlọọrụ NDLEA amachiela ụmụnwoke atọ kpuruisi so ebu ọgwụike aga Sawudi Arebịa

    Ụlọọrụ na-ahu maka ịwụ ọgwụ ịke (NDLEA) anwụchịela umụwoke atọ kpụrụ-ịsị maka ịzụ ahia ọgwụịke nke ha na-azụ n’agbata Legos steeti na Kano.

    N’ọzị ọnu na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi gbasara, o kwuru na ha nwetere ihe ruru 12kg ogwụike anakpọ ‘’skunk’’ n’aka otu onye n’ime ndi anwụchịri, nke a mere ha jiri nwụchịkọrọ onyeisi otu ha nakwa mmadu abuọ n’ime ha kpuru-ịsị Ụlọọrụ NDLEA kwuru na ha nwetere ọgwụ ike ana-akpọ ‘’tramadol’’ ruru nde iri na anọ na ịkọ codeine ruru ijeri niara iri na atọ nke ha siri na-ọbu ndị nnukwu mmadu atọ na-azụ ọgwụ ịke n’Lagọs steeti nwe ha.

  11. A maala Sam Bankman-Fried, eze 'cryptocurrency' ikpe maka izu ijeri kwuru ijeri dọla ndị ahịa ya

    Sam Bank-Fried

    Ebe foto si, Getty Images

    I chetara nwokorobịa a le elegara anya dịka eze 'cryptocurrency 'maka ịba ọraranya site azụmahịa ego ayọrọ intanet Bekee kpoọrọ 'cryptocurrency'?

    Ụlọikpe mba Amerika amaala Sam Bankman-Fried ikpe ritere ya ọtụtụ afọ n'ụlọmkpọrọ maka izu ijeri kwuru ijeri dọla ndị ahịa ya.

    A ga-akpọ okwu aha dịka o siri metụta okwu dịka a na-ele anya ịtụ ya mkpọrọ afọ 110 maka mpụo mere.

  12. IDF ekwuola na ha ga-enye ohere ka Ndị Gaza si Ugwu gaa nNdịda Gaza

    Ndị mbịara mbịara enwebeghị ohere gafee okeala Rafah

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ndị mbịara mbịara enwebeghị ohere gafee okeala Rafah

    Ndi agha Izrel ekwuola na ha ga-enye ndi bị na mpaghara Ugwu Gaza ohere ịgbaga ndịda n’ime awa anọ.

    Ebe ha ga-esi gafee bụ ụzọ Salah al-Din-uzo Ugwu na Ndịda Gaza, n’Elekere iri ruo Elekere iri-na-anọ.

    Ihe yiri nke emebuola n’ụbochị Satọde mana ndi agha Hamas wakpọrọ ndi agha Izrel, ha boro ha ebubo na ha chọrọ i ijigide ndi mmadu nkịtị. Cheta na Izrel maara ọkwa na ha ga-ekpocha mpaghara Ugwu Gaza.

    Ha gwara ndi bi ebe ahụ ha kwaga Ndịda Gaza na-agbanyeghị na ha ebusobuola Ndịda Gaza agha site n'ụgbọelu.

    Mana onye ozi US mere ka anyi mata na mmadu 350,000 ruo 400,000 ka bi n’mpaghara Ugwu Gaza.

  13. Nepal Earthquake: Ihe karịrị mmadụ 150 anwụọla n'ala ọmajijiji

    Nepal

    Ebe foto si, AFP

    E zigala ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Jajarkot na West Rukum d ị nọ Ọdịda Anyanwụ Kathmandu dị na mnba Nepal.

    Ihe karịrị mmadụ 150 anwụọla dịka ọmajiji mara na Ọdịda Anyanwụ Nepal n'ụbọchị Fraide.

    Ọmajiji mara na isiobodo Nepal nakwa ụfọdụ obodo gụnyere Delhi dị na mba India.

    Ndị gọọmentị kwuru na mmadụ 375 merụrụ ahụ.

    Ndị merụrụ ahụ juru ụlọọgwụ Jajarkot'.

    E ji ụgbọelu buga ụfọdụ Kathmandu, mana ndị ọrụ na-atụ uche na ọnọdụ ndị merụụ ahụ nwere ike ịkawanye njọ

    Otu onye zọtara ndụ ya bụ Geethakumari Bista gwara BBC na a zọpụtara ada ya nwaanyị mana ọdụdụ nwa ya nwaanyị fularị ya.

    "Anyị atọ nọ n'otu ọnụ ulọ n'ụlọelu. Ihe nile mere ozugbo . Anyị aghọtaghị ihe na-eme.

    Ka ụlọ ha dachara, o liri ha n'ala.

    "Ndị mmadụ na-eti mkpu. Ndịuweojii bịara , m tiwe mkpu, " Adị m ndụ."

    "Ha bụ ụzọ zọpụta ada m nwaanyị, mana ọ dị mwute na ha azọpụtalighị nke obere dị afọ 14.

    Ọla ọmajiji mere ugboro atọ n'otu awa. Ndị ọrụ gọọmentị gwara ndị mmadụ ha nọrọ n'ilo o pekata mpe otu abalị dịka obere ọmajijiji ka na-eme na mpaghara ahụ.

  14. Ndeewo!

    Soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa taa.

  15. Mba Amerịka agbaala ama na ndị oyi ndụ egwu chọrọ ịwakpọ ụfọdụ ọlụ oriri na Naịjirịa

    Ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa agbaala ama banyere nchekwa nke kwuru na e nwere ụfọdụ ụlọ oriri na ndina dị n’obodo ndị mepere emepe a chọrọ ịwakpo.

    Nke a dị n’ozi ụlọọrụ ha wepụtara n’ọbaozi websaịt ha n’ụbọchị Fraịde 3 Nọvemba nke kwuru “Gọọmentị mba Amerịka maara maka ozi banyere nchekwa metụtara ụlọ oriri ndị dị elu na Naịjirịa.”

    Ozi ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-agbasi mbọ ike ikpochi mwakpo ahụ.

    Mana gọọmentị mba Amerịka dụrụ ụmụafọ ya ndụmọdụ ka ha tụlee ozi ahụ ma ha chọrọ ime njem a bịa Naịjirịa maọbụ ịga n’ụlọ oriri ndị dị elu na Naịjirịa.

    Ha nyere ụmụafọ akara ekwentị nakwa ebe ha nwereike ịkpọtụrụ maka enyemaka.

    Ozi ịdụ aka na ntị a maka nchekwa na-abịa n’ime ọnwa abụọ mba Amerịka depụtachara ụfọdụ steeti ọ gwara ụmụafọ ha agala na Naịjirịa.

    ụfọdụ steeti ndị nke a metụtara gụnyere; Borno, Yobe, Kogi and northern Adamawa, Bauchi, Gombe, Kaduna, Kano, Katsina, Sokoto and Zamfara, Abia, Anambra, Bayelsa, Delta, Enugu, Imo and Rivers steeti.

    Ha kwuru na nke a bụ maka ntọrị ndị mmadụ na-aga n’ihu n’ụfọdụ steeti ndị a.

  16. Ụlọikpe enyela iwu ọhụrụ gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ n’Imo Steeti

    Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee

    Ebe foto si, Nigeria Labour Congress

    Ụlọikpe na-ahụ maka nrụpụta ihe bụn National Industrial Court dị n’Owerri enyela iwu ọhụrụ nke gbochiri ndị ọrụ ịgba abụbụọrụ n’Imo Steeti ruo oge a na-amaghị.

    Ụlọikpe a dọrọ aka na ntị kwuo na nnupuisi n’iwu a ga-ebute ezigbo ntaramahụhụ.

    Ọkaikpe N.C.S Ogbuanya nyere iwu n’ụbọchi Fraịde mgbe ọ nụchara mkpesa si n’ọnụ ọkaiwu ndị a na-ekpezibeghi esemokwu dị n’etiti ha.

    Ndị na-azara ọnụ ha bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na odeakwụkwọ ha bụ Emmanuel Ugboaja, Trade Union Congress (TUC) na odeakwụkwọ ha bụ Nuhu Toro.

    Ebe ndị gbara akwụkwọ akara ya bụ NICN/OW/41/2023 bụ ọkaiwu gọọmentị Imo Steeti na Gọọmentị Imo Steeti n’ọnwe ha.

    Ụlọikpe a kwuru na ọ bụ n’ụbọchị 30 Nọvemba ka ọ ga-achabi ikpe dị n’etiti ndị a dịka o lebachara anya.

    Ụlọikpe a gara dụọ ndị ometụtara ndụmọdụ ka ha rubeisi n’iwu o nyere banyere nke a, nke pụtara na abụbụọrụ otu ngalaba ndị ọrụ na-agba n’Imo steeti ugbua ọkachasị ndị ọrụ ọkụ latrik EEDC megidere iwu.

  17. NAFDAC adọọla aka na ntị maka otu mmanya 'energy drink'

    Mojisola Adeyeye bụ onyeisi ụlọorụ NAFDAC

    Ebe foto si, @Nafdac/Instagram

    Ụlọọrụ na ahu maka nri na-ọgwu (NAFDAC) amaala ọkwa na mmaya ana-akpọ ‘’G Fuel energy drink ’’nke ndi T&E imports na GPAE trading corp’’ bubatara Niajịrịa adịghị mma ị ṅụ n’ịhi oke’’ caffine’’ dị n'ime ya.

    Onyeisi NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye kwuru na ha mmara ọkwa mmaya ahụ maka oke caffine eji ruọ ya.

    Mojisola kwuru na oke ‘’caffine’’adighị mma na-aru, o nwere ịke ị kpata ịsị ọwụwa,ehịghị ura nakwa ọrịa ndi ọzọ.

    O kwurukuru na ụlọọrụ ha nụrụ na ụlọọru na-ahu maka nri na-mmaya nke Canada na Netherlands jukwara mmaya ahu n’obodo ha.

    Ọ gwara umuwanyi dị ịme ha sọọ mmaya ahu maka na-onwere ịke ị wepụ ime maọbụ mee ha ị mu nwa n’oge na-erughị-eru.

    Mojisola kwuru na ndi ahuha na-asọ ‘’caffine’’ sọọrọ mmaya a maka naani obere ha nụru nwere ịke ịbutere ha nsogbu.

    Mgbe BBC Igbo jụru ọnụ na-ekwuru NAFDAC bụ Christy Obiazikor,o kwuru na akukọ a bụ eziokwu.

  18. Etu ndị ọrụ nchekwa si kụsasịa mwakpo Boko Haram chọrọ ime na Kano Steeti

    Ngwa ọgụ si n'aka Boko Haram

    Ebe foto si, Nigerian Army

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha akụsaala mwakpo otu na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram chọrọ ime na Kano n’ụbọchị Fraịde 03 Nọvemba, 2023.

    Ndị otu nke ngalaba 3 Brigade na ndị ọrụ DSS gbakọtara aka ọnụ ma nyopuo ebe ndị a nọ n’okpuruọchịchị Gezawa dị na Kano Steeti.

    Ha mere nke a ma nwuchie ndị Boko Haram abụọ atụmatụ ha bụ ịwakpo Kano steeti. A na-apụtara ndị a egbe AK47 ise na mgbọ ya ise, ogbunigwe a kpọrọ RPG ise, ogbunigwe aka dị isii, nakwa uwe ọzara ndịagha dị ise nakwa ọtụtụ ogbunigwe ndị ọzọ.

    Ndịagha kwuru na mmekọrịta ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-amịta ezi mkpụrụ n’ibuagha megide mpụ na iyi ndụ egwu na Naịjirịa.

    Ha kwuru na ọganihu ha n’ọrụ na-akasi ha obi ime karịa ka ha dị mbụ eme na mbọ ha na-agba ebuagha megide ndị a.

    Ha rịọrọ ka ọhaneze mụrụ anya ma gbaara ha ama ihe ọjọọ ọbụla na-eme na gburu gburu ebe ha bi na-atụghị egwu ọbụla.

  19. Mmiri Elegushi eriela otu nwoke so ndị ụka ya gaa ezumike

    ikpere mmiri di na Legos

    Mmiri eriela otu nwoke dị afo 34 n’akụkụ mmiri Elegushi dị na Lagos steetị.

    Akuko kwuru na nwoke ahu so ndị otuụka ya gaa nleghiari anya n’akuku mmiri Elegushi dị na Lagos n’ubọchị Satọde.

    Ulọụka ahu amaghị aha ya dị na Ikorodu Lagos steeti, kpọkọtara ndi ntorobia ka ha mee njem nleghiari anya n’akuku mmiri Elegushi, nwoke aha ya bụ John so ha mee njem a.

    Dịka e siri kwu, ha bidoro chọba John mgbe ha kwakọrọ ịla n’ehihie Satọde ahu mana ha ahụghị ya, ọ nwere onye gwara ha na ohuru ya ka ọbanyere n’ime mmiri, na ya chere na ọma egwụ mmiri mere ya jiri gba ya nkịtị.

    Ka ha malitere ị chọ ya,ndi ọzọ ndu nyere aka n’ịchọ ya mana ha ahughị ya.

    Ndi ụka ahu labara. Akụkọ kwuru na ndi ọzọ ndu mechara hu ozụ ya n’ahihe Tụsde n’akuku mmiri Elegushi.

    Mgbe BBC IGBO jụrụ onu na-ekwuru ndi uweojii Lagos Steeti bụ Benjamin Hundeyin o kwuru na ihe dị otu ahu mere eme na Lagos.

    Ọ sị ’’Anyi ezịgaala ezinaulo onye nwụrụ ozị, buga kwa ozu ya ụlọọgwụ dị na Yaba ebe aga- eme ya nyocha puruịche nke ndị beeke kpọrọ ‘’Autopsy’’

  20. Mba Rwanda agbapeerela ndị Afrịka niile ụzọ ha

    Paul Kagame

    Ebe foto si, EPA

    Onyeisiala mba Rwanda bụ Paul Kagame ekwuputala iwu ga-enye ndị Afrika niile ikike ime njem bata ala ya n'enweghi Visa.

    "Ka o doo anya, onye Afrịka ọbụla nwereike ịbanye ụgbọelu bata Rwanda mgbe ọbụla ha chọọ n'akwụghị ihe ọbụla iji bata ala anyị" ka o kwuru.

    Nke a ga-eme Rwanda mba anọ n'ime mba iri ise na anọ dị n'Afrịka ịmanye atụmatụ a.

    Ndị ọzọ gụnyere Gambia, Seychelles nakwa Benin Republic.

    Cheta na onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kwukwara na ịna ndị Afrịka ọbụla akwụkwọ Visa ga-ebi kpam kpam n'ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2023.

    Mba ndị ọzọ nwere nkwekọrịta ịgbapere Afrịka niile ụzọ ha gụnyere Ghana, Saut Afrịka, Uganda nakwa Kongo mana ha ekwuputabeghi nke ha.