Aka akparala nwoke metọrọ ma tụwa nwata ime mkpuke n'Anambra Steeti

Ebe foto si, Actuality with Ify Obinabo/Facebook
Ndị uweojii Anambra Steeti anwụchiela otu nwoke maka imetọ ma tụnye nwata dị afọ iri na anọ ime n’ụlọụka dị n’Anambra Steeti
N’ozi si n’aka Chidinma Ikeanyionwu bụ onye enyemaka mgbasaozi kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’Anambra Steeti bụ Ify Obinabo kwuru na nwamadị a aha ya bụ James Rich dị afọ 31 bụ nwafọ Cross River Steeti ma na-arụ ọrụ n’ụlọụka St. Michaels Aglikan dị n’Awka.
Akụkọ kwuru na ọ na-arabata nwata ahụ n’ime ụlọmposi, dinaa ya tupu a malite ụka n’ụbọchị ahụ.
Nwoke a ji ọnụ ya kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ na-edina nwata ahụ n’isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, na o mere nke a ugboro atọ ma nye nwata ahụ N200 ka o were zụọ achịcha bekee ‘biscuit’.
Nwoke a alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ abụọ dịka ọ na-atụ anya nke atọ, o bi n’ime ụlọụka ahụ bụ ebe ọ na-anọ eme arụ a.
Ọ rịọrọ mgbaghara ma sị na ọ bụ ya mbụ ime ụdịrị ihe a, sị na ọ bụ ọnwụnwa dubara ya n’ime ya.


















