'Kpọọnụ gọọmentị Finland jụọ ha ihe ha ji echekwa Simon Ekpa' - CDS

Ebe foto si, Nigeria Army/Simon Ekpa
Onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Christopher Musa agwala gọọmentị naịjirịa ka ha kpọọ ndị nnọchiteanya gọọmentị mba Finland ma jụọ ha ajụjụ ihe kpatara ha ji enye Simon Ekpa nchekwa n'agbanyeghị etu o si ebute ọgbaaghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Musa kwuru nke a n'ụlọ omeiwu Naịjirịa dịka ndị omeiwu kpọrọ ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche na Naịjirịa iji gbaa ha ajụjụọnụ maka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ ugbua.
Simon Ekpa bụ onye na-eso ụzọ Mazi Nnamdi kanu, bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe Naịjirịa bụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).
Ekpa ekwapụla onwe ya n'otu Ipob ma bido otu nke ya ọ kpọrọ 'Auto Pilot' bụ ndị na-eti iwu mmachi mkpagharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
N'okwu ya, Musa kwuru na Simon Ekpa abụrụla nnukwu nsogbu nye Naịjirịa ma kwuo na o kwesịghị ka a hapụ ya ka ọ na-eme ihe ọ na-eme na-aga n'ihu.
"N'Ọwụwa Anyanwụ, Simon Ekpa abụrụla nnukwu nsogbu. Gọọmentị kwesịrị ime ihe gbasara ya. Anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị ka ihe dị otu a na-aga n'ihu - ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi ndị ọzọ kwesịrị itinye ọnụ n'okwu a."
"Ọ (Ekpa) na-ebutere anyị nnukwu nsogbu site n'okwu ya, ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi nke a. Ọ dị mkpa ka anyị kpọọ onye nnọchite anya mba Finland ka ọ bịa kọwaa ihe ha ji echekwa Ekpa."
Musa gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ọrụ dịịrị ndị ọrụ nchekwa ịkwalite ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. "Ndị ọrụ nchekwa enweghị ike ịnọzu ebe niile. Ya mere o ji dị mkpa ka e nwee atụmatụ dị icheiche iji na-akụziri ndị mmadụ ihe oge niile gbasara nchekwa. Ị hụ ihe ọbụla - kwuo okwu gbasara ya. i kwesịghị ịgbachi nkịtị na-asị na ọ bụ ọrụ ndị uweojii maọbụ ọrụ ndị agha. Onye ọbụla nwere ọrụ dịịrị ya."

Ebe foto si, NIGERIAN ARMY/POLICE/NAVY/PRESIDENCY/NTA
Cheta na ndị omeiwu Naịjirịa kpọrọ ndị isi ọrụ nchekwa n'ụbọchị Tuzde gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa nakwa ihe ha na-eme iji wulite ya.
Ndị isi ọrụ nchekwa a gụnyere Christopher Musa onye ji ọkwa 'Chief of Defence Staff' (CDS'; Taoreed Lagbaja ji ọkwa 'Chief of Army Staff (COAS); Hasan Abubakar ji ọkwa 'Chief of Air Staff (CAS); Emmanuel Ogalla ji ọkwa 'Chief of Naval Staff' (CNS); na Kayode Egbetokun i ọkwa 'Inspector General of Police' (IGP).
Ha kpọrọ oku ka gọọmentị kwalite ọdịmma ndị ọrụ nchekwa, tinye ego n'ịzụtara ha akụrụngwa ọrụ bụ ọkaibe, bịakwa wulite atụmatụ ọzụzụ a na-enye ha.




















