Ndị uweojii egbuola ndị ekperima karịrị 50 na Taraba Steeti

Nke a bụ nchịkọta akụkọ niile dị mkpa site na mbido ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Kpọọnụ gọọmentị Finland jụọ ha ihe ha ji echekwa Simon Ekpa' - CDS

    Christopher Musa na Simon Ekpa

    Ebe foto si, Nigeria Army/Simon Ekpa

    Onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Christopher Musa agwala gọọmentị naịjirịa ka ha kpọọ ndị nnọchiteanya gọọmentị mba Finland ma jụọ ha ajụjụ ihe kpatara ha ji enye Simon Ekpa nchekwa n'agbanyeghị etu o si ebute ọgbaaghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

    Musa kwuru nke a n'ụlọ omeiwu Naịjirịa dịka ndị omeiwu kpọrọ ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche na Naịjirịa iji gbaa ha ajụjụọnụ maka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ ugbua.

    Simon Ekpa bụ onye na-eso ụzọ Mazi Nnamdi kanu, bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe Naịjirịa bụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).

    Ekpa ekwapụla onwe ya n'otu Ipob ma bido otu nke ya ọ kpọrọ 'Auto Pilot' bụ ndị na-eti iwu mmachi mkpagharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    N'okwu ya, Musa kwuru na Simon Ekpa abụrụla nnukwu nsogbu nye Naịjirịa ma kwuo na o kwesịghị ka a hapụ ya ka ọ na-eme ihe ọ na-eme na-aga n'ihu.

    "N'Ọwụwa Anyanwụ, Simon Ekpa abụrụla nnukwu nsogbu. Gọọmentị kwesịrị ime ihe gbasara ya. Anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị ka ihe dị otu a na-aga n'ihu - ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi ndị ọzọ kwesịrị itinye ọnụ n'okwu a."

    "Ọ (Ekpa) na-ebutere anyị nnukwu nsogbu site n'okwu ya, ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi nke a. Ọ dị mkpa ka anyị kpọọ onye nnọchite anya mba Finland ka ọ bịa kọwaa ihe ha ji echekwa Ekpa."

    Musa gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ọrụ dịịrị ndị ọrụ nchekwa ịkwalite ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. "Ndị ọrụ nchekwa enweghị ike ịnọzu ebe niile. Ya mere o ji dị mkpa ka e nwee atụmatụ dị icheiche iji na-akụziri ndị mmadụ ihe oge niile gbasara nchekwa. Ị hụ ihe ọbụla - kwuo okwu gbasara ya. i kwesịghị ịgbachi nkịtị na-asị na ọ bụ ọrụ ndị uweojii maọbụ ọrụ ndị agha. Onye ọbụla nwere ọrụ dịịrị ya."

    Ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa

    Ebe foto si, NIGERIAN ARMY/POLICE/NAVY/PRESIDENCY/NTA

    Cheta na ndị omeiwu Naịjirịa kpọrọ ndị isi ọrụ nchekwa n'ụbọchị Tuzde gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa nakwa ihe ha na-eme iji wulite ya.

    Ndị isi ọrụ nchekwa a gụnyere Christopher Musa onye ji ọkwa 'Chief of Defence Staff' (CDS'; Taoreed Lagbaja ji ọkwa 'Chief of Army Staff (COAS); Hasan Abubakar ji ọkwa 'Chief of Air Staff (CAS); Emmanuel Ogalla ji ọkwa 'Chief of Naval Staff' (CNS); na Kayode Egbetokun i ọkwa 'Inspector General of Police' (IGP).

    Ha kpọrọ oku ka gọọmentị kwalite ọdịmma ndị ọrụ nchekwa, tinye ego n'ịzụtara ha akụrụngwa ọrụ bụ ọkaibe, bịakwa wulite atụmatụ ọzụzụ a na-enye ha.

  2. Ịchị Naijirịa adịghị ofere, mana agbalịrị m ole m nwereike - Buhari

    MUHAMMADU BUHARI

    Ebe foto si, FACEBOOK/MUHAMMADUBUHARI

    Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ihe o ji anya ya hụ n'ime afọ asatọ ọ nọrọ n'ọkwa ọchịchị Naịjirịa.

    Buhari kwuru na obi dị ya ụtọ nke ukwuu dịka ọ rịturu n'ọchịchị n'ihi na o nweela ohere nakwa oge ịrụ orụ ugbo ya.

    na mkparịtaụka nke ya na ụlọọrụ ntaakụkọ NTA nwere n'ọdịnso a, Buhari kwuru na onweghị ihe ọbụla fulahụrụ ya dịka ọ ritutu n'ọchịchị, naanị ekele ka ọ na-enye ndị Naịjirịa n'ihi ohere ha nyere ya ịchị ha.

    "Atụrụ m anya maka ụbọchị m ga-arịtu n'ọchịchị, obi dịkwa m ụtọ dịka oge ahụ ruru. Alọghachila m n'obodo m, ana m aga ugbo m na-elekọta ụmụ anụmanụ m na-emekwa 'exercise. Ana m ebili oge m chọrọ, ana m apụta oge m chọrọ," Buhari kwuru.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gbalịrị ole o nwere ike n'oge ọchịchị ya, mana ọ bụ ndị mmaọ̄ụ ka ọ dị n'aka ikpebi ma ọrụ ọ rụrụ ọ dị mma ka ọ bụ ọdịghị mma.

    "Ebusoro m ọnọdụ nchekwa ọjọọ agha, gbaa mbọ ịkwalite akụnụba, ma busokwa nrụrụaka agha. Ihe ndị a bụ ihe atọ anyị kpebiri na anyị ga-eme, ọ kachasị na mpaghara 'Northeast ebe ndị ọgụ Boko Haram na-akpa ike."

    Buhari kwuru na ya ekweghị ka onye ọbụla mee nrụrụaka n'ọchịchị ya maọbụ were ego ọha tinye n'ime akpa nke onwe ya.

    "Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-ekwu na ndị gbara m okirikiri bụ ndị nrụrụaka, nke ahụ bụ uche aka ha. Anaghị m ekwe ka onye ọbụla were ego ọha maka onwe ya. onweghị onye karịrị iwu, onweghịkwanụ onye nwereike igosi ihe akaebe na m hapụrụ onye dara iwu ka ọ laa."

  3. Etu Anambra ga-esi mefuo N410b n'afọ 2024 - Gọvanọ Soludo

    Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Gọọmentị Anambra Steeti

    Gọvanọ Anambra Steetu bụ ọkammụta Chukwuma Soludo ebugarala ndị omeiwu steeti ahụ bọjeetị nke steeti ahụ n'afọ 2024 ka ha nyochaa ya ma binye ya aka.

    Bọjeetị Anambra Steeti nke afọ a dịka SOludo si gosipụta ya gbakọtara N410,132, 225, 272. Ego a ji pasentị 57.8 karịa nke afọ 2023.

    Ihe kacha gbapụta ihe n'atụmatụ mkpata na mmefụ ahụ gụnyere:

    • Ego a ga-eji rụpụta ọrụ gbara ọkpụrụkpụ (Capital expenditure) - N313.9 billion nke bụ pasentị 76.54
    • Ego a ga-eji na-akwụ ụgwọ ọnwa na mmefu ndị ọzọ (recurrent expenditure) - N96.2 nke pụtara pasentị 23.46.
    • Atụmatụ ikepụta obodo mepere emepe atọ nke bụ: Awka 2.0, Onitsha 2.0, na 'Industrial City'
    Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Gọọmentị Anambra Steeti

    N'ọgbakọ ndị omeiwu ebe Soludo gosipụtara bọjeetị 2024 n'ụbọchị Tuzde, o kwuru na ọchịchị ya nwere atụmatụ ịrụ okporo ụgbọ oloko; atụmatụ dọla 200 nke Afrieximbank maka mmepe obodo, ịrụchapụ ọrụ 'Fun City' na ịrụ otu ụlọ oriri na nkwari (hotel) ga-abụ ọkaibe n'Awka, isi obodo Anambra.

    Soludo kwukwara na ọ dị mkpa ka ndị bi n'Anambra nyere gọọmentị aka n'atụmatụ mmepe niile ndị a site n'ịkwụ ụtụisi ha etu o kwesịrị nakwa oge o kwesịrị iji wulite ego na-abata n'akpa gọọmentị.

  4. Ọ bụghị eziokwu na Alex Otti mefuru ₦927m n'ihe oriri - Gọọmentị Abia Steeti

    Alex Otti

    Ebe foto si, Gọọmentị Abia Steeti

    Gọọmentị Abia steet ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha mefuru ego ruru nde naịra 927 iji zụta ihe oriri maka Gọvanọ Alex Otti, dịka akụkọ si efegharị.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mmaọ̄ụ na-akatọ ma na-akọcha ọchịchị Alex Otti na soshal midia dịka akụkọ na-efegharị na ọchịchị ya mefuru ₦927 naanị n'ihe oriri n'ime ọnwa anọ ọ nọrọla n'ọchịchị.

    Onyeisi ọrụ ntaakụkọ nke Gọvanọ Otti bụ Kazie Uko, na onye ndụmọdụ gọvanọ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Ferdinand Ekeoma, kwuru n'ụbọchị Tuzde, dịka ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha.

    "Nke bụ eziokwu bụ na onweghị ụdị ego ahụ e mefuru n'ụlọọrụ gọvanọ. Akụkọ ahụ na-efegharị bụ ụgha," ka Uko na Ekeoma kwuru.

    "Ego niile gọọmentị Abia Steeti mefurula maka ịzụta ihe oriri maka ngalaba gọọmentị niile n'ime oge a bụ ₦223,389,889.84.

    "Nke a gụnyere 'department', mịnịstrị, na 'agency' niile nke gọọmentị.

    "Ọ dị mkpa ịmata na ego a gbakọtara steeti Abia niile, ọ bụghị naanị ụlọọrụ gọvanọ. ọ gbakọtakwara emume na ọgbakọ niile nke gọọmentị Abia hazirila n'ime oge a.

    "Gbasara ego gọọmentị mefuru na ngalaba ọdịmma, ihe ọ gbakọtarala bụ ₦397,520,734.84.

    "Ngalaba ọdịmma metụtara ahụike, mwugharị nakwa ọnọdụ gbatagbata ọha".

    Ụfọdụ ndị a ma ama so katọọ gọọmentị Abia steeti oge akụkọ a malitere ifesa gụnyere Aisha Yesufu, onye a ma ama na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị mmadụ, ma bụrụkwa nnukwu onye nkwado otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Pati' bụ ebe Gọvanọ Alex Otti nọọ na ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Anyị enweghị ego anyị ga-akwụ Peseiro ma anyị chụọ ya - NFF

    Jose Peseiro

    Ebe foto si, Jose Peseiro/X

    Nse Essien, bụ otu n'ime ndị isi otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' (NFF) ekwuola na ha enweghị ego ha ha ga-eji kwụọ Jose Peseiro, onye nkuzi bọọlụ ndị otu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naịjirịa ma ọ bụrụ na ha chụọ ya n'ọrụ.

    Essien kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu dịka Naịjirịa na mba Zimbabwe gbachara asọmpi itozu oke maka iko mba ụwa n'ụbọchị Sọnde.

    O kwuru na ha ma na ọtụtụ ndị Naịjirịa na-akpọ oku ka NFF chụọ Peseiro n'ọrụ maka ọtụtụ ọnyụpa ndị Super Eagles na-agba n'ọdị nso a.

    Cheta na Naịjirịa na Lesotho gbara 1-1 n'asọmpi itozu oke maka iko mba ụwa n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba, bịakwa gbakwaa otu ihe ahụ oge ha na Zimbabwe zutere n'ụbọchị Sọnde.

    Essien kọwara na ọ bụghị ndị NFF nyere Peseiro ọrụ dịka onye nkuzi ndị Super Eagles, ọ bụ Mịnịstrị egwuregwu.

    "Ruo ugbua, anyị ekwesịla ịkwụcha ha ụgwọọnwa ha niila, mana anyị enwebeghị ike ịkwụ ha ọbụladị otu kọbọ," Essien kwuru.

    "Onye ga-akwụ ya ụgwọọnwa ya ruru $70,000 n'otu ọnwa, ma ọ bụrụ na anyị chụọ ha n'ọrụ? Nke a bụ ọnọdụ anyị hụrụ onwe anyị na ya ugbua."

    "Ọ bụrụ na anyị nwere ego ahụ iji kwụchapụ ya ụgwọ, anyị ga-asị ya lawa. Obi adịghị anyị mma etu ihe dị ugbua."

  6. Fr Alia enwatala mmeri n'ụlọikpe mkpegharị dịka gọvan Benue Steeti

    Hyacinth Alia

    Ebe foto si, Hyacinth Alia

    Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja enyela mkpebi ma kwuo na ọ bụ ụkọchukwu Hyacinth Alia bụ onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Kogi steeti n'ọnwa Maachị afọ 2023.

    Alia, onye bụ ụkọchukwu na ụlọụka Katọlik, meriri ntuliaka ahụ n'otu 'All Progressives Congress' (APC) dịka o meriri Titus Uba nke otu 'Peoples Democratic Party (PDP).

    Cheta na ụlọikpe 'Tribunal' e hibere maka ntuliaka ahụ kụchapụrụ mkpesa nke Titus Uba kpesara gbasara ntuliaka ahụ ma kwuo na ọ bụ Alia meriri.

    Mana Uba wegara mkpesa n'ụlọikpe mkpegharị ma kwuo na Alia abụghị onye kwesịrị ịzọ ọkwa gọvanọ na pati APC.

    Na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị ahụ nke onyeisi ya bụ ọkaikpe Onyekachi Otisi, ha kpebiri na Otisi enweghị ikike ọbụla ịgbagha mpụtara ntuliaka imeụlọ nke ndị APC. Ha kwukwara na ntuliaka imeụlọ nke ndị APC mere iji họpụta Hyacinth Alia, nwetara nkwado nke ụlọikpe ukwu dị na Makurdi, Benue Steeti.

    Ọzọkwa, ụlọikpe kụchapụrụ ebubo asambodo adigboroja nke Uba boro Alia.

  7. Anyị nwere ozu dọọrọla afọ 18 years- Ụlọozu mahadum 'Godfrey Okoye University'

    Godfrey Okoye University,Enugu

    Ebe foto si, Godfrey Okoye University

    Mahadum Godfrey Okoye University (GOUNI) dị n'Enugu Steeti enyela ezinaụlọ nwere ozu n'ụlọozu nke ụlọọgwụ mahadum ahụ abalị 21 ka ha bịa buru ozu ndị nke ha tupu ha elie ha n'ile n'otu ili ọha.

    Na nsonso a, mahadum ahụ natara ikike ụlọikpe ili ozu dị 33 tọrọ n'ụlọọzụ nke mahadum ha.

    Onyeisi mahadum ahụ bụ Vice-Chancellor Christian Anieke, gbara ama ụbọchịụka n'ụfọdụ ozu anọọla na mahadum ahụ afọ 18, na-enweghị onye gbara ha.

    The university has given families a 21-day ultimatum to claim the bodies, before the planned mass burial.

    “I am appealing to those who have corpses in the mortuary to come and remove them. We are talking about human beings here and not animals. Go and check if your relation is there,” Mr Anieke was quoted as saying by the Lagos-based Daily Sun newspaper.

    The university teaching hospital intends to clear bodies to allow the facility to be upgraded.

  8. Nwunye Jimmy Carter, Rosalyn Carter alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 96

    Rosalyn Carter

    Ebe foto si, EPA

    Nwunye Jimmy Carter, aka chịburu mba Amerika bụ Rosalynn Carter, anwụọla ka ọ gbachara afọ 96.

    Ụlọọrụ 'Carter Center' bụ ndị gbara ama na ọ nwụrụ n'ezie n'ozi ha wepụtara, kwuru na ọ nwụrụ n'udo n'ihu ndị ezinaụlọ ya.

    Di ya bụ Jimmy Carter n'ozi nke ya sịrị, "Rosalynn bụ onye mụ na ya kwụ n'ime nile m mepụtara."

    "Ọ nyere m ndụmọdụ nakwa agbamuume oge ọbụla ọ dị m mkpa."

    " Rosalynn nọrọ n'ụwa, a mara na o nwere onye hụrụ m n'anya ma na-akwado m."

    Jimmy na Rosalynn Carter

    Ebe foto si, Reuters

    N'ụbọchị Fraide, e kwuru na e bugara Oriakụ Carter n'ụlọ nnekọta ndị oge ha gwụwarala nke dị na Georgia,ebe ya na dị ya gbara afọ 99 bụ onye nọ n'ụlọ nleta ndị ahụ esighị ike oge ha gwụwarala kemgbe ọnwa Febụwarị.

    A chọpụtara na Oriaku Carter na-arịa ọrịa agadi Bekee kpọrọ, 'Dementia'.

    Jimmy Carter na nwunye ndị lụọrọ onwe ha ogologo oge mere ncheta afọ 77 ha gbara akwụkwọ n'ọnwa Julai afọ 2023.

    A mụrụ Oriakaụ Carter bụ onye na-azabu Eleanor Rosalynn Smith n'abalị 18 ọnwa Ọgụstụ afọ 1927.

  9. Igbo, mma mmanụ!

    Igbo, mma mmanụ!

    Onye biri, ibe ya biri!

  10. Gọọmentị ga-atọhapụ mmadụ 4,068 nọ n’ụlọmkpọrọ na Naịjirịa

    Ndị na-elekọta ụlọmkpọrọ na Naịjirịa

    Ebe foto si, Nigerian Correctional Service/Facebook

    Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-atọhapụ mmadụ puku anọ na iri isii na asatọ e ji eji n’ụlọmkpọrọ ka ha nwere onwe ha.

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo bụ Olubumi Tunji-Ojo kwuru nke a mgbe ọ na-agbape atụmatụ e ji atọhapụ ndị a n’Abuja n’ụbọchị ụka 19 Nọvemba, 2023.

    O kwuru na ha na-eme nke a iji belata ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụlọmkpọrọ niile dị na Naịjirịa, ma kwuo na ndị a ga-atọhapụ bụ ndị na-enweghi ike ịkwụnwu ụgwọ ngha e tinyere n’isi ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị ewepụtala ego dị nde narị naịra ise na nde iri asatọ na ise (N585m) ha ga-eji akwụ ụgwọ dị ndị a n’isi iji tọhapụ ha mmadụ 4,068.

    O kwuru na ọ ga-abụ ndị ụgwọ maọbụ ngha dị n’isi ha agaghị akarị otu nde naịra.

    O kwuru na ministri na ministri na-ahụ maka ikpe ziri ezi ga-agbakọta aka iji hụụ na e belatara ndị e ji na nga maka na ikpe ha ga-adị n’ụlọikpe kamgbe a kpọrọ ‘awaiting trial’.

    Na nzaghachị onyeisi ndị nlekọta ụlọmkpọrọ na Naịjirịa bụ Haliru Nababa kelere minista na-ahụ maka ime obodo n’ihi atụmatụ a.

  11. Etu mmiri si rie nwata akwụkwọ Abia Steeti Politeknik

    Mmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Mmiri eriela otu nwata akwụkwọ ngalaba ‘Higher Diploma (HND1) nke ụlọakwụkwọ Abia Steeti Politeknik mgbe ọ na-egwu mmiri n’otu iyi dị n’Umuahia isiobodo steeti ahụ.

    Akụkọ kwuru na nwata nwoke a a na-amatabeghi aha ya bụ nwafọ obodo Uzuakoli nke okpuruọchịchị Bende.

    Akụkọ kwukwara na ọ bụ otu mkpụrụ anya nne na nna ya ji ahụ ụzọ (naanị otu nwa ha nwere).

    Njiji a mere mgbe nwaokoroọbị a na ndị enya ya gara igwu mmiri n’iyi Umuchime dị n’obodo Ossah Ibeku nke Umuahia North.

    Mgbe mmiri a malitere iri ya, ndị enyi achọpụtaghị ọsịsọ mana tupu ha na-amata ihe na-eme mmiri erimiela ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia Steeti Maureen Chinaka ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke dịka ekwentị ya anaghị aga tupu akụkọ apụta.

  12. Ụlọikpe achụọla Gọvanọ Mutfwang nke Plateau steeti ma nye Goshwe nke APC ọkwa

    Mutfwang na Goshwe

    Ebe foto si, Mutfwang/Goshwe/Facebook

    Ụlọikpe mkpegharị sị n’Abuja achụọla gọvanọ Caleb Mutfwang nke Plateau Steeti ma nye Nentawe Goshwe nke All Progressive Congress mmeri.

    N’ikpe nke a chabiri n’ụbọchị Sọnde, ọkaikpe Elfrieda Williams-Dawodu nyere ụlọọrụ Inec iwu ka ha nye Goshwe asambodo dịka onye meriri na ntuliaka e mere n’ọnwa Maachị 2023.

    Ọkaikpe a kụchapụrụ ikpe ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka nyere bụ nke gara n’ihu kwadoo mmeri gọvanọ Mutfwang ma sị na ikpe ahụ erijughi afọ.

    O kwuru na mkpebi ụlọikpe nke kwuru na mkpesa APC na Goshwe enwghi ikike itinye ọnụ n’ihe mere na pati Peoples Democratic Party e ji họpụta Mutfwang medigere ngalaba 177 nke iwu 1999.

    O kwuru na PDP nupuruisi n’iwu ụlọikpe nyere nke sị ha mee ntuliaka imeụlọ n’okpuruọchịchị 17 dị na steeti kama ha mere naanị n’okpuruọchịchị atọ nke pụtara na o nweghi isi.

    Ụlọikpe a kwuru na okwu banyere mmadụ itozuoke azọ ọkwa bụ okwu mmalite nakwa mmecha ntuliaka (pre and post election matters).

    Ụlọikpe gara n’ihu nye Inec iwu ka ha na-apụ gọvanọ Mutfwang asambodo mmeri ngwa ngwa ma nye ya Goshwe.

  13. Aka akparala nwoke tọọrọ onwe ya,na-ana nde naira atọ

    Onye a na-enyo enyo maka ịtọrọ onwe ya

    Ebe foto si, Abia State Police

    Ndị uweojii Abịa steeti anwụchiela nwoke tọọrọ onwe ya , na-apụ ndịezinaụlọ ya nde naira atọ maka mgbapụta.

    Ezinaụlọ nwoke a kpọrọ 'John' onye Amachara Umuahia wegara ndị uweojii mgbesa na nwa amadi ahụ gara ụlọakụ dị n'okporoụzọ'Bank Road' dị n'Umuahia ịdọrọ ego, e were tọọrọ ya.

    Mana oge ndị uweojii mewere nnyocha, ha chọpụtara ba na nọ n'ụlọ ndịna Wisdom Guest House, na onweghị aka ọzọ dị na ntọrọ ya ọbụla.

    Maazi John ji aka ya konukọọ ntọrọ ya ma sị ndị ezinaụlọ ya kwụta nde atọ naria, o mechara kweta ka e weta nde naira abụọ dịka ndị ezinaụlọ ya na-agbagharị inweta ego ahụ.

    Ohe a nwụchiri ya, nwa amadi ahụ kwetara n'ezie na ọ bụ ya kpara ya bụ nkata ma kwuo na o mere nke a iji nweta ego ọ ga-eji akwụ ụgwọ o ji.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia bụ Maureen Chinaka, onye kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie kwuru na ha na-enyocha ya nbụ ihe dịka ọ dọọ aka na ntị na ụdị mpụ ga-adọtara onye mere ya nga afọ iri.

  14. Etu aka si kpara mmadụ atọ so n'otu ndị mgbere egbe n'Anambara steeti

    Egbe na mgbọegbe

    Ebe foto si, Anambra Police Command

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha anwụchiela mmadụ atọ so n'otu ndị na-agba mgbere egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ n'Ọnịcha, Anmbara steeti.

    A napụtara ndị ahụ egbe 23 nakwa mgbọegbe 625.

    Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ọ bụ nnyọcha ha mere imi n'ala mee ọtụt.ụ izuụka mitara ya bụ mkpụrụ.

    Ikenga gara n'ihu sị, " Mmadụ atọ ka a nwụchiri n'Onicha dịka nnyocha na-aga n'ihu."

  15. Igbo ndị ọma, ndewoonụ!

    Igbo ndị ọma, ndewoonụ!

    Ka izu a maara ụnụ mma!

  16. Etu e si metọọ nwata akwụkwọ nwaanyị dị afọ atọ n'ụlọakwụkwọ dị n'Enugwu

    Ụlọakwụkwọ Tender Links dị n'Enugwu

    Gọmentị Enugwu Steeti emechiela ụlọakwụkwọ Tender Links dị na Trans Ekulu maka ebubo na onye nkuzi metọrọ nwata akwụkwọ dị afọ atọ ma nọrọ na klassị ọta akara (Nursery).

    Nke a mere n'ụbọchị Tuzde 14 Nọvemba 2023 mgbe nwata ahụ si n'ụgbọala na-ebu ha aga akwụkwọ rituo, a chọpụtara na o nwere mmerụ ahụ nke mere ọbara ji na-agba n'ihe o ji bụrụ nwaanyị dịka ndị uweojii si kwuo.

    Kọmishọna uweojii bụ Kanayo Uzuegbu kọwara na ahụ nwata ahụ nọ na-afụkwa ya ụfụ nke mere e jiri chọpụta na mmadụ emetọọla nwata ahụ ma nye ya nnukwu ọnya dị iche ịche.

    Dịka nyocha na-aga n'ihu, ndị uweojii gara n’ihu chọpụta na e metọọla ọtụtụ ụmụakwụkwọ ebe ahụ n’oge gara aga.

    Ụlọakwụkwọ Tender Links dị na Trans Ekulu, Enugwu Steeti

    N'ihi nke a ha nwụchiri ndị a na-enyo enyo na aka ha nwereike ịdị na nke a, ha gụnyere, onye nkuzi nwaanyi na-akụziri nwata ahụ, nwoke na-akwọ ụgbọala ụlọakwụkwọ ahụ nakwa onye na-elekọta ụgbọala ụmụakwụkwọ.

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ mere ngagharịiwe n'ụbọchị Fraịde 17 Nọvemba iji gosi iwe ha maka mmetọ a na-emetọ ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    Uzoegbu gara n'ihu katọọ ụdịrị agwa a ma sị na ọ bụ ụdịrị ihe mmadụ kwesịrị iche n'obi ka ọfọdụzie ime ya.

    O kelekwara gọọmentị Enugwu Steeti maka imechi ụlọakwụkwọ ahụ ma sị na nyocha ka na-aga n'ihu ịmata kpọkwem onye gbara arụ a.

  17. Etu ndị ojiegbe si gbagbuo ndị uweojii abụọ n’Ebonyi Steeti

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwupụtala ọnwụ ndị otu ha abụọ bụ ndị ojiegbe wakporo ma gbagbuo n’okporoụzọ Nwofe dị n’akụkụ Abakaliki.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Onome Onovewakpoyeya sị na nke a mere n’elekere asatọ nke ụtụtụ Fraịde 17 Nọvemba 2023, mgbe ndị ojiegbe bu ụgbọala wakpo ndị uweojii n’ụzọ ahụ.

    O kwuru na ndị a gburu ndị otu ha mmadụ abụọ ebe otu onye merụrụ ahụ mana na-anata ọgwụgwọ ugbua.

    Kọmishọna ndị uweojii bụ Augustina Ogbodo agaale njem mgbaru n’ebe ahụ ihe a mere ma kpọọ oku na onye ọbụla nwere ozi ga-enye aka ịnwụchi ndị a mee ka ha mata.

  18. Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, TVC news/Screenshot

    Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya n'aka Inec taa bụ ụbọchị Fraịde n'Owere bụ isi obodo steeti ahụ.

    Uzodimma n'okwu nnabata ya kwuru na ihe Inec mere egosila ndị mmadụ na ha nwereike ịnwe ntụkwasiobi na vootu ha ga-enwe isi.

    O ji ohere ahụ kelee ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec maka ịhazi ntuliaka ọ sị bụ nke kachasị "nwe udo ma nye ohere ma bụrụ nke ziri ezi"

    O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha nyere atụmatụ ntuliaka n'ụbọchị ahụ.

    Cheta na Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti e mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.

    Ọ ga-achị afọ anọ ọzọ dịka iwu Naịjirịa si nye.

  19. Ọrịa otolo ebutela ọnọdụ gbatagbata na Zimbabwe

    Ndị na-achọ mmiri

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, E nweghi mmiri ọṅụṅụ dị mma so n'ihe na-ebute ọrịa otolo

    Gọọmentị Zimbabwe enyeela ịwu ọnọdụ gbatagbata n’isiobodo ha bụ Harare n’ihi oria otolo dakwasiri ha.

    Ọrịa a egbuọla ọtụtụ mmadụ, a na-enyocha na ihe ruru puku mmadụ asaa awụola n’ọrịa a.

    Ndi ọchịchị kwuru na ọria a na-echetara ha mgbe ọrịa ojoo ahụ fesara n'afọ 2008 nke gburu puku kwuru puku mmadụ.

    ''Anyi etiela ịwu ọnọdu gbatagbata maka ọrịa otolo’’ bụ ihe ọtu ụlọntakụkọ sị na Mayọ Makone kwuru.

    Ha na-ariọ enyemaka iji hu na e gbochiri ọria a site na ị webata mmiri dị ọcha ma kwuo na enyemaka ha na-enweta ezughi oke.

  20. Lee ndị ọkaikpe a họpụtara maka ibuli ha n’ọkwa ‘Supreme Court’

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa

    Ebe foto si, Supreme Court

    Ngala na-ahụ maka ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ Federal Judicial Service Commission (FJSC) ewepụtala aha ndị ọkaikpe mmadụ iri abụọ na abụọ a chọrọ ibugo n’ọkwa ikpe ikpe n’ụlọikpe kachasị.

    A họpụtara ndị a site na mpaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị isii na Naịjirịa a kpọrọ ‘geopolitical zone’.

    Mmadụ isii si na mpaghara North/Central, mmadụ isii ọzọ si na South/East, North/West nwere mmadụ anọ ebe South/South, South/West na North/East nwere mmadụ abụọ abụọ.

    Aha ndị a gụnyere;

    SOUTH-EAST

    1. Hon Justice Nwaoma Uwa (Abia State)-Priority

    1A.Hon Justice Onyekachi Otisi (Abia State) -Reserve

    2. Hon Justice Obande Ogbuinya (Ebonyi State)-Priority

    2A. Hon Justice Theresa Orji-Abadua (Imo State)- Reserve

    3. Hon Justice Anthony Ogakwu (Enugu State)-Priority

    3A. Hon Justice Chioma Nwosu-lheme (Imo State)-Reserve

    SOUTH-SOUTH

    1. Hon Justice Moore Adumein (Bayelsa State)-Priority

    1A. Hon Justice Biobele Georgewill (Rivers State)-Reserve

    SOUTH-WEST

    1. Hon Justice Adewale Abiru (Lagos State)-Priority

    1A. Hon Justice Olubunmi Oyewole (Osun State)-Reserve

    NORTH-CENTRAL

    1. Hon Jummai Sankey (Plateau State)-Priority

    1A. Hon Justice Muhammad Ibrahim Sirajo (Plateau)-Reserve

    2. Hon Justice Stephen Adah (Kogi State)-Priority

    2A. Hon Justice Ridman Maiwada Abdullahi (Nassarawa State) -Reserve

    3. Hon Justice Baba Idris (Niger State)-Priority

    3A. Hon Justice Joseph Ikyegh (Benue State)-Reserve

    NORTH-EAST

    1. Hon Justice Haruna Simon Tsammani (Bauchi State)-Priority

    1A. Hon Justice Abubakar Talba (Adamawa State)

    NORTH-WEST

    1. Hon Justice Muhammad Lawal Shuaibu (Jigawa State)-Priority

    1A. Hon Justice Bello Aliyu (Zamfara State) -Reserve

    2. Hon Justice Abubakar Sadiq Umar (Kebbi State)-Priority

    2A. Hon Justice Abdullahi Mahmud Bayero (Kano State)-Reserve