Ndị uweojii egbuola ndị ekperima karịrị 50 na Taraba Steeti

Nke a bụ nchịkọta akụkọ niile dị mkpa site na mbido ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị uweojii egbuola ndị ekperima karịrị 50 na Taraba Steeti

    Ndị ekperima

    Ebe foto si, Getty Images

    E gbuola opekatampe ndị ekperima karịrị 50 na-akpa ike n’okpuruọchịchị Bali nke Taraba Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abdullahi Usman gwara ndị ntaakụkọ Channels TV na nke a mere n’ụbọchị Tuzde 28 Nọvemba 2023.

    O kwuru na ọ bụ site na mbọ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbakọtara aka mere ka e gbuo dị ekperima a.

    O kwuru na ọ bụ dịka ndị bi n’obodo dị iche iche n’okpuruọchịchị ahụ na-eti mkpu n’ihi oke mwakpo ndị ekperima a na-eme ha.

    “Uweojii Taraba Steeti nwetere ozi na ndị ojiegbe e cheere bụ ndị ntọrị ruru otu naarị mmadụ wakporo obodo Toni n’elekere ise nke ụtụtụ mgbe ndị Alakụba na-ekpe ekpere ha ma malite ịgba egbe aghara aghara,” ka o kwuru.

    “Ngwa ngwa ha natara ozi a, kọmishọna uweojii zipuru ndị otu ya n’ebe ahụ, site na mgbakọ aka ha na ndịagha.

    “Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha na ndị ekperima a kwatara mgbọ ebe ha gbagburu ọtụtụ n’ime ha dịka ndị ọzọ bu mmerụ ahụ site na mgbọ egbe rie mbọ mbọ ọsọ.”

    O kwuru na ndị gbagburu ndị obodo iri na abụọ tupu ndị uweojii erute ebe ahụ.

    Cheta na Taraba so na steeti dị n’Ugwu ebe ndị ekperima na-akpa ike dị egwu, ha tọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụakwụkwọ na nso nso a.

  2. Agadị nwaanyị dị afọ 70 amụọla ejima nwoke na nwaanyị

    Safina Namukwaya

    Ebe foto si, Women's Hospital International and Fertility Centre

    Nkọwa foto, Safina Namukwaya mụrụ ejima nwoke na nwaanyị n'ụbọchị Wenzde.

    Otu agadị nwaanyị mba Yuganda dị afọ 70 amụọla ejima n'ụlọogwụ dịka ọ mechara ọgwụgwọ pụrụiche akpọrọ IVF na Bekee.

    Ugbua ọ bụrụla nwaanyị kachasị dị agadị mụrụla ejima n'ala Afrịka niile.

    Ụlọọgwụ ahụ ebe ọ mụrụ nwa bụ Women's Hospital International and Fertility Centre dị na mba ahụ kwuru na ọ mụrụ nwoke na nwaanyị ma kwuo na nne na ụmụ nọ na mma.

    Namukwaya kwuru na nna ụmụaka ahụ gbahapụrụ ya kemgbe ọ chọpụtara na ọ bụ ejima ka o bu.

    "Ụmụ nwoke achọghị ịma maọbụrụ na ị bụkarịrị otu nwa. Kemgbe m nọ ebe a, onye otu m agbahapụla m" ka o kwuru.

    Ọ sịkwa na obi dị ya ụtọ ịmụ ụmụ dịka ọ mụrụ nwa mgbe ogologo oge gachara.

    Namukwaya amụbuola nwa nwaanyị ọzọ n'afọ 2020.

    Ụlọọgwụ ahụ kwuru na akụkọ abụghị naanị maka ọrụ ndị sayensị kama o gosiri uchu dị na mmụọ mmadụ.

  3. Ụlọikpe enyeghị Peter Obi mkpebi n'akwụkwọ ọ gbara- Labour Party

    Njirimara Labour Party

    Ebe foto si, Labour Party/Facebook

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party (LP) egosila enweghị afọ ojuju n’ihi nchabi ikpe Ụlọikpe okpechaaọgwụ Naịjirịa nyere maka ntụliaka ọkwa onyeisiala afọ 2023, kọwaa ya dịka nke na-amapụ obi.

    N’ozi otu ahụ wepụtara site n’aka odeakwụkwọ ya bụ Alhaji Umar Farouk Ibrahim, Ọkaikpe ziri ezi John Inyang Okoro nọọrọ n’oge ọ na-achabi ikpe n´abalị 26 nke ọnwa October, afọ 2023 kwuo na nchabi ikpe n’akwụkwọ mkpegharị ikpe Labour Party gbara n’ihu ụlọikpe ahụ bụ nke ga-adabere na nchabi ikpe e nyere na nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP).

    Dịka o siri kwuo, ewezuga ihe banyere inweta pasenti vootu 25 n’Abuja nke otu abụọ ahụ nwere nkwekọrịta, akwụkwọ mkpegharị ikpe PDP na LP gbara n’ihu ụlọikpe ahụ bụ ụzọ akwụkwọ abụọ dị iche ndị sitere na nchabi ikpe e nyere n’ụlọikpe tribunal ma bụrụkwa ndị ụlọikpe ahụ lebara anya iche iche.

    O kwukwara na mgbe ụlọikpe okpechaa ọgwụ na-elebaara okwu ndị ahụ anya, enweghị oge ọ bụla e kpebiri ka ejikọọ ha ọnụ ma ya fọdụzie inye ntụziaka maọbụ iwu ka nchabi ikpe a ga-enye maka otu bụrụ ebe nke ọzọ ga-agbakwasa ụkwụ.

    Ọ sịrị na Labour Party nọọrọ n’abalị 26 nke ọnwa October, afọ 2023 degaara onye Registrar ụlọikpe okpechaa ọgwụ akwụkwọ ka o nye ha akwụkwọ ji chabie ikpe n’okwu otu ahụ bụ́kwa nke o mechara chetaara ya ọzọ n’abalị 8 nke ọnwa November, afọ 2023 mana ruo taa e nwebeghị ihe ruru ya aka.

    N’ihi nke a, ọ kọwara akparamaagwa ụlọikpe ahụ dịka nke na-ekwesịghị ekwesị nakwa nke a na-atụghị anya ya dịka ọ bụ nke megidere mpaghara iwu 294 (1) nke obodo Naịjirịa nke afo 1999 (dịka emegharịrị ya).

  4. Omeiwu emeela ngagharịiwe otu-onye maka nkagbu Ụlọikpe Mkpegharị kagburu mmeri ya

    Destiny Nwagwu

    Ebe foto si, Destiny Nwagwu/Facebook

    Onye omeiwu na-anọchite Abia-North n'ụlọomeiwu Abia steeti bụ Hon. Destiny Nwagwu,emeeela ngaghariiwe otu-onye iji gosi iwe ya banyere nkagbu nke Ụlọikpe Mkpegharị kagburu mmeri ya.

    Ụlọikpe Mkpegharị nke Legọs Steeti kagburu mmeri Nwagwu ma kpọpụta Aaron Uzodike dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

    Nwagwu bụ akwụkwọ o dere iwe ya gagharia n'okporoụzọ dị n'Aba, isiobodo Abia steeti.

    Cheta na n'afọ 2019 Nwagwu zọrọ otu ọkwa ahụ n'aha otu Apga dara na ntuliaka, ebe Ụzọdịke meriri n'ụzọ seere okwu.

  5. Onyeisiala Tinubu ewepụtala akwụkwọ mkpata na mmefu (Bọjetị) afọ 2024

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Gacebook

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ewepụtala akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2024 nke ọnụ ego ya ruru Tarịị naịra 27.5 (N27.5trn).

    O mere nke n’ụbọchị Wenezde 29 Nọvemba, 2023 n’ihu ndị ụlọomeiwu Naịjirịa ma nke ukwu ma nke nta.

    Mkpata na mmefu a nke ọ kpọrọ nwogharị olileanya (Budget of Renewed Hope), Onyeisiala Tinubu sị na ọ ga-eweta mwulite akụnaụba, belata ụbịam, nye ndị mmadụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ebe ndị ọ sị kachasị mkpe na mkpata na mmefu a gụnyere, nchekwa, ikewapụta ọrụ, ntinye ego, nwulite azụmaahịa ndị obere, mbelata ụbịam, na nwulite ọnọdụ mmadụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ ga-aka emetụta bụ ụmụaka maka na ha bụ isisekpu ntị na nwulite ọnọdụ obodo.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ ga-agba mbọ kpachie mpio niile e si zuru ego ma chọta ụzọ ndị ọzọ e si enwete ikike na-enye ọkụ latrik.

    Ọ dizi n’aka ndị ụlọomeiwu inyocha akwụkwọ mkpata na mmefu a tupu ha ebinyeaka na ya ma kwadoo ya ka ọ bụrụ iwu.

    Mgbe Onyeisiala Tinubu gosiri akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2024

    Ebe foto si, House of Representatives

    Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka bọjetị nke 2024

    • Ọnụego mkpata na mmefu (bọjetị) nke a 2024 ji ihe dịka pasentị iri abụọ na isii (26%) karịa nke afọ 2023.
    • Ọ gbakwasịrị ụkwụ n’ọnụego mmanụ agbịdị dị dọla iri asaa na asaa na ụma ($77.96) kwa otu udu mmanụ (per barrel) ebe a na-amịpụta udu mmanụ otu nde na ụma (1.79m) kwa ụbọchị.
    • Gọọmentị na-achị ibite ego dị ijeri dọla asatọ na ụma ($8.8bn) iji kwalite ego mkpata na mmefu nke afọ 2024.
  6. Ụlọikpe achụọla osote onyeisi ụlọomeiwu Bauchi, ụlọikpe mkpegharị enyela iwu ka e megharịa ntuliaka ụfọdụ ebe

    Ụlọikpe mkpegharị n'Abuja achụpụla oso onyeisi ụlọomeiwu Bausti Steeti bụ Jamilu Barade ma nye iwu ka e megharịa ntuliaka ụfọdụ ebe na steeti ahụ.

    Nke a na-abịa naanị abalị ka ụlọomeiwu chụpụkwara onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Abubakar Suleiman na-anọchite mpghara Ningi n'okpuru ọchịchị Ningi na steeti ahụ.

    Ụlọikpe ahụ kachapụrụ ikpe ụlọikpe ntuliaka nke Bauchi steeti meburu ebe e kpebiri na Barade onye PDP meriri ntuliaka ahụ ma bụrụ onye kwesiri ịnọchite mpaghara bauchi Sentraalụ n'ụlọomeiwu ahụ.

    Jamilu Barade

    Ebe foto si, Jamilu Barade Facebook

    Nkọwa foto, Jamilu Barade n'ụlọomeiwu

    Cheta na onye zọrọ oche ahụ na pati All Progressive's Congress APC bụ Aliyu Ilela gbara akwụkwọ n'ụlọikpe megide mpụtara ntuliaka ahụ ma kwuo na e a tụkarịrị vootu n'ogbe vootu itoolu, mana ụlọikpe kagburu mkpesa ya.

    Ọ nabatakwaghị mkpebi a ma buru ya gaa n'ụlọikpe mkpegharị ebe e kpebiri ya nye ya bụ onye APC mmeri ugbua,

    Ụlọikpe nyere iwu ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission bụ Inec napụta Barade asambodo nyere ya ọkwa e nyere ya ma megharịa ntuliaka n'ebe e nwere nsogbu ahụ ka a mata onye meriri n'ezie.

    Etu ọ dị ugbua, Inec na Bauchi gwara ndị ntaakụkọ na ha anatabeghi akwụkwọ si n'ụlọikpe mana ha dị njikere imegharị ntuliaka ahụ.

  7. Uttarakhand Tunnel: A gbapụtala ndị ọrụ 41 tọọrọ n'ime ọgba

    Ndị  ọrụ agbapụtara n'ọgba zere eze n'India

    Ndị ọrụ mmadụ 41 tọọrọ n'ime ọgba(tunnel) ebe ha na-arụ ọrụ n' dị n'India e nwerela onwe ha ga ọ gachara abalị 17(Novemba 12) ọgba ahụ ji zee.

    O si gọọmentị kwuru na nkea bụ ezigbote 'ozi ọma" nye mba ahụ

    O nweghị onye n'ime ha merụụ ahụ maka a na-eme ha nnyocha ahụ.

    Ndị isi obodo na-enye ha ikuku oxygen, nri na mmiri site n'okporo igwe.

  8. Ihu ọchị awaala ndị Enugwu dịka mmiri malitere ịgba ọzọ

    Ndị na-echu mmiri

    Ndị Enugwu nna-enwe ọṅụ, achị eze dịka mmiri malitere gbawa ọzọ n’ọtụtụ ebe dịka Gọvanọ Peter Mbah si kwee na nkwa.

    Mbah kwere nkwa dịka a na-edu ya n'iyiọrụ dịka Gọvanọ Eniigwu steeti na mmiri ga-amalite ịgba n’ime mkpụrụ ụbọchị 180 ọ banyere ọchịchị.

    N'ụbọchị Satode, abalị 25 nke ọnwa Novemba, afọ 2023 Mbah mere emume ịgbape mmiri na 9th mile dị n’Enugwu ma kwuo na mmiri ahụ adịla onye ọbụla bi n’ime isi obodo Enugwi nso.

    Govanọ Peter Mba nke Enugwu Steeti

    Oge BBC Igbo gagharịrị na gburugburu Enugwu iji chọpụta na mmiri ọ na-agbazi n’ezie, ọ hụrụ Edinburgh Junction na Bilante dị na GRA Enugwu pọmpụ mmiri ahụ na-agba nke ọma, ebe ndị bi na gburugburu ahụ na-echuzi mmiri etu o siri masị ha.

    Ebe ndị ọzọ mmiri na agbakwa gunyere; Artisan, Asata, Transekulu, Abakpa, Emene nakwa ebe ndị ọzọ.

    Ụfọdụ ndị Enugwu na-echu mmiri kwuru na obi dị ha nnukwu aṅụrị na gọọmenti nọ ugbua mezuru nkwa ha kwere.

    Onye bi n'Enugwu

    Otu n'ime ha gara n'ihu rịọkwara Mbah ka ọ ghara ịkwụ ime ihe ọma ma o nweta ohere ịzọ agba nke abụọ ya.

    "Obi dị m ụtọ ka m hụrụ mmiri a. Peter Mbah bụ Gọvanọ anyị egosila na mbata ọ batara n'ọchịchị,anyị agaghị anọ n'ụkọ mmiri n'afọ.

    "Ọ bụghị o mee nke a maramara, o rụe n'agba nke abụọ ya, ọ pịawa anyị ụttarị."

    Gọvanọ Peter Mbah kwere nkwa na ya ga-arunyekwa otụtụ ebe ọzọ a ga na-echu mmiri ma kwue na ebumnobi ya bụ na oge na adighị anya mmiri ga na-agba n’ime ụlọ ndị mmadụ.

  9. Mmadụ 11 anwụọla n'ụmị ọnatarachi

    Ụlọọrụ Implat nwe ụmị ọnatarachi

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ụlọọrụ Implat nwe ụmị ọnatarachi

    Mmadụ iri na otu anwụọla dịka ihe mberedere mere n'ụmị a na-ekwupụta ọnatarachi 'platinum' na Saụt Afrịka n'ehihie Monde, dịka ụlọọrụ nwe ụmị ahụ bụ 'Implats' si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Johan Theron gwara BBC na mmadụ 86 danyere n'ihe mberede ahụ mana ọbụ mmadụ 11 nwụrụ.

    Ndị ọzọ nmerụrụ nnukwu ahụ.

    Theron kwuru na a malitela nnyocha ihe mere na ihe mberede ahụ nke metụtara ụdọ a na-ekonye ihe a na-etinye n'ihe e ji adọlite maọbụ dọtuo ndị mmadụ n'ụmị otatarachi.

  10. Kedụ ka ụnụ mere?

    Igbo ndị ọma,Kedụ ka ụnụ mere?

    Sonyere anyị maka akụkọ dị mkpa.

  11. Etu ndi ọrụ nchekwa si memila ojiegbe atọ a sị ji keke akpa ike n' Enugwu

    Keke ha ji akpa ike

    Ebe foto si, Enugu Police Command

    Nkọwa foto, Keke ha ji akpa ike

    Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ 'Department of State Service' (DSS), ememila umunwoke atọ (3) a na-enyo enyo na ha ji egbe ezu ohi taa(27/11/2023 n'ebe Elekere Mbu nke chi ofifo.

    Ịhe mkpamkpa a mere na 'Second Avenue, Independence Layout, Enugwu, ka ha gbachara egbe.

    Ndi ọrụ nchekwa wetara egbe 'revolver' abụọ, mgbọ egbe isii.

    Ha nwetakwara igwe keke ndị ahụ gi-arụ ọrụ nke nwere aha Enugu bụ MGL 100 WL na Flet akara ENS/20560, nakwa ịhe ndi ọzọ.

    Ihe ngosi ndị ọzọ enwetara bụ ego dị ka narị puku naịra ise (N500,000.00), akwụkwọ mpịakọta POS, ekwentị mkpanaaka dị iche iche, obere akpa, na ihe ngosi ndị ọzọ ha zuru n'aka ndị ọrụ POS na ndị ahịa nọ na-ebe dị iche iche.

    Cheta na ndị ahụ a na-enyo enyo wakporo ndị na-arụ ọrụ POS n'ebe dị iche iche n'ime obodo Enugwu.

    Ọtụtụ n'ime ndị madu ha wakporo na-agba osiari ọtụ e sịrị wakpoo ha .

  12. Ọnọdụ ihu igwe mere ka anyị fetuo ụgbọelu na-aga Abuja n’Asaba- United Nigeria Airline

    Ụgbọelu United Nigeria Airline'

    Ebe foto si, United Nigeria Airline'/Twitter

    Ụlọọrụ ụgbọelu United Nigeria Airline arịola mgbaghara maka nghọtaghie so ụgbọelu ha na-aga Abuja nke gara daa n’Ọdọụgbọelu Asaba Ụbọchịụka.

    Ndị njem so ụgbọelu ahụ kwuru naụgbọelu kwụsịrị ha n’Ọdọụgbọelu Asaba, ndị ọr ụgbọelu ahụ maara ha ọkwa sị na ha erutela Abụja.

    Mana n’ozi ha wepụtara, ụlọọrụ new ụgbọelu ahụ kwuru na ọ bụ ajọ ọnọdụ ihu igwe mere ka ọkwọụgbọelu ga fetụo ụgbọelu ahụ n’Asaba, sị na onye ọrụ mara ọkwa dahiere.

    Ha gara n’ihu kwuo na ụgbọelu ahụ mechara Laghachie Abuja ka ọnọdụ ihu igwe gbanwere.

  13. Ndeewonụ, ndị ọma!

    Igbo , ndeewonụ!

  14. Etu e si sụọ onye uweojii ahụ gburu George Flyod mma n’ụlọ mkpọrọ

    Derek Chauvin, onye uweojii a maara ikpe maka igbu onyeisi ojii George Floyd na mba Amerịka

    Ebe foto si, Reuters

    Onye bụbu onye uweojii na Minneapolis bụ Derek Chauvin a mara ikpe maka igbu George Floyd, ka a sụrụ mma n’ụlọmkpọrọ dị n’Arizona mba Amerịka dịka ndị ntaakụkọ Amerịka si kwuo.

    Otu onye gwara ụlọ ntaakụkọ AP na nwamadị a dị afọ 47 nwere nnukwu mmerụ ahụ site na mma ahụ onye ọzọ nọ n’ụlọmkpọrọ sụrụ ya.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ New York Times wepụtakwara akụkọ sị na a wakporo nwamadị a n’ezie.

    Chauvin bụ onyeisi ọcha na-ata ahụhụ dịịrị ya maka igbu onyeisi ojii, nke butere nnukwu ngagharịiwe megide nwakpo, mkpagbu na ịkpaoke agbụrụ ndị uweojii na-eme ndị mmadụ.

    Ụlọọrụ ndị mkpọrọ wepụtara ozi na a sụrụ otu onye nọ na mkpọrọ mma n’ebe elekere iri na abụọ n’ụbọchị Fraịde.

    Ha kwuru na ndị ọrụ ha gbara mbọ ịzọ ndụ onye ahụ, tupu e buru ya gawa n’ụlọọgwụ. Ha akpọghị aha onye mkpọrọ ahụ.

    Ọkaiwu ukwu nke Minnesota bụ Keith Ellison kwuru na a sụrụ Chauvin mma mana akụkọ kwuru na ọ na-enwete onwe ya ugbua, dịka CNN si kwuo.

    “Obi adịghị mma maka na a wakporo Chauvin. A mara ya ikpe n’ụzọ ziri ezi maka mpụ o mere, dịka onye ọzọ nọ n’ụlọmkpọrọ, o kwesịrị ịta ahụhụ dịịrị ya na-atụghị egwu ọbụla maka ịwakpo ya,” ka Ellison gwara CNN.

    Mwakpo a na-abịa ka ụlọikpe kachasị jụrụ ịnabata mkpesa o wetere nke kwuru na a maghị ya ikpe n’ụzọ ziri ezi maka igbu Floyd.

    A maara Chauvin ikpe ma tụọ ya nga afọ 22 maka igbu George Floyd. Ha tụkwasịrị afọ 20 n’oge n’ọnwa Julaị maka ịkpagbu ikike dịịrị Floyd.

  15. Ụlọikpe 'Appeal' enyela Gọv. Francis Nwifuru nke Ebonyi Steeti mmeri

    Gọvanọ Francis Nwifuru nke Ebonyi Steeti

    Ebe foto si, SA Project Documentation

    Ụlọikpe mkpegharị dị na Legọs Steeti ekwuola n’ezie na ọ bụ Gọvanọ Francis Nwifuru nke Ebonyi Steeti meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n’ọnwa Maachị 2023.

    Ụlọikpe a kụchapụrụ mkpesa Ifeanyichukwuma Odii nke People Democratic Party (PDP) gbara megide Gọvanọ Nwifuru ma sị na mkpesa ahụ achịtaghị aja ọbụla.

    Hakwuru na n’ihe banyere mmadụ iso n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ okwu na-abịa tupu e mee ntuliaka nke metụtara pati, na o nweghi ụlọikpe ọbụla nwere ikike itinye aka na ya.

    “Ajụjụ ma Francis Ogbonna Nwifuru ọ bụ onye pati PDP maọbụ APC bụ okwu mere tupu e mee ntuliaka bụ nke ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka enweghi ikike itinye aka na ya.

    “Onye gbara akwụkwọ bụ Ifeanyi Odii na pati ya PDP egosinwughi ihe akaebe na Nwifuru e merighi na ntuliaka aka ahụ.

    “Ikpe ahụ ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka kpere kwụụ chịm. Ya mere nhọpụta Francis Ogbonna Nwifuru dịka gọvanọ Ebonyi Steeti bụ ihe ziri ezi.”

    Cheta na ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị 2023, Nwifuru nke APC nwetere vootu 199,131 iji merie ebe Ifeanyi Odii nke PDP nwetere vootu 80,191 iji na-eso ya dịka Benard Odoh nke APGA nwetere vootu 52,189 iji bụrụ onye nke atọ.

  16. A ga-atọhapụ Oscar Pistorius gburu enyi ya nwaanyị na Saụt Afrịka

    Oscar Pistorius

    Ebe foto si, Getty Images

    Oscar Pistorius ga-enwere onwe ya site n’ụlọmkpọrọ kamgbe afọ iri na otu o gbuchara enyi ya nwaanyị bụ Reeva Steenkamp.

    Nwamadị a tuuru ugo n’asọmpi egwuregwu Olympics ndị nwere nkwarụ gbara Steenkamp egbe ugboro atọ n’ọge emume Valentine nke afọ 2013 ma sị na o cheere na ọ bụ onye ohi.

    Otu ụlọikpe dị na Saụt Afrịka tụrụ Pistorius dị afọ 37 mkpọrọ afọ iri na atọ (13yrs) n’afọ 2016.

    Ndị ụlọmkporo kwuru na a ga-atọhapụ ya n’ụbọchị 5 Jenụwarị 2024.

    Nne Steenkamp bụ enyi ya nwaanyị akatọghị mkpebi ahụ mana ọ jụrụ ma Pistorius o nwerela onwe ya site n’iwe ọkụ ọ na-ewe.

    O kwuru na “ebere m na-emere nwaanyị ọzọ” ga-abịa nwamadị a nso.

    Nke a bụ ugboro abụọ a ga-anụrụ mkpesa maka ịtọhapụ nwamadị a n’ime otu afọ.

  17. Labour Party Imo Steeti emeela ngagharịiwe n’isiụlọọrụ Inec dị n'Abuja

    Ndị Labour Party Imo Steeti

    Ndị nkwado Labour Party eburula ngagharịiwe gaa n’isi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec).

    Ha mere nke a megide mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n’Imo Steeti n’ọnwa Nọvemba 2023 bụ nke gọvanọ Hope Uzodimma meriri.

    Ndị Labour Party Imo Steeti

    Ndị a na-akpoku ka e nye ha ezi akwụkwọ mpụtara ntuliaka ahụ a kpọrọ ‘certified true copy’ (CTC) ma kwuo na ha anabataghi mpụtara ntuliaka ahụ.

    Onye du ndị Labour Party mee ngagharịiwe ahụ bụ Athan Achonu bụ onye ji aha Labour Party zọọ ọkwa gọvanọ n’Imo Steeti.

    Labour Party Imo Steeti
  18. Ụlọikpe mkpegharị ekwuola na ọ bụ Abdullahi Sule ka bụ Gọvanọ Nasarawa Steeti

    Abdullahi Sule na David Ombugadu

    Ebe foto si, ABDULLAHI SULE/OMBUGADU/FACEBOOK

    Ụlọikpe mkpegharị akagbuola ikpe ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka kpere nke chụpụrụ Abdullahi Sule n’ọkwa dịka gọvanọ Nasarawa Steeti.

    N’ikpe ahụ, ọkaikpe Uchechukwu Onyemenam kwuru na ụlọikpe nwere ikike ịnabata ọgbụgba ama onye akaebe nyere.

    Ụlọikpe a kwuru na ikpe ahụ ọkaikpe Ezekiel Ajayi nke Tribunal kpere adabaghi adaba, n’ihi nke ahụ ha tụgharịrị ikpe ahụ ma sị na ọ bụ Abdullahi Sule bụ gọvanọ steeti ahụ.

    Cheta na ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka na Nasarawa Steeti kpere ikpe ma sị na ọ bụ David Ombugadu nke PDP meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n’ọnwa Maachị.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Inec kpọpụtara Abdullahi Sule nke All Progressive Congress (APC) na ọ bụ ya meriri na ntuliaka ahụ.

  19. Ihe mberede gwongworo egbuola mmadụ 25

    Ọ bụ n'ụdịrị gwongworo a ka ndị ahụ nọ eme njem

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ọ bụ n'ụdịrị gwongworo a ka ndị ahụ nọ eme njem

    Mmadụ 25 anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere mgbe ụgbọala gwongworo bu pụrụ na gear were kpọkasịa n'okporoụzọ na Niger steeti.

    Gwongworo ahụ si Sokoto a ga Legọs bukarịrị mmadụ na ngwongwo ma na-efe speed nke mere ka ọdachi a mee dịka ndị ọrụ okporoụzọ si kwu.

    E kwukwara na ọnụọgụgụ ndị nọ n'ime ya bụ ụgbọala ukwu karịrị 200 dịka ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọogwụ anata ọgwụgwọ.

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ bụ nnukwu ihe mwute ma nye iwu ka ndi ọrụ gbatagbata nye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwọ zuruoke.

    Gọvanọ steeti Niger bụ Mohammed Bago enyela iwu ka a kwụsị iji gwongworo e ji e bu ibu e bu ndi mmadụ.

  20. Sonyere anyị ọzọ echi

    Anyị ekeleela gị maka isonyere anyị taa.

    Chebiri anyị ọzọ malite n'elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị Wenezde.

    Ya gazie!