You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Onyeisiala Buhari ga-anọkwụnye otu izu ọzọ na Briten maka nleta eze ya

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Bashir Ahmed zipụtara ozi n'abali Tuzde ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee ma gbaa ama na Buhari bụ onye gara mba Briten maka emume ịchị Eze nke Eze Charles III e mere n'ụbọchị Satọdee ga-anọkwanye otu izu ọzọ na mba ahụ maka ọgwụgwọ eze dịka dọkịnta eze ya siri nye ntuziaka.

    Ahmed kọwara na Buhari ga-ahụ ya bụ dọkịnta n'ime abalị ise na-abịa abịa.

    N'oge ọchịchị ya, Buhari na-emekarị njem gaa mba Briten bụ ebe ọ na-aga eleta ahụike ya anya.

    Nchịkọta ugboro ole o mere njem ahụike ndị a gafere ugboro 12.

  2. Unu asaaal chi?

    Nnọọ na websaịt anyị taa bụ ụbọchị 10 nke ọnwa Mee, 2023.

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  3. Agba nke itoolu ndị si Sudan alọtala

    Ndị mmadụ si ọdọụgbọelu Port Sudan hapụ maka agha na-eme na mba Sudan gbara ụkwụ n'Abuja n'elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị Tuzde.

    Ndị ahụ bụ ndị agba nke itoolu si mba hụ bụ ndị Naịjirịa bulatara.

    Mmadụ 126 ahụ ji ụgbọelu Tarco Air gbara ụkwụ n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe n'Abuja dịka onyeisi otu na-ahụ maka ndị Naịjirịa no ofesi bụ Nigeria Diaspora Commission NIDCOM, Abike Dabiri-Erewa siri kwuo.

    Agha ahụ na-eme na Sudan ka na-ebiri ọkụ agbanyeghi na e kwuru ka obi dajụọ ndị ọchịagha abụọ na-alụ agha ahụ.

    Etu ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ndị sirila na mba ahụ gbapụ ruru mmadụ puku narị asaa (700,000) ma a mabeghi oge agha ahụ ga-ebi.

  4. Ụlọikpe enyela iwu ka a malite ịnabata ụmụaka bu dada n'ụlọakwụkwọ

    Otu ụlọikpe ukwu na Malawi enyela ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba ahụ iwu ka e kwe ụmụakwụkwọ nwere dada ka ha bata n’ime ụlọakwụkwọ mee mụta n’akụkụ mba ahụ niile.

    Ụlọikpe ahụ nke mere mkpebi a n’obodo Zomba ji nke a saa mkpesa ndị nke ụmụakwụkwọ abụọ bụ ndị okpukperechi Rastafari wetere dịka e kweghị ha bata ụlọakwụkwọ n’afọ 2016 nakwa n’afọ 2010 maka ntutu dada ha.

    Mana ụlọikpe mechara nye ha ohere ịga akwụkwọ dịka a nọ na-eche mpụtara nakwa mkpebi ikpe a.

    Mbọ ịnwe nkwekọrịta ọkaiwu gọọmentị mba ahụ na ndị otu Rastafari gbara achitaghị aja nke mere ya bụ ikpe jiri nọtee ezigbo aka ruo ụbọchị Mọnde mgbe ụlọikpe ahụ mere mkpebi a.

    Ọkaikpe Zione Ntaba ikpere ikpe a kwuru na igbochi ụmụaka nwere dada ịgụ akwụkwọ megidere ikike dịrị ha n’agụmakwụkwọ.

    Ọ nyere iwu si:

    “Ministri agụmakwụkwọ kwesịrị inye iwu ka amalite inbata ụmụaka otu Rastafari nwere dada n’ụlọakwụkwọ niile. Iwu kwesịrị ịgba n’ọha n’ebe ụbọchị 30 nke ọnwa Juun.”

    Ọ bụ otu ikike dịrị onye atọ buuru okwu a gaa ụlọikpe n’aha ndị otu Rastafari mba ahụ.

  5. Etu ndị uweojii si nwụchie ndị omekome na-akpa ike n’akụkụ Usmusiome Nkpor, Anambra

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na mbọ na ha na-agba ịnwụdo ndị omekome na-akpa ike na steeti ahụ amịtala mkpụrụ ọhụrụ dịka ha nwụchiri ụfọdụ ndị mmadụ na nso nso a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steet ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara ozi ma kọwa etu ha siri nwụchie mmadụ anọ ha sị bụ ndị omekome n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde, abalị asaa nke ọnwa Mee, 2023.

    Ikenga kwuru na anwụdọrọ mmadụ anọ ndị a n’akụkụ Usmusiome Nkpor, nke okpuruọchịchị Idemili North ebe ha bụ ụgbọala Lexus SUV ojii na-akpa mkpa mkpa abe ahụ.

    O kwuru na ha na ndị a kwakọrịtara mgbọ memina mmadụ abụọ n'ime ha dịka ha mechara napụ ha ọtụtụ egbe, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ikenga kwukwara na n’otu ụbọchị ahụ ndị uweojii Anambra nwụchikwara mmadụ anọ ndị omekome ọzọ nọ na-awakpo otu ụgbọala e chee ha zuru ezu n’akụkụ okpuruọchịchị Azu Ogbunike Oyi.

    O kwuru na ndị a kwupụtara ihe ndị a sị ha mere ma na-enyere ndị uweojii aka n’atụmatụ inwụchie ndị ọzọ n’ime ha.

  6. Ndị ojiegbe atọrọla mmadụ 25 n'otu ụlọụka na Kaduna

    Ndị ojiegbe awakpoola otu ụlọụka dị na Kaduna ma tọrọ opekatampe ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise n'ọgbakọ ụka ahụ.

    Dịka onye ọrụ otu ‘Christian Association of Nigeria’ (CAN) si kwuo, ndị ojiegbe ahụ wụbara n'ụka Bege Baptist dị n’obodo Chikun tọọrọ mmadụ iri anọ mana mmadụ iri na ise n’ime ha mechara jisiri ike gbapụ.

    Onye na-ekwuchitere ndị uweojii kwuputara na enwere mwakpo mere ebe ahụ n’ezie mana onyeghi nkọwa ọbụla ọzọ banyere ya bụ mwakpo.

    Kemgbe afo olemole Kaduna so na steeti mpaghara ugwu Naijirịa ebe akụkọ mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ na-esikari apụta.

    N'ime afọ abụọ gara aga, ndị ojiegbe na-tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ aghara aghara bụ ndị a na-echeghị na ha na ndịagha nnupụisi otu alakụba ọbụla na-akpa ike n’akụkụ ugwu Naijirịa nwere njịkọ ọbụla.

    Ndị ntọrị ebe ahụ na-anakarị ndị mmadụ nakwa ndị ezinaụlọ ya ego mgbapụta tupu ha atọhapụ ndị ha ji eji.

  7. Okwu ‘ikpe udo’ apụtaghi mgbe Peter Obi zutere m – Wole Soyinka

    Ọkammụta Wole Soyinka bụ onye e ji ide akwụkwọ mara ekwuola na njem Peter Obi mere bịa zute ya abụghị maka okwu ‘ikpe udo’ ọbụla dịka ụfọdụ si ekesa.

    Peter Obi zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 gbara ama n’ụbọchị Sọnde na o zutere Soyinka ma kwuo na atụmatụ njem ahụ bụ iji hụ na e hichara nghọtaghie ọha nwereike inwe n'okwu ime enyi ha abụọ.

    Iji saa akụkọ na-efeagharị nke aha Sonyinka na-ada n’ime ya, ọ wepụtara ozi n’abalị Mọnde ma kwuo:

    “Ka o doo ọha anya: A ma onye a a na-akpọ Peter Obi bụ onye zọọrọ Labour Party ọkwa, mụ na ya nwereike inwe mmekọ. Mụ na Labour Party nwereike inwe mmekọ bụ ndị ọ zọọrọ ọkwa a na ntuliaka. E nweghi nsogbo nọ n’etiti anyị ma fọdụzie okwu ikpe udo ịpụta.”

    “Na nzụkọ anyị, mmadụ abụọ ndị ọzọ bịara, okwu ‘ikpe udo’ apụtaghị ma ncha, maọbụ n’ụzọ ọbụla yiri ya.”

    “Kama ihe pụtụrụ bụ okwu ‘ibu arụ ọchịchị’ ‘ịgba mbọ’ ‘ịrọ mgbaghara’, ‘ịrọ arịrọ’. ‘ịgupụ onwe’, okwu nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ‘agbụrụ’, anyị nwere mkparịtaụka dịka ndị nwere amaihe. Okwu ‘ikpe udo apụtaghị.”

    N’akwụkwọ ozi ahụ ọ wepụtara, ọ gụpụrụ onwe ya na mmekọ ọbụla metụtara ndị nkwado Peter Obi a na-akpọkarị ndị ‘Obidients’ dịka o kwuru:

    “Ndị m amaghị nakwa ndị m na ha enweghiike inwe mmekọ bụ ndị a kpọrọ ha ndị ‘Obidients’ maọbụ ‘ezinaụlọ Obidients’,

    Cheta na mkparịtaụka Soyinka nwere banyere ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nakwa ntuliaka 2023 na nso nso a kpatara ọtụtụ okwu dịka ọ kpọrọ aha Obi na ndị nkwado ya bụ ndị 'Obidients'.

  8. Unu asaala chi?

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa.

    Soro akụkọ niile ị kwesịrị ịkọ taa ebe a bụ Tuzde, ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee, 2023.

  9. Ọkụ latrịk adọgbuola nwata akwụkwọ nwara imezi ọkụ n’otu ụlọọgwụ na Sudan

    Ọkụ latrịka dogburu otu nwata akwụkwọ dị afọ 27 nke na-agụ na ngalaba ‘Electrical Engineering’ dịka ọ gara inyere otu ụlọogwụ na mapaghara Dafur aka mezie ọkụ ha.

    Nwaamadị a nke aha ya bụ Muhammedin Fadul Idris Wadi bụ onye ọkụ latrịk dogburu n’ụlọọgwụ Sayed al-Shahada Health Centre nke dị n’obodo Fasher n’ụbọchị Tọọzde.

    Nwata akwụkwọ a so n’otu otu wepụtara onwe ha inyere ụlọọgwụ ahụ aka dịka ọgbaghara na-adasịike na mba Sudan.

    Ụlọọgwụ a so n’ụlọọgwụ ka kwụ na-enyere ndị merụrụ ahụ aka n’oge ọgụ a.

    Otu enyi ya nke aha ya bụ Ahmed Ishaq nke bụkwa ogbo ya na mahadum Fasher gwara BBC okwu sị:

    “E ji ịmụ amụ mara nwaamadị tụmadị n’oge a ọgụ na-ada.”

    “Onye ndụ ya dịka onye odibo ndị mmadụ na mpaghara Fasher.”

    Ọgụ malitere ịda na mba Sudan n’ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel, 2023 dịka otu nchekwa abụọ bụ otu ndịagha mba ahụ na otu nchekwa Rapid Support Forces (RSF) malitere inwe nghọtaghie banyere ọchịchị mba ahụ.

    Mmadụ nde asaa tọrọ n’ime ụlọ ha n’isi obodo mba a bụ Khartoum ebe ọgbaghara kpụ ọkụ n’ọnụ na-ada dịka ha enweghi pụta zụta nrị, mmiri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ.

    Nari kwuru narị ndị mmadụ anwụọla n’ọgụ a na-ada dịka ọtụtụ mba na-agba mbọ ịkpọpụ ndị nke ha.

  10. APC ekwuola ndị ha choro ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị ụlọomeiwu Naijiria

    Otu All Progressives Congress (APC) ewepụtala akwụkwọ ozi n’ụbọchị Mọnde a bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee, 2023 banyere okwu mpaghara Naịjirịa a ga-ekenye ọchịchị ụlọomeiwu Naịjirịa n’ọchịchị ọhụrụ ga-amalite na nso nso a.

    Ozi APC kwuru na kọmịtịị pati ha nke na-ahazị ọrụ n’ime pati ahụ bụ 'National Working Committee' natara mkpesa ọtụtụ ma mee mkpebi ka ha mechara ọgbakọ n’ime ụlọ ‘National secretariat’ ha n’Abuja.

    Ozi a odeakwụkwọ pati a bụ Felix Morka wepụtara kọwara na e nyela:

    • Sịnetọ Godswill Akpabio nke si mpaghara ndịda ndịda Naịjirịa ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa
    • Osote ya bụ Sịnetọ Barau Jubrin si mpaghara ugwu Naijirịa
    • Abbas Tajudeen ga-abụ onyeisi ụlọomeiwu nta nke si mpaghara ugwu Naịjirịa
    • Osote ya ga-abụ Ben Kalu nke si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa

    Cheta na n’ụbọchị Fraịdee, abalị ise nke ọnwa Mee na Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ David Umahi kwuru na ya esoghizi azọ ọkwa onyeisioche ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa n'ihi na Tinubu rịọrọ ya ka ọ rituo.

    O kwuru sị: "Ụnyaahụ (bụ Tọzde, Mee 4), mụ na onyeisiala ọhụrụ (Bola Tinubu) nwere ọgbakọ, o wee gwa m na ya etinyela aka n'okwu a, ma rịọkwaa m ka m kwụsị ịzọ ọkwa ahụ."

    "M wee kwere ma kwụsị ịzọ ọkwa a, ugbua ana m akwadozi nwanne m nwoke bụ Sinetọ Godswill Akpabio."

    Okwu so atụtụ ndọrịtaụka dapụtara n’oge ntuliaka 2023 banyere agbụrụ Naijirịa nakwa mpaghara kwesịrị iweta ọchịchị.

    Ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) kpọpụtara aha Bola Ahmed Tinubu zọọrọ APC ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 dịka onye nwetere mmeri na ya bụ ntuliaka. Dịka a na-eche idu ya iyi ọrụ n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023, ọtụtụ okwu nakwa ndọrịtaụka na-adapụta n’ọha banyere mpaghara Naịjirịa kwesịrị inweta ọkwa ọchịchị ụlọomeiwu.

  11. Ọgụ ka na-adasi ike na Khartoum dịka okwu udo na-aga n'ihu na Saudi Arabia

    Ụgbọelu agha nke ndị agha mba Sudan na-aga n'ihu n'ịtụ ogbunigwe n'ebe dị icheiche n'obodo Khartoum, bụ isi obodo mba ahụ, nakwa na obodo ndị dị ya nso dịka Bahri na Omdurman.

    Nke a na-eme n'agbanyeghị mkparịtaụka udo na-aga n'ihu na mba Saudi Arabia n'etiti otu ndị agha abụọ na-ebuso onwe ha agha.

    Ọgụ na-agakwa n'ihu n'etiti ndị agha ụkwụ nke Sudan na ndị ọgụ Rapid Support Forces (RSF) na mpaghara abụọ nke obodo Bahri - Shambat na Halfiya.

    Na mpaghara Shambat, ọgụ na-adasi ike na nso ogige ndị agha dị ebe ahụ, ebe ọgụ na-adakwa na mpaghara Halfiya iji mara ndị otu akwa mmiri dị ebe ahụ ga-adị n'aka ha. Akwa mmiri ahụ dị n'aka ndị RSF ugbua.

    Ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara ndị a nọ na nnukwu ụjọ ugbua ma zoo n'ime ụlọ ha n'ihi ọgụ a na-ada.

    Mana ọtụtụ ka nwere olileanya na mkparịtaụka ahụ na-aga n'ihu na mba Saudi Arabia ga-amịta mkpụrụ.

  12. Ahụla ozu mmadụ karịrị 400 n'ọdachi ideimmiri mere na Congo

    Gọọmentị mba Democratic Republic of Congo ewepụtala otu ụbọchị dịka ụbọchị iru uju maka ndị nwụrụ n'ihe mberede ideimmiri na mbuze mere na mba ahụ n'ọdị nso a.

    ọtụtụ ndị mmadụ ka a ka na-achọ achọ dịka a na-eche na mmiri aja ụrọ ekpuchiela ha n'ime ala.

    Ọdachi a ka njọ n'obodo abụọ dị na mpaghara Kalehe, mana achọtara ụfọdụ ozu ndị mmadụ n'osimiri Lake Kivu dị nso n'obodo ahụ.

    Gọọmentị ezigala ụfọdụ ndị ọrụ na mpaghara ahụ ịmata etu ọnọdụ si dị ugbua dịka ọ gachara ụbọchị anọ ihe mberede ahụ mere.

    Otu dọkịta a ma ama na mba Congo, onye ritekwara nkwanye ugwu Nobel Peace Prize bụ Denis Mukwege katọrọ etu e si lie ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ime otu nnukwu ili.

    O kwuru na e kwesịrị ịkwanyere ha ugwu n'olili ha.

  13. Mba Iran akwụgbola mmadụ abụọ e boro ebubo ịkparị Mohammed

    Ụmụ nwoke abụọ e boro ebubo "ịgba Quran ọkụ" nakwa "ịkparị Onye Amụma nke Islam" anwụọla dịka ngalaba ikpe nke mba Iran si kwuo.

    Gọọmentị Iran gburu mmadụ abụọ a aha ha bụ Yousef Mehrad na Sadrollah Fazeli-Zare, site n'ịkwụ ha ụdọ n'olu dịka ụlọikpe kachasị na mba ahụ kwadoro ikpe ọnwụ a mara ha abụọ n'afọ 2020.

    Onye ọkaiwu otu n'ime ndị a e gburu kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo ahụ.

    Otu na-azọ maka ikke dịịrị mmadụ kwuru na ogbugbu mmadụ abụọ a bụ arụ obi ọjọọ si n'aka ndị ọchịchị mgbe gboo.

    Akwụbguru Yousef Mehrad na Sadrollah Fazeli-Zare n'ogige ụlọ mkpọrọ dị na Arak nke mba Iran n'ụtụtụ Monday.

  14. Etu 'tyre' ụgbọelu bu ndị njem si Yola lọta Abuja si gbapuo n'ike

    Akụkọ apụtala na otu ụgbọelu bu ndị njem mmadụ 143 gụnyere otu nwatakịrị siri nwere ihe ọdachị n’ime ọdụ ụgbọelu nke Abuja ka ya bụ ụgbọelu tụrụ ụkwụ ebe ahụ na Sọnde a.

    Ụlọọrụ Max Air gbara ama nke a n’akara Twitter ha ma kwuo na ụkwụ ‘tyre’abụọ n’okpuru ụgbọelu ha bulatere ndị njem a gbapuru n’ime ọdụ ụgbọelu Abuja.

    Ozi ha kwuru na ya bụ ụgbọelu hapụrụ Yola bụ isiobodo Adamawa n’ebe elekere abụọ na nkeji ise nke ehihe Sọnde a dịka a tụrụ anya na ọ ga-abata Abuja n’elekere atọ.

    Ụlọọrụ Max Air kwuru enweghi ọkọ kọrọ ndị n'ahụ, kọwa na enweghi onye n'ime ha merụrụ ahụ ma kwuo na ha emeela ihe niile dịịrị ha ịhụ na obi ruru ndị njem nọ n’ụgbọelu ahụ ala. Ha kwukwara na ha ahaziela ihe ndị kpatara nsogbu a dapụtara ebe ahụ.

    Mana ọtụtụ ndị mmadụ amalitela izipụta ozi etu ihe a mere si metụta ha nakwa atụmatụ ha ime njem.

    Max Air kwuru na ha na-eme nnyocha n’okwu a ugbua.

    'Ndị ọrụ FAAN gbara mbọ dịịrị'

    Otu anya hụrụ ihe a emee bụ Alhassan Umar Adamu kwuru na ụlọọrụ gọọmentị ha-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN)“gbara ezigbo mbọ ka ma mee ihe dịịrị ha”.

    N’otu ihe onyonyo gbara na Facebook ya, a hụrụ ebe ndị ọrụ FAAN nọ na-agwa ndị ya bụ ihe metụtara okwu ma na-agba ha ume na a ga-edobere ha ngwo ngwo nakwa ibu ha.

    Adamu gbakwara ama na ọkwọ ụgbọelu ahụ nwara ike ya ka ya bụ ihe mere ma kwuo na ndị ọrụ mmeyụ ọkụ nakwa ndị ọrụ gbata gbata wụchiri ebe ahụ ngwa ngwa.

  15. Tinubu arịọla m ka m hapụ ịzọ ọkwa onyeisi Sineti - Dave Umahi

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ David Umahi ekwuola na ya esoghizi azọ ọkwa onyeisioche ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa n'ihi na Tinubu rịọrọ ya ka ọ rituo.

    Umahi kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee 2023.

    O kwuru sị: "Ụnyaahụ (bụ Tọzde, Mee 4), mụ na onyeisiala ọhụrụ (Bola Tinubu) nwere ọgbakọ, o wee gwa m na ya etinyela aka n'okwu a, ma rịọkwaa m ka m kwụsị ịzọ ọkwa ahụ."

    "M wee kwere ma kwụsị ịzọ ọkwa a, ugbua ana m akwadozi nwanne m nwoke bụ Sinetọ Godswill Akpabio."

    Umahi kwukwara na ya agaghị azọkwa ọkwa osote onyeisioche Sineti, maka na ya nwere onye ya na-akwado.

    Onyeomeiwu ọzọ bụ Ali Ndume, onye nọkwa n'ọgbakọ ahụ kwuru na ya na-akwadokwa Akpabio maka ọkwa onyeisi Sineti "n'ihi na ọ bụ ya ka onyeisiala na-akwado; ọ dị mkpa na-anyị kwadoro obodo anyị nakwa pati anyị karịa ịchọ naanị ọdịmma onwe anyị".

    Ka ọ dị ugbua ndị fọdụrụ na ndọrọndọrọ ọkwa onyeisioche sineti bụ Orji Uzor Kalu (Abia), Osita Izunaso (Imo), Jibrin Barau (Kano), Sani Musa (Niger), na Abdulaziz Yari (Zamfara).

  16. Onye ojiegbe agbagbuola mmadụ asatọ n'ụlọ ahịa na Texas mba Amerịka

    Otu onye ojiegbe agbagbuola mmadụ asatọ n'ụlọahịa dị na mpaghara ugwu nke Dallas, na steeti Texas nke mba Amerịka.

    Ụfọdụ n'ime ndị nwụrụ na mwakpo a bụ ụmụaka. Mmadụ asaa ndị ọzọ mgbọ egbe tụrụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ, atọ n'ime ha nọ n'ọnọdụ dị oke njọ.

    Ndị niile nwụrụ na mwakpo a dị n'etiti afọ ise ruo 51.

    Ndị uweojii kwuru na ha gbagbukwara nwata nwoke mere mwakpo a, ma kwuo na ọ bụ naanị ya so mee ya.

    Brian Harvey bụonyeisi ndị uweojii mpaghara Allen bụ ebe ya bụ ihe mere kwuru na ndị uweojii "nụrụ ụdaegbe, gbaga ebe egbe ahụ si ada, kwaa onye ojiegbe ahụ mgbọ ma gbagbuo ya".

    Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata na mpaghara ahụ bụ Jonathan Boyd kwuru na mmadụ asaa - nke gụnyere onye ojiegbe ahụ - nwụrụ n'ụlọahịa ebe ya bụ ihe mere, ebe mmadụ abụọ ọzọ nwụrụ n'ụlọọgwụ.

    Gọvanọ steeti Texas bụ Greg Abott kowara mwakpo a dịka "nnukwu ihe ọjọọ na-adịghị mma ikwu n'ọnụ" ma kwuo na steeti ahụ dị njikere inye aka n'ụzọ ọbụla.

    Ndị uweojii na-arịọ ndị ọbụla setere onyonyo oge ya bụ ihe na-eme ka ha zitere ya ndị FBI dịka ha maliterela nnyocha.

    Ụfọdụ ndị hụrụ oge ihe a mere kwuru na onye ojiegbe ahụ yi akwa ojii ma jikee dịka ndị agha. Foto e setere oge onye ojiegbe ahụ nwụchara gosiri egbe AR-15 tọgbọrọ n'akụkụ ya.

    Ụbọchị olemole gara aga, ndị uweojii na Texas jidere otu nwoke bụ onye ha boro ebubo ịgbagbu ndị agbatobi ya ise, nke gụnyere otu nwata nwoke dị afọ itoolu.

    Iwu obodo Texas nyere onye ọbụla rurula afọ 21 ikike inwe obere egbe na-anataghị ikike ọbụla, ma ewepụ onye a marala ikpe mbụ.

    Ọzọkwa, enwechaghị mgbochi ọbụla siri ike megide mmadụ inwe ụdị egbe dị iche iche na steeti ahụ. Ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Republican kacha n'ọnụọgụgụ n'ụlọ omeiwu steeti Texas.

    Na mba Amerịka n'afọ a, enweela mwakpo egbe ruru 198 ebe mmadụ anọ maọbụ karịa nwụrụ maọbụ merụọ ahụ, dịka ngụkọ si na 'Gun Violence Archive' si gosi.

    Nke a bụ ọnụọgụgụe kachasị n'etu oge a n'afọ ọbụla kamgbe 2016.

  17. Otu abụọ na-alụ ọgụ na mba Sudan agaala Saudi Arabia inwe mkparịtaụka udo

    Ndị nnọchiteanya otu ndị agha Sudan abụọ na-ebuso onwe ha agha ekwetala inwe mkparịtaụka udo nke ihu na ihu na mba Saudi Arabia.

    Nke a na-abịa dịka nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ bụ nke ha nwerela ugboro ugboro kamgbe ọgụ ahụ malitere amịtabeghị mkpụrụ.

    Mana otu abụọ a kwuru na ihe ha ga-akpa maka ya bụ etu a ga-esi kwụsịtụ ọgụ iji nye ohere ka ihe enyemaka bata maka ọtụtụ ndị nkịtị nọ na nhịahụ, ọ bụghị maka ịkwụsị ọgụ ahụ kpọm kwem.

    N'ụbọchị Satọde, Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Saudi Arabia na mba ndị ọzọ bụ Faisal bin Farhan nabatara otu ndị agha abụọ ahụ na mba ha, ma kwuo na ya nwere olileanya na mkparịtaụka ahụ "ga-eme ka ọgbaaghara dị na Sudan kwụsị, ka udo na ịda jụụ lọghachị na mba ahụ.

    Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo, onyeisi ndị ọgụ Rapid Support Forces (RSF), kwuru n'akara Twitter ya na ọ na-ekele ndị niile na-agba mbọ iji kwụsị ọgụ ahụ ma nye ohere ka ihe enyemaka batara ndị Sudan.

    O kwukwara na ya dị njikere inyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị.

    Dagalo, onye a ma dịka Hemedti, na onyeisi ndị agha mba Sudan bụ Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan, na-ese okwu maka nghọtahie dị n'etiti ha gbasara etu ọchịchị mba Sudan ga-esi dị.

    Nke a na-abịa dịka otu ndị agha abụọ a gbakọrọ aka chụtuo onye bụbu onyeisiala mba Sudan bụ Omar Al-Bashir n'afọ 2019, ma weghara ọchịchị.

    Ha mechara hafee ndị nkịtị ọchịchị, ma mechakwaa chụtukwaa onye nke ahụ na 2021.

  18. Etu Anambra steeti si gbaa ndị nke mbụ n'ule Jamb nke afọ 2023 - Gọọmentị

    Gọọmentị Anambra Steeti etoola nwata akwụkwọ nwaanyị aha ya bụ Ejikeme Joy Mmesoma maka "ịbụ onye nke mbụ n'ule Jamb nke afọ 2023'.

    Nwaada Mmesoma, bụ nwata akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ 'Anglican Girls Secondary School' dị na Nnewi, Anambra Steeti, nwetara akara 362 na ngalaba mmụta anọ o lere n'ule. Akara ndị o nwetara bụ: English - 98; Physics - 89; Biology - 94; Chem - 81.

    Chetakwa na a kanwere ụmụ akwụkwọ ọnụọgụgụ ha karịrị puku iri asatọ bụ ndị ga-ele ule Jamb nke ha taa bụ Satọdee.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka mgbasaozi Soludo bụ Christian Aburime, o kwuru na Kọmishọna agụmakwụkwọ n'Anambra Steeti bụ Ọkammụta Ngozi Chuma-Udeh kọwara ike nwataakwụkwọ nwaanyị ahụ kpara dịka ihe ịma atụ nakwa ihe ịgba ama maka mwulite ọnọdụ agụmakwụkwọ n'Anambra Steeti.

    "Obi bụ anyị sọ aṅụrị n'ihi etu nwaada Ejikeme si gosipụta onwe ya, ụlọakwụkwọ ya nakwa steeti ya," Ọkammụta Chuma-Ude kwuru.

    "Anyị ga na-aga n'ihu na-elebara agụmakwụkwọ ya anya ma na-enyekwa ya nkwado kwesịrị ekwesị."

    "Anyị na-ekelekwa Gọvanọ steeti anyị bụ Chukwuma Soludo bụ onye kwuru na agụmakwụkwọ ga-abụ ihe mbụ ọ kpọrọ mkpa na steeti a."

    Ngụkọ gosiri na ọnụọgụgụ ndị lere ule Jamb n'afọ 2023 dị 1,586,765, n'ime ndị a mmadụ 80,166 esoghị lee ya bụ ule n'ụbọchị mbụ e lere ya nke bụ Eprel 25 2023.

    Ndị a ga-elezi ule nke ha taa bụ Satọdee, ụbọchị isii nke ọnwa Mee 2023.

  19. Ndị ụkọchukwu Katọlik abụọ a tọọrọ na Delta Steeti enwerela onwe ha

    Ụkọchukwu katọlik abụọ ndị ojiegbe tọọrọ na Warri, Delta Steeti, n'ụbọchị Satọde, Eprel 29, enwerela onwe ha.

    Nke a bụ dịka ozi si n'aka ndị otu ụkọchukwu Katọlik a kpọrọ Schoenstatt Fathers taa bụ Fraịde, ụbọchị ise nke ọnwa Mee 2023, si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru ndị otu ahụ bụ Fr Okereke Kingsley kwuru na a tọhapụrụ ndị ụkọchukwu ahụ aha ha bụ Chochos Kunav na Raphael Ogigba n'abalị ụbọchị Tọzde, na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.

    Fr Okereke kelere ndị niile sonyere n'ekpere maka ntọhapụ ndị ụkọchukwu a.

    O dobeghị anya ma a kwụrụ ụgwọ ọbụla iji gbapụta ndị ụkọchukwu abụọ a, mana ndị ụka Katọlik na Naịjirịa nwere iwu nke bụ na ha agaghị akwụ ụgwọ ọbụla iji gbapụta onye ụkọchukwu ha ọbụla ndị ojiegbe tọọrọ.

  20. Ndị ojiegbe egbuola onye uweojii bepụ ya isi n'Aba

    Ndị uweojii abia Steeti ekwuola na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ gburu otu onye uweojii ma bepụ ya isi.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na nke a mere n'ụbọchị Tuzde, bụ abalị abụọ nke ọnwa Mee, 2023, na mpaghara East/Tenant road n'Aba.

    Ogbonna kwuru na ndị uweojii si n'ụlọọrụ Ndiegoro dị n'Aba nọ ọrụ inyocha ụgbọala n'okporoụzọ ahụ oge ndị ojiegbe a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob/ESN wakporo ha.

    "Ha gbagburu onyeisi ndị uweojii ahụ bụ Linus Ominyi, bepụ ya isi, ma buru isi ya nakwa egbe AK47 ya nke mgbọegbe 15 dị n'ime ya, gbaa ọsọ," Ogbonna kwuru.

    "Anyị ebutela ozu onyeuweojii ahụ isi ya nọkwaghị ya ma buga ya n'ụlọ ozu, anyị amalitekwala ịchọ ndị kpara arụ a iji nwetaghachi isi ya nakwa egbe ya ha buuru.

    "Ndị uweojii Abia Steeti na'arịọ ndị ọha obodo ka onye ọbụla nwere ozi gbasara ihe a merenụ ka ọ bịa gwa ndị uweojii, dịka anyị na-ekwe nkwa na onye ahụ ga-enwe nchekwa zuru oke."

    Chetakwa na n'ụbọchị Tọzde, ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gburu ndị uweojii atọ n'obodo Umunze nke dị n'okpuru ọchịchị Orumba-South n'Anambra Steeti, dịka ọnọdụ nchekwa na-akwanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.