Ndị ọrụ ahụike ebidola abụbọ ọrụ na Naịjirịa
Ụlọọgwụ gọọmentị na ngalaba ahụike ndị ọzọ arụghị ọrụ nke ọma dịka ngalaba Joint Health Sector Unions (JOHESU) bidoro abụbọ ọrụ maka ụgwọ a na-akwụ ha na-etu ọnọdụ ọrụ ha siri dị.
JOHESU bụ ngalaba jịkọrọ ndị ọrụ ahụike na-agụnyeghị dọkịnta, dọkịnta eze na ndị nọsụ.
JOHESU kwuru na ha nyere gọọmentị izuụka abụọ iji hu na ha tinyere uche maka ihe ha chọrọ kama na enweghị ihe gọọmentị mere.
Ihe ndị ọrụ a chọrọ bụ ka gọọmentị were ọsọ were ije hiwe usoro ịkwụ ụgwọ etu o kwesịrị, gwụọ ha ụgwọ eji ha ma megharịa afọ ole mmadụ ji akwụsị ọrụ na ihe ndị ọzọ.
Abụbọ ọtụ ha bidoro n'ụbọchị frịde na-ebido dịka ọ fọrọ ụnọchị atọ ka Onyeisiala Muhammadu Buhari nyefe ọchịchị.
Osote onyeisi otu a bụ Obinna Ogbonna gwara BBC na gọọmentị ọhụrụ na-abata dịkwa njikere ime ihe ha kwesịrị ime.
O kwuru sị, " Ka abụbọ ọrụ a soro n'ihe gọọmentị ọhụrụ a ga-erite, otu ọrụ cheere gọọmentị ọhụrụ a n'ihu bụ idozi ma hazie ọnọdụ ndị ọrụ ahụike".
O kwuru sị, " Nke a ga-enye kwa ohere ka a mara ihe bụ uche gọọmentị ọhụrụ a".
Abụbọ ọrụ a na-eso ụbọchị anọ ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ kwụsịrị abụbọ ọrụ ụbọchị anọ ha jiri dọọ goọmentị aka na ntị ma nye ha izuụka abụọ ime ihe ha chọrọ.
Gọọmentị Naijirịa ekwubeghị ihe ọbụla maka abụbọ ọrụ a.