You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị ọrụ ahụike ebidola abụbọ ọrụ na Naịjirịa

    Ụlọọgwụ gọọmentị na ngalaba ahụike ndị ọzọ arụghị ọrụ nke ọma dịka ngalaba Joint Health Sector Unions (JOHESU) bidoro abụbọ ọrụ maka ụgwọ a na-akwụ ha na-etu ọnọdụ ọrụ ha siri dị.

    JOHESU bụ ngalaba jịkọrọ ndị ọrụ ahụike na-agụnyeghị dọkịnta, dọkịnta eze na ndị nọsụ.

    JOHESU kwuru na ha nyere gọọmentị izuụka abụọ iji hu na ha tinyere uche maka ihe ha chọrọ kama na enweghị ihe gọọmentị mere.

    Ihe ndị ọrụ a chọrọ bụ ka gọọmentị were ọsọ were ije hiwe usoro ịkwụ ụgwọ etu o kwesịrị, gwụọ ha ụgwọ eji ha ma megharịa afọ ole mmadụ ji akwụsị ọrụ na ihe ndị ọzọ.

    Abụbọ ọtụ ha bidoro n'ụbọchị frịde na-ebido dịka ọ fọrọ ụnọchị atọ ka Onyeisiala Muhammadu Buhari nyefe ọchịchị.

    Osote onyeisi otu a bụ Obinna Ogbonna gwara BBC na gọọmentị ọhụrụ na-abata dịkwa njikere ime ihe ha kwesịrị ime.

    O kwuru sị, " Ka abụbọ ọrụ a soro n'ihe gọọmentị ọhụrụ a ga-erite, otu ọrụ cheere gọọmentị ọhụrụ a n'ihu bụ idozi ma hazie ọnọdụ ndị ọrụ ahụike".

    O kwuru sị, " Nke a ga-enye kwa ohere ka a mara ihe bụ uche gọọmentị ọhụrụ a".

    Abụbọ ọrụ a na-eso ụbọchị anọ ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ kwụsịrị abụbọ ọrụ ụbọchị anọ ha jiri dọọ goọmentị aka na ntị ma nye ha izuụka abụọ ime ihe ha chọrọ.

    Gọọmentị Naijirịa ekwubeghị ihe ọbụla maka abụbọ ọrụ a.

  2. I bọọla chi

    Sonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  3. Ka chi fo

    Ụmụ ibe, ka anyị wụsa ọwa ebe a na nke taa.

    Anyị ga-amalitekwa ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ echi.

    Ya gazie.

  4. Ndị ojiegbe atọrọla ụkọchukwu, ndị ọzọ n'Owere

    Ndị ojiegbe atọrọla ụkọchukwu Katolic n'Dayosisi Owere.

    A tọọrọ Fada Mathias Opara n'agbata okporoụzọ Ejemekwuru- Ogbaku Road housing Oguta nna Okpuru Ọchịchị Mbaitoli,Imo State.

    Onye nọ ebe ihe mere kwuru na awakporo ụkọchukwu ahụ e ji "Owu Ujo"na alaghachi Owere ka o si akwamozu nna onye otu ha n' Izombo dị n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta.

    Ọ sịrị," A tọọrọ Fada Mathias Opara a ma ama dịka "Owu Ujo"n'ụzọ Ejemekwuru/Ogbaku Road'"

    "A tọọrọ ndị ọzọ ya na ya so n'otu ụgbọ."

    "O mere n'anya anyị ugbua"

    " Anyị si Owere ebe anyị gara akwamozu nna otu ụkọchụkwu Katọlik na Izombo dị n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta."

    Ọnụ na-ekwuru Owere Dayọsis bụ Fada Raymond Ogukwuru n'ezie na a tọrọ ụkọchụkwụ ahụ bụ onye bụ onyeisi ndị otu 'Man O' War' na dayọsisi Owere.

    Cheta na nsonso a, a tọọrọ ụkọchụkwu Katolic ọzọ bụ Fada Jude Maduka, bụ ụkọchụkwụ na-achịkọta ụlọụka "Christ the King Catholic Church Ezinachi/Ugwuago n'Okpuru Ọchịchị Okigwe A tọrọkwara Fada Michael Asomugha bụ ụkọchukwu na-achịkọta St Paul's parish dị n' Osu dị n'Okpuru Ọchịchị Isiala Mbano .

  5. Anyị ejidela ndị ekperima wakporo ndị 'US Embassy' n'Anambra - Soludo

    Gọvanọ Anambra Steeti ekwuola na aka ndị ọrụ nchekwa akparala ndị ekperima wakporo ma gbuo ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka n'Ogbaru izuụka olemole gara aga.

    Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels TV na mgbede ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na ụfọdụ n'ime ndị ekperima ahụ nwụrụ oge ha na ndị ọrụ nchekwa kwara mgbọ n'ụbọchị sotere ụbọchị ha mere mwakpo ahụ.

    "Anyị anaghị anabata ịkpa arụ dị otu a n'Anambra Steeti chaachaa," Soludo kwuru. "N'ime ụbọchị abụọ mwakpo a mechara, ụfọdụ n'ime ndị ekperima so mee mwakpo ahụ anwụọla n'aka ndịọrụ nchekwa."

    "Mana ụnyaahụ, anyị jidere onye bụ onyeisi ndị ekperima ahụ mere mwakpo a, ọ nọ n'aka anyị ugbua dịka nnyocha anyị ka na-aga n'ihu."

    "Anyị ekwuola ya ugboro ugboro na anyị agbachi nkịtị ka ndị ekperima were Anamabra Steeti mere ebe obibib maọbụ ebe ha ga na-akpa arụ na-enweghị mgbochi ọbụla."

    "Iji maa atụ, Odumodu, otu onye ekperima a ma ama na-akpa ike n'Imo Steeti, ụbọchị ya na ndị otu ya bịafetere n'Anambra Steeti, ụbọchị ahụ ka o zutere ọnwụ ya."

    Soludo kwuru na gọọmentị ya ezigala ozi iti aka n'obi nye ezinụlọ ndị nwụrụ na mwakpo ahụ n'Ogbaru, tinyere ndị uweojii so ha.

    Ọ rụtụkwara aka na ndị ọrụ US embassy ahụ agwaghị ndị ọrụ nchekwa Anambra Steeti maka njem ahụ ha gara n'Ogbaru; "a gaara igbochi ụdị ọdachi dị etu ahụ", Soludo kwuru

  6. Buhari edughariala Tinubu n'Aso Rock

    Onyeisiala Muhammadu Buhari dughariri onye a na-atụ anya ịbanye n'ọkwa onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu n'obi Gọọmentị Naijiria bụ Aso Rock taa dịka ọ na-apịakọ ọrụ ya dịka onyeisiala taa bụ Fraide, abalị 26 nke ọnwa Mee afọ 2023.

  7. Gọọmentị etinyela ụbọchị 29 nke ọnwa Mee dịka ụbọchị ezumike

    Gọọmentị etiti ekwupụtala na ụbọchị Mọnde, nke bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, ga-abụ ụbọchị ezumike.

    Nke a bụ maka na ọ bụ n'ụbọchị ahụ ka a ga-edu onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu n'iyi ọrụ.

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Rauf Aregbesola kwupụtara nke a n'ụbọchị Fraịde.

    N'oge mbụ, ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbọchị e ji echeta ọchịchịonye kwuo uche ya, nke a na-akpọ 'Democracy Day' na bekee; ọ na-abụkarị ụbọchị ezumike.

    Mana n'afọ 2019 ka Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka ụbọchị 'Democracy Day' bụrụzie n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jun afọ ọbụla.

    Nke a bụ iji cheta ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jun afọ 1993, bụ nke onyeisiala oge ahụ bụ Ibrahim Babangida kagburu.

    Ya mere na n'afọ 2019, 2020, 2021 na 2022, Naịjirịa mere emume 'Democracy Day' n'ụbọchị Jun 12 nke bụkwa ụbọchị ezumike.

    Mana na nke afọ a, gọọmentị ekwuola na ụbọchị Mee 29 ga-abụkwa ụbọchị ezumike.

  8. Ụgbọelu 'Nigeria Air' nke mbụ atụọla ụkwụ na Naịjirịa - Hadi Sirika

    Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na ụgbọelu mbụ nke 'Nigeria Air' atụọla ụkwụ n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja, taa bụ Fraịde, ụbọchị 26 nke ọnwa Mee 2023.

    Sirika kwuru na nke a bụ mmejupụta nkwa nke mịnịstrị ya kwere na Naịjirịa ga-enwerịrị ụgbọelu nke ya tupu ya bụ Sirika arituo n'ọkwa mịnịsta njem elu.

    Cheta na Naịjirịa nweburu ụlọọrụ ụgbọelu a na-akpọ 'Nigeria Airways' ọtụtụ afọ gara aga, mana ụlọọrụ ahụ dakpọrọ n'afọ 2003.

    N'ozi o zipụtara n'akara Twitter ya n'ehihie Fraịde, Sirika kwuru sị: "Anyị abịaruola. Otito dịrị Chukwu. Nke a eweela ogologo oge, nnukwu ịgba mbọ nakwa ọrụ siri ike. Anyị na-ekele ndị niile nyere anyị nkwado. Site n'uche Chukwu, nke a ga-adịrị anyị nakwa ndị ọgbọ na-abịa n'ihu. Ka Chineke mee ka ọ baara obodo anyị nakwa mmadụ niile uru."

  9. Nigeria Air launch : Sirika na-enupụ isi na mkpebi ụlọikpe - AON

    Otu jikọrọ ndị nkịtị nwere ụlọọrụ ụgbọelu na Naijiria a kpọrọ 'Airline Operators of Nigeria' edegarala onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ na-na-akatọ atụmatụ mgbape ofufe ụgbọelu nke Gọọmentị Etiti bụ 'Nigeria Air' nke Minista ụgbọelu na-achọ ọpụpụ bụ Hadi Sirika, na-akwado taa bụ Fraide.

    Nke a na-abịa dịka Sirika kwuru na a ga-eme mgbape ụgbọelu 'Nigeria Air dịka Naijiria ga-anabata ụgbọelu abụọ maka nke a, taa bụ Fraide abalị 26 nke ọnwa Mee.

    N'akwụkwọ ozi nke ndị ọkaiwu otu AON degara Buhari, ha kwuru na mgbape ahụ bụ "ileli iwu ụlọikpe" nyere, ka ọchịchị Buhari ghara ime nke a.

    Fraide bụ ụbọchị ọrụ ikpeazu ọchịchị Buhari ga-anọ n'ọkwa tupu Mee 29 bụ oge Buhari ga-enyefe ọchịchị n'aka onyeisiala ga-abata.

  10. Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akụpụla ikpe PDP gbara Kashim Shettima

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akụchapụla ikpe otu Peoples Democratic Party gbara nke na-ekwu na Kashim Shettima onye bụ osote Bola Tinubu nke otu All Progressive Congress ekwesịghị ịbụ osote Tinubu mgbe ha zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ngalaba Independent National Electoral Commission kpọpụtara Bola Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023.

    Akwụkwọ PDP gbara hiwere isi na Shettima nwetara akwụkwọ ịzọ ọkwa ụlọomeiwu ma nwetekwa akwụkwọ ịzọ ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa nke ha si megidere iwu Naịjirịa.

    Kama ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nke nọ n'Abuja kụpụrụ ya bụ ikpe.

    Akụkọ ka na-abịa

  11. Ị bọọla chi

    Sonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  12. Etu ndị bu egbe si gbauo otu nwoke n'Aba

    Ụmụnwoke anọ a maghị ndị ha bụ agbagbuola otu nwoke n'Aba, Abia Steeti n'ụbọchị Tozde.

    Ndị omekome ahụ bu keke wakporo nwa amadi ahụ a mabeghị aha ya n'ụlọ oriri na ọnụnụ dị n'okporo 'St. Michael's Road',Aba.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na kwuru na ha gbara nwoke ahụ egbe ugboro atọ ma were mma gbupụ ya isi.

    Ndị nwere ọdọ ahịa nso ebe ahụ ji ọsọ kpochie ọdọahịa, ebe ndị na-aga gbara ọsọ ndụ dịka ha nụrụ ude egbe.

    Mbọ ịnụta olu ndị uweojii steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steetii ahụ bụ Geoffrey Ogbonna azaghị ekwentị ya nke ọ na-asaa ozi e zigara ya n'ekwentị.

  13. Etu ndị uweojii Ghana si nwụchie ụmụafọ Naịjirịa 49 maka ebubo ire mmadụ

    Ndị uweojii Ghana agbaala ama na ha nwụchiri mmadụ 49 ụmụafọ Naijirịa maka ebubo ịtụ mgbere mmadụ na izu ohi ịntanetị.

    Ha nwụchịrị ndị a na-enyo gụnyere umunwoke 47 nakwa ụmụnwaanyị abụọ n’isi obodo mba ahụ bụ Accra dịka ụlọọrụ “Economic and Organised” mba ahụ rụrụ orụ nchekwa pụrụiche ma nyochapụta ha. Gọọmentị mba a kwuru na ha ezighachiela mmadụ 45 n’ime ndị a na-enyo maka ịtụ mgbere mmadụ Naịjirịa dịka ha kọwara na ndị a dị agbata afọ 18 na 34.

    N’aka ọzọ, mmadụ anọ bụ ndị a sị na-achị ndị otu ịtụ mgbere mmadụ a nọzị n’ụlọikpe azara ọnụ ha. Ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha gbapụtara kọmpụta 70, ụgbọala abụọ, ekwentị 51 nakwa ihe e ji ekesa ịntanetị n’aka ndị oge ha wakporo ebe ha na-ezo.

  14. Nwaafọ Naịjrịa akwụọla ụdọ etu mmadụ akwụtubeghi n’ụwa na Guinness World Record

    Otu nwata akwụkwọ Naijirịa dị afọ 17 abụrụla onye e tinyere aha ya n’ihe nrite ‘Guinness World Record’ maka ịwụ ụdọ.

    Philip Solomon mere nke a site n’ịwụ ụdọ otu footu na tịnkọm tinkọm 30.

    Oyemekun mere ihe a n’ụbọchị 24 nke ọnwa Jenụwarị, 2023 n’ime ụlọakwụkwọ Oyemekun Grammar School dị n’Akure nke Ondo steeti.

    Ọ wụrụ ụdọ ugboro 153 ma kụchapụ onye nọbụ n’isi ya bụ ihe bụ Rasel Islam nke mba Bangladesh onye mere ihe a n’afọ 2021.

    Guinness World Records gwara BBC na ha etinyela ihe a nwata a mere dịka ihe mmadụ kacha mee nke bụ ịkacha kwụọ ụdọ n’ime tịnkọm tịnkọm 30.

  15. Ihe mere ndị uweojii jiri nwụchie nwaanyị onye otu ha

    Ndị uweojii Naịjirịa na Legọs steeti ezipụtala ozi banyere akụkọ nwaanyị onye otu ha nọ n’ọkwa ‘Corporal’ nke aha ya bụ Fauzziya Isiak bụ onye na-ebo ha ebubo ijichi ya maka na ọ gbara arụkwaghim n’ọrụ uweojii Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin zipụtara ozi na Twitter maka okwu a nke ọ kpọrọ ‘ịnye ezi nkọwa ka o doo anya’ ma kwuo na mmadụ itinye akwụkwọ ịgba arụkwaghim n’ọrụ uweojii Naịjirịa nwere usoro nke bụ na ruo mgbe a nabatara ya bụ akwụkwọ, onye tinyere akwụkwọ ahụ ka bụ onye uweojii ma nọrọkwa n’okpuru iwu na-achị ndị uweojii.

    Ozi ya sị:

    “Mmadụ itinye akwụkwọ ịgba arụkwaghim bụ otu ihe mana ihe ọzọ bụkwa ya bụ akwụkwọ igafee usoro nabata tupu enye onye ahụ asambodo ịkwụsị ọrụ.”

    “Ruo mgbe enyere mmadụ asambodo a, onye ahụ ka bụ onye uweojii Naịjirịa ma nọrọ n’okpuru iwu niile na-achị ọrụ uweojii.”

    Akụkọ a dapụtara mgbe nwaanyị onye uweojii bụ Fauzziyah tipụrụ ‘mkpu’ na soshal midia ma boo ebubo na-ekwu “Kemgbe afọ gara aga ka m na-anwa ịgba arụkwaghịm mana ekwebeghi nabata akwụkwọ m. Onyeisi m kpọrọ oku ka m bịa hụ osote Kọmịshọna ndị uweojii n’ụbọchị 24 nke ọnwe Mee maka ajụjụ ọnụ”

    “E chekwa m na ọbụ ka enye m akwụkwọ nabata arụkwaghim m gbara mana a nụrụ ebe a sị ka e jichie m ngwa ngwa ma chụọ m n’ọrụ”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ụjọ ihe a mere tụrụ ya n’ọnụ ma mee oke isi a na-wazi ya dịka ahụ kuriri ya.

    O kwuru na ọ rụọla ọrụ uweojii ruo afọ isii ma chọzie ịkwụsị.

    Mana ndị uweojii na-ekwu na nwaada a bụkwa onye na-azụ aṅụ anataghi ikike n’aka onye ọbụla ma ghara ịbịa ọrụ ruo otu ọnwa.

    Ozi Hundeyin kwukwara na ya bụ nwaada emechuola aha ndị uweojii Naịjirịa site n’ịkesa akụkọ ụgha ma ịgbanwe eziokwu maka akụkọ a.

    Ya bụ akụkọ akpatala ọtụtụ ndọrịtaụka nakwa nkatọ na soshal midia nye ma ndị uweojii Naịjirịa nakwa ya bụ nwaada.

  16. E nyela Tinubu ugo 'GCFR', akwụkwọ nnyefe ọchịchị

    E tunyela onye ga-abụ onyeisiala hụrụ Naijiria nturuugo kachasị na Naijiria nke a kpọrọ, "Grand Commander of the Order of the Federal Republic, (GCFR), nk e bụ nturuugo kachasị na Naijiria n'emume e mere n'Abuja ụbọchị Tọzde.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari nyekwara Tinubu akwụkwọ mgbanwe ọchịchị.

    N'ozi ya, Tinubu kelere ụmụ Naijiria ndị tụụrụ ya vootu ma kwee nkwa na ọ gaghị awụ ha ụkwụ n'ala.

    “Ndị mmadụ nwere ntụkwasị obi n'anyị."

    "Onyeisiala, i meela nke gị. Ugbua nnukwu ọrụ dịịrị m. Agghọtara m ihe nkwanye ugwu e nyere m taa pụtara.

  17. Ndị agha anyị mmadụ 20,000 nwụrụ maka ọgụ obodo Bakhmut - Ndị agha Wagner

    Yevgeny Prigozhin bụ onyeisi ndị agha e goro ewgo ndị mba Rọshịa ji alụ ọgụ bụ Wagner Mercenary group ekwuola na ha adịla njikere inyefe ndị agha mba Roshịa obodo Bakhmut nke ha sị ha napụtara n'aka ndị mba Yukren.

    Prigozhin onye kwere nkwa inyefe obodo a n'aka mba Rọshịa n'ụbọchị mbụị nke ọnwa Jun kwuru na ọgụ ịnweta obodo Bakhmut tara isi ndị agha ha mmadụ puku iri abụọ.

    Kama mba Yukren ekwetabeghị na ha anapụrụ ha obodo Bakhmut.

    Mịnịsta nchekwa mba Yukren bụHanna Maliar kwuru n'ụbọchị Tọzde na ndị agha mba Yukren ka nọ na mpaghara Litak nke obodo Bakhmut.

  18. U20WC: Otu Flying Eagles abanyela gba nke mgbapụ iko mba ụwa nke U-20

    Otu bọọlụ Naijirịa nke ndị na-agafabeghị afọ 20 bụ Flying Eagles etozuola ịgba agba nke mgbapụ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie ndị nke mba Ịtali na asọmpị iko mba ụwa.

    Ha bụ ndị isi na otu ha dịka ha meriri asọmpị abụọ ha gbara.

    Flying Eagles emeribeghị asọmpị U-20 nke Fifa kama ha gbara ndị nke abụọ n'afọ 1989 na 2005.

  19. Osisi njirimara mba Sierra Leone adaala

    Osisi 'Cotton' bụ njirimara mba Sierra Leone nke nọ n'obodo Freetwon mba adaala.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Julius Maada Bio kwuru na ya bụ osisi dara dịka oke mmiri zoro ma sị na ọdịda osisi a bụ 'Nnukwu ọdachi nye obodo ha".

    Bio kwuru na osisi a na-egosi nwereonwe dịka ndị ohu bịara biri na mba Sierra Leone dịka ndị nweere onwe ha.

    O kwukwara na ya bụ osisi nke pụtara n'akwụkwọ ego ha ga-enwe ihe iribama ọzọ ga-anọchị ebe osisi a nọ.

  20. Ị bọọla chi

    Sonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị si mba ụwa niile