Otu onye bụbu
onye ụkọchukwu n’otu ụka na Kenya a gbaala ama na ụka ahụ zubere ka ụmụaka buru
ụzọ nwụọ site n’ibu ọnụ tupu ụmụnwaanyị nakwa ụmụnwoke esochie ha.
Ndị uweojii
na-eme nnyocha maka ụka a egwupụtala ozu mmadụ 201 n’ime oke ọhịa Shakahola bụ ebe ndị nọ na-ebu ọnụ
ma na-eche ọnwụ ha ka ha zute Jizọs.
Onye a bụbu onye ụkọchukwu
n’ụka a gwara ụlọ ntaakụkọ the New York Times na a sị ụmụaka ndị ahụ ka ha “buo
ọnụ n’okpuru anwụ iji hụ na ha nwụrụ ngwa ngwa.”
Maazị Katana onye na-enyerezi
ndị uweojii aka n’ọrụ nnyocha ha bokwara ebubo n’akụkọ ọ kọrọ ndị ụlọọrụ ntaakụkọ
The Sunday Times na a na-emekpe ụmụahụ ndị ahụ ahụ dịka a na-akpọchido ha n’ime
ụlọ ruo ihe dịka abalị ise ma ghara inye ha nri maọbụ mmiri.
O sị: “A na-eji akwa
kpuchie ha ma lie ha gụnyere ụfọdụ n’ime ha ka na-eku ume.”
Akụkọ ụka a pụtara n’ọnwa
gara aga nke na-ebo ebubo na onyeisi ụka ahụ gwara ndị nso nso ya ka ha malite
ibu ọnụ ma ruo mgbe ha nwụrụ iji hụ na ha gara eligwe ngwa ngwa.
Nnyocha e merela n’ime
ahụ ozu ụfọdụ ndị egwupụtara gosiri na ụfọdụ n’ime ha nwụrụ site n’agụụ so ibu ọnọ,
mkpachi iku ume, nakwa ntigbu.
E kwuru na a na-achọ
ihe karịrị mmadụ 600 bụ ndị a sị bụ ndị ụka achọ ugbua.
Pastọ Paul Mackenzie bụ
onyeisi ụka a nọzị n’aka ndị uweojii Kenya ebe a na-enyocha ya mana o kwuru na
o mechiri ụka Good News International Church n’afọ anọ gara aga dịka ya
bụ ụka ruburu ọrụ gafee afọ 15.
Nnyocha BBC chọpụtara
na narị kwuru narị ozi ụka nwoke ka nọ n’ịntanetị dịka a hụrụ na e sere ụfọdụ n’ime
ha oge gafere mgbe ụkọchukwu a sị na o mechiri ya bụ ụka.
Na mkparịtaụka Mackenzie
na ụlọ ntaakụkọ Daily Nation nwere n’izu ole m ole gara aga, o ghọrọ na e
nweghi mgbe o ji sị ndị ụka ya ka ha kwụọ agụụ maọbụ buo ọnụ.
Ụkọchukwu Mackenzie
na-ezi ozi megide agụmakwụkwọ dịka o kwuru na dịka ọ natachara ‘ozi mkpuhie n’aka
Chukwu’ na ọ chọpụtara na agụmakwụkwọ bụ aka ọrụ ekwensu, nke a so n’ama Maazị
Katana gbaara ụlọọrụ New York Times.
Katana kwuru na ọ pụrụ ụka
ahụ n’ihi na oziu ụkọchukwu ahụ bịara bụrụzie “ihe egwu” nye ya.
Pastọ Mackenzie zikwara
ozi megide ụmụnwaanyị dị ime ịga ụlọọgwụ n’oge ọmụmụ nakwa megide ịgba ụmụaka ọgwụ
mgbochi.
Mgbasaozi ya gbadoro ụkwụ
n’ozi ọgwụgwụ oge nakwa ike ekwensu nke ọ sị banyerela n’ime ọchịchị ụwa a.