You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Oke ikuku na mmiri ozuzo emebiela mpaghara ụfọdụ na Myanmar, Bangladesh

    Nnukwu ikuku akụriela mpaghara ndị dị n'akụkụ osimiri na mba Bangladesh nakwa Myanmar taa bụ Sọnde.

    Ọdachi a akpọrọ 'Cyclone Mocha' bu oke mmiri ozuzo nakwa ikuku ike bụkwa nke a na-eche na ọ ga-akpata nnukwu ideimmiri.

    A na-atụ egwu na ọdachi a ga-emetụta mpaghara Cox's Bazar bụ ogige ebe ọnụọgụgụ ndị na-agba ọsọ ndụ kacha n'ụwa bi.

    Akpọpụla ihe karịrị mmadụ 500,000 gaa ebe ọzọ iji zọọ ndụ ha, oke ikuku ahụ kụpụkwara ọkụ latrik nakwa ịntaneetị maka ọtụtụ ndị bi na mpaghara ebe o metụtara.

    Onyonyo gosiri etu ikuku ahụ si butuo otu igwe ịntaneetị, nakwa etu ikuku si ebupụ elu ụlọ ndị mmadụ na mpaghara Sittwe nke Myanmar.

    Ndị ntaakụkọ mba ahụ kwuru na osisi dagburu otu nwata nwoke dị afọ 14 na Rakhine Steeti.

  2. Etu ndị uweojii Anambra si nwụchie nwaaanyị a sị mekpara nwata dị asatọ ahụ

    Akụkọ pụtara n’izu a nke gosiri otu nwata a sị dị afọ asatọ ebe o bu ọtụtụ ọnya n’akụkụ anya ya nakwa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ.

    Ndị uweojii Anambra steeti zipụtara ozi n’ụbọchị Sọnde a ma gbaa ama na ha anwụchiela nwaanyị a sị mere nwa odibo ya ihe a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru “Site n’ọrụ anyị na ministri na-ahụ maka ọdịnma ụmụnwaanyị rụrụ, anyị gbapụtara otu nwatakịrị nwaanyị dị afo asatọ na Nkpor n’akụkụ okporoụzọ King of Glory...”

    O kwukwara “Anyị anwụchiela nne ya ukwu ma kpọgaa nwa ahụ bu ọtụtụ ọnya n’aha ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.”

    “E nyefeela nne ya ukwu a dị afọ 25 n’aka ngalaba nnyocha nke to State Criminal Investigation Department ugbua.”

    Ihe onyonyo nakwa foto so akụkọ a saara ọkụ na soshal midia n’izu a nke mere ọtụtụ ji malite ịkpọ oku ka anwụchie nwaanyị a sị mere nwata ahụ ihe a.

    N’ihe onyonyo ahụ, dịka otu onye nọ na-ajụ nwata ahụ ajụjụ, o kwuru na ọ bụ n’ihi na ọ tụrụ nwata n’ala mere e ji tie ya oke ihe ma mekpa ya ahụ.

    Olu dara n’ihe onyonyo ahụ kọwara na ha hụrụ nwata ahụ n'ụzọ ebe nne ya ukwuu ziri ya ozi n’ụzụ ụtụtụ sị ya pụta gaa kpofuo ahịahịa agbanyeghi na ọ ka bu ọtụtụ ọnya nakwa apa n’ahụ ya.

  3. Egwupụtala ozu mmadụ 201 bụ ndị ụka a sị na-ebu ọnụ izute Jizọs na Kenya

    Otu onye bụbu onye ụkọchukwu n’otu ụka na Kenya a gbaala ama na ụka ahụ zubere ka ụmụaka buru ụzọ nwụọ site n’ibu ọnụ tupu ụmụnwaanyị nakwa ụmụnwoke esochie ha.

    Ndị uweojii na-eme nnyocha maka ụka a egwupụtala ozu mmadụ 201 n’ime oke ọhịa Shakahola bụ ebe ndị nọ na-ebu ọnụ ma na-eche ọnwụ ha ka ha zute Jizọs.

    Onye a bụbu onye ụkọchukwu n’ụka a gwara ụlọ ntaakụkọ the New York Times na a sị ụmụaka ndị ahụ ka ha “buo ọnụ n’okpuru anwụ iji hụ na ha nwụrụ ngwa ngwa.”

    Maazị Katana onye na-enyerezi ndị uweojii aka n’ọrụ nnyocha ha bokwara ebubo n’akụkọ ọ kọrọ ndị ụlọọrụ ntaakụkọ The Sunday Times na a na-emekpe ụmụahụ ndị ahụ ahụ dịka a na-akpọchido ha n’ime ụlọ ruo ihe dịka abalị ise ma ghara inye ha nri maọbụ mmiri.

    O sị: “A na-eji akwa kpuchie ha ma lie ha gụnyere ụfọdụ n’ime ha ka na-eku ume.”

    Akụkọ ụka a pụtara n’ọnwa gara aga nke na-ebo ebubo na onyeisi ụka ahụ gwara ndị nso nso ya ka ha malite ibu ọnụ ma ruo mgbe ha nwụrụ iji hụ na ha gara eligwe ngwa ngwa.

    Nnyocha e merela n’ime ahụ ozu ụfọdụ ndị egwupụtara gosiri na ụfọdụ n’ime ha nwụrụ site n’agụụ so ibu ọnọ, mkpachi iku ume, nakwa ntigbu.

    E kwuru na a na-achọ ihe karịrị mmadụ 600 bụ ndị a sị bụ ndị ụka achọ ugbua.

    Pastọ Paul Mackenzie bụ onyeisi ụka a nọzị n’aka ndị uweojii Kenya ebe a na-enyocha ya mana o kwuru na o mechiri ụka Good News International Church n’afọ anọ gara aga dịka ya bụ ụka ruburu ọrụ gafee afọ 15.

    Nnyocha BBC chọpụtara na narị kwuru narị ozi ụka nwoke ka nọ n’ịntanetị dịka a hụrụ na e sere ụfọdụ n’ime ha oge gafere mgbe ụkọchukwu a sị na o mechiri ya bụ ụka.

    Na mkparịtaụka Mackenzie na ụlọ ntaakụkọ Daily Nation nwere n’izu ole m ole gara aga, o ghọrọ na e nweghi mgbe o ji sị ndị ụka ya ka ha kwụọ agụụ maọbụ buo ọnụ.

    Ụkọchukwu Mackenzie na-ezi ozi megide agụmakwụkwọ dịka o kwuru na dịka ọ natachara ‘ozi mkpuhie n’aka Chukwu’ na ọ chọpụtara na agụmakwụkwọ bụ aka ọrụ ekwensu, nke a so n’ama Maazị Katana gbaara ụlọọrụ New York Times.

    Katana kwuru na ọ pụrụ ụka ahụ n’ihi na oziu ụkọchukwu ahụ bịara bụrụzie “ihe egwu” nye ya.

    Pastọ Mackenzie zikwara ozi megide ụmụnwaanyị dị ime ịga ụlọọgwụ n’oge ọmụmụ nakwa megide ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi.

    Mgbasaozi ya gbadoro ụkwụ n’ozi ọgwụgwụ oge nakwa ike ekwensu nke ọ sị banyerela n’ime ọchịchị ụwa a.

  4. Etu ntuliaka ọkwa onyeisiala si aga na mba Turkey

    Ndị mba Turkey na-esonye na ntuliaka ugbua iji kpebie ma Recep Tayyip Erdogan ọ ga-aga n'ihu ịbụ onyeisiala mba ahụ kamgbe afọ 20 ọ malitere ọchịchị ya.

    Onye ya na Erdogan na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Kemal Kilicdaroglu ekwela nkwa ịkụchapụ ọtụtụ ike Erdogan nyere onwe ya kamgbe afọ 2016 dịka ụfọdụ gbara mbọ ịchutu ya n'ọkwa.

    Ụfọdụ ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na Kilicdaroglu nwereike inweta imeri.

    Ihe abụọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ dịka ntuliaka a na-amalite bụ mgbalị ọnụahịa ọtụtụ ihe nakwa ala ọma jijiji abụọ mere na mba ahụ nke gburu puku kwuru puku ndị mmadụ.

    Ndị mmadụ amalitelarị ịkwụ n'ahịrị ọtụtụ awa tupu ntuliaka ahụ amalite dịka ọtụtụ kwuru na ha nwere olileanya ịnabata ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ha.

    N'Antakya, nke bụ ebe ala ọma jijiji ahụ kacha metụta n'ọnwa Febrụwarị, ụgbọala bụs karịrị 100 si n'ụlọ nchereoge ebe ndị ala ọma jijiji bi bute ha n'ebe a na-eme ntuliaka ka ha wee tụọ vootu.

    Iji nweta mmeri, otu onye n'ime Erdogan na Kilicdaroglu kwesịrị inweta ihe karịrị pasentị 50 nke vootu niile a tụrụ, ma ọ bụghị ya, a ga-enwe agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ n'ime izuụka abụọ.

  5. Ana m ekpe ekpere oge niile ka udo lọghachi na Ukraine - Pope Francis

    Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis na onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky nwere ọgbakọ na Vatican n'ụbọchị Satọde, ebe Pope Francis nọrọ kwe ya nkwa na ya na-ekpesi ekpere ike ka agha dị na Ukraine ugbua kwụsị, ka udo laghachi.

    N'akwụkwọ ozi mke ngalaba mgbasaozi Vatican wepụtara n'ụbọchị Satọde, ha kwuru na "Pope Francis na Zelensky nwere mkparịtaụka maka ọnọdụ ọjọọ ndị nkịtị na-agabiga ugbua na mba Ukraine n'ihi agha nke a na-aga n'ihu".

    "Ha abụọ kwekọrịtara na ọ dị mkpa ka ka ọrụ enyemaka na-aga n'ihu na mba ahụ iji nyere ọtụtụ ndị mmadụ nọ na mkpa aka."

    "Pope kwere nkwa na ya ga-aga n'ihu na-ekpere nakwa ịrịọ Chineke ka udo laghachi, kamgbe ọnwa Febrụwarị afọ 2022 bụ mgbe onyeisiala Vladmir Putin nyere iwu ka ndị agha ya wakpo mba Ukraine."

    Pope Francis ekwuola ugboro ugboro na Vatican dị njikere ikpe udo n'etiti Russia na Ukraine iji kwụsị agha a.

    Na mbido ọnwa Mee a, o kwuru na Vatican na-akwado atụmatụ udo bụ nke ha nwere olileanya na ọ ga-akwụsị ọgụ a, ma kwuo na ya bụ atụmatụ erubeghị mgbe a ga-ekwupụta ya ka ọha mara. "Oge ruo, aga m ekwupụta ya," ka Pope kwuru.

  6. Ihe mere onyeisi uweojii ji nye iwu ka e jide Seun Kuti

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba enyela iwu ka e jide otiegwu a ma ama bụ Seun Kuti, onye e setere n'onyonyo ebe ọ na-eti otu onye uweojii ihe.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede ụbọchị Satọde.

    Olumuyiwa kwukwara na "IGP nyekwara iwu ka amalite nnyocha iji chọpụta ihe kpatara mwakpo ahụ ma kpụpụkwa Mazị Kuti ụlọikpe dịka iwu si dị".

    "IGP Usman Alkali Baba na-ekwe ụmụ Naịjirịa nkwa na ndị uweojii agaghị anabata akparamagwa ọbụla iji metọọ ihe njirimara nkwanyeugwu nke Naịjirịa ọbụla, onye ọbụla mere nke a ga-enweta ntaramahụhụ dịịrị ya," Olumuyiwa kwuru.

    Mana n'ozi o tinyere n'akara Instagram ya n'uhuruchi ụbọchị Satọde, Seun Kuti kwuru na mmadụ chọrọ igbu ya na ezinụlọ ya.

    O dere sị: "Ọ chọrọ igbu mụ na ezinụlọ m. Enwere m ihe akaebe, mana abụghị m onye na-ekwu ọtụtụ okwu. Ọ rịọla m mgbaghara m wee kweta na agaghị m akpụpụ ya ụlọikpe."

    Seun Kuti etinyeghị aha onye ọ na-ekwu maka ya, o dochabeghịkwa anya ma ọ bụ onye uweojii ahụ o tiri ihe ka ọ na-ebo ebubo a.

  7. Ụtụtụ ọma

    Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi.

    Nke onye chiri ya zere o.

    Izuụka ọhụrụ abịala, gaa n'ihu na-esonyere anyị maka akụkọ niile dị mkpa.

    Ndewo.

  8. Mmadụ ise bi Abuja agbaala akwụkwo megide idu Tinubu n'iyiọrụ

    Mmadụ ise bi Abuja,isiobodo Naijiria agbaala akwụkwo iji kwụsị idu iyiọrụ onye Inec kpọpụtara dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023 bụ Ahmed Tinubu.

    Anyaegbunam Okoye, David Adzer, Jeffrey Ucheh Osang Paul, na Chibuike Nwanchukwu, bụ ndị bi n'Abuja gbara ọkaiwu ukwu Naijiria nakwa Minista Ikpe Naijiria akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja si ka a ghara idu Bola Tinubu n'iyi ọrụ n'abalị 29 nke ọnwa Mee, afọ 2023 sị na Tinubu enwetaghị pasent 25 vootu a tụrụ n'Abuja na ntuliaka e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị, 2023.

    Ha chọkwara ka ụlọikpe kpebie ka a gbatia oge Onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ịnọ n'ọche onyeisiala ganye na ekpebie onye ga-anọ n'ọkwa ahụ.

    Inec kpọpụtara Tinubu nke APC dịka onye ji nde vootu nari asaa na puku iri itoolu na ụma merie na ntuliaka ọnwa Febụwarị 25, 2023, ebe AbAtiku Abubakar gbara onye nke abụọ, Peter Obi nke Labour Party onye nke atọ.

  9. E chiela ụkọchụkwu Katolika anọ ‘monsignor taa n’Owere

    E chiela ụkọchụkwu Katolika anọ ‘monsignor taa n’Owere, isiobodo Imo steeti.

    Ụka Katolik nke Achịdayọsis nke Owere chiri ụkọchukwu anọ ‘Monsignọr’ n’emume kpọtụrụ na nnukwu ụlọụka 'Assumpta Cathedral' dị n’Owere taa bụ Satọde.

    Ndị a buliri n’ọkwa a gụnyere;Rev Monsignor Joseph Chukwudi Ejimofor, Rev Monsignor Celestine Kakie Anyanwu, Rev Monsignor John Iheanyichukwu Obilor na Rev Monsignor Kevin Chijike Ugoamadi.

  10. Tinubu emeela njem gaa Europe iji ‘hazie ọfụma’ atụmatụ mgbanwe ya

    Bola Tinubu emeela njem ọzọ gaa Europe maka ịkwado atụmatụ mgbanwe ya nke ọma.

    Onye enyemaaka ya kwuru na njem a bụ njem ọrụ, ma sorokwa na nkwado nke ikpeazụ tupu ọ malite ọrụ na Mee 29, 2023.

    Njem a ga-eme ya ugboro abụọ Tinubu na-apụ Naịjirịa kamgbe e jiri kwupụta, na Maachị 2023, na ọ ga-abụ onyeisiala.

    Cheta na ọ laghachitara Naịjirịa n’ọnwa gara aga, dịka o mere njem gaa France maka ezumike. Ọ nọ ebe ahụ ruo izu anọ, ma laghachite Naịjirịa n’ụbọchị Eprel 24.

    Ọzọkwa, cheta na ụfọdụ ekwenyeghi na mmeri Tinubu na ntuliaka onyeisiala, nke mere pati ole ma ole jiri kpọpụ ya na Inec n’ụlọikpe mkpegharị.

    N’aka nke ọzọ, onyeisiala Muhammadu Buhari ka nọ na London, ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka eze ya, dịka ọ gachara mmemme ịchị eze Charles III na ngwụcha izu gara aga.

  11. Elon Musk ahọpụtala Linda Yaccarino dịka onyeisi nchịkọ Twitter

    Elon Musk ahọpụtala Linda Yaccarino dịka onyeisi ọhụrụ ga na-achịkọta Twitter.

    Musk kwuru na ozi o wepụtara na Twitter na Yaccarino ga-amalite ọrụ ya n'izuụka isii na-abịa.

    Tupu ọkwa ọhụrụ ya. Yaccarino na-ahụ maka ozi ahịa(advertising) n'ụlọọrụ mgbasaozi NBCUniversal.

    Ọ rụburu n' ụlọrụ 'Turner Entertainment' afọ 15 tupu ọrụba na NBCuniversal.

  12. A daala achịbishop nke Canterbury nha ịgba oke ọsọ

    A daala Achịbishop nke Canterbury bụ Justin Welby maka ịkwọ ụgbọala Voulkswagen Golf mita 25 n’otu awa n’ebe a tinyere ka a na-agba 20m otu awa.

    Ụkọchukwu ahụ kwetara ya dajọrọ dịka e kpeere ya ikpe n’ụlọikpe majie zoro ezo.

  13. Ndị mwakpo egbuola otu onye nche na nwanne ya n’Aba

    Ndị amaghị ndị ha bụ egbuola onye nche n’Aba, Abia steeti.

    Ha gbukwara nwanne ya nwoke, ma gbaa ụlọ obibi ha ọkụ.

    Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ihe a mere n’Udoka Street, dị na mpaghara Amucha n’okpuruọchịchị Aba South.

    A na-ekwu na nwanne ya si mba ofesi lọta Naịjirịa ọnwa ole ma ole gara aga.

    Ndị bi n’ogbe ahụ agbaala ọsọ ụkwụ eru ala, maka ụjọ na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ga-anwuchi ha.

    Onye bi ebe ahụ kwuru na ọ bụ n’abalị ka ihe a mere.

    Dịka agbatobi ha siri kwuo, ndị oji egbe jiri ike bata n’ụlọ ha, sị nwunye onye nche ahụ na ya kpọrọ ụmụ ha pụọ. Na ọ bụ maka di y ka ha jiri bịa.

    Mgbe nwanne ya bịara inyere ya aka, ndị mwakpo ahụ eke ha ụdọ, ma gbuo ha.

    Ha gbara ụlọ ha ọkụ ka ha mechara nke a.

    Onye na-ekwuchitere ndịm̄ uweojii n’Abia steeti, bụ Geoffrey Ogbonna, kwuru na e bugara ozu nwanne abụọ a n’ụlọ ozu.

    O kwukwara na onye ọbụla mara ihe nwereike inye ndị uweojii aka n’ịnwuchi ndị mere ihe ọjọọ kpọtụ ha.

  14. Imo state: Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịkwara mmiri Oguta/Orashi ụzọ banye n'osimiri Atlantic

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agbapeela ọrụ imalite ịkwara mmrịrị Oguta na Orashị dị n'Imo steeti ka ọ banye nke ọma na nnukwu mmiri mba ụwa bụ Atlantic Ocean.

    Osinbajo kwuru na ya bụ ọrụ, nke a kpọrọ "Oguta/Orashi River development project", bụ nke ga-eweta ezigbo mmepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

    Ya bụ mmemme ka e mere ụnyaahụ Tọzde 11th Mee 2023 n'okpuru ọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.

    Osinbajo kwere nkwa na ya bụ "dredging" a malitere na mmiri Oguta bụ iji kwalite azụmahịa na mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na obodo ndị ọzọ n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.

    O kwuru na ndị so na ya bụ nkwekọrịta gụnyere ndị ọrụ agha Naijirịa, gọọmenti Imo steeti, nakwa gọọmentị etiti nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.

    N'okwu nke ya, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu kwuru na obi dị ya ụtọ na ụdị mmepe a a na-achọ ka mgbe amalitela, were rịọ ka arụruo ya n'isi njedebe.

    Iwuanyanwụ jikwa ohere ahụ rịọ ka onyeisiala Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu tupu orituo n'ọkwa na Mee 29th.

    Onye ji ọkwa Chief of Naval Staff, bụ Vice Admiral Awwal Gambo, kwuru na ya bụ "dredging" nke mmiri Oguta /Orashi ga-akwalite akụnụba Imo nakwa Naịjirịa wee kelee gọọmenti ka o siri nye ndị ọrụ Navy ọrụ nchewa ebe ahụ.

    Gọvanọ Hope Uzọdimma dugharịrị ndị niile zukọrọ na ya bụ ebe ịgba akaebe na ọrụ amalitela.

  15. Ọgbaghara na nnwụchị ndị mmadụ na-aga n’ihu na Pakistan ka a nwụchiri Iman Khan

    Ọgbaghara na-aga n'ihu na Pakistan dịka onye bụbu praịm minista mba ahụ bụ Imran Khan kwuru na aka ya dị ọchaoge anwụchiri ya n’ụbọchị Tuzde a.

    Opekatampe, mmadụ asatọ anwụọla n’ime ngagharịiwe na-aga n’ihu na mba ahụ niile dịka anwụchiri mmadụ 1,400, dịka ndị uweojii si kwuo.

    A kpọọla ndịagha oku ka ha tinyeaka kwụsị ọgbaghara na-ada ebe ahụ dịka ha dọrọ ndị na-eme ngagharịiwe aka na ntị ka ha ghara iwakpo maọbụ kụsaa ụlọọrụ gọọmentị ọbụla.

    Nnwụchi a nwụchiri Khan emeela ka esemokwu dị n'etiti ya na ndịagha mba ahụ ọkachasị n’oge a nsogbu nkuda akụnaụba na-aga n’ihu ebe ahụ.

    Ụlọikpe maa ya ikpe, a ga-ewepụ aha Khan onye bụbu onye egwuregwu cricket mba ụwa nakwa praịm minista Pakistan site n’afọ 2018 ruo 2022 na ndị nwereike ịzọ ọkwa ọchịchị dịka ntuliaka na-abịa n’ebe ngwụcha afọ a.

    Ndịagha Pakistan nwere aka n’etu ọchịchị mba ahụ nke nwere ngwaagha ogbunigwe ‘Nuclear’ si aga kemgbe ụwa ma si n’azụ na-ahazị ọchịchị mba a.

    Ọtụtụ ndị ọkaibe n’okwu ndọrọndọrọ kwenyere na mmeri Khan mere na ntuliaka 2018 bụ site n'enyemaka nke ndịagha. Mana kemgbe a chụpụrụ ya n’ọkwa ọchịchị mba ahụ, Khan abụrụla otu n'ime onye kacha akatọ ndịagha mba a.

  16. Etu e si kpebie nghọtahie dara n'etiti NLC,Gọọmentị Imo

    Oku latrik alachiela n'Imo steeti ka ọ gachara abalị isii dịka ndị ọrụ na-agba abụbọrụ wụsara ọwa.

    Nke na-eso nkwekọrịta nke Gọọmentị Imo steeti na otu jikọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress na-alaka ya bụ Trade Union Congress nwere dịka ndị ọrụ gbara abụbọọrụ na steeti ahụ.

    Imo steeti nọrọ n'ọchịchị abalị isii dịka abụbọọrụ ndị ọrụ gbara banyere mwakpo ọgbakọ ụbọchị ndị ọrụ ahụ dị ire.

    Ụgbọelu efebataghị maọbụ fepụ n'ọdọụgbọelu 'Sam Mbakwe Airport' dị n'Owere, isiobodo steeti ahụ dịka ha na-ebo ndị na-arụụ gọọmentị Imo Steeti ebubo aka ha ịdị na mwakpo ọgbakọ mmemme ndị ọrụ n'abalị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2023.

  17. Ndị ọrụ oyibo Abia steeti agbaala abụbọọrụ

    ụlọọrụ gọọmentị Abia nile gbachiri agbachi dịka ndị ọrụ oyibo nọ n'okpuru otu 'Nigeria Labour Congress, ngalaba nke Aba, gbara abụbọọrụ a mabeghị oge ọ ga-ebi n'ihi ụgwọọnwa e ji ha.

    N'ozi mgbasaozi nke onyeisioche otu NLC Abia steeti bụ Nweke Iheme na odeakwụkwwọ ha bụ Emma Alozie binyere aka, otu sịrị:

    "Site n'ozi mgbasaozi a, anyị naenye ndị ọrụ Abia steeti nile ka kwụsị orụ ha na-arụụ gọọmentị Abia steeti malite n'Elekere 12 nke ime abalị Monde, abalị asatọ nke ọnwa Mee, afọ 2023."

    "Ka ọ doo ewu na ọkụkọ anya, anyị akaghị akwụsị abụbọọrụ belụsọ ma kwụrịụ ụ ndị ọrụ nile na ndị lara ezumike nka ụgwọ ha."

    Ozi ahụ na-eso ọgbakọ nke NLC Abia nwere n'Ụmụahịa bụ ebe otu gbarụụ ihu na gọọmentị Abia emezughị nkwekọrịta ha na otu ahụ nwere maka ọnọdụ ndị ọrụ.

    Ncheta na otu ahụ kagbuburu abụbụọrụ ha n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị afọ.

  18. Ụlọikpe amachiela NBC ịda ụlọ mgbasaozi nha

    Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja enyela edobela n'akụkụ nha N500,000 ngalaba na-ahazi mgbasaozi n'ikuku bụ the National Broadcasting Commission (NBC) ịda ụlọmgbasaozi n'ikuku 45 n'abalị mb u nke ọnwa Maachị , afọ 2023.

    Jọstịs James Omotosho onye nyere mkpebi ahụ machịkwara NBC ịda ụlọmgbasaozi n'ikuku dị na Naijiria nha.

    Ọkaikpe ahụ kwuru na ihe NBC mere megidere iwu, na ọ gaghị abụ onye mkpesa, ụlọikpe nakwa ọkaikpe okwu metụtara ya.

  19. Etu ndị mmanye ‘sit-at-home’ si gbaa otu onye ọrụ nchekwa ụlọakụ egbe n’ụkwụ n’Anambra

    Ndị uweojii Anambra steeti ezipụtala ozi ma kọwa etu ha siri chụsaa ndị ha sị bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) pụtara imanye ndị mmadụ iwu ka ha onye nọrọ n’ụlọ bụ nke ọha ji sit-at-home mara.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kọwara na ndị a bụchaa egbe nakwa nkwa ọgụ ndị ọzọ bu ọgba tum tum ha wụchịe n’ahịa Nkwo nke akụkụ Ihiala ma malite ịgba egbe aghara aghara ebe ahụ.

    Ikenga kwukwara na ndị ahụ nwara iwakpo otu ụlọakụ nọ n’ebe ahụ ma nwaa ịchụsaa ndị mmadụ nakwa gbochie ngagharị ndị mmadụ ebe ahụ.

    Ikenga kwuru ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ebe ahụ ngwa ngwa gbochie atụmatụ ha ma chụsaa ha.

    O kwukwara na mgbọ tụtara onyeisi nchekwa ụlọakụ ahụ nọ ebe n’ụkwụ.

    N’ozi ya, o kwuru:

    “Dịka ndị ojiegbe ahụ gbara egbe aghara aghara, mgbọ tụtara onyeisi nchekwa ụlọakụ ahụ n’ụkwụ mana ebugala ya ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụọgwọ ugbua mana enweghi onye nwụrụ na mwakpo a.”

    Gọọmentị Anambra steeti ekwuola ugboro ugboro na enweghi ihe dịka iwu onye nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ dịka ọ gwara ndị mmadụ pụta na-aga mkpa ha kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

    Cheta na n’afọ 2021 mgbe e duchara gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra iyi ọrụ, ọ kpọkuru ndị niile nwere iwe nye gọọmentị Naijirịa maọbụ nke steeti ka ha bịa ka enwee mkparịtaụka ma chọo ụzọ udo iji dajụọ tigbuo zọgbuo nọ na-ada na steeti ahụ nakwa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.

    Akụkọ ọgbaghara nakwa mwakpo ndị mmadụ jputakwara n'ihi iwu onye nọrọ n’ụlọ ndị otu Ipob tinyere n’akụkụ ọwụwa anyanwụ niile kwa ụbọchị Mọnde.

    Iwu onye nọrọ n’ụlọ a nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tiburu ma mechaa kagbuo bụ maka iji gosi gọọmentị Naịjirịa iwe ha maka etu e si nwụchie ma kpọlata onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu Naijirịa.

    Kanu nọ n’aka ndị uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services dịka ikpe ya ka na-aga n’ihu agbanyeghi na ụlọikpe mkpegharị kwuru ka a tọhapụ ya n’afọ 2022 ma kụchapụ ebubo niile gọọmenti Naijirịa nwere n’isi ya.

    Mana na nso nso a, Ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa nyere gọọmentị etiti iwu ka ha weta ebubo itoolu ọzọ ha sị na ha chọrọ itinyekwu n'ebubo ha na-ebo Mazi Nnamdi Kanu.

  20. E Jean Carroll: Ụlọikpe achọpụtala na Trump kpara nwaanyị aka n’ike n’ụzọ ọ chọghị

    Otu ikpe n’ikpe agbara onye bụbu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump achọpụtala ọ kpara otu nwaanyị bụ onye na-ede ihe aka n’ike n’ụzọ ọ chọghị n’otu ngalaba ọrụ na New York n’ebe agbata afọ 1990.

    Mana achọpụtaghị na Trump dịnara na E Jean Carroll n'ike n’ime ụlọ ebe a na-agbawe akwa nke Bergdorf Goodman.

    Ndị otu ikpe ahụ chọpụtakwara na ikpe mara Trump maka okwu mmetọ aha n’ihi ọ kwuru na ebubo onye edemede ahụ bụ “ezigbote akụkọ ụgha”

    Nke a ga-abụ mbụ ya a na-achọpụta na aka Trump dị n’okwu mwakpo mmadụ n’ike.

    Ndị otu ikpe nke Manhattan nyere Trump iwu ka ọ kwụọ nwaanyị ahụ ihe ruru nde dọla ise (£4m) na maka etu okwu a siri metụta ya.

    Otu ndị ọkaikpe ahụ bụ nwoke isii na ụmụnwanyị atọ ruru mkpebi ha mgbe nọrọ ihe awa atọ mee mkparịtaụka n’okwu a n’ụbọchị Tuzde.

    Nwada Carroll kwuru:

    "Taa, ụwa emechaala mara nke bụị eziokwu” dịka o zipụtara ozi n’ihe ederede nso mkpebi ikpe ahụ. "Mmeri a abụghị naanị maka m kama ọ bụ maka nwaanyị ndị ọzọ niile tarala ahụhụ n'ihi na enweghi onye kwetere ha.”

    Onye ọkaiwu Trump kwuru ọ ga-agbagha mkpebi ụlọịkpe mere n’ikpe a.