You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe mere otu AU ji esonye n'ọgbakọ G7 nke afọ a

    Otu Africa Union na-esonye n'ọgbakọ G7 nke afọ 2023 bụ nke na-aga n'ihu ugbua na mba Japan.

    G7 bụ otu jikọrọ mba asaa bara ọgaranya n'ụwa nke gụnyere: Japan, Amerịka, UK, Kanada, Germany, France na Itay.

    Otu a na-enwe ọgbakọ kwa afọ ọbụla iji kpaa etu ha ga-esi wulite mmekọrịta n'etiti onwe ha.

    Mana nke afọ a, ha akpọọla ka Afrịka sonyere ha n'ọgbakọ ahụ, dịka Kọmishọna na-ahụ maka okwu azụmahịa n'otu AU bụ Albert Muchanga nke mba Zambia.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mba ụwa dị icheiche na-achọ iwulite mmekọrịta ha na Afrịka n'ihi ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara na mpaghara ahụ.

    I ji maa atụ, Onyeisiala German na nke Fransị nakwa osote onyeisiala mba Amerịka, abịala njem nleta na mba Afrịka dị icheiche n'afọ a bụ 2023.

    Praịm Mịnịsta mba Japan gakwara njem nleta na mba Egypt, Ghana, Kenya, na Mozambique, na mbido ọnwa Mee a.

    Chetakwa na mba Chaịna na Russia - bụ ndị esoghị na G7 - na-ewulitekwa mmekọrịta ha na Afrịka.

    Na mkparịtaụka ya na BBC, Muchanga kwuru na "Afrịka agaghịzi anabata ịbụ naanị mba ebe a na-eweta ihe akụ ọnatarachi na-ebuga mba ụwa ndị ọzọ Kama Afrịka ọdịnihu ga-eweta mmekọrịta ga-adịrị mpaghara ahụ mma, dịkwara ndị ọzọ."

    "Anyị agaghị aga n'ịhụ ịbụ mba a ma ama maka mbubu ihe akụ ọnatarachi nakwa akụrụngwa e ji arụpụta ihe, nke ahụ agaghị adabazi. Dịka ọnụọgụgụ anyị na-agbalite, anyị chọrọ ohere ndị mmadụ ga-eji na-arụ ezigbo ọrụ, ohere ahụ ga-abịa ma ọ bụrụ na arụọ ụlọọrụ ndị a na-emepụta ihe n'Afrịka."

    "Ezigbo ọmụmaatụ bụ na mba DRC na Zambia bụ ndị na-achọ ijikọ aka ọnụ ma hibe ụlọọrụ na-emepụta batrị maka ụgbọala latrik."

    Mba abụọ a so na mba kacha emepụta 'copper' na 'cobalt' nke bụ akụrụngwa e ji arụpụta batrị, nke ọtụtụ mba dị icheiche na-achọ ugbua.

    N'aka nke ọzọ, Mba Amerịka na-agba mbọ iwulite azụmahịa ha na mba Afrịka.

    Nke a na-abịa dịka azụmahịa mba Chaịna na Afrịka na-agbago n'ike n'ike; cheta na Amerịka na-ahụta Chaịna dịka ndị ha na ha na-ama aka.

    N'afọ gara aga, azụmahịa Chaịna n'Afrịka ruru ijeri dọla 282 ($282bn), dịka ngụkọ azụmahịa nke mba Chaịna si gosi. Nke a pụtara na o ji pasentị 11 rịa elu karịa afọ 2021, dịka ọnụahịa mmanụ agbịdị, 'copper', 'cobalt' na 'iron' gbaliri.

    Nke a pụtakwara na azụmahịa Chaina na Afrịka ji ugboro anọ karịa azụmahịa Amerịka na Afrịka, bụ nke ego ya gbakọtara ijeri dọla 72.6 ($72.6bn) n'afọ 2022

  2. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, chi abọọla.

    Ya dịrị gị mma dịka ị na-esonyere anyị.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.

  3. E likọtala ọtutụ mmadụ ndị ekperima gburu na Platu steeti

    E liela ọtụtụ ndị mmadụ n'otu nnukwu ili n'obodo Mwaghavul, dị na Mangu Platu steeti dịka ndị ekperima bu egbe wakporo obodo ahụ gbagbuo ọtụtụ ndị mmadụ ma sunye ụlọ ha ọkụ.

    Otu onye ndu obodo ahụ gwara BBC na "ndị ojiegbe wakporo ogbe 17, e nwere o pekata mpe mmadụ 85 nwụrụ".

    Deborah Samuel, onye bi na ebe ahụ ihe mere kwuru na ya gbara ọsọ ndụ dịka ya nọ n'ahịa nụ ka egbe na-ada aghara aghara, kwuru na e gburu nna dị ya na ụmụnne dị ya nwoke anọ .

    “Samuel ku nwa n'aka kwuru sị, "Anyị nọkatara nụwa ụda egbe si elu na ala. Anyị malitere gbawa ọsọ. Ihe mere ka na-afụ mụ ụfụ."

    Ụfọdụ ndị gbara ọsọ ndụ ka nọ n'ebe mgbaba ndị gbara ọsọ ndụ nke abụghị nke gọọmentị.

    O nweghị onye o doro anya ihe butere mwakpo ahụ, mana ụfọdụ ndị bi ebe ahụ na-arụtụ aka na ọ bụ mbọgwara ndị Fulani a wakporo ọnwa ole na ole gara aga.

    Esemokwu na-ada n'etiti ndị ugbo na ndị ọchịehi kemgbe ogologo oge.

  4. Abụbụọrụ ndị dọkịta na Naịjirịa abanyela ụbọchị nke atọ

    Abụbụọrụ ịdọ aka na ntị nke ndị dọkịta nọ n'otu 'National Association of Resident Doctors' abanyela ụbọchị nke atọ taa bụ Fraịde, ụbọchị 19 nke ọnwa Mee 2023.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times si dee, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na steeti dị icheiche nọ n'ihe nhịahụ n'ụlọọgwụ dị icheiche n'ihi abụbụ ọrụ a.

    Ndị dọkịta malitere abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị n'ụbọchị Wnezde (Mee 17) dịka ha kwuru na gọọmentị achọghị ige ntị n'ihe ha na-arịọ. Ha kwuru na abụbụ ọrụ a ga-anọ ụbọchị ise; taa bụ Wenezde bụ ụbọchị nke atọ.

    Otu n'ime ihe ndị dọkịta a chọrọ bụ ka gọọmentị kwụọ ha na-egbughị oge ọbụla ụgwọ a kpọrọ 'Medical Residency Training Fund' nke afọ 2023, ibuli ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị dọkịta, nakwa ịkwụchapụ ha ụfọdụ ụgwọ ọnwa e ji ha n'ụgwọ kamgbe afọ 2015.

    Ha chọkwara ka gọọmentị wee ọtụtụ ndịọrụ ahụike n'ọrụ ma wepụkwa ihe nhịahụ niile na-egbochi gọọmentị idochi anya ọtụtụ ndị ọrụ ahụike bụ ndị na-ahapụ Naịjirịa aga mba ofesi aghara aghara.

    Gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na mkparịtaụka na-aga n'ihu n'etiti ha ndị dọkịta a, mana otu NARD kwuru na gọọmentị akpọbeghị ha oku ọbụla maka inwe mkparịtaụka.

    Ndị dọkịta nọ n'otu NARD bụkarị ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ dị elu na Naịjirịa, nke mere abụbụ ọrụ a ha na-agba ji emetụta ọtụtụ mmadụ.

    Otu onye n'ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị n'Abeokuta, Ogun Steeti, aha ya bụ Adeola, kwuru na ya na-ahapụ ụlọọgwụ ahụ lawa, n'agbanyeghị na ahụ esichabeghị ya ike.

    "Agaghị m atọ ebe a. Ihe m hụrụ kamgbe ụnyaahụ, ọdịghị m ka e nwere ihe ga-agbanwe. Ndị dọkịta nọ ebe a anaghị ezu maka ndị mmadụ chọrọ ahụike, mana ugbua, onweghịzi nke nọ ya chaachaa," ka o kwuru.

    Otu a kwa ka ọ dị n'ụlọọgwụ 'Lagos University Teaching Hospital' dị na Legọs steeti. Otu onye ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ gwara BBC Igbo na ndị dọkịta anaghị arụ arụ. Naanị ụfọdụ ndị dọkịta na-eme ọzụzụ na-enye aka eleta ndị mmadụ.

  5. Mmadụ itoolu anwụọla n'oke idemmiri n'Italy

    O pekata mpe mmadụ Itoolu anwụọla ,ebe azọpụtytarala mmadụ 10,000 n'ụlọ ha dịka idemmiri wakporo Emilia-Romagna dị n'ugwu mba Itali.

    Mayọ mpaghara Castel Bolognese, kwuru na ọkọtọ karịrị, ebe Mayọ Forli dị ya nso kwuru na ideakpụ mmiri ahụ ekpuola mpaghara nke ha "ikpere n'ala ma bụtere ha ihe ụfụ".

    Praim Minista mba Itali bụ Giorgia Meloni nọrọ n'ọgbakọ gbatgbata a kpọrọ kelee ndị ọrụ gbatagbata maka ịgbatara ndị o metụtara ọsọ enyemaka.

  6. Kenya akwụsịla ndị ọrụ gọọment 27 ọrụ maka orire sugar na mba ha

    Akwụsịtụla onyeisi ngalaba na-elekọta ihe oriri na mba Kenya na ndị ọrụ gọọmenti 26 ndị ọzọ maka etu ha si wee hapụ ka shuga adigboroja karịrị tọn otu puku baa n'ime ahịa.

    Onyeisi ngalaba ndị ọrụ gọọmenti bụ Felix Koskei kwuru na ihe karịrị akpa shuga puku iri abụọ abanyela mba ahụ n'afọ 2018. Ọ katọkwara etu ngalaba ọrụ kwesịrị ilekọta nri si wee mee ka ya bụ ngwa ahịa a baa n'ahịa ha.

    Ndị ọrụ Kenya Bureau of Standards ekwuola na shuga adịghị mma maka oriri ha nọ na-eche ka e ji etanọl mebie ya bụ shuga adigboroja.

    E kwesịrị ime ya n'ihụ ọha na ndị ọrụ by regulatory agencies.

    Ha kwesịrị ịchọ onye nwere ngwa ahịa etanọl ma sikwa ụzọ ziriezi kwụọ ya ma kwụọkwa utuisi niilke e kwesịrị.

    “O dooro anya na ndị ọrụ ngalaba hapụrụ ọrụ ha kwesịrị ilebaanya hapụrụ ọrụ ha nagbanyeghi ihe izendu ọdịịrị ọha,” ka Maazị Koskei si kwuo.

    Mmachi ha na-abịa ka ndị mba Kenya na-ahụ ụkọ shugar nakwa ọnụego shuga karịrị akarị n'afọ niile.

  7. Ndị na-akpụ olu m, njirmara arịala elu- Peter Obi

    Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n'aha 'Labour Party' bụ Peter Obi etiela mkpu na ndị na-akpụ olu ya nwere akpọ ndị mmadụ iji butere aha ọjọọ na Naijiria nakwa ofesi arịala elu.

    Obi kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya ụbọchị Fraide.

    Obi gara n'iru rutụ aka na o nwere ndị mkpụrụ olu ya were jiri ya akpọ ndị mmadụ n'ekwentị na-ezi ha ihe ya ezighị ha.

    ọ sịrị,

    "E nwetara ozi dịka m nọ n'ụlọikpe n'abalị 17 nke ọnwa Mee, afọ 2023 na nwa aka chịburu Kogi steeti bụ Mustapha Audu, gwara ọnụ na-ekwuru ndị Labour bụ Dr Yunusa Tanko sị na m kpọrọ ya dịka m kwụ n'ihu ụlọọrụ n'ụtụtụ Tuzde n'ebe Elekere 11 nke ụtụtụ mana a gbanyụrụ m ekwentị ka m sụchara ya Igbo na ya bụ Audu enwelighị ike ịsa m."

    Obi kwuru na dịka otu onye ozi ya nụrụ akụkọ ahụ, ọ mere ka ya mata ma gba mbọ hụ na ya na Audu hụrụ.

    "Ka ụlọikpe gbasara, agwara m ya na ọ bụghị m kpọrọ gị. Enwelighị m ike ịkwụ n'ihu ụlọọrụ gị ụbọchị Tuzde n'ihi na anọghị m n'Abuja, Anọghị m dị na Naijiria. A ka=ka m si Nice dị na Fransi bụ ebe m gara ọgbakọ."

  8. "Meghan and Nwaeze Harry dịka ụjọ o ji ha," onye ọkwọụgbọala New York kwụọ ha, Onye ọkwọ ụgbọlala na New York kwọ nwa Eze UK bụ Harry na Meghan; nwunye ya nkeji iri n'abalị Tuzde si na o nwere ndị osefoto na-achụ ha mere ka di na nwunye a wee na-eme ka ụjọ o ji ha n'oge nkenke ha bara ụgbọala ya

    Sukhcharn Singh maọbụ Sonny, ka e si akpọ ya, gwara BBC n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'etiti Manhattan.

    Onye na-ekwuchitere Harry na Meghan ekwuola n'ozi o depụtara sị na di na ihe nwunye a gamigara bụ ọchụchụ ndị chọrọ ise ha foto ruo ihe dịka wlwkere abụọ.

    Mana Maazị Singh jiri anya hụtụ etu ihe ha gamigara si na o jighị maka ya bụ ọchụchụ a na-agba ọsọ.

    "Anọ m okporoụzọ 67th mgbe m hụrụ ndị nche. Ihe ọzọ m hụrụ bụ Nwaeze Harry na nwunye ya abaa n'ụgbọ m," dịka o si kwuo.

    "Ụgbọala atịtị ekweghị anyị gaa, ihe ọzo anyị hụrụ bụ ndị oseefoto si ebe niile achụ anyị ns-ese ha foto." Harry na Meghan chọbụrụ ikwu ebe ha na-aga mgbe onye nche ha si ka anyị gaghachj n'ụlọọrụ ndị uweojii."

  9. Ndewoo

    Ndewoonu , Igbo ndị ọma anyị ji biri!

  10. EFCC anwuchiela mmadu 21 n'Enugu maka ebubo ohi intanet

    Aka ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC n'ịchafụ akparala ndị ntorobia mmadu 21 n'Enugwu maka ebubo iji intanet anapụ ndị mmadụ ego. EFCC nwuchiri Nwosu Nonso Paul, Onuji Chibuike Samson, Eze Chukwudi, na Stanley Okoroafor, dịka hamere mwakpo n'ụbọchị Tuzde na steeti ahụ. Ndị ọzọ aka kpara gụnyere Michael Nnamchi, Henry Ozonwanji, Victor Ifesinachi Ozonwanji, Victor Ibik, Anthony Ugwu, Ndubuisi Amala, Eneje Chisom, Henry Chukwu, Abumchukwu Dominic, Agafe Victor, Victor Abah, Jide Favour, Samson Onyedika, Joshua Uchechukwu, Izuchukwu Paul,Samuel Chizitiere na Emanuel Abah. Dịka ozi EFCC wepụtara n'akara Facebook ha siri kwuo, e nwetara ụgbọala kpọchakpọcha ise, kọpụta asaa na ekwentị 32 n'aka ndị a na-enyo enyo.

  11. Igbo ndị ọma, ndewoonụ!

    Taa maaranụ anyị mma o!

  12. Ka ọ dịzie nụ

    Daalụ maka isonye anyị taa.

    Ebe a ka anyị ga-apịachị ịkọ akụkọ nke taa bụ ụbọchị 16 n'ọnwa Mee, 2023.

  13. Ihe Inec kwuru maka ihe ndị dị omimi BBC nyochapụtara na ntuliaka Naịjirịa 2023

    Ụlọọrụ nhazị ntuliaka Najiịrịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na ha agaghị ekwu ihe ọbụla banyere nnyocha BBC mere nke chọpụtara ihe omimietu e si degharịa mpụtara ntuliaka n'ụfọdụ ebe na Naịjirịan’oge ntuliaka 2023.

    A na-akwado idu Bola Ahmed Tinubu iyi ọrụ dịka onye nwetere mmeri na ntuliaka ahụ n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee mana ụfọdụ pati na-agbagha mmeri ya.

    Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Mazị Festus Okoye gwara BBC na “Okwu a nọ n’aka ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka. Anyị ga-enwerịrị ntụkwasị obi n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.”

    Ọ kọwara na ụlọikpe so n’ohere usoro ntuliaka nyere ma kwuo na ụfọdụ ihe nnyocha BBC gbara n’anwụ nọkwa na mkpesa ụfọdụ ndị patị na-agbagha mpụtara ntuliaka a mere n’ụlọikpe. “Ọ gaghị abụ ihe ziri ezi itinye aka n’ikpe a tupu ụlọikpe e mechaa mkpebi ha.”

    N’ụbọchị Tuzde, BBC wepụtara akụkọ nyochapụtara na e nwere ndegharị mpụtara ntuliaka mere na Rịvas steeti, nke bụ otu steeti kpọtụrụ akpọtụ n’oge ntuliaka 2023 agbanyeghi na mpụtara nnyocha enweghi ihe gbara ọkpụkpụrụ nke nwereike ịme akụchapụ mpụtara ntuliaka a e mere n’ọnwa Febrụwarị.

    Akụkọ a kwuru na “e nwere ọtụtụ ajụjụ a na-ajụ banyere otu onye ọrụ Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka ndị dị aṅaa.”

    Ụfọdụ otu ekwuola na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke a bụ ọpụrụiche maka etu o lee anya ya ịgbanwe ihe na Naịjirịa. Nke a mbụ a na-eseta foto akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu n’oge ntuliaka ma gbaa ya n’anwụ n’ịntanetị.

    Nke mere ọ bụrụ ihe kwere omume na e ji akwụkwọ ndị a gụkọọ vootu ndị si ọgbọ ntuliaka ma tupu ma ha na mpụtara ntuliaka ndị a kpọpụtara na steeti abụ otu.

    Ọ bụ iso usoro a ka BBC si mee nnyochata a gbara ọkpụrụkpụ n’otu steeti na-akpata ndọrịtaụka bụ Rịvas steeti. Nnyocha gosiri ihe dị ka otu onye enweghi onye ma onye ọ bụ so rụọ ọrụ na ntuliaka n’ọkwa Election Returning Officer.

    Onye a nọ n’isi okwu a nke sị na aha ya bụ Dkt Dickson Ariaga kpọpụtara mpụtara ntuliaka nke a na-eche nrụrụaka banyere n’ime ya iji menyere APC bụ patị nọ n’ọchịchị.

    BBC mara imi n’ala ịchọta nwoke ahụ, ma gakwa n’ụlọakwụkwọ mahadum ọ sị bụ ebe ọrụ ya mana enwebeghi onye nwereike ịhụ ya. Otu onye ọrụ na mahadum Federal College of Education, Omoku, nke bụ mahadum nwoke a sị na aha ya bụ Dkt Ariaga sị bụ ebe ọrụ ya mgbe ọ na-akpọpụta onwe ya oge ngụpụta aha gwara BBC “Site n’akwụkwọ ndị ọrụ anyị nakwa akwụkwọ anyị ji akwụ ụgwọ enweghị onye dị etu ahụ, anyị amaghị onye ọbụla na-aza aha ahụ.”

  14. Mba Amerịka akụchapụla akụkọ ụgha na-egosi aha ndị a sị ha nyere mmachi ịbata mba ha

    Mba Amerịka aghọọla Ịwepụta aha ndị mmadụ nke a sị ha nyere ụfọdụ ndị Naịjirịa mmachị ịbata mba ha n'ihi “agwa ọjọọ n'oge ntuliaka” e mere n’ọnwa Febrụwarị.

    Aha ndị a e depụtara nke bụ akụkọ ụgha gbara mbụ na Twitter dịka odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken wepụtachara ozi na Twitter ya, na mba Amerịka amachiela ụfọdụ ndị Naijirịa ibata mba ha maka agwa ha kpara n’oge ntuliaka e mere n’ebe malite afọ a.

    E kesaala ozi a na Twitter ihe ruru ugboro 1200 dịka ndị mmadụ agụọla ya ruo ugboro 450,000 kemgbe e wepụtara ya bụ ozi.

    Mgbe BBC jụrụ maka ndepụta aha na-efesa na soshal midia ugbua, ụlọọrụ mba Amerịka na-arụ na Naijirịa kwuru na ndepụta aha ndị a esighi n’aka ha ma kwuo na ihe gbasara akwụkwọ ikike ime njem ndị mmadụ bụ ihe dịịrị ndị dịka iwu mba Amerịka si kwuo, nke bụ na ha agaghị agba ya n’anwụ.

    Omenala mba Amerịka bụ na ha anaghị agba aha ndị ha nyere mmachị n’anwụ nakwa ụdịrị mmachị ha nyere onye ọbụla n’anwụ.

    Ozi Blinken nke dị websaịt ụlọọrụ nnọchịteanya mba Amerịka kwuru na mkpebi inye ndị a mmachị bụ iji gbaa n’anwụ na mba Amerịka na-agba mbọ ikwado atụmatụ Naịjirịa igbaso nakwa ikwalite ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa usoro iwu.

    Tupu e mee ntuliaka, mba Amerịka zipụtaburu ozi ṅụọ iyi na ha ga-amachị onye ọbụla a hụrụ n’aka ya dị n’agwa ọbụla ga-akụsa usoro ntuliaka Naịjirịa.

    Mana ha kwuru na ha agaghị ewepụta ihe ịgba ama ọbụla gosiri ndị mmachị a metụtara.

  15. Ụlọikpe enyela iwu ka ndị uweojii jide Seun Kuti na mkpọrọ ruo abalị abụọ

    Otu ụlọikpe nta dị na Legọs enyela ndị uweojii iwu ka ha jichie otiegwu a ma ama bụ Seun Kuti ruo awa 48 iji mechaa nnyocha ha gbasara ebubo iti onye uweojii ihe nke ha na-ebo ya.

    Ndị uweojii nke mpaghara Yaba dị na Legọs Steeti kpụrụ Seun Kuti na Yaba Magistrate Court taa ma na-arịọ ka ụlọikpe nye ha ikike ijichi Seun Kuti ruo ụbọchị 21 n'ihi nnyocha ha na-eme.

    Mana ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Adeola Olatunbosun nyere iwu na ha agaghị ejide nwa amadị ahụ karịa ụbọchị abụọ, ma gwakwa ndị uweojii ka ha mee nnyocha ha ngwangwa ma nyefee akwụkwọ ikpe ahụ n'aka ngalaba ikpe nke gọọmentị Legọs Steeti.

    "Ọ bụrụ na awa 46 agafee, a ga-atọhapụ onye e ji eji (ya bụ Seun Kuti) ma ọ kwụọ otu nde naịra, ma kpọta ndị akaebe abụọ bụ ndị nwere agba n'obodo, ha ga-eweta akwụkwọ ụtụisi afọ atọ ha, otu n'ime ha ga-abụ onye nwere ala n'okirikiri ebe ụlọikpe nwere ikike," Ọkaikpe Olatunbosun kwuru.

    N'akwụkwọ mkpesa nke ọkaiwu Kuti bụ Adeyinka Olumide-Fusika (SAN) wepụtara, o kwuru na ndị uweojii "ekweghị ka nwunye Kuti hụ ya ma bunye ya ihe oriri kamgbe mgbede ụbọchị Mọnde, ebe ọ bụ na ha enweghị atụmatụ ọbụla iji nye ya nri".

    Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka Seun Kuti hafere onwe ya n'aka ndị uweojii dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali-Baba nyere iwu ka e jide ya.

    Onyonyo pụtara na mgbede ụbọchị Sọnde ebe Seun Kuti mara otu onye uweojii aka ntị n'okporoụzọ.

    Iti onye uweojii ihe bụ nnukwu mmehie nnupuisi na ngalaba 356 nke iwu Nigerian Criminal Code Act, nke nwere ike ibutere mmadụ ịga mkpọrọ afọ atọ.

  16. Mmadụ asaa anwụọla ebe 17 torọ n'ala n'ebe a na-egwu ọlaedo na Ghana

    Mmadụ asaa alaala mmụọ ebe mmadụ 17 ka tọrọ n'ime ala dịka otu ebe a na-egwupụta ọlaedo na mpaghara Ugwu nke mba Ghana zere n'ụbọchị Mọnde.

    Naanị mmadụ abụọ ka a zọpụtarala na Mọnde n'ogige ebe ahụ ana-egwuputa akụ ọnatarachi na Korle Teye Takorso dị na Birim North n'ọwụwa anyanwụ mba Ghana.

    Ndị ọrụ ngwupụta akụ ọnatarachi n'ime ala, bụkwa ndị na-agba mbọ ịzọpụta ndị otu ha ọdachi ahụ dakwasara, ekweghị ka ndị ntaakụkọ bịarute nso ma sete foto maọbụ onyonyo etu ihe ahụ si mee.

    Ndị ọchịchị mba Ghana ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ihe a merenụ.

    A na-eche na ọ bụ nnukwu mmiri ozuzo na mpaghara ụfọdụ na mba Ghana kpatara ọdachi a.

    Igwupụta akụ ọnatarachi na-anataghị ezi ikike n'aka gọọmentị bụ bụ ihe a na-ahụkarị na mba Ghana n'agbanyeghị na ndị ọrụ gọọmentị na-agba mbọ ịkwụsị ya.

    A na-akpọ ụdị ọrụ a 'galamsey' na Ghana.

  17. Iwu ịmachi ndị dọkịta Naịjirịa ịpụ mba ofesi agaghị achịta aja - Chris Ngige

    Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na iwu nke ndị omeiwu Naịjirịa na-atụle ugbua iji machie ndị dọkịta Naịjirịa ịpụ mba ofesi, agaghị enwe isi.

    Ngige, onye bụkwa dọkịta n'onwe ya, kwuru nke a dịka e mechara ọgbakọ 'Federal Executive Council' pụrụ iche n'ụlọ gọọmentị dị n'Abuja.

    Cheta na ọ bụ otu onye omeiwu aha ya bụ Ganiyu Johnson, onye si Legọs steeti, wepụtara iwu ahụ nke kwuru na onye ọbụla gụchara akwụkwọ ịbụ dọkịta na Naịjirịa ga-arụrịrị ọrụ afọ ise na Naịjirịa tupu e nye ya ikike ntozu oke dịka dọkịta.

    Johnson kwuru na ime etu a ga-ebelata mgbapụ ndị dọkịta na-agbapụ na Naịjirịa ngwangwa ha gụchapụrụ akwụkwọ.

    Mana Ngige kwuru na ịjụ inye onye dọkịta mecharala ọzụzụ ikike ntozu oke ga-abụ ịda iwu na-achịkọta usoro ọrụ ahụike na Naịjirịa.

    "Onweghị onye nwere ikike ikwu na ndị dọkịta agaghị enweta ikike ịrụ ọrụ ruo mgbe ha rụzuru ọrụ afọ ise na Naịjirịa. Iwu hibere uzoro ngalaba ahụike Naịjirịa akwadoghị nke a," ka Ngige kwuru.

    "Iwu ahụ dị n'ụlọ omeiwu Naịjirịa agaghị akwụsịnwu onye ọbụla inweta ikike ọrụ dịka dọkịta. Ihe ahụ bụ iwu nke otu onye wepụtara n'aka onwe ya, ọ bụghị iwu nke ndị ọchịchị gọọmentị zigaara ndị omeiwu ka ha tụlee.

    "Akwụkwọ iwu ahụ, n'uche nke m, ọ bụghị ihe kwere omume. Malite n'isi mbido, akwadoghị m ya, agaghị m akwado ya.

    "Dịka m kwuru na mbụ, ọ dịka iji nnukwu anyụike akụgbu obere ijiji. Ọ bụrụ na ha bụ ndị omeiwu na-achọ ụzọ iji kwụsị etu ndị nwere ụbụrụ si agbapụ na Naịjirịa, ha chemie echiche chọta ụzọ ọzọ."

    Chetakwa na otu dị icheiche, nke gụnyere otu jikọrọ ndị dọkịta na Naịjirịa bụ Nigeria Medical Association, katọrọ iwu ahụ ma kwuo na ọ bụ ụzọ ndị omeiwu Naịjirịa ji chọọ ijigide ndị ọrụ ahụike dịka ohu n'obodo nke ha.

  18. Ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Turkey ga-abanye agba nke abụọ

    Ntuliaka ọkwa Onyeisiala na mba Turkey ga-abanye agba nke abụọ dịka onweghi onye meriri n'agba nke mbụ dịka iwu mba ahụ si dị.

    Onyeisiala Recep Tayyip Erdogan na Kemal Kilicdaroglu bụ ndị kacha nweta vootu dịka agba nke mbụ nke ntuliaka ahụ bịara n'isi njedebe.

    Erdogan nwetara pasentị vootu 49.51 ene Kilicdaroglu nwetara pasentị 44.88, mana iwu kwuru na tupu a kpọpụta onye ọbụla dịka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala, onye ahụ ga-enweta vootu karịrị pasentị 50 ma ọ bụghị otu a, ntuliaka ahụ ga-abanye agba nke abụọ.

    Agba nke abụọ nke ntuliaka a ga-abụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee, ya bụ n'izuụka abụọ na-abịanụ.

    Kilicdaroglu gwara ndị nkwado ya ka ha ghara ịda mba dịka ntuliaka a na-abanye agba nke abụọ.

    Onyeisiala Erdogan achịala mba Turkey ihe karịrị afọ 20, dịka ọ malitere ọchịchị ka Praịm Mịnịsta malite n'afọ 2003.

  19. Mba Amerịka amachiela ụfọdụ ndị Naịjirịa ịbata mba ha n'ihi agwa ọjọọ n'oge ntuliaka

    Ndị ọchịchị mba Amerịka ekwuola na ha enyela ụfọdụ ndị Naịjirịa ntaramahụhụ ma mchie ha ịbata n'Amerịka n'ihi agwa ọjọọ ha kpara n'oge ntuliaka.

    Antony Blinken, bụ odeakwụkwọ mba Amerịka kwuru nke a n'ehihie ụbọchị Mọnde site n'akara Twitter ya.

    "Anyị etinye mmachị inweta visa n'isi ụfọdụ ụmụ Naịjirịa bụ ndị kpara agwa buturu usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa n'oge ntuliaka 2023. Anyị ga-akwụdosi ike n'ịkwado atụmatụ niile ga-ewulite ọchịchị ponye kwuo uche ya na usoro ikpe ziri ezi."

    Mana ọtụtụ na-akatọ ozi a Blinken tinyere dịka ha na-ekwu na ọ dị mkpa ka a kpọpụta aha ndị ahụ e nyere ntaramahụhụ iji kụziere ndị ọzọ ihe.

    Cheta na n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị afọ a, ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa gwara gọọmentị Naịjirịa ka ha jichie ma kpụpụ n'ụlọikpe ndị niile kpara agwa ọbụla iji gbochie ndị mmadụ ịtụ vootu na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a dịka onyonyo na-efegharị na sosha midia gbasara etu ụfọdụ ndị ekperima si eji aka ike na mwakpo na-egbochi ndị mmadụ ịtụ vootu na steeti dị icheiche na Naịjirịa ọ kachasị na Legọs, Rivers Steeti, Kano Steeti na ebe ndị ọzọ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị, oge a na-eme ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti dị icheiche.

  20. Aka ndí uweojii akparala Seun Kuti maka ịma onye uweojii aka ntị

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs Steeti bụ Benjamin Hundeyin ekwuola na aka ha akparala otiegwu Seun Kuti, onye e boro ebubo iti onye uweojii ihe.

    Hundeyin kwuru na Seun Kuti ji aka ya bịa n'ụlọọrụ ndị uweojii n'ụtụtụ Mọnde a.

    Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba, nyeburu iwu a e jide Mazị Kuti dịka onyonyo pụtara na soshal midia nke gosiri ebe ọ mara onye uweojii aka ntị.

    Ọ bụ ihe megidere iwu na Naịjirịa ịkpaso onye ọrụ nchekwa ọbụla agwa ọjọọ, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa si kwuo.

    Amabeghị mgbe a ga-akpụpụ Seun Kuti ụlọikpe maka ebubo a.