Poopu Francis ekwuola na ‘ọ ka dị ndụ’

Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụnụ eteela ụra

    Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  2. Onye agha Naịjirịa egbuola ndị agha atọ, gbukwaa onwe ya

    Onyeagha Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Otu onye agha ji ọkwa 'Lance Corporal' aha ya bụ Nwobodo Chinonso, egbuola ndị otu ya atọ, nke gụnyere onyeisi ya, ma gbukwaa onwe ya.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si dee, ihe a mere n'ụbọchị Sọnde, ụbọchị ise nke ọnwa Maachị 2022, n'ụlọ obibi ndị agha na Rabah, Sokoto State.

    Ndị agha atọ ndị ọzọ nwụrụ na ọdachi ahụ bụ Sam Oladapo, bụ onyeisi ngalaba 'Forward Operating Base' na mpaghara Rabah; Iliyasu Inusa onye ji ọkwa 'Sergeant Major', na Attahiru Mohammed ji ọkwa 'Private'.

    Otu onye agha na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ọ bụ Chinonso na Oladapo nwere nghọtahie, Inusa na Mohammed wee bịa ikpeziri ha, ọ bụ dịka nrụrịtaụka a na-aga nihu ka Chinonso gbagburu ha atọ gbagbukwaa onwe ya.

    Eburula ozu mmadụ anọ ahụ gaa n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum Usman Dan Fodio na Sokoto.

    Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuru "e hibela otu nnyocha ga-eleba anya n'ọdachi onye agha gburu ndị otu ya ma gbukwaa onwe ya na Rabah, Sokoto Steeti".

    "Anyị amatabeghị kpọmkwem ihe kpatara nke a n'ihi na onye agha ahụ gbagbukwara onwe ya ozugbo, mana kọmiti nnyocha a ga-enye aka chọpụta ihe merenụ kpọmkwem iji gbochie ụdị ihe a ime ọzọ n'ọdịnihu."

  3. Ụtụtu ọma umu Igbo

    Daalụ nụ maka isonye anyị taa.

  4. Buhari agaala Qatar isonye n'ọgbakọ mba ndị na-emepe emepe

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency

    Nkọwa foto, Foto a bụ iji kọwaa akụkọ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari hapụrụ obodo ya bụ Daura n'ụbọchị Satọde gawa mba Qatar isonye n'ọgbakọnke otu United Nations na-ahazi maka mba ndị na-emepe emepe.

    Nke a bụ dịka ọnụ na-ekwuru Buharị bụ Garba Shehu si kwupụta n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Satọde.

    Ọgbakọ a nke a kpọrọ na bekee 'United Nations Conference on the Least Developed Countries' ga-adị na Doha, isi obodo Qatar, bido taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Maachị ruo ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị 2023.

    A na-enwe ọgbakọ a otu ugboro n'afọ iri iji nye mba dị icheiche na-emepe emepe ohere ka ha na mba ndị meperela emepe nwee mkparịtaụka maka etu ha ga-esi nyere ha aka iweta ọganihu na mmepe na mba ha dị icheiche.

    Garba Shehu kwuru na n'ọgbakọ ahụ, mba dị icheiche ga-atụle ihe ha na-eme iji weta ogbugbo maka ọdachi dị icheiche na-echere ha aka mgab dịka ụbịam, nchekwa ihe oriri, enweghị ezi ihe nrụpụta, enweghị ezi ọnọdụ ahụike, mgbanwe ihu eligwe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Buhari na ụfọdụ ndị Mịnịsta ya nakwa ndị isi gọọmentị ndị ọzọ so mee njem a, dịka ha na gọọmentị mba Qatar ga-enwe nkwekọrịta dị icheiche maka ọdịmma mba abụọ ahụ.

    Buhari ga-alọghachi na Naịjirịa n'ụbọchị Wenezde, abalị asatọ nke ọnwa Maachị 2023.

  5. Ndị omekome egbuola ndị ọrụ nchekwa atọ na Zamfara Steeti

    Eserese gosiri ndị ojiegbe

    Ndị ojiegbe awakpola isi ụlọorụ okpuru ọchịchị Maru dị na Zamfara Steeti, gbuo otu onye uweojii na mmadụ abụọ ọzọ.

    Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ mere mwakpo a n'abalị ụbọchị Satọde, mana Kazeem Raheem bụ onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii dị nso ebe ahụ kpọọrọ ndị otu ya ka ha ga buso ndị ojiegbe ahụ agha.

    Dịka ha na-akwakọrịta mgbọ, ndị ojiegba ahụ gbagburu Kazeem Raheem na otu onye uweojii aha ya bụ Rabiu Bagobiri na onye nche aha ya bụ Shehu Chuka.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Zamfara Steeti bụ Mohammed Shehu gwara ndị ntaakụkọ Channels na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu mana ha ka na-eme nnyocha.

    Otu n'ime ndị ọrụ n'okpuru ọchịchị ahụ kwuru na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ọtụtụ mmadụ na mwakpo ahụ, mana amabeghị kpọmkwem mmadụ ole a tọọrọ.

  6. Mbappe abụrụla onye kacha nye goolu na PSG kamgbe otu ahụ malitere

    Kylian Mbappe

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mbappe agafeela Edinson Cavani dịka onye kacha nye goolu n'otu bọọlụ PSG

    Kylian Mbappe dị naanị afọ 24 mana ike ọ na-akpa n'egwuregwu bọọlụ karịrị afọ ole ọ dị.

    N'abalị ụbọchị Satọde, n'asọmpi nke otu Paris St-Germain (PSG) na ndị Nantes gbara, ka Mbappe nyere goolu nke 201 iji bụrụ ọgba bọọlụ kacha nye goolu n'otu PSG kamgbe otu bọọlụ ahụ malitere.

    O nyere goolu a na ngwụcha asọmpi a iji gafee Edinson Cavani, ọgba bọọlụ mba Uruguay onye jibu ọkwa ahụ. PSG ji ọkpụ goolu anọ a satara abụọ wee merie ndị Nantes n'asọmpi nke abalị Satọde

    Mbappe si otu bọọlụ Monaco gafee PSG n'afọ 2017; ugbua o buliela iko Ligue 1 ugboro anọ ma bụrụkwa onye kacha nye goolu n'ime afọ anọ gara aga.

    O sorola mba ya bụ France ruo agba nke ikpeazụ n'asọmpi iko mba ụwa abụọ, bu nke France buru na 2018 ma gbaa ndị nke abụọ na 2022.

    Mbappe nyere goolu atọ n'agba nke ikpeazụ nke iko mba ụwa afọ 2022, mana Argentina mechara jiri penariti merie France iji bulie iko ahụ.

    N'afọ bọọlụ nke a, Mbappe enyelarị goolu 30 ma nwekwaa enyemaka goolu asatọ.

  7. Igbo mma mmanụ o!

    Onye biri,ibe ya biri.

    Ndụ mmiri, ndụ azụ.

  8. Ndị ọrịa Lassa Fever gburu n'afọ a eruola 104 - NCDC

    Oke na oke ọzọ

    Ebe foto si, Matthieu Aubry

    Ngalaba na-egbochi ọrịa na-efe efe bụ NCDC ekwuola na Lassa Fever egbuola mmadu otu narị na anọ na mpaghara Naịjirịa niile kemgbe afọ 2023 bidoro.

    N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha, ha kwuru na achọtara ọrịa ahụ n'ahụ mmadụ 636 bụ narị isii na iri atọ na isii n'otu oge ahụ.

    Ndekọ ha dị n'ime ozi ahụ gosikwara na ọ metụtara steeti iri na okpuruọchịchị iri abụọ na anọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. A tụọla Kem Sokha nke Cambodia mkpọrọ imeụlọ afọ 27 maka ịkpa nkata ịkwado gọọmentị

    Kem Sokha

    Ebe foto si, Getty Images

    A tụọla Kem Sokha, onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba na Cambodia mkpọrọ imeụlọ afọ 27 maka ebubo ịkpa nkata ịkwatụ gọọmentị mba ahụ.

    Sokha bụ bụ onye bụ onye ndu otu pati na anọghị na gọọment bụ ‘Cambodia National Rescue Party’ (CNRP) nke e kposalara.

    Ọkaikpe Koy Sao nyere iwu ka e gbochie Sokha ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla maọbụ ịtụ vootu na ntuliaka ọbụla.

    A nwụchiri Sokha n’afọ 2017 maka ebubo na ya na mba Amerịka na-akpa nkata ịkwatu Hun-Sen bụ onye chịarala Cambodia ihe ruru afọ 40(kemgbe afọ 1985) n’ọkwa.

    Mba Cambodia na-akwado ntuliaka n'ọnwa Juun afọ, a na-atụ anya na Hun Sen ga-apụta zọkwa ọkwa ọzọ.

    Sokha agọọla sị na ebubo ahụ e boro ya abụghị eziokwu.

    Ọkakiwu ya bụ Ang Udom kwuru na ịnapụ ya ikike dịka nwa amala nakwa ịtụ ya mkpọrọ imeụlọ “abụghị ikpemnkwụmọtọ”.

  10. Onye uweojii egbuola enyi ya nwaanyị, gbuo onwe ya,

    Otu onye uweojii agbagbuola enyi ya nwaanyị gbuo onwe ya.

    Olalere Michael, gbagburu enyi ya nwaanyị a kpọrọ Tosin n'ogige otu ụlọakwụkwọ n' Agba Dam Housing Estate, dị n' Ilorin Kwara Steeti n'ụtụtụ ụbọchị Tozde.

    Ndị nọ ebe ihe kwuru sịrị na onye uweojii ahụ na enyi ya nwaanyị nwere nghọtahie nke kpalitere ihe mere.

    Onye ji egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwoke uweojii ahụ jibu mma gaa n'ụlọ nke nwaanyị ịwakpoo ya mana o nwetaghị ya.

    Ọ gara n'ụlọakwụkwọ nwa enyi ya nwaanyị ahụ chebiri ya ma were egbe gbagbuo ya n'ụtụtụ Tozde ka ọ bịara ịkpọta nwa ya akwụkwọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kwara steeti bụ Okasanmi Ajayi, onye kwuru na ha ebụpụla ozu ha abụọ,kwuru na ta bụ ihe abụghị okwu metụtara ndị uweojii ịkpagbu ndị nkịtị, kama na ọ bụ nghọtahie dapụtara n'etiti nwoke na nwaanyị ya.

  11. A tụọla ọkaiwu gburu nwunye ya na nwa ha nga afọ 30

    Maagie, paul na Alex Murdaugh

    Ebe foto si, Maggie Murdaugh

    Otu onye ọkaiwu na mba Amerịka egbuola nwunye ya na nwa ha nwoke iji gbuchie mpụ metụtara ego o mere.

    A tụrụ Alex Murdaugh gbara afọ 54 mkpọrọ afọ 30 maka igbu nwunye ya bụ Maggie na nwa ha bụ Paul Murdaugh, na enweghị ohere ịrịọ mgbaghara .

    Nwa amadi ahụ gji egbe gbagbuo nwunye ya n’ụlọ ha n’abalị asaa nke ọnwa June afọ 2021.

    Ọkaikpe nọ n’isi ikpe ahụ e kpere na South Carolina kwuru sị,“ihe akaebe karịrị akarị.”

  12. Ngagharịiwe amalitela maka ihe mberede ụgbọoloko na Greece

    Ngagharị iwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe mberede ataala isi mmadụ 43 dịka ụgbọ oloko bụ mmadụ 350 na nke bu ngwahịa sukọtara isi n’abalị Tuzde na Larissa dị na mba Greece.

    Praim Minista mba ahụ bụ Kyriakos Mitsotakis kwuru na“ọ bụ ndahie nke mmadụ “ butere ya bụ ọdachi.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbatagbata ka na-agbalị ịzọpụta ndị ya bụ ihe mberede metụtara.

    A kpụpụla onyeisi na-elekọta ọdọ ụgbọloko ahụ ebe ya bụ ihe mere maka’igbu ọchụ dịka a na-ajụ ajụjụ etu ụgbọoloko abụọ siri gakọta.

    Mana nwoke sị na aka ya dị ọcha, na ọ ga-abụ ihe mebiri .

    Mana ka ọ gachara ebe ahụ, Mitsotakis sị na ihe nile na-arụ aka na ọ bụ “aka mere”ihe mere.

    Ọ gara n’ihu kwee nkwa na a ga-ekpe ikpe nkwụmọtọ, na“gọọmentị kwụnyere ọha ndị mmadụ.”

    Mịnịsta na-ahụ maka njem na mba ahụ agbala arụkwaghị n’ihi ihe mere sị, “Oke ihe mee, ọ gaghị ekwe omume ịgba nkịtị mee ka ọ bụ na o nweghị ihe mere.”

  13. Unu abọọla chi!

    Nnọọ n'ọnwa ọhụrụ

    Lee nke ndị na-akpọtụ na mbaụwa taa.