Poopu Francis ekwuola na ‘ọ ka dị ndụ’

Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Cash Scarcity: Gọọmentị, CBN na NLC enweela nzukọ iji zeere abụbụọrụ

    Chris Ngige, Godwin Emefiele na ndị NLC zutere maka okwu ụkọ ego

    Ebe foto si, Channels TV

    Gọọmentị etiti na ndị isi otu jikọrọ ndịọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress enweela ọgbakọ iji zeere abụbụ ọrụ ndị NLC sị na ha ga-agba ma ọ bụrụ na ụkọ ego ka na-aga n'ihu na Naịjirịa.

    Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige kpọrọ ọgbakọ a n'ụbọchị Mọnde n'Abuja, nke onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, na onyeisi ndị NLC bụ Joe Ajaero sonyere na ya.

    Ndị NLC zigaburu akwụkwọ ozi nye Ngige ma na-ekwu na ụkọ ego dị na Naịjirịa ugbua emetụtala ndị ọrụ n'ụzọ dị ukwu, ma dọọ aka na ntị na ọ bụrụ na CBN emeghị ka ndị ụlọakụ nwee ego ha ga na-enye ndị mmadụ, na ha ga-amalite abụbụọrụ.

    N'ọgbakọ ahụ, Emefiele, bụ onyeisi CBN kwuru na ha amalitelarị inye ndị ụlọakụ nnukwu ego ha ga na-akwụ ndị mmadụ iji belata ụkọ ego a.

    O kwukwara na ha nyere ụlọakụ dị icheiche iwu ka ha rụọ ọrụ n'ụbọchị Satọde nakwa Sọnde iji na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ.

    N'okwu nke ya, Ajaero bụ onyeisi NLC kwuru na afọ juru ha maka nkọwa Emefiele nyere ma kwuo ha agaghị agazi n'iru ịgba abụbụ ọrụ.

  2. Ekele ụtụtụ

    Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma o.

    Taa bụ Tuzde, ahịa Nkwọ.

    Ka ụbọchị taa maara onye ọbụla mma o.

  3. Mmadụ isii anwụọla na mwakpo mere n’otu ụlọakwụkwọ Nashville mba Amerịka

    Ụlọakwụkwọ dị na Nashville

    Ebe foto si, EPA-EFE/REX/ShutterstockCopyright

    Mmadụ isii nke mmadụ atọ n’ime ha bụ ụmụaka anwụọla na mwakp mere n’otu ụlọakwụkwọ prịamarị dị na Nashville nke mba Amerịka.

    Ndị uweojii kwuru na nwaada gbagburu ndị a dị afọ 28 dịka ha wụbatara ebe ahụ gbagbuo ya.

    Ya bụ nwaada bụ egbe abụọ nke otu n’ime ha bụ ụdịrị a na-akpọ ‘Assault riffle’ ebe nke ọzọ bụ ‘Handgun’.

    A na-eche na ya bụ nwaada gụburu n'ụlọakwụkwọ ahụ n'oge gara aga.

    E bugara ụmụaka atọ a ụlọọgwụ ebe e kwupụtara na ha anwụọla n’ezie.

    Ndị uweojii ewepụtabeghị aha nakwa afọ ole ụmụaka ndị a nwụrụ nakwa ndị ọzọ nwụrụ dị.

    Ụlọakwụkwọ a dị n’akụkụ Nashville mba ahụ bụ ụlọakwụkwọ okpukperechi Kraịst nke ụmụaka ndị dị afọ atọ ruo 11 na-aga.

    Onyeisiala Joe Biden ezipụtala ozi maka ihe a mere na kpọkuo ndị omeiwu mba ahu ka etinye anya n’okwu mwakpo si n’egbe ndị mmadụ si arị elu na mba ahụ ugbua.

    Ngụkọ otu ụlọọrụ na-ahụ maka okwu egbe bụ ‘Gun Violence Archive’ mere na-ekwu na mwakpo metụtara egbe 120 emeela na mba Amerịka n’afọ 2023 a.

  4. Etu ndị uweojii si nwụchie otu onye nche maka ebubo ịgbagbu mmadụ n'Abịa steeti

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Iwaria

    Ndị uweojii Abịa steeti ekwuola na ha nwụchiri otu nwoke onye otu nche n’Umuahia, Abịa steeti maka ebubo na aka ya dị n’ọnwụ otu nwoke obodo ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ha ji otu onye nche a na-enyo enyo maka ọnwụ otu nwaamadị ọzọ.

    Ka o si kwuo, ya bụ nwoke a na-enyo enyo dị afọ 48 ebe onye a sị ọ gbagburu dị afọ 29.

    O kwuru:

    “Ọ bụ ihe mwute, anyị anwụchịela ya dịka anyị napụrụ ya egbe a sị ọ gbara ya”

    “Anyị na-arịọ ọha ka ha nọrọ jụụ dịka anyị na-eme nnyocha n’okwu a”

    Akụkọ so ọnwụ nwaamadị a edochabeghi anya mana akụkọ na-ekwu na ya bụ nwaamadị e ji eji bụ onye otu nche Bakassi dịka onye nwụrụ na-arụ n’otu ụlọ ebe a na-ere nri n’Ụmụahịa isiobodo Abịa steeti.

    E kwuru na ya bụ nwoke gburu onye ọzo n’okwu ebubo izu ohi ekwentị mmadụ.

    Ka e si kwuo, ekwentị ahụ furu n’ụlọọrụ a ebe a na-ere nrị dịka ihe onyonyo nyotere na e nwereike ị bụ na nwaamadị ahụ agbagburu ma maka ekwentị ahụ furu efu.

    A kpọkuru ndị nche Bakassi, oge ịgba ajụjụ ọnụ, onye nche ahụ kwara nwaamadị ahụ na ọ ga-agba ya egbe, nke a sị o mechara gbaa ya n’ụkwụ nke mere o jiri gbaa ezigbo ọbara.

    E kwuru tupu e buga ya ụlọọgwụ na ọ nwụrụ.

  5. 'Ebubo na Ekwremadu riri ego achọrọ iji rụọ ụlọọgwụ bụ nnukwu ụgha'

    Ike Ekweremadu

    Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Instagram

    "Akụkọ na-efegharị na soshal midịa Naịjirịanke na-ekwu na omeiwu Ike Ekweremadu zuru ego dị nde naịra 400 nke e kwesịrị iji rụọ ụlọọgwụ na'Enugwu, bụ nuukwu ụgha si 'ala ala ọkụ mmụọ."

    Nke a bụ ozi si n'Aka Mazi Uche Anichukwu bụ onye enyemaka mgbasaozi Ekweremadu n'ụbọchị Mọnde, iji katọọ ndị na-ebo Ekweremadu ebubo ụgha ugbua ọ nọ na mkpọrọ na mba Briten.

    Akụkọ a nke BBC hụrụla mana amaghị ebe o si na-ekwu na Ekweremadu nwere ohere ịrụ ngalaba ebe a na-eleta akụrụ mmadụ n'ụlọgwụ mahadum Naịjirịa bụ 'University of Nigeria Teaching Hospital' (UNTH) Enugwu, mana kama ime nke a, o zuru nde naịra 400 gọọmentị wepụtara iji malite ya bụ ọrụ.

    Anichukwu kwuru na akụkọ ụgha a bụ nke ndị iro Ekweremadu na-ekesa "iji metọọ aha ọma ya n'oge a nnukwu ọdachi dakwasara ya na ndị ezinụlọ ya".

    Ọ jụrụ sị: "kedu ụdị ụlọọgwụ na-ahụ maka akụrụ nke enwereike iji nde naịra 400 wuo, tinye ngwaọrụ tekịnụzụ ọhụrụ n'ime ya ma nyekwa ndị ọrụ ahụike ga-arụ ebe ahụ ọzụzụ kwesịrị ekwesị?"

    "Ọ bụ ihe gosiri nnukwu obi ọjọọ na mmadụ ga na-ekesa akụkọ ọjọọ dị otu a ma na-ekwu na ọ bụ ihe Ekweremadu metara na-eso ya."

    "Ọ bụrụ na onye dere akụkọ a ma na ihe ọ na-ekwu bụ ezie, ọ gaara etinye aha ya n'akụkọ ahụ, tinye afọ kpọmkwem mgbe ya bụ ihe mere, tinye aha onye bụ onyeisi ụlọọgwụ UNTH n'afọ ahụ, tinye ihe akaebe gosiri ọba ego ebe ọ sị na a kwụnyere ego ahụ," ka Anichukwu kwuru.

  6. Mmekọrịta Amerịka na Afrịka dị anyị mkpa - Kamala Harris kwuru na Ghana

    Kamala Harris na mba Ghana

    Osote Onyeisiaa mba Amerịka bụ Kamala Harris nọ njem ugbua na mba Ghana dịka ọ na-eme njem na mba Afrịka dị icheiche nke ga-agụnye mba Tanzania na Zambia.

    Harris tụrụ ụkwụ na mba Ghana n'ụbọchị Sọnde, mana ya na onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo ga-enwe ọgbakọ taa bụ Mọnde.

    Nke a na-abịa dịka mba Amerịka, China nakwa Rọshịa na-agba mbọ iwulite mmekọrịta ha na mba Afrịka dị icheiche.

    Chetakwa na odeakwụkwọ gọọmentị Amerịka bụ Antony Blinken mekwara njem gaa mba Afrịka abụọ - Ethiopia na Niger - n'ọdị nso a.

    "Anyị ji njem a arụtụ aka n'ezi mmekọrịta enyi na enyi dị n'etiti ndị bi na mba Amerịka nakwa ndị Afrịka," Harris kwuru.

    "Ọ bụ nnukwu ihe nkwanye ugwu ịnọ ebe a na mba Ghana nakwa mpaghara Afrịka. Obi dị m ụto maka ọdịnihu Afrịka," ka Harris kwuru.

    Kamala Harris na mba Ghana
    Nkọwa foto, "Obi dị m ụtọ maka ọdịnihu Afrịka," Harris kwuru
    Kamala Harris na mba Ghana
  7. Ndị mmadụ amalitela ngagharịiwe n'Israel n'ihi ebubo ọchịchị aka ike Netanyahu

    Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Israel

    Ebe foto si, Reuters

    Ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ na-aga n'ihu ugbua na mba Israel n'ihi mgbanwe nke aka na-achị mba ahụ bụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu chọrọ itinye n'usoro ikpe na mba ahụ.

    Ihe kpatara ngagharịiwe nke a bụ ọchụchụ Netanyahu chụrụ Mịnịsta nchekwa mba Israel bụ Yoav Gallant, n'ihi na o kwuru okwu megide atụmatụ nhazigharị usoro ikpe ziri ezi na mba ahụ bụ nke Netanyahu chọrọ ime.

    Mgbanwe a Netanyahu na-achọ itinye ga-enye ndị omeiwu ikike ịkụchapụ mkpebi ụlọikpe kachasị na mba Israel, mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụrụ na nke a gaa n'ihu ọ pụtara na ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ anwụọla.

    Gallant kwuru na ọ dị mkpa ka Netanyahu gee ntị n'ihe ndị mmadụ na-ekwu ma hapụgodi mgbanwe ahụ ọ chọrọ ime, mana okwu ya mere ka Netanyahu chụọ ya n'ọrụ.

    N'ihi nke a ka ọtụtụ mmadụ ji malite ngagharịiwe ma na-ekwu na ha anabataghị ọchịchị aka ike Netanyahu nakwa etu o si chọọ ịgbanwe usoro iwu ISrael naanị maka ọdịmma nke onwe ya.

    Cheta na Netanyahu n'onwe ya nwere ebubo nrụrụaka nke ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe.

    Ngagharịiwe na mba Israel

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii ji egbe mmiri na ikuku ose chụsasịa ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ Netanyahu nakwa n'isi ụlọ omwieu mba Israel a na-akpọ Knesset.

    N'ụtụtụ Mọnde, onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ n'Israel bụ Arnon Bar-David, akpọọla oke ka ndịọrụ malite abụbụọrụ na-egbughị oge.

    Onyeisiala mba Israel bụ Isaac Herzog etinyekwala ọnụ kpọọ oku ka Netanyahu kwụsị mgbanwe ndị ahụ ọ chọrọ itinye n'usoro ikpe Israel.

  8. Ụtụtụ ọma

    Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi.

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

    Ka anyị malite.

  9. 'Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekesa okwu akpọmasị, kwụsịnụ ya ugbua' - DSS

    DSS

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngabala ndị uweojii pụrụiche bụ The Department of State Services (DSS) adọọla ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbaara nkesa okwu ikpọmasị ọsọ nakwa nkesa akụkọ ụgha nwereike ikpata ọgbaghara maọbụ nwereike itakọta isi ụmụafọ Naịjirịa na Onyeisiala Muhammadu Buhari maọbụkwanụ onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ Bola Tinubu ọnụ.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya zipụtara n’abalị Satọde o kwuru na ọgbaghara ndị na-achọ ịkpata tigbuo zọgbụ na-amụnye ọkụ ya ga-eregbukwa ha ma o suu.

    Ozi a so mkpesa minista ọrụ bụ Festus Keyamo na-ekwukwara APC kwetere ha banyere okwu na Peter Obi nke LP na osote ya jụrụ ịnabata nhọpụta Bola Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa.

    Afunanya kwuru na ha ma maka atụmatụ ụfọdụ na-eme ịhụ na ọgbaghara dapụtara na Naịjirịa ugbua ma kwuo “ndị a tigbuo zigbụọ na-agụ gbaa mbọ wepụ aka na ya.”

    “Cheta na ụlọọrụ anyị dụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọdụ ka ha rube isi n'iwu dịịrị okwu ma bugara ụlọikpọ mkpesa ha ma ọ bụrụ na a nwere akụkụ ntuliaka ha na-enyo enyo.”

    “Ọ bụ ihe doro anya na ụfọdụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi adịghị ma na-eso usoro ikpe a, nke a bụ ihe dị mma so usoro ọchịchị kwuo uche ya. Usoro bụ ihe anyị masịike ga-akwado udo nakwa nchekwa, ka ọha niile nabata nke a.”

    “Mana ka o dokwaa ọha anya na ụlọọrụ DSS agaghị anabata ndị mmadụ maọbụ otu ọbụla ịme ha sọrọ ha bụ nke ga-akpata ọgbaghara. Ndị niile na-ekesa okwu akpọmasị bụ ihe nwereike ikpata ọgbaghara mọabụ metụta ọchịchị a họpụtaara Naịjirịa maọbụ akụkụ ọchịchị nọ ugbua kwụsị ya ngwa ngwa.”

    "Ya mere, ndị ọrụ anyị jiaga n'ihu na-eme ihe ndị dị mkpa iji nyochaa ihe ndị mmadụ na-eme bụ nke na-achọghị ka mba anyị dị mma. Nke a bụ iji hụ na e nyere ụmụ amaala na ndị bi na gburugburu mba anyị ndụ dị mma nakwa ikike iga mkpa ha. Ka mmadụ niile nwere ire ya gụọ eze ha ọnụ.”

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Ndị uweojii egbochiela ụmụ nwaanyị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu otu onye n'Ebonyi Steeti.

    Nigerian Police

    Ebe foto si, Nigerian Police/Facebook

    Ụmụ nwaanyị egbochiela ndị mmadụ ígafe n'okporoụzọ díka ha mere ngagharịiwe maka ogbugbu ha sị ndị ọchi ehi gburu otu onye n'obodo Ishiagu nke dị n'okpuru ọchịchị Ivo nke dị n'Ebonyio steeti.

    Ọnụ na-akwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovewakpoyeya kwuru na ya bụ ngaghariiwe mere dịka ha nwetara mkpesa maka ya ma sịkwa na ndị uweojii gbochiri ha.

    O kwuru na ụmụ nwaanyị a ji ụkwụ ụgbọala ha mụnyere ọkụ na ihe ndị ọzọ mechie okporoụzọ eji eme njem dịka ha mebi kwara ụfọdụ ụgbọala.

    O kwukwara na ụmụ nwaanyị a kwadoro ịme ya bụ ngharịiwe ụbọchị asaa maka ogbugbu e kwuru ndị ọchie ehi na-egbu ndị mmadụ na mpaghara ha.

    Onovewakpoyeya kwuru sị, " ụmụ nwaanyị dịka ha mechichara okporoụzọ, gara na nke Eze obodo ha, gaa nke kọmịshọna mgbasaozi, ma mebie ụgbọala, okoko osisi na ihe ndị ọzọ. Ndị uweojii pụrụ iche gbochiri ha ịgba ụlo ndị nọ ebe ahụ ọkụ".

    Onovewakpoyeya kwukwara na ha ma ndị haziri ya bụ ntuliaka ma sị na akpọola ha ka ha na ndị uweojii nwee mkparịta ụka.

  11. Ihe ruru ndị njem sị Afrịka awụba Europe mmadụ 29 anwụọla n'ihe mberede ụgbọmmiri n'akụkụ Tunisia

    Ndị mba Afrịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe ruru ndị njem na-aga Europe mmadụ 29 anwụọla dịka ihe ruru opekatampe ụgbọmmiri abụọ kupuru n’akụkụ mmiri mba Tunisia.

    Akụkọ na-ekwu na dịka otu ụgbọmmiri buụzọ kpuo tupu nke ọzo ekpuo n’awa olemole so ya.

    Ndị njem a si akụkụ mpaghara Ọdịda anyanwụ Afrịka agafee oke osimiri Mediterrea iji ruo Italy mgbe ihe mberede a mere.

    Nke a so ụdịrị ihe mberede a metụtara ndị njem na-agafee akụkụ mmiri mba Tunisia nke ụgbọmmiri ha na-ekpu abalị olemole gara aga nke ise n’ime ha kpuru n’abalị anọ gara aga.

    Akụkọ ndị dị etu a so achụmnta ịchụpụ ndị mba Afrịka ndị na-ekweghị akwụkwọ ikike ibi na Tunisia gọọmentị mba ahụ na-eme ugbua.

    Ka nke a na-eme, gọọmentị Italy na-ekwu na aka ejula ha ịnabata ndị ọbịa dịka ihe na-emetubeghị mbụ mere n’abalị gara aga nke bụ na ndị ọbịa mmadụ 2500 si akụkụ mmiri wụbatara mba ahụ n’otu ụbọchị.

    Praịm minista mba ahụ bụ Giorgia Meloni a dọọla ndị mba Europe ka nantị na-ekwu na ha chee aka ghọrọ ọtụtụ ndị njem na-agbapụ mba ha awụbata mpaghara mba ndị nọ n’akụkụ mmiri ebe ahụ.

    Tunisia bịara bụrụ ebe nzọba ụkwụ ndị mba Afrịka na-achọ isi ụzọ mmiri wụba Europe dịka otu UN kwuru na ihe ruru ndị ọbịa mmadụ 12,000 wụbatara mba Italy n’afọ gara aga si akụkụ mmiri mba Tunisia wụbata.

    Agbanyeghị nke a, ndị nche n'ụsọ osimiri Tunisia na-ekwu na ha na-eme dịịrị ha iji kwụsị ngafe ndị na-njem mba ọzọ isi akụkụ mmiri ha agafee dịka ụlọ ntaakụlọ Reuters sị na ha kwuru na ha akwụsịla ihe dịka ụgbọ mmiri 80 na-aga Europe n'ime ụbọchị anọ gara aga.

    Cheta na na nso nso, n'okwu na-ese okwu nke Onyeisiala Tunisia kwuru, o boro ndị si akụkụ Ọdịda Anyawnụ Afrịka bi na mba ha ebubo na ha nọ n’isi mpụ na-eme ebe ahụ ma kọwaa ha ihe iyi egwu dịịrị ha.

    Ndị otu mba Afrịka katọrọ okwu Kais Saied kwuru dịka ọtụtụ otu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye kwuru na okwu ya bụ "okwu ịkpọasị agbụrụ".

  12. EndSars: Kwụọ ọkwọ ụgbọala ndị uweojii mekpara ahụ nde naịra ise ruru ya - Gọvanọ Sanwo-Olu

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Facebook

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti enyela iwu ka a kwụọ onye ọkwọ ụgboala aha ya bụ Adedotun Clementụgwọ iti aka n’obi maka etu ndị uweojii steeti ahụ siri meekpa ya ahụ n’ụbọchị emume ncheta ngagharịiwe EndSars nke mbụ na Ọktọba 20, 2021.

    Ihe a mere n’akụkụ ogige Lekki Toll-gate Legọs steeti n’ụbọchị ahụ.

    Ụlọikpe ukwu steeti ahụ nyere iwu n’ebe mbido ọnwa Maachi 2023 ka gọọmentị steeti ahụ kwụọ nwoke ọkwọ ụgbọala ahụ ego ruru naịra nde ise iji tie ya aka n’obi.

    Ụlọikpe ahụ katọrọ mmekpa ahụ ndị uweojii steeti ahụ nyere ya nakwa nke ndị dakwasịrị n’isi ndị uweojii Naịjirịa.

    Cheta na ihe onyonyo gbara na soshal midia n’ụbọchị emume ahụ nke gosiri ebe ndị uweojii kpọpụtara nwoke onye ọkwọ ụgbọala ya n’ime ụgbọala ya, tie ya ihe, dọkaa ya akwa ma mekpa ya ahụ.

    Ya bụ nwoke kwuru na ọ pụtaghị isonye ndị ngagharịiwe kama ọ bu mmadụ si n’akụkụ Lekki ahụ na-aga akụkụ Mainland na Legọs ụbọchị mana ndị uweojii amalitela ịchụsa ndị ngagharịiwe ebe ahụ mgbe ọ nyefere ụgbọala ya ebe ahụ nke mere ha jiri mekpa ya ahụ.

    Ọkaikpe Ambrose Lewis-Allagoe kpere ikpe a kwuru na ihe ndị uweojii mere ụbọchị megidere ikike dịrị nwoke ahụ nakwa ugwu ya nke mere ha jiri nye gọọmentị iwu ịkwụ ya ego ahụ.

    N’ozi gọvanọ Sanwo-Lou kesara n’akara Twitter ya n’abalị Satọdee, o kwuru:

    “A natala m ozi banyere ikpe Clement Adedotun nakwa mkpebi ụlọikpe ugwu nyere n’okwu a, aghọtara m etu okwu ikpe nwereike isi metụta nwaamadị a”

    “Dịka m nyochachara ikpe Clement, enyela ọkaikpe gọọmentị Legọs iwu ka o kpọkuo ya ka a kwụọ ya ụgwọ a ụlọikpe nyere n’iwu ka a kwụọ ya”

    “Agbanyeghi na gọọmentị steeti a achọghị iso ụzọ mgbagha mpụtara ikpe a, a rịọla m ka e soro ihe ụlọikpe kwuru mana echiche ọha ndị maọdụ, ya mere m ji gwaa ọkaikpe gọọmentị ka o sonye mkpebi ụlọikpe a.”

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Oladipo Diya, bụbu osote onyeisiala Naịjirịa alaala mmụọ

    Oladipo Diya

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Oladipo Diya oge ọ na-agba akaebe n'ọgbakọ 'Oputa Panel' n'ụbọchị isii nke ọnwa Disemba afọ 2000

    Donaldson Oladipo Diya, bụbu osote onyeisiala Naịjirịa n'oge ọchịchị ndị agha nke Sani Abacha bụ onyeisiala, alaala mmụọ.

    Akwụkwọ ozi si n'aka ndị ezinụlọ ya, nke otu nwa ya bụ Oyesinmilola Diya binyere aka na ya kwuru na Diya nwụrụ n'isi ụtụtụ taa bụ Sọnde, Maachị 26 2023.

    Ọ gbara afọ 79 tupu ọ nwụọ.

    Oladipo Diya rigoruru n'ọkwa Lieutenant General n'otu ndị agha Naịjirịa tupu ọ laa ezumike nka.

    Diya bụ osote Onyeisiala oge Abacha chịrị Naịjirịa malite n'afọ 1994 ruo 1997.

    E mechara jichie ya na 1997 n'ihi ebubo ịgba ọchịchị Naịjirịa mgba okpuru nke bekee kpọrọ Treason.

    A kpụpụrụ ya n'ụlọikpe ndị agha ebe a nọrọ maa ya ikpe ọnwụ ma tinye ya na mkpọrọ.

    Mana Abacha n'onwe ya nwụrụ tupu ụbọchị e kwuru na a ga-egbu Diya erute. Onye weere ọchịchị n'aka Abacha bụ Abdulsalami Abubakar kagburu ikpe ọnwụ a mara Diya ma tọhapụ ya na mkpọrọ.

    Diya rụkwara ọrụ dịka gọvanọ Ogun Steeti n'oge ọchịchị ndị agha malite n'afọ 1984 ruo 1985.

  14. Ọ bụ ezie na Iwuanyanwu kpọrọ ndị Yoruba 'Political Rascals'?

    Emmanuel Iwuanyanwu

    Ebe foto si, Channels TV

    Otu Ohaneze Ndigbo akatọọla akụkọ na-efesa na soshal midia ugbua nke na-ekwu na Emmanuel Iwuanyanwu, bụ onyeisi otu ndị okenye Ohaneze, kwuru na ndị si mpaghara Yoruba bụ 'political rascals'.

    Ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia kọwara akụkọ a na-efesa dịka "asị ọcha, nakwa akụkọ ndị aghụghọ ji achọ itinye ọgbaaghara n'etiti ndị Igbo na ndị Yoruba.

    Ogbonnia dere sị: "N'oge ọ na-ekwu okwu n'Awka n'ụbọchị Satọde (Maachị 25) n'emume iji cheta otu afọ gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo malitere ọchịchị, Chief Iwuanyanwu gwara onye ọbụla na ndị Igbo na ndị Yoruba anaghị ese okwu, ha anaghịkwa alụ ọgụ, nke pụtara na ha dị na mma."

    "Iwuanya kwuru sị, 'achọrọ m ịgwa ndị Igbo bi na Legọs na oneghị ọgụ dị n'etiti anyị na ndị Yoruba', o kwukwara na 'ndị wakporo ndị Igbo na Legọs n'ọdịnso a bụ ndị ekperima (rascals), ndị e kwesịrị ijichi',"

    "Mana ọ bụ okwu a ka ụfọdụ ndị aghụghọ tụgharịrị ma na-ekwu na Iwuanyanwu na-akpọ ndị Yoruba niile 'political rascals' ma kwukaa na anyị ga-aluso ha ọgụ.

    "Ndị na-ekesa akụkọ a bụ ndị aghụghọ jupụtara n'obi ha, ndị ọjọọ chọrọ itinye iro na asị n'etiti ndị si agbụrụ Igbo na ndị agbụrụ Yoruba."

    Ogbonnia gara n'ihu kọwaa eti ndị Igbo na ndị Yoruba si emekọrịta ka nwanne na nwanne, azụkọrịta ahịa, ma na-alụkọrịta di na nwunye kamgbe ọtụtụ ogologo afọ gara aga.

    Ọ gara n'ihu kwuo na otu Ohaneze Ndigbo agaghị ekwe ka mmadụ ọbụla were anya agbụrụ na-ahụta ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ a.

    "Asiwaju Bola Ahmed Tinubu nke pati All Progressives Congress (APC) na Alhaji Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) nwetachara nkwado n'aka ọtụtụ ụmụ Igbo a ma ama," Ogbonnia kwuru.

    "N'otu aka ahụ kwa, o doro anya na mpụta Peter Obi pụtara ịzọ ọkwa Onyeisiala nwetakwara nkwado site n'aka ụmụ Naịjirịa si agbụrụ, nakwa okwukwe dị icheiche."

    Nke a pụtara, Ogbonnia na-ekwu, na onweghị esemokwu maọbụ ịkpa oke ọbụla dị n'etiti ndị Igbo na ndị Yoruba, maọbụ agbụrụ ọbụla na Naịjirịa.

  15. Ọchịchị kwesịrị Soludo bụ na gọọmentị etiti maọbụ mba ụwa - Olusegun Obasanjo

    Olusegun Obasanjo na Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Anambra Govt

    Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etoola gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo maka mbọ ọ gbarala n'ime otu afọ o ji were ọchịchị dịka gọvanọ.

    Obasanjo nyere otuto a n'emume a haziri n'ụbọchị Satọde iji cheta ụbọchị 365 Soludo malitere ịchị Anambra, ma kwuo na "ọchịchị steeti Soludo na-achị ugbua bụ iji mụtachaa ọrụ nke ọma, maka na ihe kwesịrị ya bụ ọchịchị gọọmentị etiti".

    N'okwu ya, Obasanjo sị na ya na Soludo rụrụ ọrụ nke ọma oge Soludo bụ onye ndụmọdụ ya n'okwu gbasara aakụnụba oge ya bụ onyeisiala.

    "Onweghị mgbe o nyere m ndụmọdụ ọjọọ, kama otu, ọ bụ ya mere m ji ziga ya ka ọ bụrụ onyeisi ụlọakụ etiti," Obasanjo kwuru.

    "Soludo na Ngozi Okonjo-Iweala bụ mmadụ abụọ m ga-asị na ha bụ nhọpụta kacha mma m mere dịka onyeisiala Naịjirịa."

    "Oge mbụ Soludo bịara gwa m na ya na-achọ ịbụ gọvanọ, enyeghị m ya nkwado. Agwara m ya na o kwesịrị ị na-eche echiche maka ịrụrụ Naịjirịa niile ọrụ maọbụ mba ụwa.

    "N'oge ahụ, ihe m mabu maka ọchịchị Anambra Steeti bụ ije Ngige na Chris Uba. Agwara m Soludo n'oge ahụ na ọ bụ ụdị ihe a ga na-eme ma ọ bụrụ na ndị bụ ezigbo mmadụ dịka ya onwe ya abanyeghị n'ọchịchị.

    "Oge m gwara ya na iwe ya na-ewe m maka na ọ chọrọ ịga zọọ ọchịchị steeti, o chetaara m ihe m gwaburu ya na ọ bụ ndị dịka ya kwesịrị ịbanye ma dozie ọchịchị.

    "Ya mere m ji sị ya gaa n'ihu, mana ya echefukwala na ọrụ gọvanọ bụ iji cheretụ oge, akwadoola m gị maka ọrụ Naịjirịa niile."

    Obasanjo kwuru na site n'ihe ndị ọ hụrụla, na Soludo emechughị ya ihu, o mechughịkwa ndị Anambra steeti ihu.

    "Ọ bụrụ na i mechaa nke a, bido chewe echiche maka ọrụ ị ga-arụrụ Naịjirịa niile, maọbụ mba ụwa," Obasanjo kwuru.

  16. Ndị nwụrụ n'ihe mberede oke ikuku na Mississippi eruola 26

    Ajọ ikuku na Mississippi, Amerịka

    Ebe foto si, Reuters

    Mmadụ 26 ka a ma nwụrụla ugbua n'ihe ọdachị oke ifufe nke mere na steeti Mississippi nke mba Amerịka n'abalị Fraịde, Maachị 24 banye ụtụtụ Satọde, Maachị 25.

    Ka ọ dị ugbua gọọmentị steeti Mississippi etinyela ọnọdụ gbatagbata na steeti ahụ niile n'ihi ya bụ ọdachi.

    Onye ntaakụkọ BBC gara na mpaghara ahụ hụrụ etu ikuku ọjọọ ahụ si kurie ụlọ, ụgbọala, nakwa ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji ebi ndụ.

    Ọtụtụ ndị ya bụ ọdachi metụtara nọzị ugbua n'ụlọ enyemaka gọọmentị wepụtara ebe ndị mmadụ ga-ebigodu tupu ha arụzie ụlọ nke ha.

    Otu onye kọọrọ BBC na ikuku ọjọọ ahụ malitere n'abalị oge ndị mmadụ na-arahụ ụra.

    "Ọ bụ ụda ikuku ahụ kpọtere m n'ụra, m wee mepee 'window' m lepụ anya n'ezi wee hụ mkpamkpa na-akpanụ. Oge ahụ ka m ji ọsọ gbaba n'ebe a na-asa ahụ ma zoo onwe m n'ime 'bath tub'. Ebe ahụ ka m nọ ruo mgbe ikuku ọjọọ ahụ kuchara," nwa amadi aha ya bụ Francisco McKnight kwuru.

    Ọ sị na ikuku ọjọ ahụụ kuru ihe dịka nkeji asatọ ruo nkeji iri, mana ihe ọ lara n'iyi karịrị akarị.

  17. Ekele ụtụtụ

    Igbo daalụkwanụ o.

    Onye foro chi ya kelee Olisa.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.

  18. Anyị anwuchiela mmadụ ise na-agba mgbere mmanụ agbịdị nke megidere iwu - NSCDC

    Ndị a na-ebo ebubo ire mmanụ agbịdị nke dara iwu

    Ebe foto si, NSCDC Imo State

    Ngalab Nigerian Securities and Civil Defence Corps (NSCDC) nke Abia Steeti ekwuola na ha ejidela mmadụ isii na-agba mgbere mmanụ agbidi n'ụzọ ezịghị ezi.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke Paul Igwebuike bụ onyeisi ngalaba a n'Abia Steeti wepụtara ka o kwuru nke a ma sị na ha nwuchịrị ndị a n'ụbọchị 24 nke ọnwa maachị n' Iheome, Uratta, Aba, Abia State.

    Ebe e dowere udu mmanụ agbidi

    Ebe foto si, NSCDC Imo State

    Igwebuike kwuru na ha napụtara ndị a otu gwongworo na udu iri abụọ na anọ ha chere na ọ bụ mmanụ agbidi nọ n'ime ya.

    O bụ dịka ha gosiri ndị ntaakụkọ ndị a ha jidere ka ha kwuru ihe ndị a ma sị kwa na ha meecha nyocha ha na ha ga-akpụpụ ha ụloikpe.

    Ebe e dowere udu mmanụ agbidi

    Ebe foto si, NSCDC Imo State

    Ebe e dowere udu mmanụ agbidi

    Ebe foto si, NSCDC Imo State

  19. Oke ikuku egbuola ihe ruru mmadụ 23 na Mississippi, dị na mba Amerịka.

    ụlọ oke ikuku mebiri

    Ndị bi na steeti Mississippi nke mba Amerịka nọ na gbagharịa dịka oke ikuku bidoro kuwe n'abali fride ma gbuo ihe dịka mmadụ iri abụọ na atọ.

    Eldridge Walker bụ onye ọchịchị obodo Rolling Fork gwara ndị CNN sị, " Oke ikuku a ekpochapụla obodo anyị, kama anyị siri ike, anyị ga-arụgharị obodo anyị".

    Walker kwukwara na ọtụtụ ndị ka tọrọ n'ụlọ ha ebe enwerela ndị a kpọorọ gawa ụlọọgwụ.

    O kwukwara na oke ikuku a ebidola ịwakpo ha tupu ha anụta ozi na oke ikuku a ga-awakpo ha.

  20. Ihe gọọmentị etiti na-ekwu maka atụmatụ inyefe Tinubu ọchịchị

    Tinubu na Buhari

    Ebe foto si, Gọọmentị Etiti Naijirịa

    Gọọmentị etiti Naịjirịa akụchapụla akụkọ ndị na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari achọghị enyefe onye a họpụtara ka ọ chịa Naịjirịa bụ Bola Tinubu ọchịchị n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu kwuru na ehibelari otu ga-ahụ maka nnyefe ochịchị dịka o kwuru:

    “Gọọmentị etiti na-akagbuo akụkụ ụgha ma na akatọ ya bụ akụkọ na-efeagharị nke na-ekwu okwu onyeisiala Muhammadu Buhari ekwughi.”

    “Kedụ ka mmadụ ga-esi gbaa mbọ sonye onye ọzọ achụmnta vootu, tụnyere onye ahụ vootu ma sị na ị gaghị enyefe onye ahụ ọchịchị?”

    Shehu kwuru na ụlọntakụkọ kesara akụkọ ahụ bụ ‘ndị ekwesịrị imere ebere’ ma kwuo na ndị nwee ya ‘na-akwudoro otu pati bụ nke na-enweteghi mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala.’

    O boro ebubo na kama ya bụ ụlọakwụkwọ ka ike akụkọ ndị dị mkpa na ọ bụ naanị akụkọ ụgha ka ha ma ekesa.

    “Gọọmentị a abanyela n’agba nyefe ọchịchị. E hibela kọmịtịị maka nke a bụ nke gụnyere ụfọdụ ndị nọ n’ọchịchị ugbua nakwa ụfọdụ ndị a họpụtara ịchị n’okpuru Tinubu/Shettima.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị obodo Buhari bụ ndị Daura amalitela ime ihe nkwadobe inbata ya maka “ọchịchị rijuru afọ nke ọ chịrị Naịjirịa n’afọ asatọ gara aga.”

    O kwukwara na onyeisiala Buhari adịla njikere ịla bee ya gaa ezumike nke a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post