A ga-eli Christian Atsu nwụrụ na Turkey taa

Ebe foto si, Getty Images
Christian Atsu bụbu ọgba bọọlụ mba Ghana nwụrụ n'alaọmajijiji mere na Turkey n'izu ole na ole gara aga ga-anakpu n'ala na mba ya taa.
A chọtara ozu n'ebe ọtụtụ ụlọ gụnyere nke ya dara na mpaghara ndida Turkey. Ọ na-agbaburu otu Hatayspor mba ahụ bọọlụ tupu nke a e mee.
Akwamozu ya nke gọọmentị mba Gana so were hazi ga-aga n'ihu n'isiobodo ha bụ Accra n'ụbọchị Fraịde.
Nwunye Atsu, ụmụ ya nakwa eji ma ya akwanyerela ya ugwu ikpeazụ na soshal midia.
Atsu dị afọ 31 tupu ọ nwụọ gbarala mba ya bọọlụ ihe karịrị ugboro iri na isii ma gbakwuoro otu Everton nakwa Newcastle nke mba Ingland.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post






















