Ihe gọọmentị Legọs kwuru a ga-eme ọkwọ ụgbọala ahụ ụgbọoloko kụrụ na steeti ahụ

Gọọmentị Legọs steeti ekwuola okwu banyere ihe mberede mere na steeti na mbido ọnwa a oge otu ụgbọala na ụgbọoloko kpọkatara isi ọnụ.
Ozi si n’aka ngalaba mgbasaozi nke ministri ikpe Legọs n’abalị Fraịdee, ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị kwuru na dịka a nwụchịchara ọkwọ ụgbọala ahụ nke e kwuru na-ekweghi rubere ndị uweojii isi mgbe ha sị ya agafeela ebe okporo ụgbọoloko ahụ, nnyocha ha gosiri na ikpe amaghi ama gbuo ndị mmadụ nakwa mmadụ ịma ụma merụọ onwe ya ahụ dakwasịrị ya n’isi.
Ebubo 10 metụtara nke a nke megide akụkụ akara iwu Legọs nke 224 na 225 bụ ihe eboro nwoke ọkwọ ụgbọala hụ.
E kwuru na ọ ga-abịa zara ọnụ ya n’ụlọikpe ukwu Legọs ma ọ gbakeechaa n’ahụ ndị ọ merụrụ site n’ihe mberede ahụ mere.
Cheta na ngụkọ so ihe mberede a gosiri na mmadụ 96 merụrụ ahụ ebe mmadụ isii lara mmụọ oge ụgbọoloko ahụ kụrụ ya bụụgbọala bọọsụ n'okporo ụgbọoloko dị nso n'Ikeja Legọs n'ụbọchị Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Maachị 2023.
Otu n’ime ndị nwụrụ n’ime ihe mberede a bụ nwata nwaanyịna-efe ala Naịjirịa nke aha bụ AinaOreoluwa Juliana. Ndị ezinaụlọ nwaagbọghọ a dị afọ 27gwara BBC na ọnwụ ya tinyere ha n’ọnọdụ ịgba anya mmiri nke ukwu.
Na mkparịtaụka mama nnukwu Oreoluwa bụ Deaconess P.A. Aina na BBC nwer, o kwuru na Oreoluwa bụ nwa nwa ya nke mbụ ma bụrụkwa onye kacha akpachapụrụ ya anya.
"Ọ bụ nwa nwa m n'eziokwu, ọ na-akpachapụrụ m anya nke ọma, ọ na-aga ozi niile n'ụlọ a. Ọ bụrụ na m rịawa ọrịa, ọ bụ ya na-azụtara m ọgwụ, na-eleta m anya, kwụdebe m n'akụkụ, ọ naghị achọ ihe ọbụla ga-eme ka m taa ahụhụ.





























