Nnọọnụ na peeji anyị n'ụtụtụ a
Ndị Igbo unu abọọla chi?
Ka izu ụka ọhụrụ a maara anyị niile mma!
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.
Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi
Ndị Igbo unu abọọla chi?
Ka izu ụka ọhụrụ a maara anyị niile mma!
Opekete mpe a hụla ozu mmadụ iri n'obodo Unguwar Wakili nke dị n'okpuruọchịchị Zango Kataf, Kaduna Steeti dịka ndị omekome wakporo obodo a n'abalị Frịde.
Dịka o sirio dị, ndị ọchịchị ime obodo a etinyela iwu onyeapụtalaezi ruo awa 24 n'obodo Ungwan Juju, Mabuhu, Ungwan Wakili na Zango.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi nke osote onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi nke bụ Chris Ephraim, ebe ha kwuru na ya bụ iwu bụ ime ka ndị nchekwa weghachi udo nampaghara ahụ.
Kaduna so na otu n'ime steeti ndị nọ na mpaghara ugwu Naịjirịa nke ndị omekome na-enye oke nsogbu.
Puku kwuru pukue ndị mba Israel esonyela ihe ụfọdụ na-akpọ ngagharịiwe kacha ukwuu na mba ahụ kemgbe ụwa.
Ngagharịiwe a na-eme megide atụmatụ gọọmentị ihazighari usoro ọrụ ndị ikpe na-aga n'ihu kemgbe izu iri ugbua.
Ọtụtụ ndị ngagharịiwe awụpụtrala n'obodo dị iche iche dịka Haifa, ebe ihe ruru ndị mmadụ dịka 200,000 awụchiela okporoụzọ obodo Tel Aviv.
Ndị na-akatọ atụmatụ gọọmentị a na-ekwu na mgbanwe a na-ezube ime ga-emetụta ọchịchị onye kwuo uche ya n’ụzọ ọjọọ ebe ahụ.
Mana gọọmentị Benjamin Netanyahu na-ekwu na mgbanwe a na-achọ ime ga-adịrị usoro ọchịchị onye kwuo uche ya mma ọkachasị n’okwu gbasara usoro ntuliaka.
Ndị nhazi ngagharịiwe a kwuru na ihe ruru ndị ngagarịiwe mmadụ bụ ndị na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya ebe ahụ wụchịrị okporoụzọ dị iche iche na mba ahụ n’ụbọchị Satọde, nke bụ ihe akwụkwọ akụkọ uwa mba ahụ bụ Haaretz kpọrọ "ngagharịiwe kachasị ibe ya kemgbe ụwa na Israel".
Onyendu otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị n’ọchịchị bụ Yair Lapid gwara igwe mmadụ n’akụkụ obodo Be'er Sheva na mba ahụ na ọ chere na mba ahụ adanyela n’ọnọdụ "nsogbu kachasị ukwuu”
O kwuru:
"Oke ihe iyi ndụ egwu jụpụtara ebe a, akụnaụba anyị na-adatu, ego na-agbanarị mba anyị. Mba Iran na Saudi Arabia bịanyere aka na nkwekọrịta ọhụrụ ụnyaahụ. Mana naanị ihe gọọmentị a na-eche bụ atụmatụ ịkụda ọchịchị onye kwuo uche Israel, "
Tamir Guytsabry, onye ngagharị iwe na Tel Aviv, gwara Reuters: "Ọ bụghị mgbanwe ikpe. Ọ bụ mgbanwe na-eme ka Israel gaa n'ọchịchị aka ike zuru oke na achọrọ m ka Israel nọrọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya maka ụmụ m."
Atụmatụ mgbanwe ndị a na-achọ inye ndị ọchịchị ahọpụtara ikike na nhọrọ ndị ọkaikpe ma belata ikike nke Ụlọikpe Kachasị ime mkpebi megide ndị ọchịchị maọbụ ịkụchapụ iwu ndị ụlọomeiwu.
Okwu a ebutela nkewa miri emi na mba Israel, nke pụtara ihe ugbua dịka ụfọdụ otu ndị agha – na-akwupụta atụmatụ ha ịjụ isonyezi ndịagha mba ahụ dịka ụzọ isi gosipụta iwu ha nye gọọmentị.
N’ụbochị Mọnde, iji gosi iwe ha, ọtụtụ ndịagha elu mba Israel kwuru na ha esonye ọzụzụ nke ụbọchị ahụ mana ha mechara gbanwee uche ha wee kweta isonye dịka ha na ndị ọchịagha ha nwere mkparịtaụka.
Li Qiang onye onyeisiala mba Chaịna bụ Xi Jinping họpụtara ka ọ bụrụ onye ọchichị mba ahụ emeriala ntụliaka dịka ndị patị National Peoples Congress nke ruru mmadụ 2,900 họpụtara ya ọzọkwana ntụliaka imeụlọ ha mere.
Li ugbua abụrụla onye ka abụọ kacha nwee ike ọchịchị dịka iwu mba Chaịna siri dị.
Li Qiang onye dị afọ 65 ga-anọchị Li Keqiang.
Ndị uweoji nke Zamfara Steewti ekwuoa na ha azọpụtala mmadụ iri na anọ bụ ndị a tọọrọ ma nọrọ n'aka ndị ntọ ụbọchị iri isii na asatọ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii a bụ Mohammed Shehu kwuru na ọ bụ n'ọhịa nke Munhaye ka ha zọpụtara ndị a.
O kwuru sị, "Ọ bụ mbọ anyị gbara mgbe anyị wakporo ogige ndị ntọ a ka anyị zọpụtara mmadụ 14 nke gụnyere ụmụ nwoke abụọ, ụmụ nwaanyị asaa na ụjmụ aka ise".
O kwurun na ọ bụ ndịa ha zọpụtara gwara ha na ndị a tọọrọ ha n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.
Otu ụlọọrụ na-achịkwa ụlọakụ mba Amerịka emechiela ụlọakụ ‘Silicon Valley Bank (SVB)’ wee weghara ọrụ nlekọta nkwụnye ego ndị mmadụ n’ụlọakụ ahụ dịka ịkpụ afọ n’ala kasị ukwuu mere n’ụlọakụ ahụ bụ nke na-emebehi n’ụlọakụ mba Amerịka kemgbe 2008.
Nke a mere dịka ụlọakụ ahụ bụ ụlọakụ na-agbazinye ndị mmadụ ego site n’ụzọ teknụzụ malitere na-achọsiike inweta ego iji kwughachite ego furu ha n’aka site n’ire akụ nke bịara dịka ihe na-agaghị achịtara ha aja.
Nsogbu a kpalitere ụjọ n’ime ndị mmadụ nke mere ha jiri malite na-ewepụ ego ha n’ike n’ike n’ihi akụkọ ụlọakụ ahụ nọ.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ha mere njichi ụlọakụ ngwa ngwa iji “chekwaa ego ndị mmadụ nkwunyerela n’aka ụlọakụ ahụ.”
Ụlọakụ ‘Silicon Valley Bank’ danyere n’ọnọdụ dịka ‘enweghi ego zuruoke iruzu ọrụ’ ndị na-ahụ maka ụlọakụ na mpaghara California, bụ ebe ụlọakụ ahụ nwere isi ụlọọrụ ha, zipụtara ozi na ha iwegharala isi ọrụ ụlọakụ ahụ.
Ngalaba ‘Federal Deposit Insurance Corporation (FDIC)’, bụ ụlọọrụ na-echebekarị nkwụnye ego ruru $250,000, kwuru na ha amalitela ịhụ maka ihe ruru ijeri $175 (£ 145bn) bụ ego ndị mmadụ kwụnyere n’ụlọakụ bụ nke iri na isii kachasị na mba Amerịka.
E kwuru n’ụlọakụ ndị a ga-emepe ọzọ dịka ndị mmadụ ga-enwekwaike ikwụnye ego ha ọzọ "n’ụbọchị n’agaghị agafe ụtụtụ Mọnde", dịka a gbakwụnye na ego ndị a ga-enweta site na ire akụ ụlọakụ a ga-agara ndị dobere ego ha n’aka ụlọakụ a ugbua.
Otu Ohaneze na Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike enweela nzụkọ maka akụkọ na-ekwu na ọ mere nrụrụka ntụliaka megide Peter Obi onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
Nke a sitere n'akwụkwọ ozi nke Chiedozie Alex Ogbonnia bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị otu a kwuru na ya bụ nzụkọ jụọ sị, " Kedụ etu onye Ikwere ga-esi megide Peter Obi".
Ogbonnia gwara Wike sị, "Mara na obi ndị Igbo n'ụwa niile adịghị mma ebe Wike nọ ọkachasị maka ebubo nke na-fegharị na ịntanetị na ọ mere nrụrụaka oge ntụliaka megide Peter Obi".
Ha dere na ọ bụ ebubo ndị a mere Ohaneze jiri sị ka ha na ya nwee nzụkọ.
N'aka nke ọzọ ka Wike kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na ndị Ohaneze bịara njem nchọpụta.
Wike kọwara na ndị gọvanọ ndịda Naịjirịa nwere nzụkọ ebe ha kpebiri na ọchịchị Naịjirịa ga-alọhachi na mpaghara ndịda Naịjirịa.
O kwuru sị, "Na nzụkọ a niile, enweghị mgbe okwu na ọchịchị ga-aga mpaghara ọwụwa anyanwụ jiri pụta ihe".
Wike gosiri nwute ya na e nwere ndị si mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ ndị kwadoro ma tụnyere onye si mpaghara ugwu oge PDP mere ntụliaka ime ụlọ ha.
O gara n'ihu sị, "Na ihe niile m mere maka ntụliaka 2023 bụ mkpebi uche obi m. E nwere mgbe ndị Ohaneze gwara ya ka ọ kwado Peter Obi? A dị m njịkere ịkwado ihe m mere oge ọbụla, anaghị m asị asị enweghị kwa onye m mejọrọ m ga-arịọ mgbaghara...e nweghị nrụrụaka ntụliaka ọbụla m mere megide Peter Obi".
Onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka njem ụgbọoloko na Legọs bụ Yetunde Longe ekwuola na ha ga-eme nnyocha ụbụrụ onye ọkwọụgbọala bọọsu tinyere isi n’ụgbọloko kwọpịara mmadụ n’ụbọchị Tọzde.
Mmadụ isii nwụrụ ebe mmadụ 102 merụrụ ahụ n’ihe mberede ụgbọloko mere na Lefgọs ụbọchị Tozde ,dịka mịnịstry ahụike steeti ahụ si kwuo.
Longe, onye kwuru nke ọ ge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu kwuru na “Ọkwọụgbọala ahụ nọ n’aka anyị, anyị ga-enyefe ya ndị dọkịta ka e nyocha ya ụbụrụ n’ihi na otu onye nọ n’ụgbọala ahụ kwuru nah ọkwụsịghịka onye nọ n’ụgbọala ahụ gwara ya kwụsị kama o tiri onye ahụ mkpu n’isi.”
Kọmịshona ahụike steeti ahụ bụ Ọkammụta Akin Abayomi kwuru na e dobere ndị merụrụ ahụ n’isi nakwa n’obi n’ụlọọgwụ Lagos State Teaching Hosspital dị n’Ikehja, ebe e bugara ndị mmerụahụ ha dị obere ọnụọgụgụ ha dị 25 na ụlọọgwụ General họspịtal ise dị na steeti ahụ.
Ihe mberede dapụtara na PWD dị nso Shogunle dị na Legọs dịka ụgbọala bọọsụ bụ ndị ọrụ Legọs steeti aga ọrụ na ụgbọloko sukọtara isi n’ụtụtụ Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Maachị afọ 2023.
A gbagbuola mmadụ asaa n'ụlọ ọgbakọ ụka 'Jehovah Withness' na Hamburg dị na mba Jamini n'ụbọchị Tọzde, dịka ndị uweojii si kwuo.
Ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na mgbọ ahụ a wụrụ n'okporoụzọ Deelböge street dị na mpaghara 'Gross Borstel district' na mba ahu.
Ndị uweojii kwuru na ha hụrụ ozu otu onye ha na-eche na ọ bụ ya gbara egbe ahụ na ebe ya bụ ihe metrere.
Akụkọ an-ekwu na ndị uweojii gara n'ụlọ onye kpara mkpamkpa a dịka ha nwetara mkpesa maka ọnọdụ ụbụrụisi ya kama enweghị ihe siri ike ha hụrụ ha ga-eji napụ ya egbe ya.
Ya bụ nwoke aha ya bụ Philipp F dị afọ 35 nwere ikike ịnwe egbe nke iwu kwadoro.
Igbo ndị ọma, ndewoonụ o!
Otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye a kpọrọ 'Women Aid collective'(WACOL) agbarụọla ihu maka ihe ha kpọrọ,a"kpamoke megide ụmụnwaanyị" n' ọrụ teknuzu na iji intanet agbasa ozi.
N'ozi nke otua wepụtara iji mee ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị(March 8) nke onyeisi otu ahụ bụ Ọkammuta Joy Ezeilo binyere aka, ha kwuru na nke a mere ka ọnọdụ mkpachapụ ụmụnwaanyị n'ọrụ teknụzụ kawanye njọ.
Ezeilo siri, "Ụnwaanyị anọghị n'ọrụ teknuzu nke Bekee kpọrọ 'ICT dịka ọ kwesịrị."
"Ụmụnwoke ji nnukwu ọrụ n' ICT ji mgba iri karịa ụmụnwaanyị."
"Ịkpachapụ ụmụnwaanyị n'ọrụ teknuzu mere ka enweghị nhatanha ụmụnwaanyị na-agabiga kawanye njọ."
Ọ gara n'ihu kpoo oku ka ndị ọ dị n'aka mapụta amụma ga-enye aka hụ na ụmụnwaanyị na ụmụagbogho so n'ihe a na-eme na teknuzu nakwa iji intanet agbasa ozi.
O pekata mpe mmadụ isii anwụọla na ihe mberede okporoụzọ mere dịka ụgbọoloko kụrụ ụgbọala bọọsụ na Shogunle ,Legọs n'ụtụtụ taa bụ Tọzde, dịka onye ọrụ Gọọmenti si gwa onye ntaakụkọ anyị.
Ụgbọoloko na-aga aga suru ụgbọala bọọsụ nke Legọs steeti bụ ndị ọrụ aga ọrụ n'ebe Elekere asaa na ọkara nke ụtụtụ Tọzde.
E bugara nọtụtụ ndị merụụ ahụ n'ụlọọgwụ Gọọmenti steeti bụ ,Lagos State university Teaching Hospital,Ikeja.
Onyeisi ụlọọrụ gbagbata steeti ahụ bụ Oluwafemi Damilola Oke-Osanyitolu kwuru sị," Anyị nwetara ozu abụọ,a donyela ha n'ụlọozu."
"Anyị ebugala ndị merụrụ ahụ ụlọogwu. Dịka omenala gọọmentị steeti a si dị, a ga-eleta ha n'efu."
Ndị uweojii Ebonyi steeti kwuola na ha agbagbuola ndị omekome bu egbe mmadụ atọ dịka ha na ha kwara mgbọ n'Okpuru Ọchịchị Ivo dị n'Ebonyi steeti.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti bụ Onome Onovwakpoyeya kwuru na onyeisi Ogige ndị uweojii na mpaghara Ivo nwetara ozi gbatagbata na ndị bu egbe na-agbakasị egbe ma mụnyere ọdọ mmanụ ụgbọala nakwa ụgbọala abụọ ọkụ were gawa ebe ahụ.
Mana nd ị omekome ahụ chechiri ha nụzọ ma wakpoo ndị uweojii n' Ogwor dị n' Ishiagu gbaa otu onye uweojii welitere isi egbe( Assistant Superintendent of Police( a kpọghị aha ya) egbe..
"Ndị uweojii na ndị agboro ahụ kwarịtara mgbọ,, a gbagbo otu n'ime ha ndị ọzọ buru mgbọ n'ahụ ha gbalaga."
"DPO kpọrọ oku ka e sitere ya mmadụ, Kọmishona ndị uweojii bụ Faleye Sunday zigara ya mmadụ , ndị ha na ndị omekome ahụ kwarịtara mgbọ, agbagbuo mmadụ abụọ ma nwuchie abụọ ọzọ n'Osso Junction."
Ihe ndị uweojii nwetara n'aka ndị omekome ahụ gụnyere egbe AK-47 abụọ, otu egbe ọka, ọdaeshi, nakwa ụgbọalaToyota Corollna-acha ọbaraọbara, igwe na-enye ọkụ, otu igbe njụoyi Thermocool , igwe e ji ezirịta ozi( Walkie talkie), redio, mgbọ egbe, ekwentị abụọ, otu uwe na okpu ndị uweojii abụọ na ihe ndị ọzọ.
Tigbuo-zogbuo na-arị eru n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Gọọmenti Etiti na ndị uweojii na-arụ otu nwereonwe Biafra bụ Ipob aka na ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ahụ taarala isis ọtụtụ ndị mmadụ.
Mana ndị Ipob agọọla isi onwe ha ugboro ugboro ma boo ndị ọrụ nchekwa na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.
Dịka Ntuliaka 2023, e nwekwara gbuogbuo nke a na-arụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na-azọ ọkwa aka na ọ bụ ha nna-egbusịọ̀ị ndị ha na ha na-azọkọ ọkwa ọchịchị.
Mana o nwebeghị onye ndị uweojii nwụchiri maọbụ kpụpụ ụlọikpe maka ebubo ndị a.
Ihe mberede emeela na Legọs n'ụtụtụ taa bụ Tozde dịka ụgbọoloko na-aga aga na ụgbọala bọọsụ nke Legọs steeti bụ ndị ọrụ sukọtara isi na PWD dị nso Shogunle.
A mabeghị mmadụ ole nwụrụ na ya bụ ọdachị mana ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ, dịka ụlọọrụ gbatagbata steeti ahụ siri kwuo.
Otiegwu Naijiria a ma ama bụ TTiwa Savage so n'ụmụnwaanyị kara aka nwunye Eze mba Britan bụ Camila lere ọbịa dịka e mere ncheta ụmụnwaanyị n'ụwa ụnyaahụ bụ Wenezde n'obi ezee, bụ Buckingham Palace.
Savage, onye gbara ama n'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchị Tọzde giu okwu dị n'akwụkwọ nso nke kwuru, "onyinye onye na-akwara ya ụzọ, duga ya n'ihu ndị nnukwu mmadụ."
Abalị asatọ nke ọnwa Maachị bụ ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị n'ụwa n'ile.
Puku kwuru puku ụịmụnwaanyị mba Turkey kpọchiri ntị ha na mmachi a machiri ngagharịiwe wujuo ama ụbọchị Wenezde abalị asatọ nke ọnwa Maachị bụ ụchọchị ncheta ụmụnwaany, mee ngagharị n'isiobodo mba ahụ bụ Istanbul nke ha kpọrọ 'Ngaghari abalị maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị".
Ndị uweojii gbochiri ha irute n'ọgbọ 'Taksim Square' mana ha hapụtụụ ha nwa oge tupu ha jiri anwụrụ ose chụsasịa ha,
Ndị uweojii nwụchikwara ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ngagharịiwe ahụ.
Pati anọghị n'ọchịchị a kpọrọ 'Republican People's Party' wepụtara akwụkwọ nke kwuru na ụmụnwoke gburu ihe karịrị ụmụnwaanyị 600 naTurkey kemgbe 2021, oge Onyeisiala mba ahụ bụ Recep Tayyip Erdogan wepụtara mba ha na nkwekọrịta 'Istanbul Convention' bụ nke e mere iji belata tigbuo-zogbuo ezinaụlọ.
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari esila na Doha, isiobodo, Qatar bụ ebe ọ gara njem lọta n'ụtụtụ taa bụ Tọzde.
Onyeisiala Buharionye gara Qatar maka ọgba otu United Nation hiwere maka mba ndị emepeghị emepe a kpọrọ 'Least Developed Countries' (LDCs) na ụzọ a ga-esi mezue ebumnuche ịkwalite mba ha tupu afọ 2030 wuchiri na Daura,Katsina Steeti.
Ka ihe ọchị mere gị taa!
Ọkụ agbaala ụfọdụ mpaghara n'ahịa ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Olodi-Apapa dị n'Ajegunle, Legọs.
Ọkụ a malitere n'ebe elekere atọ na ọkara nke isi ụtụtụ taa bụ Wenezde, dịka Adeseye Margaret bụ onyeisi ngalaba Mgbanyụ Ọkụ nke Legọs Steeti si kwuo.
Adeseye kwuru na mgbe ndị ọrụ ha bịarutere n'ebe ahụ, ha hụrụ na nnukwu ọkụ na-agba n'ọtụtụ ụlọahịa ndị mmadụ, mana ha gbara mbọ ịgbanyụ ya bụ ọkụ ma gbochie ya ịbanye n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala nke dị n'akụkụ ahịa ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii hụkwara otu nwoke nwụrụ anwụ n'akụkụ ebe ọkụ a gbara, mana a hụrụ mmerụ ahụ si na mgbọegbe n'ahụ ya, onweghị ihe ọbụla gosiri na ọ bụ ọkụ gbagburu ya.
Adeseye kwuru na ọkụ ahụ yiri ihe a na-enyo enyo, mana ọ bụ nnyocha miri eme ga-ekwu kpọmkwem ihe kpatara ya, ụlọahịa ole o metụtara nakwa ngwaahịa ego ole lara n'iyi n'ime ha.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela ụmụnwaanyị Naịjirịa ụkpa ekele pụrụ iche, ma kwuo na "ọ bụ ihe m ji eme ọnụ na mụ na ọtụtụ ụmụnwaanyị bụ ọkaibe arụkọọla ọrụ".
Buhari kwuru nke a dịka taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị bụ ụbọchị nke otu 'United Nations' wepụtara iji cheta ma jaa ụmụnwaanyị ike n'ụwa niile, nke a na-akpọ 'International Women's Day' na bekee.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Femi Adesina, Buhari kwuru na mwulite na nkwalite ọdịmma ụmụnwaanyị bụ ihe dị oke mkpa n'ọchịchị ya.
"Onyeisiala na-eto ụmụnwaanyị Naịjirịa nke ukwuu maka mbọ ha na-agba nakwa ịdị uchu n'ọrụ nke ha na-egosi, dịka ha na-emepụta ihe a hụrụ anya na ngalaba ọbụla ha nọ n'ụwa niile," Adesina dere.
"Bido n'ụmụnwaanyị ndị na-arụsị ọrụ ike n'ubi ha kwa ụbọchị ịkọpụta ihe oriri anyịna-eri, ruo na ndị na-atụ mgbere ahịa ụbọchị niile n'ahịa anyị dị icheiche, wee ruo na ndị nke na-eme ihe dị ịtụnanya na ngalaba agụmakwụkwọ, egwuregwu, ahụike, nka, ịkpa obiọma, nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị, ebe ọnụọgụgụ ha ka dị nta."
"Ọ bụ ihe onyeisiala ji eme ọnụ na ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị bụ ọkaibe na Naịjirịa emekọọla ihe maọbụ rụkọọ ọrụ, ma ndị nọ n'ọchịchị ya, nakwa ndị nọ mba ofesi."
"N'agbanyeghị ọdachi niile ha na-ezute, ụmụnwaanyị ndị a emepụtala ihe gbara ọkpụrụkpụ n'obodo ebe ụmụnwoke jupụtara ebe niile."
Buhari kwuru na ya nwere ntụkwasị obi na ụmụnwaanyị Naịjirịa ga na-enweta ohere iji bie ndụ ha nke ọma, bụrụ ihe niile ha chọrọ ịbụ, ma tụnyekwa oke ha na mwulite obodo Naịjirịa.