You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Poopu Francis ekwuola na ‘ọ ka dị ndụ’

Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi

  1. A ga-eli Christian Atsu nwụrụ na Turkey taa

    Christian Atsu bụbu ọgba bọọlụ mba Ghana nwụrụ n'alaọmajijiji mere na Turkey n'izu ole na ole gara aga ga-anakpu n'ala na mba ya taa.

    A chọtara ozu n'ebe ọtụtụ ụlọ gụnyere nke ya dara na mpaghara ndida Turkey. Ọ na-agbaburu otu Hatayspor mba ahụ bọọlụ tupu nke a e mee.

    Akwamozu ya nke gọọmentị mba Gana so were hazi ga-aga n'ihu n'isiobodo ha bụ Accra n'ụbọchị Fraịde.

    Nwunye Atsu, ụmụ ya nakwa eji ma ya akwanyerela ya ugwu ikpeazụ na soshal midia.

    Atsu dị afọ 31 tupu ọ nwụọ gbarala mba ya bọọlụ ihe karịrị ugboro iri na isii ma gbakwuoro otu Everton nakwa Newcastle nke mba Ingland.

  2. Emere ngagharịiwe maka ikpe Ousmane Sonko na Senegal taa

    Ndị nchekwa ji ikuku ose chụsaa ndị na-eme ngagharịiwe na mba Senegal taa dịka Ousmane Sonko bịara ụlọikpe maka ebubo ịmetọ aha mịnịsta na-ahụ maka njem nlegharị anya bụ Mame Mbaye Niang.

    Ndị a na-eme ngaghariiwe gbara ụgbọala bụs atọ bụ nke ụlọọrụ Dakara Dem Dikk ọkụ.

    Ousmane Sonko kwuru na mkparịtaụka ya na ndị mgbasaozi nwere were sị na ngalaba IGE (General State Inspection) rụrụ onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ndị ntoroọbịa bụ Mame Mbaye Niang aka ma boo ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri CFA iri abụọ na itolu nke e kwesịrị iji rụọ ọrụ Community Agricultural Domain Program (PRODAC).

    Ya bụ okwu ka Niang na-ekwu na ọbụghị eziokwu.

    Sonko mechara kwugharịa sị na ọ bụ General Inspectorate of Finance boro Niang ebubo a.

    Ọ bụ ụbọchị 16 nke ọnwa maachi ka e hiwere ikpe a mana agụnyere ebubo abụọ ọzọ n'isi Sonko nke gụnyere mkparị n'ihu ọha na ịrụ ihe adigboroja.

    Nke a na-eme ya akwụkwọ abụọ agbarala n'isi dịka e boro ya ebubo mwakpo nwaanyị na iyi ndụ mmadụ egwu.

    Ousmane Sonko bụ onye kacha ama gọọmentị mba a nke onyeisiala ha bụ Macky Sall aka.

    Ahọpụtara ya dịka Mayo mpaghara Ziguinchor na ntuliaka afọ 2022.

  3. Klassị ụmụakwụkwọ nọ agụ akwụkwọ ezeela

    O pekata mpe ụmụaka 14 emerụọla ahụ dịka ụlọakwụkwọ dị na obodo Kwekwe na mba Zimbabwea zere.Ya bu ihe lotro tabulu na oche ha ji agụ akwukwọ ,ebe otu nwata akwụkwọ nwaanyị merụrụ nnukwu ahụ.

    Ụlọakụkwọ Globe and Phoenix school dị nso olulu abụọ ebe a na-egwupụta ọnatatarachi dị n'ime ala.

    Ndị isi okpuru ọchịchị ebe ihe mere boro ọdachi ahụ ndị na-egwu ọnatarachi na anataghị ikike gọọmentị.

    Ka ọ dị ugbua, a kwụsịla agụmakwụkwọ , ebe a nagba mbọ ịchọtara ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ ụlọakwụkwọ ọzọ.

  4. North Korea ezigala 'ballistic missile' na Japan

    Mba North Korea ezipụla ngwaọgụ osimbeagarambaozi nke Bekee kpọrọ ‘intercontinental ballistic missile’ (ICBM) gaa mba Japan ka ọ fọrọ awa ole na ole ka ndị ndu mba South Korea na ogbo ha ndị Japan nwee mkparịtaụka.

    Ndị ọrụ gọọmentị Japan nakwa nke South Korea ekwuola n’ezie na North Korea gbapụrụ igwe agha osimbaagarambaozi n’ụtụtụ Tozde.

    Ya bụ ngwa agha fere ihe ruru otu puku kilomita were daa na mmiri dị n’Ọdịọ̄a Anyanwụ Japan.

    Nke a bụ igwe agha nke anọ North-Korea na-ezipụ n’otu izuụka dịka mba Amerika nakwa South Korea napịkwa mbazụ nke ha ka ndị agha mmiri ha gbakọrọ aka na-eme anwansi e ji akwado ọgụ nke ha.

    North Korea ekwuola na anwansi ahụ na ọzụzụ ahụ ha na-eme bụ okwu ka ha na-achọ.

    A na-eche na igwe ballistic missile nke North Korea na-ezipụ aghara aghara ga-eso n’ihe onyeisisla mba South Korea bụ Yoon Suk Yeol na Praim Minista Japan bụ Fumio Kishida ga-akpa na Tokyo taa bụ Tọzde.

    N’afọ 2022, North Korea zipụrụ igwe osimbaaagarambaozi dị 90, nke bụ mbọ ọ na-ezipụ ụdị ruru ole ahụ n’otu afọ na-agbanyeghị ntaramahụhụ nke otu United Nation,European Union, mba Amerika na ndị agbata obi ya nyerela ha.

  5. Uranium dị tọọnụ abụọ na ọkara na-efu efu na Libya- UN

    Ngalaba otu United Nation a kpọrọ ‘International Atomic Energy Agency (IAEA)’ etiela mkpu na ọnatarachi uranium dị tọọnụ abụọ na ọkara na-efu efu n'ebe a na-edokwa ya na mba Libya.

    IAEA kwuru nke a oge ndị ọrụ nnyocha ha gachara nnyocha n' ebe ahụ ha akpọghị aha ya.

    Ha sịrị na ọ bụ uranium dị n' udu ‘drum’ iri.

    A na-atụ uche na uranium nwere ike ibute nsogbu kansa nakwa nsogbu nchekwa dịka e ji ya arụ ngwa agha nuklịa.

    N’ozi nke IAEA wepụtara, ngalaba ahụ kwuru na ha ga-aga n’ihu ilebanye anya n’ihe mere, ”iji mata etu ngwa nuklia ahụ si hapụ ebe ọ dịbu nakwa ebe ọ dị ugbua”.

    Ndị nnyocha kwesịburu ịga ebe uranium ahụ dị ugboro ugboro n’afọ gara aga(2022) mana ha higharịrị ya n’ihi ọgụ na-ada n’etiti ndị agha nnupuisi dị iche iche dị na Libya.

    IAEA gbara ama na ọdọ uranium ahụ dị na mpaghara ebe gọọmentị mba ahụ ji.

    Kemgbe a chụturu Colonel Muammar Gaddafi dịka onyeisiala Libya n’afọ 2011, mba ahụ enweela ọtụtụ nkewa otu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa otu ndị agha.

    Ka ọ dị ugbua, e nwere ọchịchị nwamgbeta ji ọgbọ n’ isiobodo mba ahu bụ Tripoli ma nwekwaa gọọmentị ọzọ ji ọchịchị n’Ọwụwa Anyanwụ mba ahụ.

  6. Ndewoonu o!

    Igbo, ndewoonu!

    Taa maara ụnụ nile mma!

  7. Ihe ruru mmadụ 225 anwụola n’oke ifufe ‘Storm Freddy’ mere na Malawi

    Ngụkọ ọnụọgụgụ ọhụrụ ndị nwụrụla n’oke ifufe mere na mba Malawi eruola 225 dịka ụlọọrụ gbatagbata mba ahụ si kwuo.

    Ifufe a bụrụla otu n’ime anọ merela n’akụkụ osimiri India ruo mpaghara Afrịka.

    Mbọ a na-agba ịgbapụta ndị mmadụ na mpaghara ndịda Malawi na-agazị n’ihu ugbua dịka mmiri ozuzo ebelatala ebe ahụ.

    Nke a enyela ndị ọru enyemaka na ndị gbatagbata awụchiela mpaghara ahụ njem so oke ifufe a kpọrọ ‘Tropical Storm Freddy’.

    Mịnịsta mgbasaozi mba ahụ gwara BBC na ụgbọelu helikopta na-efega n'ebe oke idemmiri so ifufa kewapụrụ ụzọ ha.

    Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu n’ihe ọdachị a dapụtara na mba a dịka ihe ruru mmadị 20,000 agbapụla be ha ma bụrụ ndị na-enweghi ebe obibi n’ihi oke ifufe a.

    Gọọmentị mba a ehibela ụlọ mgbapụta inye ndị na-enweghi ebe obibi ugbua dịka a na-ezigara ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ dịka uwa, ncha, akwa mkpuchi, nrị nakwa ihe ndị ọzọ.

    Taa bụ ụbọchị mbụ n’ime ọtụtụ ụbọchị ndị gara aga, mbara igwe nke akụkụ Blantyre bụ isiobodo mba ahụ derere duu.

    Nke a emeela ka ọrụ gbatagbata nweeike iji ụgbọelu malite ibuga ihe enyemaka n'ime obodo idemmiri kwekwapụrụ ụzọ nakwa akwụmmiri ha.

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi nke mba ahụ, Moses Kunkuyu, gwara BBC na ha ka na-achọkwa nkwado na enyemaka n’aka mba ndị agbata obi ha.

    Gọọmenti mba a ejirila nwayọọ nwayọọ na-eweghachi ọkụ latrịk na mmiri ọṅụṅụ.

    Ma ụzọ mgbake ka dị ogologo. A kpochapụla obodo niile na ọtụtụ puku ezinụlọ chụpụrụ, kpọchie n'ụlọ akwụkwọ na ogige nwa oge.

    Ndị ọchịchị agbatịla mmechi ụlọ akwụkwọ dị n'ọtụtụ mpaghara ruo na ngwụcha izu.

    Gọọmentị mba emechịela ọtụtụ ụlọakwụkwọ ruo ngwụcha izu a iji hụ na-echekwara ụmụakwụkwọ.

  8. Ọdeakwụkwọ mba Amerịka, Anthony Blinken atụọla ụkwụ n’Ethopia

    Odeakwụkwọ gọọmentị mba Amerịka bụ Anthony Blinken atụọla ụkwụ na mba Ethopia dịka ọ gara zute ndị isi ọchịchị mba ahụ na Addis Ababa bụ isi obodo mba ahụ.

    Njem o mere gaa ebe ahụ bụ maka ịhụ na esooro nkwekọrịta udo e mere oge agha mba ahụ kwụsịrị.

    A na-atụ anya na ọ ga-ezute ndị otu ndị ọrụ enyeamaka nakwa ndị ọrụ ikike dịịrị onye na mba ahụ ịma ihe ndị enyemaka ha ga-achọ.

    Cheta na agha dara na mba ahụ n’etiti gọọmentị ha na ndị ọchịchị mpaghara agbụrụ Tigray ndị nọọrọ ruo afọ abụọ.

    A na-eche na ndị nwụrụ n’agha a ruru mmadụ ọkara otu nde.

    Blinken ga-emekwa njem gaa mba Niger ma ọ gaacha Ethopia iji zute ndị ọchịchị mba ahụ maka ndịagha nnupụisi otu alakụba na-akpa ike n’akụkụ Ọdịda anyanwụ Afrịka.

  9. Etu Naịjirịa si kpọghachite ụmụnwaanyị 11 a chọrọ ire ere na Niger

    Gọọmentị Naijiria ezipụtala ozi na a chọtara ụmụnwaanyị 11 bụ ahụrụ n’aka ndị na-ere mmadụ dịka atụmatụ ibuba ndị a mba Libya kpụrụ afọ n’ala n'ọnụụzọ mba Niger.

    Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha akpọgharịchitela ndị Naịjrịa ọzọ.

    Ndị uweojii na-ahụ maka mgbochi orure ndị mmadụ kwuru na ha edobela ụmụnwaanyị ndị ahụ n'ebe nchekwa pụrụiche na Sokoto steeti kemgbe ngwụcha izuụka gara aga dịka ha na-agba mbọ ha ha zutere ndị ezinaụlọ ha n’udo.

    Ọtụtụ n'ime ndị ihe a metụtara si n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa dịka ndị uweojii si kwuo.

    Ndị uweojii kwukwara na ha na-eme nyocha imata kpọmkwem etu e ziri zuru ndị a.

    Ozi ha kpọkukwara ndị isi obodo si akụkụ Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Anyanwụ Naịjirịa ka ha chọọ ụzọ bịa mara ma ndị be ha eso na ndị ụmụnwaanyị ndị a.

    Mana ka ọ dị ugbua, ndị uweojii a chọpụtara na e zuuru ekwentị na ngwongwo ụmụnwaanyị ndị a na Niger ebe e zubere ire ha ma gbahapụrụ ha ebe ahụ, nke a mere ndị uweojii Niger ji gbapụta ha ma nyefee ha n'aka ndịọrụ mbata na ọpụpụ Naịjirịa nọ n’okeala ebe ahụ.

  10. Otu NLC akwụsịtula nwamgbenta abụbụọrụ ha na-agba n’Imo steeti

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ Naịjriịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ha ga-akwụsịtu abụbọ ọrụ ha na-agba n’Imo steeti nwamgbenta ruo izu abụọ.

    Ọ bụ Joe Ajaero bụ onyeisioche otu a na Naịjirịa gburugburu kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o zipụtara.

    Ozi ya kwuru na ha na-eme nke a n’ihi atụmatụ ụfọdụ ndị Naịjirịa a na-akwanyere ugwu bịa wetere ha maka iwu ha.

    Ọ gara n’ihu kọwa na ha na-eme nkwụsịtu a iji hụ na ndị Imo agaghị enwe ihe ọbụla gbochiri ha ịpụta tụọ vootu n’ụbọchị Satọdee a ga-eme ntuliaka ọkwa ndị omeiwu steeti ebe ahụ.

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọ bụ na izu abụọ gachaa ma gọọmentị steeti ahụ emegharịghi iwu ndị ha sị na-akpagbu ndị ọrụ na steeti ahụ na ha ga-aga n’ihu malitekwa ya bụ abụbọọrụ ọzọ.

  11. Mmiri eburula ndị agha abụọ nọ ọrụ enyemaka n'ihe mberede 'Storm Freddy' na Malawi

    A na-achọ ndị agha mba Malawi abụọ achọ ugbua dịka mmiri buuru ụgbọ ha ji arụ ọrụ ịzọpụta ndị tọrọ atọ n'ọdachi oke ifufe na mmiri ozuzo a kpọrọ 'Storm Freddy'.

    Ihe karịrị mmadụ 200 anwụọlarị n'ọdachi a ugbua, mana ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'ime obodo dị icheiche dịka mmiri buchapụrụ okporoụzọ nakwa akwammiri e si abata obodo ha.

    N'ụbọchị Tuzde ka mmiri buuru ụgbọmmiri mmadụ isii nọ n'ime ya na mpaghara Mulanje, dịka ụgbọ ahụ mebiri n'elu mmiri.

    Mmadụ atọ - gụnyere ndị agha abụọ na otu onye nkịtị gwuru mmiri gafee mana abụọ ndị ọzọ ka amaghị ebe ha nọ, dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọchịchị ime obodo bụ Richard Banda si gwa ndị ntaakụkọ.

    Banda kwuru na e mechara hụ otu n'ime ndị agha ahụ a na-achọ achọ n'elu osisi, mana ha na-agba mbọ ịzọpụta ya ugbua.

    Mpaghara Blantyre, nke bụ isi obodo azụmahia nke Malawi bụ ebe ọdachi oke ifufe a kacha metụta.

    Ndị ọchịchị emechiela ụlọ akwụkwọ ma tinyekwa ọnọdụ gbatagbata na steeti iri na mpaghara ndịda mba Malawi bụ ebe ọdachi ahụ kacha metụta.

  12. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ eteela ụra.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

  13. Ezenwaanyị Camilla nke Briten ezutela Mmesoma Madu bụ onye ihe onyonyo ebe ọ na-agba wuru ewu

    Nwaamadị Anthony Mmesoma Medu onye ihe onyonyo ebe ọ gba ụkwụnkiti gbaa egwu ‘Ballet’ n’ime mmiri ozuzu wuru ewu n’afọ ole m ole so n’ime ndị Ezenwaanyị Camilia zutere mgbe ọ gara ụlọakwụkwọ ndị na-ata ọzụzụ maka ịgba egwu ‘Ballet’ bụ ‘Elmhurst Ballet School’ nke dị na Birmingham, Briten.

    Ya bụ ihe onyonyo mere otu ụlọakwụkwọ nwere ugwu enye nwata ahụ ikike ịgụ akwụkọ na mba Briten na-efu.

    Ezenwaanyị Camillia kelere nwata a dị afọ 13 ma kpere ya ekpere ọma maka ihe ejije ụlọọrụ Diseny na-akwao ime maka akụkọ ndụ ya kpalitere mmụọ ọtụtụ ndị.

    Madu sara Ezenwaanyị Camilia na ịgba egwu bụ ihe na-amasị ya kemgbe afọ ise dịka ọ jụrụ ya ma o teela egwu jiri malite imasị ya.

    Nnukwu ụlọọrụ mmepụta ejije mba Amerịka bụ Diseny kwuru n’ọnwa Sepụtemba gara aga na ha ga-emepụta ejije maka ndụ nwa a dịka ihe onyonyo kpalịtere mmụọ ọtụtụ ndị nke bụ ndị lere ya ugbua n’ịntanetị eruola nde 16 site n’akụkụ ụwadị iche iche.

    Madu kwuru na o ji dalaa ya jụụ n’ịbị na mba Briten mana ọ bụ naanị oyi ka na-emekpatu ya ahụ obere.

    Camillia onye so n’isi nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ kpuhere ụfọdụ ike nka ọhụrụ ebe ahụ ma nyekwa ụmụakwụkọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ eleke ọma.

  14. Ụlọikpe atụọla onye bụbụ kọmịshọna njem n’Imo nga afọ atọ

    Ụlọikpe mere mkpebi taa na , Laz Okoroafor Anyanwu bụbụ Kọmịshọna njem n’Imo steeti ga-aga nga afọ atọ dịka ikpe mara ya maka nrụrụaka.

    Anyanwu rụrụ ọrụ dịka Kọmịshịna n’oge ọchịchị aka chịbụrụ steeti ahụ Rochas Okorocha mana ndị ụlọọrụ na-ebuso mpụ agha na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) bugaara okwu nrụrụaka a sị nọ n’isi nwaamadị a n’ụlọikpe.

    Ụlọịkpe kwuru na Anyanwu bupụrụ ego steeti ahụ ruru nde 180 bubaa n’ime ọbaego otu ụlọọrụ ma kwukwaa na dịka ọ bụ kọmịshọna njem steeti ahụ na a hụrụ na ọ nọkwara n’ọrụ isioche Kọmịtịị ndị njem steeti ahụ bụ the Imo state transport company ITC nke ọkaikpe K. ALewanya kpere ikpe kọwara megidere iwu.

    Ọkaikpe a kwuru na Anyanwu kpara agwaa megidere usoro ọrụ ya ma kwukwa na ọkaiwu ụlọọrụ EFCC bụ Michael Ani kwetere ihe akaebe doro anya na site afọ 2015 ruo afọ 2019 mgbe Anyanwu rụrụ ọrụ kọmịshọna na o bubara ego ruru nde 100 bụ ego ndị ITC n’ime otu ọbaego ụlọọrụ onye nkiti nke megidere iwu Naịjirịa.

    E nyochapụtara ego ndị ọzọkwa n’aka ya dịka ọkaikpe ahụ nyere iwu ka ejichie nde naịra 180 a hụrụ n’aka ya ma nyefee ya ụlọọrụ njem Imo steeti ngwa ngwa.

  15. Mgbọwa ugwu na mba DR Congo ebutela nchekasị n'ebe ahụ

    Ndị na-enyocha mgbọwa ugwu n'ala Congo ekwuola na ha ahụla ọkụ n'isi mbido mgbọwa ugwu dị na Nyamulagira dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

    Ha chọpụtara na ọ bụ ngagharị ọkụ mmiri ahụ `si n'okpuru ya apụta n'elu ya.

    Ọ dị n'etiti ebe akpọrọ Virunga National Park bụ ebe mba ahụ debere ọzọdịmgba ndị fọrọ obere n'ụwa.

    Dịka Goma Volcanological Observatory si kwuo, ha dụrụ ndị na-akwọ ụgbọelu ndụmọdụ ha siri ụzọ ọzo fegharịwa.

    Ha kwukwara na ndị bi n'obodo Goma dị nsọ ebe ahụ atụla egwu maka ọkụ mmiri nwereike isi na mgbọwa ala ahụ pụta.

    "Ndị mmadụ sachasie akwụkwọ nri ha ike ma jiri mmiri dọ adọ mere ihe dị ha mkpa" bụkwa ndụmọdụ ọzọ ha nyere.

    Mgbe ikpeazụ mgbọwa ugwu ahụ wụpụtara ọkụ mmiri bụ n'afọ 2011.

  16. Ndị nwụrụ n'oke mmiri ozuzo Malawi eruola 99

    Akụkọ si na mba Malawi apụta na-ekwu na oke mmiri ozuzo mba ahụ egbuola mmadụ iri itoolu na itoolu n'ụbọchị Monde.

    Akụkọ kwuru na mmadụ iri asatọ na ise nwụrụ n'obodo Blantyre sọsọ dịka ụlọọgwụ kachasị ukwu na mpaghara ahụ kwuru na ọnụọgụgụ ndị a na-ebubatara ha akarịala ha aka.

    Oke mmiri ozuzo ahụ kwaturu ụlọ, sachapụ okporoụzọ nakwa akwa mmiri dị icheiche ma kwatukwa akụrụngwa ọkụ latrik.

    Ugbu a, gọọmentị mba ahụ na-agba mbọ ịbelata ihe oke mmiri ozuzo ahụ mebiri na mba ha.

  17. Ụtụtụ ọma

    Ndị ọma, anyị na-ekele unu.

    Ụbọchị taa maara onye ọbụla mma.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa na-egbughị oge.

  18. Etu ndị ojiegbe si gbuo 'councillor' n'Ebonyi, gbaa ozu ya ọkụ

    Ihe egwu mere n'obodo Okposi Achara nke dị n'Ebonyi Steetu n'ụbọchị Sọnde dịka ndị ojiegbe wakporo otu onye ji ọkwa 'councillor' n'okpuru ọchịchị Ohaozara.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ebe elekere iri na otu nke abalị ụbọchị Sọnde ka ndị omekome wakporo nwa amadị ahụ aha ya bụ Ugwu Ogbonnaya, gbagbuo ya n'ime ụgbọala ya ma gbaa ozu ya ọkụ n'ime ụgbọala ahụ.

    Ogbonnaya, onye e ji Spaco mara na-anọchite anya mpaghara Okposi Achara 2 n'okpuru ọchịchị Ohaozara.

    Onyeisioche okpuruọchịchị ahụ bụ Chinonso Ajah kọwara Ogbonnaya dịka nwa okorobịa dị uchu n'ọrụ ya, na-anaghị achọ nsogbu maọbụ ọgbaaghara n'ụdị ọbụla.

    "Aga m eme ihe ọbụla m nwereike dịka iwu si dị iji hụ na ejidere ndị mere ihe ọjọọ dị otu a ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha," Ajah kwuru.

    "Onweghị ụdị ndọrọndọrọ ọbụla nke nwereike ibute ọnwụ mmadụ n'ụdị ọbụla. Ala anyị na-asọ ya nsọ."

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi Steeti bụ Onome Onovewakpoyeya kwuru na ha amalitela nnyocha maka ọnwụ Mazị Ogbonnaya dịka ha nwetara mkpesa gbasara ọnwụ ya n'ụtụtụ Mọnde a.

  19. Anyị anaghị agba mbọ ka e mee onye Igbo onyeisi Sịnetị - Ohaneze Ndigbo

    Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na o nweghi onye ha na-akwado maka ịbụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu na Naịjirịa dịka akụkọ na-efegharị si kwuo.

    N'ozi nke onye odeeakwụkwọ ha bụ Alex Ogbonnia binyere aka na ya na-ekwu ka ụwa mara na o nweghi mgbe ha ga-emebi ọchịchị onye ọbụla nwere banyere ọkwa ọchịchị kama na ha gbarụrụ ihu n'ụzọ adịgboroja e si etinye aha otu ha n'akụkọ ahụ.

    Ha kwuru na ha tulere ya n'ime obi ha ịgbachi ya bụ akụkọ adịgboroja nkịtị mana ha kọwara na ha mee nke a, akụko ụgha ahụ ga-emecha dịka ọ bụ eziokwu.

    "Ka ụwa mara na itinye aha n'akụkọ ụgha bụ ihe jogburu onwe ya ma bụrụkwa ihe ịchu aha" ka Ogboanna kwuru n'ozi aụ.

  20. Mgbanwe ego naira emebiela ọrụ ọma gị - Otu Arewa gwara Buhari

    Otu kpọrọ onwe ha Arewa Consultative Forum ekwuola na mgbanwe ego naira emebiela ọrụ ọma nke Onyeisiala Buhari rụrụ.

    N'ozi ha ziputere n'ụbọchị ụka, Murtala Aliyu bụ onye odeeakwụkwọ ha kwuru na ụkọ ego dị ebe niile nwereike ịbute nsogbu na ọgbaghara n'obodo.

    Ha kporo oku ka onyeisiala Buhari sọpụrụ ma kwado mkpebi nke ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nyere gbasara na ego ochie ka bụ ego rue ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba.