Ngụkọ ọnụọgụgụ ọhụrụ ndị nwụrụla n’oke ifufe
mere na mba Malawi eruola 225 dịka ụlọọrụ gbatagbata mba ahụ si kwuo.
Ifufe a bụrụla otu n’ime anọ merela n’akụkụ
osimiri India ruo mpaghara Afrịka.
Mbọ a na-agba ịgbapụta ndị mmadụ na mpaghara
ndịda Malawi na-agazị n’ihu ugbua dịka mmiri ozuzo ebelatala ebe ahụ.
Nke a enyela ndị ọru enyemaka na ndị
gbatagbata awụchiela mpaghara ahụ njem so oke ifufe a kpọrọ ‘Tropical Storm
Freddy’.
Mịnịsta mgbasaozi mba ahụ gwara BBC na ụgbọelu
helikopta na-efega n'ebe oke idemmiri so ifufa kewapụrụ ụzọ ha.
Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu n’ihe ọdachị
a dapụtara na mba a dịka ihe ruru mmadị 20,000 agbapụla be ha ma bụrụ ndị
na-enweghi ebe obibi n’ihi oke ifufe a.
Gọọmentị mba a ehibela ụlọ mgbapụta inye
ndị na-enweghi ebe obibi ugbua dịka a na-ezigara ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ dịka
uwa, ncha, akwa mkpuchi, nrị nakwa ihe ndị ọzọ.
Taa bụ ụbọchị mbụ n’ime ọtụtụ ụbọchị ndị
gara aga, mbara igwe nke akụkụ Blantyre bụ isiobodo mba ahụ derere duu.
Nke a emeela ka ọrụ gbatagbata nweeike
iji ụgbọelu malite ibuga ihe enyemaka n'ime obodo idemmiri kwekwapụrụ ụzọ nakwa
akwụmmiri ha.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi nke mba
ahụ, Moses Kunkuyu, gwara BBC na ha ka na-achọkwa nkwado na enyemaka n’aka mba
ndị agbata obi ha.
Gọọmenti mba a ejirila nwayọọ nwayọọ
na-eweghachi ọkụ latrịk na mmiri ọṅụṅụ.
Ma ụzọ mgbake ka dị ogologo. A kpochapụla
obodo niile na ọtụtụ puku ezinụlọ chụpụrụ, kpọchie n'ụlọ akwụkwọ na ogige nwa
oge.
Ndị ọchịchị agbatịla mmechi ụlọ akwụkwọ dị
n'ọtụtụ mpaghara ruo na ngwụcha izu.
Gọọmentị mba emechịela ọtụtụ ụlọakwụkwọ ruo
ngwụcha izu a iji hụ na-echekwara ụmụakwụkwọ.