Cash Scarcity: Gọọmentị, CBN na NLC enweela nzukọ iji zeere abụbụọrụ
Gọọmentị etiti na ndị isi otu jikọrọ ndịọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress enweela ọgbakọ iji zeere abụbụ ọrụ ndị NLC sị na ha ga-agba ma ọ bụrụ na ụkọ ego ka na-aga n'ihu na Naịjirịa.
Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige kpọrọ ọgbakọ a n'ụbọchị Mọnde n'Abuja, nke onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, na onyeisi ndị NLC bụ Joe Ajaero sonyere na ya.
Ndị NLC zigaburu akwụkwọ ozi nye Ngige ma na-ekwu na ụkọ ego dị na Naịjirịa ugbua emetụtala ndị ọrụ n'ụzọ dị ukwu, ma dọọ aka na ntị na ọ bụrụ na CBN emeghị ka ndị ụlọakụ nwee ego ha ga na-enye ndị mmadụ, na ha ga-amalite abụbụọrụ.
N'ọgbakọ ahụ, Emefiele, bụ onyeisi CBN kwuru na ha amalitelarị inye ndị ụlọakụ nnukwu ego ha ga na-akwụ ndị mmadụ iji belata ụkọ ego a.
O kwukwara na ha nyere ụlọakụ dị icheiche iwu ka ha rụọ ọrụ n'ụbọchị Satọde nakwa Sọnde iji na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ.
N'okwu nke ya, Ajaero bụ onyeisi NLC kwuru na afọ juru ha maka nkọwa Emefiele nyere ma kwuo ha agaghị agazi n'iru ịgba abụbụ ọrụ.