You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Poopu Francis ekwuola na ‘ọ ka dị ndụ’

Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ihe gọọmentị Legọs kwuru a ga-eme ọkwọ ụgbọala ahụ ụgbọoloko kụrụ na steeti ahụ

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola okwu banyere ihe mberede mere na steeti na mbido ọnwa a oge otu ụgbọala na ụgbọoloko kpọkatara isi ọnụ.

    Ozi si n’aka ngalaba mgbasaozi nke ministri ikpe Legọs n’abalị Fraịdee, ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị kwuru na dịka a nwụchịchara ọkwọ ụgbọala ahụ nke e kwuru na-ekweghi rubere ndị uweojii isi mgbe ha sị ya agafeela ebe okporo ụgbọoloko ahụ, nnyocha ha gosiri na ikpe amaghi ama gbuo ndị mmadụ nakwa mmadụ ịma ụma merụọ onwe ya ahụ dakwasịrị ya n’isi.

    Ebubo 10 metụtara nke a nke megide akụkụ akara iwu Legọs nke 224 na 225 bụ ihe eboro nwoke ọkwọ ụgbọala hụ.

    E kwuru na ọ ga-abịa zara ọnụ ya n’ụlọikpe ukwu Legọs ma ọ gbakeechaa n’ahụ ndị ọ merụrụ site n’ihe mberede ahụ mere.

    Cheta na ngụkọ so ihe mberede a gosiri na mmadụ 96 merụrụ ahụ ebe mmadụ isii lara mmụọ oge ụgbọoloko ahụ kụrụ ya bụụgbọala bọọsụ n'okporo ụgbọoloko dị nso n'Ikeja Legọs n'ụbọchị Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Maachị 2023.

    Otu n’ime ndị nwụrụ n’ime ihe mberede a bụ nwata nwaanyịna-efe ala Naịjirịa nke aha bụ AinaOreoluwa Juliana. Ndị ezinaụlọ nwaagbọghọ a dị afọ 27gwara BBC na ọnwụ ya tinyere ha n’ọnọdụ ịgba anya mmiri nke ukwu.

    Na mkparịtaụka mama nnukwu Oreoluwa bụ Deaconess P.A. Aina na BBC nwer, o kwuru na Oreoluwa bụ nwa nwa ya nke mbụ ma bụrụkwa onye kacha akpachapụrụ ya anya.

    "Ọ bụ nwa nwa m n'eziokwu, ọ na-akpachapụrụ m anya nke ọma, ọ na-aga ozi niile n'ụlọ a. Ọ bụrụ na m rịawa ọrịa, ọ bụ ya na-azụtara m ọgwụ, na-eleta m anya, kwụdebe m n'akụkụ, ọ naghị achọ ihe ọbụla ga-eme ka m taa ahụhụ.

  2. Ụlọakụ niile nọ na Naịjirịa enwetala ego zuruoke ha ga-ebido ikesa - CBN

    Ụlọakụ kachasị na Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria (CBN) ekwuola na ha ezipụla akwụkwọ ego nye ụlọakụ ndị nọ na Naịjirịa maka nkesa nye ọha mmadụ.

    CBN nyekwara iwu ka ụlọakụ mepee n'ụbọchị satọde na sụnde iji kesaa ego ndị a.

    Ọ bụ onyeisi nwa mgbe nta nke ngalaba a bụ Isa AbdulMumin kwuru nke a n'ụbọchị 24 nke ọnwa Maachị ma sị na ụlọakụ ndị nọ na Naijirịa enwetela ego zuru oke maka nkesa.

    O kwuru na CBN nyekwara iwu ka ụlọakụ niile tinye ego n'igwe ATM ha ma na-enye kwa ndị batara n'ime ụlọakụ ego.

    O ji ohere a gwa ndị Naịjirịa ka ha nwee ndidi na ụkọ ego ga-ebeleta nke ukwuu dịka ụlọakụ ga-ebido ịkesa akwụkwọ ego.

  3. Tupu May 29, ụgbọelu 'Nigeria Air' ga-ebido ọrụ - Hadi Sirika

    Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ụgbọelu nke gọọmentị etiti bụ Nigeria Air ga-ebido ọrụ tupu onyeisiala Muhammadu Buhari esi n'oche pụọ.

    Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru nke a na ọgbakọ ndị ụlọọrụ njem ụgbọelu n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

    Mgbe a jụrụ ya ajụjụ sị kedụ mgbe ụgbọelu a ga-ebido ọrụ, ọ zara sị, "Tupu gọọmentị a esi n'ọchịchị pụọ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mei, ụgbọelu a ga-ebido fewe".

    O kwukwara na gọọmentị a mezuru 90% ihe ha kwadoro ime maka njem ụgbọelu.

  4. Eyigharịala ikpe Dibu Ojerinde gaa ọnwa Eprel

    Ọkaikpe Iyang Ekwo nke ụlọịkpe ukwu n'Abuja kwuru na Fraịdee na a na-eyigharị ikpe n’ihi mmadụ asatọ ikpe a metụtara kwesịrị ịbịa tinye ọnụ na ya bụ ikpe abịaghị.

    Ụlọọrụ na-ebuso mpụ na nrụrụaka agha bụ ICPC n’ịchafụ kwukwara na ha agaghị enweike bute mkpesa ha n’ihi ntuliaka a ka mechapụrụ mana ọkaikpe Ekwo gwara ha ka ha nye ndị ha kwesịrị inye akwụkwọ mkpesa ya bụ akwụkwọ n’ime ụlọịkpe.

    Ọ gara n’ihu kwuo na dịka ndị ahụ abịghị ụlọikpe na a ga-eburuzi ikpe ahụ gaa ụbọchị 19 nke ọnwa Eprel dịka a ga-enye ha ntaramahụhụ dịrị ha.

    Cheta na ụlọọrụ ICPC na-agba Dibu Ojerinde akwụkwọ maka ebubo ọhụrụ gụnyere nke e kpere n'ụbọchị isii ọnwa Jụlaị, 2021 nke ga-anọzị n’elu ebubo 18 metụtara izufu ego gọọmentị mgbe ọ nọ n’ọkwa nke a sị ruru ijeri naịra ise na ụma.

    Ojerinde bụbu odeakwụkwọ ụlọọrụ Jamb n'oge gara aga bụ ebe ebubo ndị a si dapụta.

    Naanị Ojerinde bụ onye ikpe a metụtara nke bịa ụlọikpe na Fraịdee.

  5. E yigharịala njem Eze Charles zubeburu ime gaa mba France dịka ngagharịiwe na-aga n’ihu ebe ahụ

    Njem mbụ Eze Charles nke atọ ghara ime abụrụla ihe eyigharịrị ugbua dịka Obieze nke Elysée siri kwuo.

    Eze Charles ekwubuola na ọ ga-aga mba France n’izu na-abịa maka dịka ngagharịiwe na-aga n’ihu na mba ahụ, ya bụ njem agaghịzị adị ire na n’izu ahụ.

    Njem ịga Paris bụ isiobodo France nakwa akụkụ Bordeauz ghara ịmalịte n’ụbọchị Sọndee mana akụkụ mba ahụ abụọ bịara bụrụ ebe ọgbaghara so ngagharịiwe ahụ kacha metụta n’ụbọchị Tọọzdee.

    A gbara ihu ụlọ ọgbakọ nke Bordeaux town hall ọkụ n’ụbọchị ahụ.

    Ndị ọchịchị mba ahụ kwuburu na enweghị etu ngagharịiwe ndị ga-esi metụta njem Eze Charles n’ụzọ ọjọọ dịka enweghi egwu ama ama so ya.

    Ndị ngagharịiwe a na-ekwu na ha achọghị ka gọọmentị gaa n’ihu buru afọ ndị mmadụ ga-anọ site na 62 gaa 64 tupu amalite ịkwụ ha ụgwọ ezumike nka.

    Cheta na ọtụtụ ngagharịiwe emeela na mba France kemgbe. Site n’ọnwa Jenụwarị ruo ugbua, ndị mba ahụ emeela ngagharịiwe itoolu, nke Tuzde ga-eme ya 10.

    Ndị ọrụ mkpopụ ure-ure na mba ahụ na-agba abụbọọrụ kemgbe ụbọchị isii nke Maachị megide atụmatụ gọọmentị ahụ, kwuru na ha ga-amalite ya bụ abụbọọrụ ọzọ n’ụbọchị Mọnde na-abịa abịa.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Emmanuel Macron kwuru na ya bụ atụmatụ dịịrị ndị mba ahụ mkpa ebe Praịm minista ha bụ Élisabeth Borne kwuru na atụmatụ ọhụrụ a bụ iji hụ na egbochiri ihe nwereike ichere ọchịchị ha aka mgba n’ọdịnaihu.

  6. Ramadan: A ga-ata ndị na-eri nri n’ihu ọha ahụhụ - Ndị uweojii Alakụba na Kano

    E zigala ndị uweojii okpukperechi alakụba gaa n'ụlọụka alakụba ndị nọ na Kano steeti iji hụ na e chekwara ndụ na akụnụba ndị mmadụ n'ime ọnwa ibu ọnụ nke Ramadan a.

    Na nkwupụta na ndị uweojii okpukperechi a bụ Hisbah mere na Tọọzde, ha dọrọ ọha aka ná ntị ma kwuo na a ga-ata ndị na-eme omume ọjọọ n’ihu ọha ahụhụ n'ime ọnwa dị nsọ.

    Onyeisioche ha bụ Harun Ibn-Sina kwuru

    “Ụfọdụ n’ime ndị ntorobịa na-eri nri n’ihu ọha n’oge a a na-ebu ọnụ agaghị agbaghapụ ntaramahụhụ a.”

    Ọ gara n’ihu kpọkuo ndị Alakụba ka ha gbaa mbọ nyere ndị na-enweghị nne na nna nakwa na ndị nọ n'ahụhụ aka n'oge ibu ọnụa nke malitere na Tọzdee.

    Ndị uweojii Hisbah bụ ngalaba pụrụiche na-akwado ma na-amanyekwa iwu Alakụba na Kano steeti bụ mpaghara ugwu Naịjirịa ebe okpukperechi Alakụba bụ ihe ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-eso.

  7. A munyela ụlọ ọgbakọ Bordeaux town hall ọkụ na France dịka ngagharịiwe na-aga n’ihu

    Dịka ndị mba France na-eme ngagharịiwe banyere atụmatụ gọọmentị ibuli afọ mmadụ ga-anọ tupu a kwụba ya ụgwọ ezumike nka, a munyere ụlọ ọgbakọ Bordeaux town hall ọkụ .

    Ihe kariri mmadu otu nde wụpụtara n’okporoụzọ dị iche iche n’akụkụ mba France na Tọọzde dịka ọnụ ọgụgụ a hụrụ n’isi obodo mba ahụ bụ Paris ruru 119,000.

    Nke a nọ n’ozi ministri na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo zipụtara.

    Ndị uweojii gbara ndị ngagharịiwe gaasị mmiri anya n’isi obodo ahụ dịka a nwụchiri mmadụ 80 n’akụkụ mba ahụ dị iche iche.

    Ndị ngagharịiwe a na-ekwu na ha achọghị ka gọọmentị gaa n’ihu buru afọ ndị mmadụ ga-anọ site na 62 gaa 64 tupu amalite ịkwụ ha ụgwọ ezumike nka.

    Ndị otu jịkọrọ ndị ọrụ dị iche iche na mba ahụ akpọọla oku ka e mee ngagharị iwe ọzọ n’ụbọchị Tuzde bụkwa ụbọchị Eze Charles nke atọ ga-aga mba ahụ.

    A na-atụ anya na ọ ga-aga obodo Bordeaux ụbọchị ahụ bụ ebe ọkụ gbarala ọnụ ụzọ ụlọ nzukọ ya.

    O dobeghị anya ndị mụnyere ụlọ ahụ ọkụ dịka ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ji ọsọ menyụọ ya bụ ọkụ.

    Ọtụtụ ngagharịiwe emeela na mba France kemgbe. Site n’ọnwa Jenụwarị ruo ugbua, ndị mba ahụ emeela ngagharịiwe itoolu, nke Tuzde ga-eme ya 10.

    Ndị ọrụ mkpopụ ure-ure na mba ahụ na-agba abụbọọrụ kemgbe ụbọchị isii nke Maachị megide atụmatụ gọọmentị ahụ, kwuru na ha ga-amalite ya bụ abụbọọrụ ọzọ n’ụbọchị Mọnde na-abịa abịa.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Emmanuel Macron kwuru na ya bụ atụmatụ dịịrị ndị mba ahụ mkpa ebe Praịm minista ha bụ Élisabeth Borne kwuru na atụmatụ ọhụrụ a bụ iji hụ na egbochiri ihe nwereike ichere ọchịchị ha aka mgba n’ọdịnaihu.

  8. Ihe mere ikpe Nnamdi Kanu nwanne ya bu gaa ụlọịkpe mba Briten jiri kpụọ afọ n'ala

    Ikpe Nwanne nwoke Nnamdi Kanu bu gaa ụlọikpe na mba Briten kpụrụ afọ n’ala dịka ụlọikpe mba ahụ kụchapụrụ ya bụ ikpe.

    Kingsley Kanu bu ikpe na mba Briten ekwebeghi kwupụta maọbụ tinye ọnụ n’okwu etu e siri kpọghachite nwanne ya bụ Nnamdi Naịjirịa bụ nke o kwuru na usoro mkpọghachite ahụ dara iwu ma ghara ịbụ ihe ziri ezi.

    Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu nnwereonwe Indigenous People of Biafra (Ipob) nwere akwụkwọ ikike ịbụ onye mba abụọ bụ mba Nigeria nakwa mba Briten.

    Cheta na n’ọnwa Ọktoba 2022, ụlọikpe mkpegharị nke Abuja mere mkpebi n’okwu a mgbe o kwuru na ọ bụ ‘ntọrọ’ ka gọọmentị Naịjirịa mere ya, kpasa ya agwa na-ezighi ezi ma kpọghachite ya n’ụzọ dara iwu site na Kenya bịa Naịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọtụtụ ebubo nọn’isi ya oge ahụ nke gụnyere ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa nakwa iyi ndụ egwu.

    Na mba Briten n’ụbọchị Tọọzde, ọkaikpe Jonathan Swiftkagburu mkepsa nwanne Kanu ma kụchapụ ya dịka o kwuru na ọ ikike ime ihe dị na mkpesa yua abụghị ihe nọ n’aka ministri mba na mba nke Briten bụ onye ọ chọọrọ ka o kwubie ya bụ okwu.

    Ọkaiwu ndị be Kanu kwuru na ikpe ghara inye mba Briten ohere inyocha etu e si enye ndị mba ha nọ na mba ọzọ eche na a na-akpagbu maọbụ na-enye ntaramahụhụ na-ezighi ezi.

    Cheta na Naịjirịa nwụchiburu Nnamdi Kanu na mbụ n’afọ 2015 tupu ọ gbapụ gbagaa mba ọzọ. Naịjịrịa mechara nwụchie ma kpọghachite ya n’afọ 2021 dịka ọ nọ na nga ngalaba uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ DSS n’ịchafụ kemgbe ahụ.

    Ụlọikpe mkpegharị nke Abuja kụchapụrụ ebubo niile gọọmentị Naịjirịa nwere n'isi Kanu dịka ha kwuru na atụmatụ ndị a agaghị achita aja ebe usoro e ji kpọghachite ya ka ọ sara ọnụ ya ezighi ezi ma ncha.

    Ụlọikpe nyekwara iwu ka atọhapụ ya mgbe ahụ mana ọ ka nọ n'ụlọ nga DSS.

  9. Ndị omekome awakpoola ụlọịkpe ukwu Ebonyi ka mpụtara ntuliaka steeti ahụ gbara n’ọha

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola ndị omekome gbara ụlọikpe ukwu nke Ebonyi steeti ọkụ n’ụbọchị Tuzde dịka a kpọpụtachara onye mmeri na ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

    Ụlọikpe ukwu a nke dị n’obodo Owutu Edda dị n’okpuruọchịchị Afikpo South

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya gwara BBC Igbo sị:

    “Ndị omekome a na-ache na ha nwereikpe n’ime nọ ha n’isi n’ụlọikpe ahụ wụbatara n’ime ogige ụlọikpe a ma gbaa ya ọkụ, anyị nwere ozi maka nke a dịka anyị na-eme nnyocha n’ime ya ugbua.”

    Ha rụkwara aka na a na-eche na ndị a nwereike ịbụ ndị ikpe metụtara ntuliaka nọ n’isi.

    Odeakwụkwọ ụlọịkpe ahụ bụ Oluchi Uduma gwara ndị ntaakụkọ na ndị omekome ahụ nwaburu iwakpo ụlọikpe uwku ahụ n’ụtụtụ Tuzde mana ndị ntorobia obodo ahụ na ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ gbochiri nke mere ha jiri gụrụ egwu agha wụbazie ime ụlọikpe ukwu ahụ ma gbaa ya ọkụ.

    Uduma kwuru na ọtụtụ akwụkwọ ikpe, ngwa ndị a ji arụ ọrụ n’ụlọikpe ahụ, akụkụ ụlọikpe ahụ nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa gbariri ọkụ na mwakpo a.

    Onyeisi okpuruọchịchị ahụ bụ Chima Ekuma Nkama kwuru na ihe a mere bụ ihe mwute ma kwuo na ha ndị uweojii na-arụkọ ihe na anwụchiri ndị mere ihe a.

  10. Mba Ghana atụọla mmadụ ise ndị otu nnwereonwe WTRF mba ahụ nga

    Ụlọikpe dị n'isiobodo Ghana bụ Accra na Tuzdee mara ndị ise ndị otu nnwereonwe a machiri amachị bụ ‘Western Togoland Restoration Front’ (WTRF) mkpọrọ afọ ise me nye ha ntaramahụahụ ịrụ ọrụ ike.

    E jidere ha na 2020 maka ịwakpo ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na ịtọhapụ ndị mkpọrọ, yana igbochi ụzọ iji gbochie ndị si mpaghara Ghana ndị ọzọ ịbanye na mpaghara ọwụwa anyanwụ Volta.

    Ụlọ ikpe ahụ kwuru na omume nke ise ndị a bụ "ebumnuche, nke dị njọ na mkparị maka nchekwa obodo, ọbụbụeze na ókèala obodo".

    A marakwa ha ikpe maka ịbụ ndị WTRF, otu amachibidoro iwu, na-eme ka mpaghara Volta na Oti kewapụ na Ghana.

    A nwụchiri ndị a n’afọ 2020 dịka e kwuru na ha wakporo ụlọọrụ ndị uweojii ma tọhapụ ụfọdụ ndị nga ma tinyekwa ihe gbochi n’okpuruụzọ ụfọdụ nke mere ndị mmadụ enweghi ike gaa mkpa ha n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ mpaghara Volta na mba ahụ.

    Ụlọikpe kwuru na ihe mmadụ ise a mere “bụ ihe ha chere nke ọma mee, bụrụ ike kpasuru ndị mmadụ, bụrụ ihe nwereike ịkụsa nchekwa, ịdịnaotu nakwa ọchịchị mba ahụ.”

    A tụkwara ha mkpọrọ maka isonye otu WTRF bụ tu a machiri amachi na mba ahụ nakwa ịkpọ oku na akụkụ Volta na Oti na Ghana kwụrụ onwe ha ma nweta nnwereonwe.

  11. Gọvanọ Stephen Sang nke Kenya enyela ndị ọrụ iwu ịkwụ ụlọụka otu ụzọ n'ụzọ iri ụgwọ ọnwa ha

    Otu Gọvanọ na Kenya agwaala ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha nwere 10% ụgwọ ọnwa ha nyefee otu ụlọụka dịka ụlọntaakụkọ ndị nọ na mba ahụ siri kwuo.

    Gọvanọ Stephen Sang kwuru na ịme nke a dị mkpa n’ihi na ụlọụkwa ndị nọ na mba ahụ kwesiri ịnata nkwado n’aka ndị ọrụ gọọmentị.

    Dịkaụlọntaakụkọ Daily Nation siri dee, o kwuru “Ndị ọrụ gọọmentị na-arụ n’ọchịchị ga-emeriri ihe dị iche ma rụọ gosiri echiche ọhrụrụ ma bụrụkwa ndị ga-arụ ọrụ enyemaka nye obodo anyị.”

    O kwuru nke n’emume idu iyi ọrụ nke ndị ọrụ ya bụkwa emume ọtụtụ ndị isi ụka sonyere.

    O dobeghi anya etu gọvanọ a ga-esi manye iwu a mana o kwuru na ọ ga na-anata ozi nakwa aha ndị sonyere iwu ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri a nke a n’aka ndị isi ụka.

    Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ụkpụrụ ụka Kraịstị ọtụtụ ma ama mana kemgbe ụwa, nrụrịtaụka ma e kwesịrị imanye ndị mmadụ ụkpụrụ a dapụtala n’akụkụ ụwa dị iche iche.

    Ndị gọvanọ na Kenya na ndị ọrụ ha na-enwete ọtụtụ ego e ji arụ ọrụ dịka ọrụ mwulite nakwa mmezi ụlọakwụwkọ, ịrụ okporoụzọ, ụlọọgwụ n’ihe ndị ọzọ.

  12. Ụlọomeiwu Uganda ewepụtala iwu ga-amachị ndị na-edịna ndị okike ibe ha

    Ndị omeiwu Uganda ewepụtala akwụkwọ iwu ga-amachi ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị na-edịna okike ibe ha.

    Ndị mmadụ na mba a nwereike ịga mkpọrọ ogologo oge maọbụrụ na Onyeisiala Yoweri Museveni bịanye aka n’iwu ugbua.

    Iwu ọhụrụ a chọrọ ka iwu manye ndị enyi, ezinụlọ na ndị obodo igbara gọọmentị ama gbasara onye ọbụla na-edịna onye okike ibe ya na mba ahụ.

    Ụmụnwoke nakwa ụmụnwaanyị na-edịna okike ibe ha abụrụlari ihe iwu megidere na mba a kemgbe.

    Mana iwu ọhụrụ a na-achọzị ka amachịe ndị ọbụla kwupụtara maọbụ gosi njirimara na ha na-edịna ndị okike ibe ha.

    Iwu a, nke ewepụtara na mbido ọnwa a, jiri nkwado zuru oke na ụlọ omeiwu Uganda na Tuzdee.

    Ime mkpebia ikpeazụ n’okwu iwu ga-anọzị n’aka Onyeisiala Museveni ugbua onye nwereike ịhọrọ iji ikike ya binye ka n’iwu a maọbụ ghara ime nke a ka mba ahụ na mba ndị ofesi ndị ọzọ gaa n’ihu na-enwe mmekọrịta dị mma maka ihe onyinye enyemaka nakwa ọrụ netinye ego na mba ahụ.

    Iwu ahụ kwukwara na onye a mara ikpe ọ na-azụ maọbụ na-arabanye ụmụaka n’omume idina ụdị onwe ga-aga nga mkpụrụọka.

    Ndị mmadụ, ndị otu maọbụ ụlọọrụ ọbụla na-akwado maọbụ na-azọ ikike dịrị onye nye ndị a, maọbụ na-ebipụta nkwado, maọbụkwanụ na-ewepụta ihe mgbasaozi ha ga-anata ntaramahụhụ maọbụ gaakwa nga.

    Mba 30 n‘Afrịka machịrị ndị mmadụ ịdịna okike ibe ha dịka ụkpụrụ na echiche oke mmesapụ ahụ anaghị agbasasike na Afrịka.

    Mba ndị a gụnyere Naịjirịa, Kenya, Ghana na ndị ọzọ.

  13. A ga-enwe ngagharịiwe na Kenya na mpaghara Afrịka ndị ọzọ taata?, A na-ele anya ma a ga-enwe ngagharịiwe na mba atọ ndị a n'Afrịka, lee ihe kpatara ya

    Gịnị n-akpata ngagharịiwe na Kenya na mpaghara Afrịka ndị ọzọ taata?

    Ndị otu patị anọghị n'ọchịchị na mba Kenya na-akwadokwa imalite ngagarịiwe site n'ụbọchị Monde. Ngagharịiwe ndị a onyeisi ya bụ Raila Odinga nke ọ na-ahazị maka iwe ha ebe OnyeisialaWilliam Ruto na gọọmenti ya.

    Odinga si na ọ bụ maka ọnụego obibi ndụ nakwa ihe ọ kpọrọ gọọmenti esoghị iwu.

    Onyeisiala Ruto agwalla ndị niile na-apụta ha soro usoro iwu obodo kama ndị ọrụ nchekwa awụchie ha.

    Ụdị ngagharịiwe a ka a na-ahụ na mba dị icheiche n'Afrịka dịka Senegal, Tunisia and South Africa, nke na-egosi iwe ndị mmadụ ebe Onyeisiala obodo ndị ahụ nọ.

    Ndị na-eme ngagharị iwe ndị a na-ebo ọnụego obidi nakwa na ndị gọọmenti ha anaghị eme ihe ha kwesịrị ime ka ọnọdụ ha dị mma.

    Ndị uweojii achifeela ụgbọala n'okporụzọ Nairobi. E mechiela ụzọ ndị na-aga ụlọ gọọmenti. Ndị uweojii ekweghị ka ụgbọala mechie ụzọ Gọọmenti dịka Raila Odinga si wee gwa ndị na-eme ngagharịiwe ka ha mechie ụzọ ụlọọrụ Gọọmenti ka o wee nye ha akwụkwọ mkpesa ha.

    Ka ọ dị n'ụtụtụ a, agbagbuola otu onye n'akụkụ ahịa Toi. Ndị oree ahịa na-etizi mkpu na onyeahụ bụ onye na-arụzi ụgbọala na o soghị ndị na-eme ngagharịiwe. Ndị uweojii ji anwụrụ achụsasịa ndị mmadụ.

    A ga-eme ngagharịiwe na Sout Afrịka taa?

    E zipụla pukukwuru puku ndị ọrụ nchekwa gaa ebe niile na Saut Afrịka n'ụbọchị Mọnde ka ha nyere aka nweghachị udo na ngagharịiwe ndị otu pati anọghị na ọchịchị nke a kpọrọ patị na-alụọgụ maka nnwereonwe n'akụnụba akpokuola ndị mmadụ ka ha agala ọrụ inyeaka mee mmachi na mba ahụ

    Kedụ ihe kpatara ngagharịiwe ha na Sout Afrịka?

    Iwe ji ndị mba Saut Afrịka maka ọnọdụ akụnụba, enweghị ọrụ na enweghị ọkụ latrịk na-eche ndị mmadụ ihu.

    Otu patị na-alụọgụ maka nnwereonwe n'akụnụba a kpọrọ The Economic Freedom Fighters chọrọ ka Onyeisiala Saut Afrịka bụ Cyril Ramaphosa rituo n'ọchịchị maka etu o si eme ya bụ akụnụba obodo. Chetakwa na otu ọzọ bụ Democratic Alliance gara ụlọikpe ka akwụsị ngagharịiwe ahụ mana o metaghị ya.

    Ụlọikpe si ka pati EFF mee ngagharịiwe ha n'udo ma hapụ ọgbaghara ga-akpata mmechi ụlọakwụkwọ na azụmahịa.

  14. Peter Ndubuisi Mbah nke PDP atuola vootu

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'aha PDP bụ Peter Ndubuisi Mbah atuola vootu n'ọgbọ atụmvootu ya dị n' ama ọgbakọ Owo, n'Okpuru Ọchịchị Nkanu East, Enugwu.

  15. Atumvootu malitere n'oge n'Enugwu

    Ntuliaka malitere oge ọ kwesịrị n'Enugwu taa.

    Onye ntaakụkọ anyị gara Owodị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-East kwuru na ihe na-aga n'anya ya.

  16. Ụka Katọliki emeela ‘Catholic Diocese of Aguleri’,nye ha Bishopụ ọhụrụ

    Ụka Katọlik na Naijiria emeela Aguleri Dayọsis, n’emume n’Aguleri Anambara steeti ha mere ụnyaahụ bụ Fraide, abalị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    Aguleri dịbu n’okpuru Ọnicha Katolik Dayosis nwetakwara nnukwu ụkọchukwu ọhụrụ bụ Bishop Denis Isizor dịka ụkochukwu mbụ ha.

    ‘Parish’ ndị dị na Dayosis Aguleri gụnyere ụka Katolik nile dị n’Ọkpuru Ọchịchị Anambra-West, Anambra-East, Oyi nakwa Ayamelum.

    Ebe ga-abụ obi Bishopu Aguleri bụ ụlọụka ‘St. Joseph Cathedral Ugwu-Ndiuka, Aguleri’.

    Aguleri bụ obodo ama ama dịka ụkọchukwu Katolik a ma ma n’ụwa dịka onye a na-akwado ime onyenso(Saint) bụ Blessed Fada Tansi nakwa aka chịburu Anambara steeti bụ Willie Obiano si ebe ahụ pụta.

  17. Kamara Usman vs Leon Edwards: Usman na Edwards ga-achịpụ ya taa bụ Satọde

    Otiọkpọ Naijiria a ma ama na mba ụwa bụ Usman Kamara na ogbo ya nke mba Briten bụ Leon Edwards ga-anwale taa mbe naabọ nke bụ oke taa dịka nwa afọ ga-agbalị ịnata Edwards ugo 'UFC welterweight' o tupuru ya n' Ọgọstụ afọ 2022 oge ha kwatara na Salt Lake City.Usman , onye sị na ya bụ 'ojechaaọgwụ' kwuru na inwetakwa ugo ya n'aka Edward bụ onye ya na ya ga-alụkọ ọgụ nke ugboro atọ ya taa gaa abụrụ ya "ịgwọrụ ndụ".

    Usman gbara afọ 35, gwara BBC na asọmpi ahụ ga-eme na London's O2 Arena ga-adị kpọ kpọ."Ọ bụ mmeri maọbụ nkuri. A bụbu ọkaibe."

    "Achị m ọgbọ n'ogbo anyị. Anọbụ m n'ọkwa ebe m ga-asị , 'kedụ ihe ọzọ ọ fọrọ ka m mee?"

    "Ọ bụ ezigbo onyeọgụ, nwekwa ezi ụzọ o si eti ọkpọ mana ọ kaghị m mara usoro iji karate agwakọ usoro ya."

  18. Onyeisiala Buhari enyela ndị ụlọomeiwu na ndị ụlọikpe ikike inwe ego nke ha

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu ga-eme ka ndị ọkaiwu, ọkaikpe nakwa ndị ụlọomeiwu nwe ego nke ha nke pụtara 'Financial autonomy' na Bekee.

    Nke a pụtara na ha ga-enwezi ikike ịkpata nakwa imefu ego nke ha dịka nhazigharị iwu ala Naịjirịa si gosi.

    Nke a pụtara ihe n'ozi onye enyemaka mgbasaozi onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Tolu Ogunlesi wepụtara n'akara Twitter ya.

  19. ICC enyela iwu ka a nwuchie onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin

    International Criminal Court (ICC) n'ụbọchị 18 nke ọnwa maachị enyela iwu ka anwuchie onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladmir Putin maka ịda iwu megidere etu esi alụ agha.

    Mba Rọshịa na-ekwu na o nweghị iwu agha ọbụla ha dara dịka ha na mba Yukren nọ n'agha rurula otu afọ.

    Ọ bụ maka okwu gbasara ịkpọpụ ụmụaka na mba ha na iji ụzọ ezịghị ezi kpọrọ ndị mmadụ site Yukren gaa Rọshịa.

    Onye gbara akwụkwọ a bụ Karim Khan mere nyocha gbasara ịda iwu agha, ịda iwu megidere ikikere diiri onye na ikpochapụ agburu na mba Yukren n'ime otu afọ.

    Khan mere njem ugboro anọ na Yukren iji chọpụta maka ebubo mkpagbu ụmụaka ma iwu megidere agụrụngwa obodo ji ebi.

  20. Adọọla ndị ụka Katọlik aka na ntị maka ịṅụ mmiri nsọ

    A dọọla ndị njem okwukwe na mba Yuganda na-aga n'ebe akpọrọ Namugongo Martyrs Shrine ha kwụsị ịṅụ mmiri nsọ dị n'ime onunu mmiri nsọ dị ebe ahụ.

    Ndị isi ụlọụka kwuru na ha nwereike iji ya mee akara nke obe nakwa ihe ndị ọzọ mana ọ dịghị mma ịṅụ aṅụ.

    Onye odeeakwụkwọ Uganda Episcopal conference bụ John Kauta kwuru na n'agbanyeghi na ndị mmadụ kwenyere na mmiri ahụ na-agwọ ọrịa, ndị ọrụ ahụike agwaala ha na mmiri ahụ adịghị ọcha na mma ọṅụṅụ.

    Ndị njem okwukwe amalitela ịgbakọ na Namugongo maka emume ụbọchị Martyr nke afọ a ga-eme n'ọnwa Juun.