Ị bọọla chi
Igbo ndị ọma, ụnụ eteela?
Daalụ maka isonyere anyị taa.
Ka anyị malite na-egbughị oge.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ahụbeghị ego naịra ọhụrụ a.
Igbo ndị ọma, ụnụ eteela?
Daalụ maka isonyere anyị taa.
Ka anyị malite na-egbughị oge.

Ebe foto si, Reuters
Onyeisi ụlọọrụ international Monetary Fund (IMF) na-ahụ maka etu ego si aga njem n’ụwa bụ Kristalina Georgieva adọọla aka na akụnaụba mbaụwa ga-ada n’afọ ma sịkwa na ụfọdụ mbaụwa ga-adabanye n’ụbịam.
O kwuru na agha mba Russia na Ukraine, ọrịa Covid-19 mere na Chaịna nakwa ihe ndị ọzọ dị mbụ metụta akụnaụba mba Afrịka nakwa mba ndị ọzọ.
Mgbe ọ na-akọwa etu akụnaụba mbaụwa nwereike ịdị n’afọ 2023, Georgieva sị na ụbịam nwereike imetụta mba ndị nwere ego n’ụwa.
“Anyị na-atụ anya na akụnaụba otu n’ime mpaghara atọ na mbaụwa ga-adabanye n’ọnọdụ ụbịam.
“Mba ndị na-anọghị n’ụbịam, mana ọ ga-adị ọtụtụ n’ime ndị mmadụ na mbaụwa ọ nọ n’ụbịam”
Ọ gakwara n’ihu kwuo na akụnaụba mba Chaịna agaghị eto ọfụma maka mkpamkpa ọrịa Covid-19 na-eme na nrụpụta ihe.
Georgieva gbakwụnyere na ọtụtụ mba agbazirila ọtụtụ ego karịrị etu ha kwesịrị ịgbaziri.

Ebe foto si, EPA
Ihe mberede ụgbọelu mere na mpaghara Gold Coast nke mba Australia taa bụ Mọnde, ataala isi mmadụ anọ, dịka ndị ọrụ gbatagbata mba ahụ si kwuo.
Ndị uweojii sị na ya bụ ihe mere dịka ụgbọelu helịkọpta abụọ takọtara isi dịka otu n'ime ha chọrọ ifeli ebe nke ọzọ chọrọ ifetu.
Mmadụ anọ ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị nọ n'ime otu helịọpta, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ nọ n'ọnọdụ dị njọ n'ụlọọgwụ.
Mmadụ ise n'ime mmadụ isii nọ na helịkọpta nke ọzọ nwere obere mmerụ ahụ, mana ngalaba njem nke mba Asutralia bụ 'Australian Transport Safety Bureau' sị na nnyocha amalitela.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Oyo Steeti akọọrọla BBC etu mmadụ ise si laa mmụọ n'emume oriri na nkwari nke ndị mmadụ ji anabata afọ ọhụrụ na mpaghara Afijio na steeti ahụ.
Adewale Osifeso, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Oyo steeti, kwuru na ọ bụ nsogbu dapụtara ebe ndị enyi na-enwe aṅụrị maka afọ ọhụrụ.
Osifeso kwuru na ndị hụrụ ihe merenụ kọrọ na dịka mmemme ahụ na-aga n'ihu oge otu onye nyara ụgbọala aghara aghara bata n'ọgbọ ebe ahụ.
"Otu nwoke nọ ebe ahụ were iwe ma baara ya mba maka etu o si nyaa ụgbọala ya," Osifeso kwuru.
"Ndị enyi nwa amadị ahụ bakwaara ya mba ma katọọ etu o si buru ụgbọala ya bata ebe ahụ."
Dịka akụkọ ahụ si kọọ, nwa amadi a were iwe maka etu ndị enyi ya si baara ya mba, nke a mere ya na ha baa mba n'olu ike, mana ndị okenye nọ nso bịara nye aka kpee udo n'etiti ha, mana obi adịghị nwata nwoke ahụ mma.
"Nwa amadi ahụ ji iwe banye n'ụgbọala ya sị na ya ga-akwfurịrị ọbara. Ihe ọzọ ndị mmadụ hụrụ bụ ka o nyaara ụgbọala ya n'oke ọsọ kụọ ụfọdụ ndị enyi ya nakwa ndị ọzọ nọ ebe ahụ na-agba egwu," Osifeso kwuru.
"Ka nke a mere, o si n'ụgbọala ya rituo ma jiri ọsọ gbapụ ebe ahụ."
Ndị uweojii sị na ha anwụchiela mmadụ atọ ndị enyi nwa amadị ahụ, bụ ndị ya na ha nọ n'ime ụgbọala na mmemme ahụ.
Osifeso kwueu na nnyocha amalitela banyere ihe a merenụ.

Ebe foto si, Screengrab
Otiegwu Damini Ebunoluwa Ogulu onye e ji Burna Boy mara bụ aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na soshal midia Naịjirịa n'ụtụtụ taa bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2023.
Nke a bụ maka ọgbakọ mmemme egwu nke ọ haziri na Legọs n'ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị mmalite afọ ọhụrụ 2023.
Ndị mmadụ kwuru na ya bụ mmemme nke kwesịrị ịmalite n'elekere itoolu nke abalị, ebdioghị ruo ihe dịka elekere atọ na ọkara nke ụtụtụ Mọnde.
Nke a wutere ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị n'ihi nnukwu ego ndị mmadụ kwụrụ iji nweta akwụkwọ ikike isonye na ya bụ mme.
Ọnụego kacha nta ndị mmadụ kwụrụ bụ N30,000 maka ndị nkịtị maọbụ regular na bekee, ebe ọnụego kachasị bụ nde naịra ise (N5million).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Burna Boy kpọrọ ndị nkwado ya iyi
Ndị mmadụ kwuru na oge Burna Boy mechara pụta, o kwuru na ọ bụ otu onye otiegwu a na-akpọ Seyi Vibes rịọrọ ya ka ọ ghara ịla.
Burna Boy kwuru sị: "Ọ bụ ịhụnanya mere mụ na ụnụ ji ka nọdụ ebe a, ewepu Seyi Vibes agaarala m ịla. Mana mụ na ụnụ ka nọ, n'agbanyeghị na ụnụ ji aha m akụ asịrị. ụnụ kwuru na m gburu mmadụ na Cubana, ụnụ kwuru na nne m gbaara Fela egwu, mana agbanyeghị ihe ndị a niile, ahụrụ m ụnụ n'anya, onye na-ahụghị m n'anya Chukwu ga-abụ gị ọnụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia katọrọ okwu ọjọọ a Burna Boy gwara ndị nkwado ya ma kwuo na o kwesịghị ekwesị.
Mana ka nke ahụ mechara, Burna Boy gụụrụ egwu gawa n'ihu nke mere ụfọdụ ji chefuo ihe o kwuru nakwa ogologo oge ha chere tupu ọ pụta.
Otu onye akara Twitter ya bụ @Bcschoolboy kwuru na ya agbagharala Burna Boy maka na egwu ọ gụrụ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Na nchịkọta, otu onye aha ya bụ Analoo Ibadin kwuru sị: "Mmemme kwesịrị ịmalite n'elekere isii nke mgbede bidoziri n'elekere atọ na ọkara nke ụtụtụ echi ya, o nwere ka ọ dị. Anyị kwesịrị ịgbanwe. Mana mmemme a bụ ọkaibe. Ahụrụ m ya n'anya mana ihe m kpọrọ asụ bụ ogologo oge m chere."
Daalụ dịka ị na-esonye anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa

Ebe foto si, Ebonyi State Police
Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwupụtala ogbugbu e gburu nwunye otu onye ndu ndị nchekwa Ebubeagu ma gbaa ụlọ ha ọkụ n’ụbọchị mbụ nke Jenụwarị 2023.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti a bụ Chris Anyanwu sị na ihe a mere n’obodo ha bụ Owutu Edda dị n’Okpuruọchịchị Afrikpo South n’elekere abụọ nke isi ụtụtụ.
Ọ sị na ọ bụ onye ndu ndị ntoroọbịa obodo ahụ bịara nye mkpesa banyere mwakpo a n’ụlọọrụ ndị uweojii.

Ebe foto si, Ebonyi State Police
Ọ sị na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ bịara n’ụlọ onye ndu Ebubeagu bụ Oyeku Kalu Chima gbagbuo nwunye ya bụ Urenwa Kalu ma gbaa ụlọ ha ọkụ.
Ndị uweojii gara n’ihu kwuo na a matabeghi kpọmkwem ndị kpara arụ a kama na nyocha ka na-aga n’ihu ugbua.
Cheta n’izuụka gara aga e gburu ihe ruru mmadụ atọ gụnyere onye uweojii maka esemokwu dị n’etiti Stanley Okoroemegha bụ onyeisi pati APC n'Ebonyi Stanley na Eni Uduma Chima bụbu onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo South.

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammau Buharị arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha ghara inye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ohere iji ha bute ọgbaaghara nakwa tigbuo zọgbuo n'afọ ọhụrụ a bụ 2023, ọ kachasịn'oge ntuliaka.
Buhari kwuru nke a n'ime ozi ekele afọ ọhụrụ o zipụtara site n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu.
Onyeisiala kwere nkwa ọzọ na ya ga-eme ihe niile o nwere ike iji hụ na ntuliaka 2023 gara siriri werere na-enweghị nsogbu nakwa nrụrụaka ọbụla.
"Anyị ga-agba mbọ jụ atụmatụ niile nke ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ewepụta iji bute ọgbaaghara n'ụdị ọbụla iji kwasaa ntuliaka a," Buhari kwuru.
"Dịka gọọmentị, anyị onwe anyị ga-agba mbọ hụ na onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaaghara ga-enweta ntaramahụhụ kwesịrị ya dịka iwu si kwuo.
"Ọ bụkwa ọrụ dịịrị mmadụ niile ịhụ na anyị tinyere aka na mbọ gọọmentị na-agba site n'iwepụ onwe anyị n'ihe ọbụla megidere iwu obodo maọbụ ihe ọbụla nwereike imetụta ntuliaka a n'ụzọ ọjọọ."
N'okwu gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, Buhari kwuru na ọ bụ ihe obi ụtọ na "ndị ọrụ nchekwa anyị bụ ndị anyị ji eme ọnụ, ọ dị mkpa na anyị ga na-akwado ndị ọrụ nchekwa anyị site n'inye ha ozi ndị dị mkpa ha ga-eji rụọ ọrụ."
"Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị niile ịhụ na Naịjirịa bụ ebe udo na nchekwa tọrọ atọ dị maka mmadụ niile.
"Ana m anabata ma ndị na-eto m, ma ndị na-akọjọ m, n'ihi na ekwenyere m na m mere ihe niile nwereike ime maka ọdịmma Naịjirịa.
"Ekpere m bụ na Onyeisiala ga-anọchi m ga-amalite ebe m kwụsrị n'ọsọ a iji mee ka Naịjirịa bụrụ otu n'ime mba bụ ọkaibe tupu ngwụcha senchuri a."

Igbo nwe mmadụ, ekele o.
Afọ ọhụrụ ọma nụ o!
Ekele dịrị onye kere mmadụ maka afọ ọhụrụ a.
Ndụ, ahụike, ọṅụ na ọganihu bụ ọfọ anyị na-agọrọ gị n'afọ ọhụrụ a.
Ngwa ka anyị malite mgbasaozi nke taa.