Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Onye ntaakụkọ BBC na Banjul, Gambia bụ Omar Wally kwuru na ọ gafeela ọtụtụ ọnwa kamgbe a hụrụ osote onyeisiala Joof n'ọha.
N'ọnwa June afọ 2022, Joof kwupụtara iwe ya etu ihe si aga na mba Gambia ma kwuo na ndị mmadụ ga-ahụrịrị ihe dị iche n'oge adịghị anya.
Onyeisiala Barrow họọrọ Joof dịka osote ya oge o meriri ntuliaka nke abụọ ya n'ọnwa Disemba 2021.
BBC arịọla mgbaghara maka mkpọtụ aramara a nụrụ n'ụlọọrụ ha n'oge mgbasaozi bọọlụ
BBC arịọla oha obodo mgbaghara maka mkpọtụ aramara si n'ụlọọrụ ha pụta dịka ha na-agbasa ozi asọmpi iko FA nke dị n'etiti Wolves na Liverpool n'abalị ụbọchị Tuzde.
A nụrụ mkpọtụ a dịka Gary Lineker na-ekwu okwu n'asọmpi ahụ Liverpool ji otu ọkpụ goolu merie Wolves.
"Anyị na-arịọ ndị na-ekiri anyị mgbaghara maka ihe mere na mgbasaozi bọọlụ nke mgbede a," BBC kwuru.
Lineker mechara gosi foto otu ekwentị nke ọ sị na ha hụrụ n'azụ ebe ha nọ agbasaozi, bụ ebe e chere mkpọtụ ahụ si apụta.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Otu ọnụ na-ekwuru BBC kwuru na ha na-enyocha ihe kpatara mkpọtụ ahụ.
Oge ya bụ mkpọtụ malitere, Gary Lineker bidoro ịchị ọchị dịka ọ gbara mbọ ịjikọta onwe ya ọnụ n'ime ụlọọrụ ahụ nke dị n'ama egwuregwu Molineux bụ ebe ya na Paul Ince na Danny Murphy.
Lineker jụrụ Alan Shearer onye sokwa agbasaozi sị "ọ dịka enwere onye n'ime ụnụ nwetara ozi n'ekwentị ya."
Dịka BBC rịọrọ mgbaghara maka ihe a merenụ, Lineker kwuru na ya ahụghị ihe ọbụla BBC ga-eji rịọwa mgbaghara n'ihi na ya hụrụ ihe ahụ mere dịka ihe ịkpa ọchị.
Kpachapụnụ anya maka ọgwụ ụkwara ndị a - Nafdac
Ebe foto si, Nafdac
Ụlọọrụ 'National Agency for Food and Drugs Administration and Control' adọọla ọha obodo aka na ntị ka ha kpachara anya maka ọgwụ ụkwara abụọ a kpọrọ AMBRONOL na DOK-1 Max maka na ha nwere akụrụngwa na-adịghị mma maka ahụike n'ime ha.
N'ozi ha wepụtara n'ọba ozi ha n'ụbọchị Sọnde, Nafdac kwuru na ọ bụ na mba Uzbekistan ka a chọpụtara akụrụngwa ọjọọ n'ime ọgwụ ụkwara abụọ ahụ.
Nafdac kwuru na ọgwụ ụkwara abụọ ahụ dara nnyocha nke pụtara na ekwesịghị ka mmadụ ṅụọ ha.
"Nnyocha sayensị gosiri na ọgwụ abụọ ahụ nwere akụrụngwa 'diethylene glycol na ethylene glycol' nke ọnụọgụgụ ya gafere ole o kwesịrị ịdị.
Ihe mere APC na PDP ji agbarịta onwe ha egbe ọnụ
Ebe foto si, other
Esemokwu dị
n’etiti ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha pati Peoples Democratic Party na ogbo
ya nke All Progressive Congresss abanyela n’ogogo ọzọ dịka ndị PDP sara oku APC
kpọrọ nke sị ka a nwụchie ma kpee onye nke ha ikpe maka mpụ na nrụrụaka.
Onyeisi achụmnta
vootu APC bụ Festus Keyamo kpọrọ oku nọọrọ
n’ụbọchị kpọọ oku sị ka e were ụbọchị abụọ nwuchieonye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala make mpụ.
N’akwụkwọ
ozi ahụ, Keyamo gwara ụlọọrụ na-ebu aha megide mpụ bụ Economic and Financial
Crimes Commission (EFCC), na ndị ogbo ya ndị ọzọ ka ha nwuchie ma nyocha Atiku
Abubakar nke PDP.
Na nzaghachị
PDP sị na oku a APC na-akpọ bụ ka ha megharịa ndị mmadụ anya site na nsogbu ndị
na-akpagbu Naịjirịa ugbua.
N’ozi ahụ
nke odeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Debo Ologunagba wepụtara, ha sị na Bola Ahmed
Tinubu nke APC nwere ọtụtụ mpụ na nrụrụaka dị iche iche dị n’isi ya.
Ozi ahụ sị
n’ihi nke a na Tinubu etozughi oke iso na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-adị n’afọ
a.
N’otu aka
ahụ APC na-ekwukwa na Atiku kwesiri ịnọ na nga ugbua na-abụghị ịzọ ọkwa
onyeisiala Naịjirịa.
Ndị uweojii ejichiela otu nwoke nwa ya dị afọ anọ ji egbe ya egwuri egwu
Ebe foto si, Beech Grove Police
Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke na Steeti Indiana nke mba Amerịka dịka onyonyo pụtara nke gosiri nwa ya dị naanị afọ anọ ka o ji egbe na-egwuri egwu.
Nwoke a aha ya bụ Shane Osborne dị afọ 45 bu ụzọ na-atụ asị na ya enweghị egbe mana ndị uweojii banyere be ya chọọ egbe ahụ ma hụ ya.
Ọ bụ otu onye agbatobi hụrụ ka nwakịrị ahụ ji egbe na-egwuri egwu n'okirikiri ebe e si agbago elu (staircase).
Mgbe ndị uweojii bịaruru, nwoke ahụ kwuru na ọbụghị eziokwu na nwa ya ji egbe egwu egwu, na ya enweghị egbe ọbụla n'ụlọ ya.
Mana onye agbataobi ahụ kpọrọ ndị uweojii gosiri ha ihe onyonyo ebe nwata ahụ ji egbe na-agbagharị, nke a mere ka ndị uweojii baa n'ụlọ nwoke ahụ, chọọ, ma hụ egbe ahụ.
Ha nwụchiri nwoke ahụ maka ebubo ileghara nwatakịrị anya nakwa itinye nwata n'ọnọdụ o nwereike imerụ ahụ.
Ụnụ asaala chi
Igbo ndị ọma, ekele o.
Ihe ọma meere gị taa dịka ị na-esonye mgbasaozi anyị.
Ndị 'unknown gunnmen' agbagbuola otu onye uweojii, gbaa ụlọọrụ Inec ọkụ n'Enugwu
Ebe foto si, Advocate
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala iji chọpụta ndị omekome gbagburu onye otu ha ma gbaa ụlọọrụ Inec ọkụ n'Amechi dị n'okpuru Ọchịchị Enugu-South, Enugwu steeti.
Ndị bu egbe a mabeghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụlọọrụ Inec ọkụ n'abalị ụbọchịụka, (15/1/2023.), ebe otu onye uweojii tụnyere ndụ ya dịka ndị uweojii na ndị oomekome ahụ kwarịtara mgbọ ka ha na-achọ igbochi ha ịbanye ogige ụlọọrụ ahụ.
Dịka ọnụ na-ekwuru bụ Festus Okoye si kwuo na akwụkwọ ozi o binyere aka, ndị omekome ahụ gbara ụlọnche ụlọọrụ ahụ ọkụ mana ha enwelighị ike banye n'ụlọọrụ ka kpọmkwem dịka ndị uweojii na ndị agha si 82 Division gbochiri ha.
Ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe bbinyere aka kwuru sị, "Kọmishona ndị uweojii Enugwu enyela iwu ka eme nnyocha mata ndị Ipob/ESN pụtara n'igwe wakpoo ma sunye ụlọọrụ Inec ọkụ n''Amechi-Awkunanaw dị n'Enugu-South n'abali 15 nke ọnwa Jenụwarị, n'ebe Elekere 9.15 nke abalị.mana ndị ọrụ anyị gbobidoro ha."
" Dịka ha na ndị ọrụ anyị na-akwarịta mgbọ, mgbọ tụrụ otu onye otu anyị, merụọ ya ahụ, e buga ya ụlọgwụ ebe ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla e dowqe ozi=u ya n'ụlọozu, dịka ndị omekome a ji ogbunigwe e ji mmanụ ụgbọala arụọ chọọ isunye ụlọọrụ Inec ọgụ bu apa mgbọ gbalaga."
Anyị anwụchịghị Emefiele -DSS
Ebe foto si, Getty
Ngalaba ndị uweojii nzuzo a kpọrọ, 'Department of State Services’ (DSS) ekwuola na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ndị ọrụ ha wakporo Ụlọakụ Etiti Naijiria bụ CBN n'ịchafụ ma nwuchie onyeisi ha bụ ụgha.
Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị DSS wakporo iji nwuchie Emefiele bụ onye e kwuru malitere ọrụ mbụ kemgbe ọ gachara ezumike nwa oge.
Mana n'ozi ha wepụtara na mgbede Monde nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya binyere aka, DSS gọrọ na ha wakpoghị Emefiele..
Ha si na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha ma buru ihe na-eduhie ndị mmadụ.
“Anya ngalaba ‘Department of State Services’ (DSS) eruola akụkọ ụgha na-efegharị nke kwuru na ndị ọrụ anyị wakporo Ụlọakụ Etiti Naijiria nwuchie onyeisi ha bụ Godwin Emefiele bụ taaa bụ abalị 16 Jenụwarị afọ 2023.”
N'otu aka ahụ, CBN wepụtara ozi nke kwuru na onyeisi ha bụ Godwin Emefiele, amalitela ọrụ ma nọrọ n'ihu ọrụ ya dịka ọ gachara ezumike.
Ozi nke
onyeisi CBN bụ Osita Nwanisobi binyere aka ụbọchị Monde si kwuo, “Onyeisi CỤlọakụ
Etiti bụ Godwin Emefiele amalitela ọrụtaa bụ Monde abalị 16, 2023.”
“Emefiele ka kwụsịrị ike n’ọrụ dịrị ya dịkaọ ṅụrụ n’iyi ọrụ n’usoro ntụziaka Onyeisiala Muhammadu Buhari.”
Nkwuputa ekwughị ihe ọbụla maka ebubo na a nwụchiri ya.
Ndị ntọ atọrọla ụkọchukwu Katọlik n'Ekiti Steeti
Ndị ntọrị mmadụ atọrọla otu ụkọchukwu ụka Katọlik aha ya bụ Michael Olubunmi Olofinlade na mpaghara Omu-Ekiti nke dị n'okpuru ọchịchị Oye, Ekiti Steeti.
Ụkọchukwu Olofinlade bụ onye na-elekọta ụlọụka 'St George Catholic Church' Omu Ekiti.
Ozi si n'aka onyeisi mgbasaozi nke Dayọsis Ekiti bụ Anthony Ijasan kwuru na ọ bụ n'ebe elekere isii nke mgbede ụbọchị Satọde, Jenụwarị 14, 2023, ka ndị ntọ wakporo Fr Olofinlade n'etiti Itaji-Ekiti na Ijelu-Ekiti, dịka ọ nọ n'ụzọ na-ala n'ụlọụka ya.
"Bishọp anyị bụ Felix Femi Ajakaye na-arịa ọha mmadụ ka ha na-echeta Fr Michael n'ekpere ka o nwere onwe ya n'oge adịghị anya," Anthony Ijasan dere.
Ebe foto si, Ekiti Diocese
Buhari ga-aga Mauritania taa bụ Mọnde ịnata nkwanye ugwu
Ebe foto si, Presidency
Nkọwa foto, Nke a bụ Foto ochie etinyere iji kọwaa akụkọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa bụ Mọnde gawa mba Mauritania ebe ọ ga-anata nkwanye ugwu maka ime ka ọnọdụ udo siwanye ike n'Afrịka.
Ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina kwupụtara nke a ma kwuo na nkwanye ugwu a bụ n'ihi mbọ Buhari gbara iwulite udo n'etiti mba dị icheiche n'Afrịka.
Ọ bụ otu 'Abu Dhabi Peace Forum' ga-enye Buhari nkwanye ugwu a n'emume a ga-eme na Nouakchott, bụ isi obodo Mauritania echi bụ Tuzde, Jenụwarị 17, 2023.
"Tupu emume a, Buhari ga-esonye n'ọgbakọ a kpọrọ 'African Conference for Peace' ebe ọ ga-anọ kwuo okwu ma gụpụta mbọ niile a gbarala iji mee ka Afrịka nwee udo," Adesina kwuru.
Nkọwa foto, Ndị ojiegbe a bu ọgbatumtum ma burukwa egbe dị icheiche wee wakpo ụlọụka ahụ n'ụbọchị Sọnde
Ndị ekperima bucha egbe wakporo otu ụlọụka a na-akpọ 'New Life For All Church' nke dị na mpaghara Kankara nke Katsina Steeti, n'ụbọchị ụka, abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị 2023, tọrọ ọtụtụ mmadụ, ma merụkwaa ọtụtụ ahụ.
Ụfọdị ndị nọ oge ya bụ ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na ndị ekperima a ji ọgbatumtum wee wakpo ụlọụka a nke dị n'obodo Dan Tsauni Gidan Haruna.
Ha kwuru na ọ bụ mmadụ 25 ka ndị ekperima a tọọrọ ma kpụrụ ha pụọ.
Gọọmentị Katsina Steeti kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu mana ndị ọrụ nchekwa amalitela ọrụ iji zọpụta ndị ahụ a tọọrọ.
Ishaya Jurau bụ onye enyemaka Gọvanọ Katsina Steeti bụ Aminu Masari, gwara ndị ntaakụkọ Channels TV na ndị ojiegbe ahụ wakporo n'ebe elekere iri nke ụtụtụ ma merụọ ụkọchukwu ụlọụka a ahụ tupu ha akpụrụ ọtụtụ ndị bịara ụka.
Ndị uweojii Katsina kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka ahụ egbe n'aka, mana ọ bụ naanị mmadụ asaa ka ha tọọrọ wee gbafuo.
"Anyị eburula ụkọchukwu ahụ gawa ụlọọgwụ 'General Hospital' dị na Kankara, ma malitekwa ọrụ iji jide ndị ojiegbe mere ihe a," Gambo Isah, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Katsina Steeti kwuru.
Cheta na ọ bụ na mpaghara Kankara dị na Katsina steeti ka ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ma tọrọ ihe karịrị ụmụakwụkwọ 300 n'ụbọchị 11 nke ọnwa Disemba afọ 2020.
Ụdị ihe dị otu a mekwara n'ụbọchị ise nke ọnwa June 2022, n'obodo Owo nke dị n'Ondo Steeti na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.
N'ụbọchị ahụ, ndị ojiegbe wakporo ụlọụka Katọlik a kpọrọ 'St Francis Catholic Church', gbagbuo ihe karịrị mmadụ 40 ma merụkwaa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS n'ịchafụ mechara kwupụta na ha anwụchiela ndị mere mwakpo ahụ.
Ụtụtụ ọma
Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.
Ya gaziere gị n'izuụka ọhụrụ a dịka ị na-esonye mgbasaozi anyị.
Puku kwụrụ puku ndị otu ekpere ya gbakọrọ taata bụ ụbọchị ụka nke Jan 15 , 2023 iji soro ya bụ ụkọchukwu na mmemme iji kelee chukwu dịka o siri kwuo.
Cheta na katọlik diocese Enugwu nke Bishop Callistus Onaga nọ n'isi ya nyere fada Mbaka ntaramahụhụ nwa mgbe nta sị ya gaa kpee ekpere na Monastery.
Ebe foto si, screengrab
Ebe foto si, Screengrab
Fada Mbaka gara ya bụ njem ekpere na monastery dị na Naijiria nakwa nke dị na Califonia mba Amerika.
Ọlaghachịrị Enugwu n'ụbọchị anọ nke ọnwa Janụwarị afọ a.
Ogige Adoration juputara n'igwe mmadụ na ụgbọala ha dịka ha bịara ụka Mass mbụ Mbaka dịka o si ndopu iche nke ekpere lọta.
Mmadụ 68 alaala mmụọ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Nepal
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ iri isii na asatọ ka a ma larala mmụọ ugbua n'ihe mberede ụgbọelu nke mere na mba Nepal taa bụ Sọnde, Jenụwarị 15, 2023, dịka ndị ọchịchị mba ahụ si kwuo.
Ụgbọelu a nke ụlọọrụ Yeti Airlines nwe si mpaghara Kathmandu na-aga Pokhara tupu ọ kpọkasịa na nso ọdọụgbọelu dị ebe ahụ.
Ihe onyonyo na-efesa na soshal midịa gosiri ụgbọelu ahụ dịka ọ na-ada na mpaghara ahụ ebe ọtụtụ mmadụ bi.
Divya Dhakal bụ otu onye bi nso ebe ihe a mere gwara BBC na o ji ọsọ gbaga ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị.
"Tupu mụ erute ebe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ejula ebe ahụ, nnukwu anwụrụ si ebe ụgbọelu ahụ dara na-apụta, o teghị aka, ndị ọrụ enyemaka ji ụgbọelu helịkọpta bịa," Dhakal kwuru,
Mmadụ 68 nọ n'ụgbọelu ahụ oge ọ dara, iri na ise n'ime ha bụ ndị abụghị ndị obodo Nepal.
Ndị ojiegbe egbuola otu onye 'Knight' na Mbano, gbaa ozu ya ọkụ
Ebe foto si, Knights of St John
Nkọwa foto, Akụkọ a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ
Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo otu onye ji ọkwa 'knight' n'ụka Katọlik n'ụbọchị Satọde, abalị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.
Ihe a mere n'obodo a na-akpọ Ibeowerre Agbaja nke dị n'okpuru ọchịchị Ehime Mbano n'Imo Steeti.
Otu ụkọchukwu na-arụ na mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na aha nwoke ahụ bụ Sir Theodore Anosike.
"Ọ bụ mmadụ umeala, ọ naghị achọ nsogbu, anyammiri ejula onye ọbụla anya," ụkọchukwu a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru.
"Ndị ojiegbe na-achọ ikpochapụ mmadụ niile n'Imo Steeti, amaghịkwa m ma ntuliaka 2023 ọ ga-enwekwa isi ebe a."
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam azaghị oku nakwa ozi ekwentị anyị zigaara ya maka akụkọ a.
Cheta na ọ bụkwa n'ụbọchị Satọde, Jenụwarị 14, ka ndị ojiegbe wakporo obodo Akokwa nke dị n'okpuru ọchịchị Ideato North n'Imo Steeti.
Mwakpo a mere n'ụlọ otu nwoke aha ya bụ Ikenga Imo Ugochinyere onye bụ onyeisi otu jikọrọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Coalition of United Political Parties' (CUPP).
Ugochinyere na-azọkwa ịnọchite anya mpaghara Ideato North na South n'ụlọ omeiwu Naịjirịa.
Nwa amadị ahụ kwuru na ndị ojiegbe a gburu nwanne nna ya ma gbakwaa ọtụtụ ụgbọala n'ụlọ ya.
Etu ndị ojiegbe si wakpo ma gbuo ụkọchukwu Katọlik na Niger Steeti
Ebe foto si, Minna Diocese
Nkọwa foto, Fr Issac Achi
Ndị ojiegbe awakpola otu ụlọụka Katọlik n'obodo Kafin Koro ma gbuo ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka ahụ bụ Isaac Achi.
Nke a mere n'isi ụtụtụ taa bụ Sọnde, ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị 2023.
Ndị bi na mpaghara ahụ na-ekwu na ọ bụ n'ebe elekere nke mbụ nke isi ụtụtụ ka ndị omekome mere mwakpo a.
Ha gburu Fr Achi ma gbaa ozu ya ọkụ n'ime ụlọ ya, ma gbakwaa osote ya bụ Fr Collins Omeh egbe, mana ọ nwụghị.
E burula Fr Omeh gawa n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị uweojii Niger Steeti kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie, mana tupu ndị ọrụ ha agbataruo ebe mwakpo a na-eme, ndị ekperima ahụ agbaala ọsọ.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Niger steeti bụ Abiodun Wasiu kwuru nke a, ma kwukwaa na eburula ụkọchukwu nke ọzọ mgbọ tụrụ n'aka gawa ụlọọgwụ.
Mwakpo ndị ụkọchukwu na mpaghara Ugwu
Dịka enweghị nchekwa na-arị elu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, mwakpo ụlọụka nakwa ụlọ okpukperechi dị icheiche na-arịkwa elu.
N'ọnwa Mee afọ 2022, ndị ojiegbe wakporo ụlọụka Katọlik St Vincent Ferrer dị na Katsina, na dayọsis Sokoto, gbuo otu ụkọchukwu ma tọrọ ụkọchukwu ọzọ.
Ha mechara tọhapụ ụkọchukwu nke ha tọọrọ dịka abalị olemole gachara.
Ihe ruru mmadụ iri anụọla n'ihe mberede okporoụzọ nke mere n'ụzọ Lagos-Ibadan n'ụbọchị satọde.
Onyeisi ndị ọrụ nchekwa ụzọ bụ FRSC n'ịchafụ bụ Ahmed Umar gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ihe mere n'ezie n'ihe dịka elekere anọ nauma nke ụtụtụ.
Umar kwuru na ọ bụ oke ọsọ ụgbọala nke bụ ndị na-eme njem na-agba nakwa gwongworo nọchịrị ụzọ butere ya bụ ihe mberede.
O kwuru sị, " ọ bụ mmadụ 19 ka ihe mberede a metụtara ebe ụmụnwoke asaa, ụmụ nwaanyụ abụọ na nwantakịrị nwaanyị nwụrụ na ya bụ ihe mberede"..
Umar ji ohere a dụọ ndị ọkwọọ ụgbọala ndụmọdụ ka ha tinye ọkụ ụgbọala ha iji hụ ụzọ nke ọma ma sịkwa ka ndị ụgbọala ha mebiri tinye ihe na-egosi na e nwere ụgbọala mebiri emebi n'ebe ahụ.
A họpụtala Soludo dịka onye ndu Apga
Ebe foto si, Anambra Government
Komiti ndịisi otu “All Progressives Grand Alliance, (APGA),
ahọpụtala gọvanọ Anambra steeti Chukwuma
Soludo dịka onye ndu pati ahụ.
E ji ọnụ mee ya bụ ntụliaka n’ọgbakọ ndị iis pati ahụ n’ n’’
International Convention Center’ n’Ọka ebe ndị nọ n’otu ahụ nọrọ họpụta Soludo dịka onye ndụ .
Onyeisioche pati ahụ bụ Ozonkpu Victor Onye yere Soludo asambodo nhọpụta n’ihu ndịisi pati ahụ, “
“Ihe Gọvanọ anyị na-eme dị Apga na ndịisi APga mma”
“ Anyị na-akwalite ihe ndị ga-eme ka ọchịchịonyekwuocheya na
out Apga tọọrọ atọ n’ọdịn’ihu.”
N’ọsịsa ya, Soludo kwuru naọ bụ ihe ọnụ nakwere nkwa’ ịkwalite
pati ahụ dịka Odumegwu Ojukwu bụ onye ndu mbụ otu ahụ nakwa Willy Obiano bụ onye nke abụọ.
Emerefuru m ya nde Naira 60, ọ hapụ lụọ di - Nwoke Chaina a si gburu enyi ya nwaanyị
Ebe foto si, BBC/ ABDULLAHI ABDU
Otu nwoke Chaina e ji eji maka ebubo isggbu enyi ya nwaanyị akọrọla Ụlọikpe Ukwu dị na Kano ije ha abụọ...
Frank Geng-Quangrong, gwara ụlọikpe na ya hụrụ Ummukulthum Sani gbara afọ 22 ma mefuo ego ruru nde naira 60 n'isi ya dịka ya nwere ebumnobi ịlụ ya.
Mana nwa ada ahụ mewara ya obi, gbahapụ ya ga lụọ onye ọzọ.
Geng-Quangrong, onye si nọ ọnụ taprịta were kwuo okwu gwara ụlọikpe sị, "N'ọnwa Juun afọ 2020 ka Ummukulthum natara akara ekwentị m n'aka otu enyi ya were kpọọ m, sị na ọ hụrụ m n'anya, na site n'ike nke Chukwu na ọ ga-alụ m"?
."Anyị malitere tọwa ụtọ n'ọnwa Julai afọ 2020."
"Ọ malitere na-ana m ego. Ana m enye ya ego nile ọ na-ana m n'ihi na a hụrụ m ya n'anya."
"Ezigara m ego dị N60mI n'akpa ego ya n;ụlọakụ,; Nde Naira 18 maka ibido ahịa, nde naira anọ maka ụlọ nakwa nde naira isii maka agụmmakwụkwọ mahadum."transfer ova ₦60 million to her bank account. ₦18 million for her to start business, ₦4 million for house and ₦6 million for University."
Geng-Quangrong, kwukwara na ugboro ugboro na ya na-aga n'ụlọha eduru ya aga nkwarị abalị, na nne nwaagbọghọ ahụ na-anabata ya nke ọma.
Nwa amadi a kọwara na obi gbawara ya ka o ruru ọnwa Febụwarị afọ 2021,Ummukulthum gbahapụ ya ga lụọ di ọzọ.
Obimgbawa ahụ bere o jiri hapụ Kano gawa biri n'Abuja.
Nwa mgbe nta, bin marry anoda pesin and di heartbreak make am comot go Abuja.
Ummukulthum "gaara n'ihu na-akpọ m ma na-ezitere m ozi n'ekwentị. na -ana m ego".
O kwuru na abalị 12 nke ọnwa Septemba afọ 2022, Ummukulthum nara ya ego si na ọ chọọ iji ya gaa n'ihu n'ụlọ ọ na-arụ n'Abuja, ya sị ya na ya enweghị ego., ọ kwụsị ịza ekwentị ya.
"O chere na m enweghịkwa ego ọzọ na ọ bụ ya mere na m achọghị ịna-emefu ego n'isi ya ka m si eme na mbụ."
O were zitere m foto otu nwoke si m na ọ bụ onye ọbụ ya na ya ugbua nke a gbasuru m iwe."
Ebe foto si, BBC/
Ihe Mịnịstrị Ikpe na-ekwu maka ikpe a
Ọkapike ji ikpe ahụ bụ Jọstis Sanusi Ado higharịrị ikpe ahụ bụ oge a na-ele nya ịkpọpụta ndị akaebe ndị ọzọ.
Mịnistrị ikpe na-ekwu na ha ga-esochi ikpe ahụ hụ isi ya.
Hajiya Aisha Mahmud bụ direktọ Mịnịstrị ikpe na Kano kwuru na ọ bụ ha wepụrụ okwu ụlọikpe
Ebe foto si, Ummukulthum
Etu okwu si bido
Ezinaụlọ nwaada Ummukulthum na ndị bi ha nso na Janbulo ebe o bi kwuru na ha ma na mmadụ abụọ ahụ na-ayị mana ha amaghị ihe seere ha okwu.
Ha kwuru ha ha hụr u ozu Ummukulthum dịka e bere ya olu n'abalị Fraide.
Bappa Sani bụ onye bi nso be Ummukulthum gwara BBC Pidgin na nwaada ahụ alubuo la di lọta tupu ya na nwoke Chaina ahụ ayịwa.
O kwukwara sị, " n'abalị ụnyahụ bụ Fraide, apụụ m apụ, anọịọghị n'ụlọ mana ndị be ha kpọrọ gwa m ihe mere. na nwoke Chaina wụrụ aja were bata n'ọnụlọ ya, tupu o gbuo ya."
Ahmad Abdullahi bụ onye ya na ezinaụlọ Ummukulthum na-adị na mma kwuru na ya nọbu n'ime ụlọ ahụ tupu ya zọpụ iri nri pụta ndị mmadụ gbakọjuo n'ihu ụlọ ahụ.
“Be Ummu ka m na-anọkarị n'ihi na ezinaụlọ ha dịka nke m. Mụ na nwanne ya nwoke zọpụrụ ka anyị gaa rie nri ebe Elekere 9.35 nke abalị ,mgbe anyị ji pụta ndị mmadụ ejula n'ụlọ, ọ bụ ha gwaziri anyị ihe mere."
“Geng na Ummukulthum na-ayị ogologo oge tupu ya alụọ di."
"Onye ọbụla nọ n'ụlọ ma ya, ụfọdụ ha apụghị, ha na ha na-anọ n'ụlọ ebe a na-akparịta ụka."
“Ihe m ma bụ na ha na-ese okwu na nsonso a, nọ si ya na ya achọghịkwa, nke mere ka o wee iwe."
“Ọ bụ ka Geny na-agba ọsọ ka ndị mmadụ jidere ya dịka ọ gbaburu ọsọ ma lọghachi ịba buru ụgbọala ya, ka e jidere ya."
“Anyị bugara Ummu ụlọọgwụ ebe ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla n'ihi nnukwu ọbara pụrụ ya n'ahụ."