Anyị ejichiela ụfọdụ ndị na-ejichi naịra ọhụrụ - DSS

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ahụbeghị ego naịra ọhụrụ a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ahụla ozu onye ntaakụkọ ọnụ na-aghọ nkọ na Cameroon dịka o furu kemgbe Tuzde

    A hụrụ ozu ya n'isi obodo Cameroon bụ Yaounde ebe ọ tọgbọ n'ala nkiti.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A hụrụ ozu ya n'isi obodo Cameroon bụ Yaounde ebe ọ tọgbọ n'ala nkiti.

    Otu onye ntaakụkọ na-arụ n'otu ụlọọrụ redịo nke mba Cameroon foro efu kemgbe Tuzde abụrụla onye lara mmụọ dịka a hụrụ ozu ya ugbua.

    A na-eche na ofufu ya so ntọrọ dịka enweghi onye nọrọ ozi ya kemgbe ahụ.

    Martinez Zogo bụ onye onyeisi ụlọọrụ Amplitude FM nakwa onye na-ahazị okwu na-amasị ndị mmadụ na Redịọ ahụ bụ 'Embouteillage' bụ onye e ji etu o si ekwupụta ebubo nrụrụaka na nzufu ego mara.

    E kwuru na ọ na-aebuso ndị ọgaranya nakwa ndị ọchịchị agha site n'ozi mkpuhe ọ na-ezipụta n'ụlọọrụ Amplitude FM.

    Otu ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ nakwa nwunye Zogo gbara ama ha hụrụ ozu ya n'isi obodo Cameroon bụ Yaounde ebe ọ tọgbọ n'ala nkiti.

    Otu ndị na-alụ ọgụ ikike dịrị onye na-ekwu na ndị uweojii nọrọ ụda otu ihe mere oke mkpọtụ n'akụkụ ụlọọrụ ha dịka ha hụrụ ụgbọala Zogo nke a sị tipịasiri etịpịa.

    Ha kwukwara na a hụrụ ebe otu ụgbọala dị ojii gbapụrụ ebe ahụ tupu ndị uweojii apụta ezi n'uju.

  2. Boris Johnson awụbala Ukraine ọzọ

    Mgbe onyeisiala Volodymyr Zelensky  zutere Boris Johnson na Kyiv.
    Nkọwa foto, Mgbe onyeisiala Volodymyr Zelensky zutere Boris Johnson na Kyiv.

    Onye bụbu Praịm minista mba Briten bụ Boris Johnson emeela njem gaa Ukraine dịka ọ wụchiri na Kyiv bụ isi obodo mba ahụ n'ụbọchị Sọnde.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky pụtara zute ya. Nke a na-abịa dịka onyeisiala Zelensky kpọrọ ya oku ka ọ bịa nke o kwuru bụ ezigbo ihe "ugwu" dịrị ya.

    Njem a so okwu ọhụrụ na-adapụta n'isi Johnson nke na-enyo akụnụba ya na mba Briten. Ebubo ọhụrụ pụtara na nso nso a na-ekwu na onyeisioche BBC bụ Richard Sharp nyere Johnson aka nweta ego mbịte n'aka otu ụlọakụ mgba ọ ka bụ Prịam minista.

    Nke a bu tupu gọọmentị ahọpụta Sharp dịka onyeisioche BBC. Dịka Johnson mere njem a, o kwughi okwu ọbụla banyere ebubo ndị a na-adapụta.

    Zelensky zipụtara ozi na Telegram dee "Ana m anabata Boris Johnson, ezigbo enyi mba Ukraine nakwa Kyiv. Boris, daalụ maka nkwado gị!" E kwuru na Johnson gara mpaghara Bucha na Borodyanka.

    Cheta na dịka ndị Ukraine chụpụrụ ndị agha Russia na-akpa ike n'obodo abụọ ahụ na a hụrụ ozu ndị nkiti ebe ha tọgbọcha n'okporoụzọ.

    Na njem a, Johnson kwuru "Ahụhụ ndị Ukraine na-ata ugbua agafeela ogologo oge." "Etu agha ga-esi bie bụ ịhụ na Ukarine nwetere mmeri, na ha nwetere ya ngwa ngwa."

    "Putin kpụọ afọ n'ala ngwa ngwa, ọ ga-akara Ukarine nakwa ụwa niile mma".

    E kwuru na Rishi Sunak bụ Praịm minista Briten ugbua kwadoro njem a Johnson mere gaa Ukraine. Johnson emeela njem gaa Ukraine ugboro ugboro kemgbe Russia malitere iwakpo ha.

    Njem ndị a bụ ma mgbe ọ bụ Praịm minista nakwa mgbe o sirila n'ọkwa ahụ pụọ.

    Mgbe Boris Johnson zutere ụfọdụ ndị ọchịchị mba Ukraine na Kyiv.
    Nkọwa foto, Mgbe Boris Johnson zutere ụfọdụ ndị ọchịchị mba Ukraine na Kyiv.
  3. Ihe ị kwesịrị ịma maka mwakpo tara isi mmadụ 10 na California

    Ogige ebe ya bụ mwakpo mere.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogige ebe ya bụ mwakpo mere.

    Mwakpo a na-eche kachasị na nso nso a na mpaghara California nke mba Amerịka mere n'ụbọchị ụka dịka otu nwoke a na-enyo n'okwu mwakpo a dị afọ 72 wụbatara n'ime ogige ụlọ ebe ndị mmadụ na-agba egwu ma malite ịkwa ndị mmadụ mgbọ.

    Nke mere n'ogige Monterey Park. Nke a na-eme dị ndị agbụrụ Asia na-eme emume ncheta afọ ahụrụ ha nke a na-akpọ 'Lunar New Year' na Bekee.

    Akụkọ na-ekwu na puku kwuru puku ndị agbụrụ ahụ kpọtara ebe ahụ na-enwe aṅụrị tupu ya bụ nwoke nke a sị aha ya bụ Huu Can Tran amalite ịgba ndị madụ egbe.

    Ndị uweojii mba ahụ na-ekwu na amabeghị ebumnobi ya bụ nwoke na mwakpo a dịka e kwuru na mmadụ 10 nwụrụ ebe ihe a na-eche ruru mmadụ 10 ndị ọzọ merụrụ dịka ụfodụ n'ime ha nọ n'ezigbo ọnọdụ ahụike ọjọọ.

    E kwuru na ndị mmadụ gbara mbọ napụ ya bụ nwoke egbe o ji mee mwakpo ahụ tupu ọ gbaa ọsọ ma gbapụ. Ndị uweojii mba ahụ gbara ama na nnyocha ha gosiri na o zubere ịga ogige ebe a na-agba egwu ọzọ nọ nso Alhambra n'ebe ahụ ma mekwa mwakpo ọzọ.

    Ngalaba uweojii nke SWAT mechara gbaa otu ụgbọala okirikiri dịka a hụrụ otu nwoke a na-eche mere ya bụ mwakpo ebe ọ gbagburu onwe ya n'ime ya bụ ụgbọala.

    Ndị uweojii anatala egbe abụọ eche eji mee ya bụ mwakpo dịka ndị uweojii Sheriff Luna na-ekwu ka amalite ezigbo mkparịtaụka ga-elebe anya etu ndị mmadụ si azụte ma enwe egbe na mba ahụ.

    Nyocha gosikwara na ndị ya bụ mwakpo metụtara bụ ndị okenye dị ebe afọ 50 ma gafee. Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden enyela iwu ka eme nnyocha ngwa ngwa ma chọpụta etu ihe a siri mee.

    Ụgbọala a na-eche ya bụ nwoke a na-enyo nọ n'ime ya.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụgbọala a na-eche ya bụ nwoke a na-enyo nọ n'ime ya.
  4. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, unu asaala chi?

    Leekwa akụkọ ndị kwesịrị ịmasị gị taa.

  5. Ndị ọgụ nnwereonwe Ambazonia ekwetela inwe mkparịtaụka maka udo

    Ambazonia

    Gọọmentị mba Canada ekwupụtala na gọọmentị mba Cameroon na ndị otu dị icheiche na-azọ nnwereonwe na mba ahụ ekwetela inwe mkparịtaụka iji weghachi udo na mba ahụ.

    Mịnịstrị mba Canada na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    "Canada nabatara nkwekọrịta nke a iji malite usoro zuru oke maka udo na ịkwụsị ọgbaaghara niile," Mịnịsta Mélanie Joly nke mba Canada kwuru.

    Joly kwuru na gọọmentị Candata anabatala ịnọ n'isi atụmatụ a nke ga-enye aka ka ndị otu nnwereonwe ahụ họpụta ndị isi ga-eso na kọmiti ga-ekpe udo.

    Mélanie Joly

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mélanie Joly, Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Canada na mba ndị ọzọ

    Ọgbaaghara malitere na mba Cameroon n'afọ 2017 n'ihi na ndị bi na mpaghara mba ahụ ebe a na-asụ asụsụ English kwuru na gọọmentị na-emekpa ha ahụ ma na-akpachapụ ha n'akụkụ.

    Cheta na Cameroon nwere mpaghara abụọ - ndị na-asụ asụsụ French bụ ndị ka n'ọnụọgụgụ, na ndị na-asụ asụsụ English, ndị ọnụọgụgụ ha ka dị nta.

    Kamgbe afọ 2017 ahụ ndị ọgụ nnupuisi dị icheiche na-ebuso ndị agha mba Cameroon agha na mpaghara ndị na-asụ asụsụ English dịka ha na-achọ ikewapụ ma bụrụ mba nke onwe ha a kpọrọ Ambazonia.

    N'afọ 2019, e nwere ọgbakọ ebe a nọ nye mpaghara ndị a na-asụ asụsụ bekee ọnọdụ pụrụ iche, mana nke a emeghị ka ọgbaaghara kwụsị, kama ọ kawanyere njọ.

    N'afọ 2021, otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) na otu Ambazonia Governing Council nwere nkwekọrịta ijikọ aka ọnụ maka mbọ ha na-agba inweta nnwereonwe Biafra nakwa nke Ambazonia.

    Ihe ruru mmadụ 6000 anwụọla n'ọgbaaghara maka nnwereonwe Ambazonia, ebe ihe karịrị mmadụ 800,000 agbaala ọsọ pụọ n'ụlọ ha; o metụtakwara agụmakwụkwọ maka ụmụaka ọnụọgụgụ ha ruru 600,000.

    Otu ndị na-azọ nnwereonwe binyere aka n'akwụkwọ iji kpaa udo gụnyere: Gọọmentị Camroon, otu 'Ambazonia Governing Council' na ndị agha ha bụ 'Ambazonia Defence Force'; otu 'African People's Liberation Movement' na ndị agha ha bụ 'Southern Cameroons Defence Force'; otu a na-akpọ 'Interim Government'; nakwa otu 'Ambazonia Coalition Team'.

    "A na-atụ anya na otu ndị ọzọ ga-esonyekwa n'atụmatụ udo a n'oge adịghị anya," gọọmentị mba Canada kwuru.

  6. "Onweghị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị awakporo ma metọọ n'ike" - Unizik

    Unizik

    Ebe foto si, Unizik

    Ụlọakwụkwọ Mahadum Nnamdi Azikiwe nke dị n'Awka, Anambra steeti ekwuola na akụkọ na-ekwu na a wakporo ma metọọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị itoolu n'ike bụ asị.

    Ha kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Chika .G. Ene wepụtara n'ụbọchị Satọde.

    Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na enweela ụfọdụ izu ohi na mpaghara Ifite, bụ ebe ụfọdụ ụmụakwụkwọ anyị bi, mana nnyocha anyị mere gosiri na akụkọ mwakpo na mmetọ ụmụakwụkwọ abụghị eziokwu."

    Ene kwuru na mahadum Unizik na ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche nwere ọgbakọ n'ọdị nso a ebe ha nọrọ kpaa maka ọnọdụ nchekwa n'okirikiri ụlọakwụkwọ ahụ na etu a ga-esi mee ka ọ ka mma.

    "Ọzọkwa bụ na ndị isi Mahadum a etinyekwala ndị ọrụ nchekwa na-abụghị nke gọọmentị iji nye aka wulite ọnọdụ nchekwa," Ene kwuru.

    "Anyị na-arịọ ndị ntaakụkọ ka ha kwụsị ibu akụkọ na-abụghị eziokwu nke nwereike ime ka obi na-amapụ ndị mmadụ."

    Unizik

    Ebe foto si, Unizik

  7. Ọrịa Cholera egbuola mmadụ 60 n'otu mpaghara na Cross River Steeti

    Onye nọ n'ụlọọgwụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mpaghara Obubra nke dị na Cross River Steeti etiela mkpu ma kpọkuo gọọmentị steeti ahụ maka enyemaka dịka ha kwuru na ọrịa 'cholera' na-achọ ikpochapụ ha.

    Ha kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii alaala mmụọ n'ọdị nco a n'ihi ya bụ ọrịa ebe ihe karịrị mmadụ narị abụọ ka nọ n'ụlọọgwụ n'ihi ya.

    Ụlọntaakụkọ Channels TV kwuru na ọ bụ naanị otu osimiri dị na mpaghara ahụ ka ndị obodo si enweta mmiri ọṅụṅụ nakwa nke ha ji eme ihe ndị ọzọ n'ụlọ.

    Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Ovan Robert kwuru na ya bụ ihe dị nnukwu njọ maka na ha dịziị ka ndị gọọmentị jụrụ ajụ.

    Eze Robert rịọrọ gọọmentị ka ha gbapuo ụmị mmiri (borehole) olemole na mpaghara ahụ ka ndị mmadụ nwee ebe ọzọ ha ga-esi na-enweta mmiri ọṅụṅụ na-abụghị naanị site n'osimiri.

    Mpaghara Obubra bụ otu n'ime okpuruọchịchị iri na asatọ dị na Cross River Steeti, aka ọrụ ndị mpaghara ahụ gụnyere ịkụ azụ, ịkọ ugbo nakwa igwupụta site n'osimiri nke ha na-ere.

    Kọmishọna ahụike Cross River Steeti bụ Janet Ekpenyong gara leta mpaghara ahụ ma kwe nkwa na gọọmentị ga-etinyere ha mmiri ọṅụṅụ dị mma.

    Ọ rịọkwara ndị obodo ka ha gaa ụlọọgwụ oge ọbụla ha chọpụtara ihe dị iche n'ahụike ha karịa ịṅọ n'ụlọ were aka ha na-aṅụ ọgwụ.

    Ekpenyog kwuru na gọọmentị ga-amalitekwa atụmatụ nkuzi ọha iji kọwaara ndị mmadụ ụzọ dị icheiche ha ga-eji zeere ibute ọrịa na-efe efe.

  8. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ abọọla chi.

    Kedụ ka eke si anya anwụ?

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

  9. Ọ bụghị ndị otu APC ka awakporo n'Ebonyi steeti - Ndị uweojii

    Njirimara otu APC

    Ebe foto si, APC Twitter

    Ndị uweojii n'Ebonyi steeti ekwuputala na mmadụ abụo amabeghi ndị ha bụ nwụrụ n'Ebonyi steeti n'abalị ụbọchị Fraịde.

    Chris Anyanwu bụ onye kwuru nke a dịka ọdachi ahụ mere n'obodo Mkpuma Aakataka dị n'okpuruọchịchị Izzi dị na steeti ahụ.

    Cheta na akụkọ na-ekwu na ọ bụ mmadụ abụo nọ n'ọgbatumtum wakporo ọgbakọ ụfọdụ ndị mmadụ n'obodo ahụ echeere bụ ndị otu APC na-eme ma gbuo ndị ahụ.

    Mana Anyanwu kwuru na ọ bụghị ndị APC na-eme nzụkọ kama ndị nkịtị bi n'obodo ahụ.

    Ọ gara n'ihu gwa ndị obodo ahụ ha gbajọọ akụkọ ụgha na-efegharị na ọ bụ ndị otu APC na-eme nzụko ebe agbagburu ndị mmadụ.

  10. A dala Praim Minista Britem nha maka eyighị 'seatbelt'

    Rishi Sunak

    Ebe foto si, Reuters

    A daala Praim Minista Briten bụ Rishi Sunak nha maka eyighị ụdọ oche ụgbọala oge n’ime ụgbọala na-aga aga n’ihe onyonyo shoshal midia, dịka ndị uweojii Lancashire si kwu.

    Ụlọọrụ Praim Minista kwuru na Sunak gbara afọ 42 dahiere ma rịọ maghara ma kwụkwaa na ọ ga-akwụ ng=ha ahụ a dara ya.

    Ihe onyonyo ahụ nke e tinyeburu n’akara Instagram Sunak ibụ ozi nkwalite mbọ gọọmentị na-agba ike ajị n’ume ka gọọmentị si emefu ego iji nyere ndị ime ime obodo aka.

    A na-ada onye njem ekeghị ụdọ oche ụgbọala ọ nọ n'ime vya nha otu narị paunds.

    Mana ọ bụrụ na okwu ahụ gaa ụlọikpe ị mara na onye ahụ ga-akwụ ihe ruru paụnds narị ise.

    Priam Minista nọ na Lancashire oge e sere ihe onyonyo ahụ dịka ọ na-aga mpaghara Ugwu Ingland.

  11. PDP asịla Chimaroke,Chris Ogbu chịsa ọwa nwa mgbe nta

    Chimaroke Nnamani Chris Ogbu

    Ebe foto si, Chimaroke Nnamani/Chris Ogbu

    Otu PDP agwaala aka Chịburu Enugwu steeeti bụ Chimaroke Nnamani nke Enugwu steeti ,nas onyeji aha pati ha azọ ọkwa ịnọchite Ideatọ-South n’Ụlọomeiwu Imo steeti bụ Chris Ogbu ka ha ka ha nọrọ n’ụsọ nwa mgbe nta n’ihi ha kpọrọ “ịkpa agwa megidere pati” ha.

    N’ozi ha , nke odeakwụkwọ mgbasaozi pati ahụ bụ Debo Ologunagba binyere aka ma wepụtara n’ụbọchị Fraide, pati ahụ kwuru sị, “Ndị imeobi otu People’s Democratice Party’ tụlechara etu ihe gbasara pati anyị si aga n’ala Naijiria dịka o si dị n’iwu paty anyị nke a hazigharịrị n’afọ 2017 were binye akanka Senetọ Chimaroke nnamani na Chriis Ogbu nọrọ n’ụsọ malite taa bụ Friade abalị 20 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 maka ebuboịkpa agwa megidere pati.”

    Na nsọ nsọ a, Nnamani bụ Senetọ na-anọchite Enugu-East n’Ụlọomeiwu ezoghị nkwado ya nye onye na-azọ ọkwa onyeisiala n’aha APC bụ Bola Ahmed Tinubu site n’ozi ọ na-ewepụta na akara ya na soshal midia.

    Ozi agụ gara n’ihu kwuo na PDP kwụsịkwara ndị pati ha mmadụ asaa ndị ọzọ n’Ekiti steeti.

    Ha gụnyere Fayose Oluwajomiloju, nwa aka chịburu steeti ahụ bụ Ayo Fayose, Ayeni Funso, Ajijola Lateef Oladimeji, na Emiola Adenike Jennifer

    Ndị ọzọ gụnyere , Ajayi Babatunde Samuel,Olayinka James Olalere na Akerele Oluyinka

  12. Ndewoonu!

    Igbo, ya gazie!

    Ihe ọma mere onye elu, mere onye ala!

  13. Ụlọikpe kachasị enyeghachila Godswill Akpabio ikike ịzọ ọkwa Sinetọ na ntuliaka 2023

    Godswill Akpabio

    Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa atụgharịala ikpe nke ụlọikpe mkpesa nyere napụrụ Godswill Akpabio ikike ịzọ ọka Sịnetọ na ntụliaka na-abịa.

    Nke a pụtara na Akpabio bụbu Minista ihe gbasara Niger Delta ga-efe ọkọlọtọ APC n'Akwa Ibom North na ntuliaka ahụ.

    Cheta na ụlọikpe mkpesa napụrụ ya ikike ahụ n'ọnwa Nọvemba afọ 2022 mana ọkaikpe Ibrahim Saulawa bụ onye nụrụ ikpe ahụ kwuru na mkpesa Akpabio mere kwụ ọtọ.

    Cheta na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyebuola ya ikike ịzọ ọkwa ahụ ma gaa n'ihu gwa Inec ka ha tighachi aha ya dịka onye ga-anọchi anya APC na ntuliaka ahụ.

    Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Akpabio e nwere nkewa n'ime otu APC n'Akwa Ibom nke mere ka e nwee ntuliaka imeụlọ abụọ ma họpụta mmadụ abụọ ga-azọ oche ụlọomeiwu ahụ.

    Mana ụlọikpe ukwu kwuru na ọ bụ ntuliaka imeụlọ nke e mere n'ụbọchị 9 nke ọnwa Juun bụ nke ezigbo ya nke mere na Godswill Akpabio ritere ikike ịzọ ọkwa ahụ.

  14. O nwereike agaghị eme ntuliaka n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa – EU

    Ndị na-akwado onye na-azọ ọkwa ọchịchị

    Otu European Union (EU)adọọla aka na ntị na e nwereike agaghị eme ntuliaka n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa n’isi ọnọdụ nchekwa dị njọ.

    Rudolf Elbling bụ onyeisi ngalaba EU a kpọrọ ‘Support to Democratic Governance’ na Naịjirịa kwuru nke a n’Abuja na Tọzde 19 Jenụwarị 2023.

    O kwuru na ọnọdụ nchekwa dị njọ na n’ụfọ mpaghara Naịjirịa nwereike ime ka a ghara ime ntuliaka n’ebe ndị ahụ bụ nke nwereike ime ka okwu a pụọ n’ụlọikpe.

    Mana onyeisi ụlọọrụ INEC na-ahazi ntuliaka bụ Mahmood Yakubu gwara BBC na ha enweghi atụmatụ ịkagbu maọbụ ịdọtị oge a ga-eme ntuliaka.

    Ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu ga-abụ n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023, ebe nke gọvanọ ga-abụ n’ụbọchị 11 Maachị 2023.

  15. Festus Keyamo agaala ụlọikpe ịmanye ka enyochaa Atiku maka mpụ na nrụrụaka

    Festus Keyamo n'onwe ya bụ ọkaikpe. Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.

    Ebe foto si, Getty Images and @Atiku/Twitter

    Festus Keyamo bụ otu ọnụ na-ekwuchitere Bola Ahmed Tinubu agbaala onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha otu PDP bụ Atiku Abubakar akwụkwo n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

    Nke a bịara dịka abalị atọ o nyere ngalaba EFCC, ICPC nakwa ndị ọzọ ịkpọ Atiku oku ma gbaa ya ajụjụ maka mpụ na nrụrụaka gafechara.

    N'ozi o weputara n'akara Twitter ya, o dere "...a gaa la m ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ịme ka ha (ngalaba ndị ọ kpọrọ aha) kpoo Atiku oku ma mee ya nyocha gbasara iji ụlọọrụu adigboroja ezupu ego.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Ndị ojiegbe atọrọla onyeisioche Ideato North ma gbaa ụlọ ya ọkụ

    Chris Ohizu bụ onyeisioche Ideato North LGA, Imo Steeti

    Ebe foto si, Chris Ohizu

    Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ atọrọla Chris Ohizu, onyeisioche okpuruochichi Ideato North, Imo Steeti.

    Nke a mere n’abalị ụbọchị Tọzde 19 Jenụwarị, 2023 mgbe ndị a wakporo ụlọ ya dị n’obodo Imoko, Arondizuogu ma gbaa ụlọ ya ọkụ.

    Otu onye gwara ndị ntaakụkọ na ndị ojiegbe a gbara Ohizu egbe n’ụkwụ tupu ha tọrọ ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ.

    “A gbara ya egbe n’ụkwụ tupu ha a tọrọ ya, nwoke a ka si n’ụlọ ụgwọ lọta mgbe ihe a mere.”

    Onye ọzọ kwuru na ọ dịla anya ha tiwere mkpu banyere ọnọdụ nchekwa dị n’obodo Arondizuogu na-akpọ oku ka ndị nchekwa gbatara ha ọsọ enyemaka.

    “Kamgbe afọ gara aga ka m tiwara mkpu na o nweghi ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa nọ n’Arondizuogu, anyị na-agbazi ekpere chi ugbua.”

    Mgbe a kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo bụ Henry Okoye, ọ sị na ọ ga-enyocha ma nke a ọ bụ eziokwu ma zaghachị.

    Mana tupu akụkọ a apụta ọ zaghachịbeghi.

    Mwakpo a na-abịa na-erughi otu izuụka a wakpochara ọnụ na-ekwuru otu ‘Coalition of United Political Parties bụ Ugochinyere Imo, gbaa ụlọ ya na ọtụtụ ụgbọala ọkụ ma gbuo mmadụ atọ n’obodo ya Akokwa dị n’Ideato North.

    N’otu aka ahụ, e gbukwara di na nwunye chọrọ ịgba akwụkwọ na nwanne ha nwoke n’otu obodo Arondizuogu na mbido afọ a.

  17. Rust film: A ga akpụpụ Alec Badwin ụlọikpe maka igbu mmadụ n’ihe ejije

    Alec Baldwin

    Ebe foto si, Getty Images

    A ga-akpụpụ omee ihe ejije Amerika a ma bụ Alec Baldwin n’ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ n’amaghị ama maka mgbagbu oseihe ihe onyonyobụ Halyna Hutchins bụ onye o ji egbe e ji eme ihe ejije gbagbuo.

    Baldwin bụ onye ejije mabụụ ọkpaọchị a ma ama maka ihe ejije gụnyere "Beetlejuice", "Working Girl", "Married to the Mob" nakwa "Alec Baldwin Show".

    Baldwin na-amụ ihe ejije ha na-akwado ime a kpọrọ ‘Rust' oge ya bụ ihe mere na Sante Fe dị na Mexico n’ọnwa Oktoba afọ 2021.

    A ga-akpụpụkwaHannah Gutierrez Reed,bụ onye nlekọta ngwaọgụ e ji eme ihe ejije ụlọikpe.

    Ọkaiwu ukwu nke mpaghar Sante Fe bụ ebe ihe ahụ mere bụ Mary Carmack-Altwies , onye kwụpụtara nke a ụbọchị Tọzde, kwuru na o nweghị onye karịrị iwu..

    "Omee ihe ejije Alec Baldwin na odeowe ngwaọgụ Hannah Gutierrez Reed ga-azara ọnụ ha banyere ‘igbu mmadụ na-amaghị ama.”

    “ Enwere m ihe aka ebe doro anya.”."

    "Dịka nọ n’ọnwa, o nweghị onye karịrị iwu, onye ọbụla kwesịkwara inweta ikpe nkwụmọtọ.“

    Mmadụ abụọ nwere ike ịdanye na mkpọrọ ọnwa 18 ma ọ bụrụ na ikpe ma ha maọbụ nhaego ya ruru nde puku dola ise .

    Ọkaiwu Baldwin bụ Luke Nikas, kwuru na “ikpe ahụ bụ ikpe mkpegbu”.

    "Maazị Baldwin enweghị ka o siri mara nae zi mgbọ egbe dị n’ime egbe ahụmaọbụ n’ebe ọbụla dịka ha na-eme ihe ejije ahụ”

    “Ọ tụkwasịrị obi na ndị ya nay a na-arụkọ bụ ndị gwara ya na mgbọ egbe adịghị ya.”

    “Anyị ga-agba ya bụ ikpe ma nweta mmeri.”

    Halyna Hutchins

    Ebe foto si, Getty

  18. Ndewoonụ, ụmu Igbo!

    Igbo mma,mmanụ oo!

  19. Etu mmadụ ise si gbanahụ ọnwụ ha n’Awka

    Ndị ọkụ gbara n'ụlọ ha

    Mmadụ ise si n’ezinaụlọ dị iche iche bikọtara ọnụ gbanahụrụ ọnwụ dịka gbara n’ụlọ ha dị n’Araba nke obodo Awka, Anambra Steeti.

    Ihe a mere n’elekere abụọ nke isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde 19 Jenụwarị 2023, mgbe ọkụ e chere si na ọkụ latrik malitere ịgba n’ime ọtụ ọnụ ụlọ ha.

    Ụlọ ọkụ gbara n'Awka

    Otu onye bi n’ebe ahụ hụrụ ka ihe jiri mee sị na ha malitere ịnụ ụda ihe na-agba ka ogbuniwe n’isi ụtụtụ ahụ.

    Onye nke ọzọ sị na ihe o jiri pụta n’ụlọ ahụ bụ naanị ekwentị ya, na ihe ndị ọzọ dịka asambodo ya, kọpụta ya na ndị ọzọ rechara ọkụ.

    Nwa onye nwe ụlọ ahụ sị na okpokoro gaasị dị n’ime ụlọ ebe ọkụ ahụ malitere tinyekwuru aka mee ka ọ rịkwuo elu.

    Ndị bi ebe ahụ na-arịọ ka gọomentị na ndị mmadụ gbatara ha ọsọ enyemaka.

    O nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara.
  20. Anyị emefuola ego karịrị otu ijeri dọla n’ịzụ ngwagha maka ịlụso Boko Haram ọgụ.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Femi Adesina

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọchịchị ya merụrụ ego karịrị otu ijeri dọla ($1bn) iji zụọ ngwaagha maka ibuso Boko Haram agha ma na-apụ ha ụfọdụ ebe ndị ha kpachiri na mpaghara North-East.

    Buhari kwuru nke a n’ọgbakọ mba Afrịka maka udo nke afọ 2023 e mere na mba Mauritania.

    N’okwu ya “n’afọ 2015 mgbe m banyere n’ọchịchị, Boko Haram kpachiri ọtụtụ obodo ndị dị na Borno, Yobe na Adamawa steeti. Anyị weghaara obodo ndị a site n’itinye ego karịrị otu ijeri dọla eji zụọ ngwaagha na mba Amerịka nakwa ndị ọzọ.”

    N’ozi onye ndụmọdụ pụrụiche na mgbasaozi soshal midia ya bụ Femi Adesina wepụtara, Buhari sị na ha na mba ndị ọzọ ka na-agbakọta aka ọnụ iji merie ndị oyi ndụ egwu.