Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike enyela kọmịshọna ọrụ na steeti ahụ bụ George-Kelly Alabo otu ụbọchị ịrụ ụzọ dị n'okpuruọchịchị Abua/Odual.
Ọ bụ mgbe ọ gara emume mmepe ụzọ Ekagho-Ogboloma Adada n'ụbọchị Frịde ka o kwuru nke a.
Wike kpọpụtara ụloorụ ndị na-arụ ya bụ ụzo ma sị, "Gịnị mere unu ebidobeghị ọru n'ụzo a agbanyeghị na unu anarala ego n'aka gọọmentị?".
Otu onye yiri onye agbụrụ Eshịa pụtaranụ zara ya sị, " N'oge na-adịghị anya, anyị ga-ebido ọrụ ebe ahụ".
Wike gwara Kọmịshọna sị, " Kọmịshọna ọrụ, ọ bụrụ na ndị a ebidoghị ọrụ n'ime otu ụbọchị, hụ na ha nyeghachịri gọọmentị ego ha naara".
Nke a butere ekele na ọṅụ n'etiti ndị bịara mmemme ahụ.
Wike gara n'ihu kwuo, " Ị gaghị ewe ego anyị tinye ya n'ime ụlọakụ ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ ebe ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Tupu amara ihe na-eme ọnwa Maachi eruo unu a sị anyị na udu mmiri ebidola...nke a agaghị eme".
Wike gwara ndị obodo Abua/Odual ka ha gaa na soshal midia tie mkpu ma ọ bụrụ na ọrụ ụzọ ahụ anaghị aga etu ọ kwesịrị.
Daalụ dịka ị na-esonye anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị
Daalụ dịka i sonyere anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị
Ọ bụghị eziokwu na anyị kpụpụrụ onyeisi INEC n’ụlọikpe – DSS
Ebe foto si, INEC
Ngala nchekwa
Naịjirịa a kpọrọ Department of State Services (DSS) ekwuola na o nweghi mgbe ha
kpụpụrụ onyeisi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) bụ Mahmood Yakubu n’ụlọikpe
maka ekwupụtaghị akụnaụba ya.
Ọnụ na-ekwuru
ha bụ Peter Afunanya kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara na Fraịde 6 Jenụwarị
2023.
Ọ sị na akwụkwọ
akụkọ ahụ nke sị na “ụlọikpe akwụsịla ụlọọrụ DSS ịnwụchi onyeisi INEC” enweteghi
ihe dị n’okwu ahụ chaachaa.
Afunanya sị
na ha ekpesara ndịisi ụlọọrụ dere akụkọ ahụ na ha kwenyere ileba ya anya mana ha
emebeghi ya.
Cheta na otu
onye a kpọrọ Somadina Uzoamaka kpụpụrụ onyeisi INEC bụ Mahmood Yakubu n’ụlọikpe
ma sị na o kwupụtaghi eziokwu banyere akụnaụba ndị o nwere.
Somadina chọrọ
ka ụlọikpe machie Yakubu n’ike ma kwụsị ya ọrụ ruo mgbe a ga-emecha nyocha
banyere nke a.
Akwammiri Niger nke abụọ ezuola ime ka ndị Igbo tụọrọ APC vootu – Hope Uzodimma
Ebe foto si, Hope Uzodimma
Gọvanọ Imo
steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na akwammiri Niger nke abụọ ọchịchị Onyeisiala
Muhammadu Buhari rụrụ ezuola ime ka ndị Igbo tụnyere APC vootu n’ọkwa
onyeisiala.
O kwuru nke
a dịka ọ na-aza ajụjụ n’ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na Tọzde.
O kwuru na
kamgbe a lụchara agha Biafra n’afọ 1970 ka e kwere ndị Igbo nkwa ịrụ akwammiri
a, ọchịchị dị iche iche abịala laa ruo mgbe Onyeisiala Buhari bịara rụọ ya.
Uzodimma sị
na ndị Igbo ga-eme nke a iji hụụ na ọchịchị na ọrụ pati ya na-arụ na mpaghara Ọwụwa
Anyanwụ ga-aga n’ihu.
N’okwu ya “obi
dị ndị Igbo niile bi na mpaghara ọzọ mma maka etu o so dịịrị ha mfe ime njem laa
ụlọ n’oge ekeresimesi n’ihi akwammiri Niger nke abụọ a rụcharala”.
INEC amalitela ikesa PVC n'uju n'Enugwu tata
Ndị mmadụ ji nwayọ nwayọ na apụta iwere akwụkwọ ikike atụmvootu nke bụ Permanent Voters Card (PVC) ha
n'Enugwu taata dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission bụ INEC n'ịchafụ bidoro ịke ya na wọọdụ.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo rutere n'Okpara Square dị n'Enugwu ụmụ ntorobịa ejula
ebe ahụ n'eche ndị ọrụ INEC.
Ha malitere kesawa ya bụ PVC ihe dịka elekere iri na otu nke
ụtụtụ.
Ndị INEC gwara ndị ahụghị PVC nke ha, ka ha laghachi n'otu
izu ụka n'ihi na ụlọọrụ ha ga-ebutakwa PVC ọzọ.
Ụfọdụ biara iwere PVC ha gwara BBC Igbo na nke ha adịghi, INEC wee gwa ha gaa na wọọdụ ebe ha ga anọ tụọ votu.
Otu nwada sọ ndị INEC arụ ọrụ bụ Ugwuoke Ebubechukwu peace, kwuru na ọtụtụ ndị ahụghị nke ha na okpara squre ga-aga na ward ha.
Ọ kọwara na ọbụghị iwu na ọbụ ebe idebara aha n'akwụkwọ ka PVC gị ga-adị, kama na ọ ga-adị na gburu gburu ebe ị ga-atụ votu ka a ga-ebuga akwụkwọ ikike PVC gị.
Gianluca Vialli gbaburu Chelsea bọọlụ anwụọla
Ebe foto si, Premier League/Twitter
Gianluca Vialli bụ ọgbaa bọọlụ ama ama gbara otu Chelsea bọọlụ ma rụọkwa ọrụ dịka onye nchịkọta ha anwụọla.
Vialli dị afọ 58 mgbe ọ nwụrụ.
Ọ bụ onye mba Ịtalị ma gbaara ha bọọlụ ugboro 59.
A chọtaburu ọrịa kansa n'ahụ ya n'afọ 2017 ma n'ọnwa Aprel nke afọ 2020 ka e kwuru na ọlaala kpamkpam n'ahụ ya. Kama ahụtara ya ọzọ n'ahụ ya n'afọ 2021
. Nke a mere ka ọ kwụsị ọrụ ọ na-arụrụ ndị otu Ịtalị n'afọ 2022 maka ahụike ya.
Vialli banyere otu Chelsea n'afọ 1996 ma bụrụzie onye nchịkọta ma na-agba kwara ha bọọlụ n'otu mgbe n'afọ 1998.
O ritere ntụrụugo League Cup, Uefa Cup Winners Cup, Uefa Super Cup, FA cup nke afọ 2000 na Charity Shield.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ha anwuchiela ndị omekome isii ọ sị na-enye ndị mpaghara obodo Nkpor na Ogidi nsogbu.
O kwuru na ọ bụ dịka ndị uweojii na-arụ ọrụ nchekwa ha n'ụbọchị wenesde ka ha nwuchiri ndị a.
Ikenga kwuru na ha napụtara ndị a egbe pumpaction abụọ na mgbọ egbe ise, otu ụgbọala Toyota Camry dị oji ha na-eche ndị omekome a napụrụ mmadụ na otu ụgbọala Toyota Corolla na-acha ntụntụ.
O nyere aha ndị a ha nwuchịrị dịka Innocent Ifeanyi, dị afọ 29; Nweze Chiderah, dị afọ 33; Igwe Emmanuel, dị afọ 20 ,Kelechi Ani, dị afọ 35; Chidera Nwaobodo, dị afọ 23 na Emeka Onuoha, dị afọ 30.
Ikenga kwuru na ndị uweojii jidere mmadụ isii a mgbe ha chọrọ ịgba ọsọ ebe ha na-ezu ohi.
O kwukwara na ndị uweojii n'otu ụbọchị ahụ jidere Emmanuel Nwosu, dị afọ 48 ; Francis Obiano dị afọ 28 na John Philip dị afọ 31 years ma napụta ha gwongworo nke ndị nwe ya bụ ụlọọrụ Dangote Group.
Ikenga kwuru na ha nwetara mkpesa na eji egbe zuru ya bụ gwongworo n'ụbọchị mọnde.
O kwuru na ndị omekome a gbasoro ndị uweojii egbe kama na ike ndị uweojii karịrị nke ha.
E jidere ha niile dịka ha bu apa mgbọ egbe n'ahụ ha.
Ikenga kwuru na ndị a niile ji ọnụ ha kwuo na ọ bụ ha kpara arụ ndị a ma sị na ha ebidola nyocha ha n'uju.
Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa
Ị ga-enweta akụkọ niile ga-amasị gị ebe a
Kogi Explosion: Anwuchiela otu onyeisi ISWAP maka ogbunigwe gburu mmadụ atọ na Kogi Steeti
Ebe foto si, Government of Nigeria/Twitter
Ngalaba Department of State Services (DSS) ekwuola na ha anwuchiela onye kpara nkata butere ụgbọala bu ogbunigwe nke gbara n'akụkụ obi Eze Ohinoyi nke Ebira dị n'Okene, Kogi Steeti.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi onye na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Peter Afunanya depụtara ka nke a dị
Ndị DSS kwuru na ha nwuchiri Abdulmumin Ibrahim Otaru (eji Abu Mikdad mara) na onye otu ya bụ Saidu Suleiman n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2023.
A gbatara Otaru egbe n'ukwu mgbe ndị uweojii na-achụ ya ọsọ ka ha nwuchie ya.
Cheta na a gbara ogbunigwe n'ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba afọ 2022 n'obodo Okene Kogi steeti nke gburu mmadụ atọ.
Nke a mere dịka ọ fọrọ awa olemaole ka Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari bido njem nleta na Kogi Steeti.
Nyocha ndị DSS mere gosiri na Otaru bụ otu n'ime ndị isi otu Islamic State West Africa Province (ISWAP) ma kwuo kwa na ọ nwere aka n'ụfọdụ mwakpo emere, nke gụnyere:
1) Mwakpo emere n'ụbọchị 24 nke ọnwa Jun afọ 2022 n'ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo Eika-Ohizenyi, n'okpuruọchịchị Okehi nke Kogi Steeti. E zuuru egbe AK47 abụọ ma gbuo onye uweojii bụ Idris Musa.
2) Mwakpo e mere n'ụbọchị ise nke ọnwa Jụlai afọ 2022 na Kuje Medium Security Custodial Centre dị na mpaghara Kuje dị n'Abuja.
3) Mwakpo ọzọ emekwara n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgụst afọ 2022 n'ụlọọrụ West African Ceramics Ltd (WACL) dị n'okpuruọchịchị Ajaokuta dị na Kogi Steeti ebe atọorọ ndị mba Indịa atọ ma gbuo otu onye Indịa, ndị uweojii abụọ na ndị ọkwọọ ụgbọala ụloọrụ ahụ abụọ. Atọhapụrụ ndị a ha tọọrọ n'ụbọchị 31 nke ọnwa Ọgụst afọ 2022.
Ndị DSS depụtara na Otaru nwere ndị otu dị iche iche na Kogi Steeti ma na-eko mkpamkpa na Kogi na Ondo Steeti.
Etu e si hụta ozu dị na nwunye n'ụtụtụ n'ụlọ ha
Ebe foto si, Iwaria
Nkọwa foto, Nke a abụghị ebe ahụtara ozu dị na nwunye ahụ
A hụrụ ozu dị na nwunye bụ Sulaiman Idrin dị afọ iri abụọ na asatọ na nwunye ya bụ Maimuna Halliru dị afọ iri abụọ n'ime ụlọ ha.
Ọ bụ akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Kano steti bụ Abdullahi Haruna Kiyawa depụtara ka nke a dị.
A chọpụtara na ha apụtabeghị ezi n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụbọchị ahụ.
Ọ bụ nnenne Idris ji ike gbakaa ụzọ ha were hụta ka ha atọgbọ ma nụkwa ihe dịka ishi aṅụrụ n'ime ụlọ ha.
Kọmịshọna ndị uweojiio steeti ahụ bụ Mamman Dauda nyere iwu ka ndị uweojii nke onye isi ha bụ Ahmed Hamza ka ha gaa ebe ya bụ ihe mere.
Mgbe ha buru ndị a gaa ụlọọgwụ ka ndị dọkịnta nọrọ kwubie na ha anwụọla.
Nyocha mbụ ndị uweojii mere gosiri na dị na nwunye a mụnyere ọkụ n'ime ụlọ ha iji chụọ oyi.
Kama ha mechiri ebe ikuku sị abata nke mere ka anwụrụ ọkụ sitere na ya bụ ọkụ gbuo ha.
Nke a mere ka kọmịshọna ndị uweojii dọrọ ndị Kano aka na ntị ka ha mụrụ anya etu ha si eji akụrụngwa dị iche iche achụ oyi oge ụgụrụ a.
'Etu m si bụrụ onye otu aka dịka m gara igbosa ọgụ'
Otu nwoke gbara afọ 23 nke aha ya bụ abụrụla onye
na-agaghị echefu afọ 2022 eche
dịkaọ nweziri naanị otu aka.
Nwaamadị a
onye bị na Kano steeti kọwara na ọ gara igbo ọgụ nọ n’etiti mmadụ abụọ ma nata
mmerụ ahụ mere ka e bepụ ya aka.
N’okwu ya
nye BBC, o kwuru
“A rụchara
m ọrụ dịka onye na-akwa akwa, n’ebe elekere itolu nke abalị e som nna m ukwu gaa inye mmadụ akwa anyị kwara
ya ma si ebe ahụ lawa be m”
“Mgbe m
rutere n’akụkụ ụlọ m, a gara m ebe a na-ere nrị ma nọrọ ebe ahụ ka otu enyi
malitere ịrụrịtaụka banyere otu onye ọzọ ọ sị na-amaja ya”
O kwuru na
ka olu mmadụ abụọ ahụ malitere iri elu ebe ha na-abara onwe ha mba na ọ gara ha
nso ị ga rịọ ha ma kpezie udo.
“Ọ bụ mgbe
ahụ ka otu onye n’ime ha nwepụtara mma nọ n’okpuru uwe ya ma sụọ m ya n’aka nke
mere oke ọbara ji malite ịgba ebe niile.”
Ọ kọwara na
ka nke a mere na ya bụ ọgụ biri n’ike.
O kwukwara
na e bugara ya ụlọọgwụ Murtala Mohammed
bụ ebe ọ nọrọ abalị atọ tupu e buga ya ụlọọgwụ Aminu Kano Teaching Hospital ma
sizie ebe ahụ gawa ụlọọgwụ Dala Orthopaedic.
Salisu kwuru na ọ bụ
na ụlọọgwụ ahụ ka a gwara ya na a ga-ebepụ ya aka n’ihi na ya bụ ihe mere a dọkaala
akwara aka ya.
E mechara bepụ ya aka
n’ihe a mere.
“E bere ezigbo akwa dịka
m nọ na-eche na ‘ọ bụ etu a ka ndụ ga-esi gbanwee””
O kwukwara na ọrụ ya
dịka onye na-akwa akwa ebiela ka ya bụ ihe mere ebe ọ ka na anata ọgwụ ọgwụ.
Ugbua, ụlọikpe
atụnyela onye mere ya ihe a n’ụlọikpe Kuramawa
Correctional facility nke Kano steeti.
Ghana na Morocco abụrụla mba Afrịka mbụ na-amachi ndị njem si China
Ebe foto si, AFP
Mba Ghana
na Morocco abụrụla ndị mba Afrịka mbụ wetara mmachi nye ndị njem si China maka okwu
gbasara mfesa ọrịa Coronavirus.
Malite n’ụbọchị
Tuzdee, Morocco amachiela ndị
njem si mba China
n'agbanyeghị ndị mba ha bụ
ruo oge amabeghị ugbua.
Ministri na-ahụ
maka mmekọ mba na mba na Morocco kwuru na mkpebi a bụ iji gbochie mmụba na
mfesa ọrịa a na mba .
Mmachi a na
mba Ghana ga-amalite na Fraịde.
Mkpebi ndị a na-abịa dịka China wepụrụ ọtụtụ
iwu nchekwa Covid-19 n’ebeọnwa Disemba afọ gara
aga.
Mba ndị ọzọ na-abụghị
mba ndị Afrịka na nso nso a tinyere iwu mmachi nye ndị njem
si mba China.
Iji maa atụ, ndị njem si China na-abata Ịnglandị ga-enwerịrị akwụkwọ ịgba ama na ha ebughị ọrịa tupu e kwe
ha malite njem ha ebe mba Amerịka na-enyocha ime ahụ ndị mmadụ maka ọrịa ma ha
tụọ ụkwụ na mba ahụ.
Mba ndị na-enyocha ime ahụ ndị njem na-ekwu na atụmatụ a ga-enyere aka chọpụta ụdịrịnje ọrịa ọhụrụ nwereike ibata mba ha n'oge ma gbochie mbata
ya.
Ghana kwuru
na a ga-enyocha ime ahụ ndị njem si China na ọdụ ụgbọelu ha n'efu dịka ndị njem
ahụ ga-egosi akwụkwọ ịgba ama dị ire n’abalị abụọ gara aga na ha ebughị ọrịa
Covid.
Ndị ọkachamara
n'ihe gbasara ahụike na mba ụwa ekwuola na mwepụ mmachi maka ọrịa a e mere na
China emeela ka Covid-19 malite ịgbasa ngwa ngwa ọzọ.
Mana ministri
na-ahụ maka mba na mba na China ekwuola na e kwesịrị itinye iwu maka ọrịa
coronavirus naanị na mgbado ụkwụ n’ụkpụrụ “Sayensị” dịka ọ na-ebo ndị mba ofesi
dị iche iche nakwa ndị ụlọ ntaakụkọ ebubo na ha ma ụma akwalite ụjọ site na ‘akwanye
ọkụ’ n’akụkọ ọrịa.
Gọọmentị
China na-ekwu na mmachi ndị njem si mba ha nke ọtụtụ mba na-enye ugbua bụ atụmatụ
okwu ndọrọndọrọ ọchịchị iji taa ha ahụhụ - ma dọọ aka na ntị na ha nwereike ịbọ
ọbọ n’atụmatụ gaa n’ihu.
Buhari enyela ikike ka e jiri tekịnụzụ busoo ndị ekperima agha na Southeast – Uzodimma
Ebe foto si, Hope Uzodimma
Gọvanọ Imo Steetị
bụ Hope Uzodimma ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ikike ka e jiri
tekịnụzụ busoo ndị ekperima agha n’Ọwụwa Anyanwụ.
O kwuru nke
a n’Abuja mgbe o zutechara Onyeisiala Buhari bụ ebe ha kpara nkata banyere
nchekwa dị ọjọọ na mpaghara ahụ.
Uzodimma sị
na ikike a bụ ka ebido ngwa ngwa tinye tekịnụzụ ndị a n’ọrụ nchekwa Ọwụwa
Anyanwụ.
Ọ gara n’ihu
kwuo na aka ya dịghị n’ihe na-eme n’Imo Steetị ma sị na ọ bụghị naanị na steetị
ya ka ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ.
Okenye Niger Delta a ma ama bụ Edwin Clark akwadoola Peter Obi
Onye okeneye a ma ama na Naịjirịa bụ Edwin Clark ekwuola na ya na-akwado Peter Obi maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 2023.
Clark kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ e nwere n'Abuja taa bụ Tuzde.
O kwuru na nkwado ọ na-enye Peter Obi bụ maka na ọ hụtara na Peter Obi nwere ihe dị mkpa ugbua iji bụrụ onye ndu Naịjirịa
Onyeisiala Buhari ebinyela aka na bọjet tarị N21.8 nke afọ 2023
Ebe foto si, Presidency Nigeria
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ebinyel aaka n'ịwụ kwadoro bọjetị nke tarị naịra iri abụọ na otu na ụma asataọ (Tarị N21.8) maka afọ 2023.
Nke a na-eme dịka abali isii gachara mgbe ndị omeiwu kwadoro ya bụ bọjet ma gbakwunye otu ịtarị naịra na ụma iri atọ na abụọ n'ime ya.
Dịka o siri dị, ịtarị isii na ụma isii bụ maka ịkwụ ụgwọ Naijirịa ji.
Bọjetị a gosiri na narị ijeri naịra abụọ na iri asatọ na ise (Ijeri N285) ga-abụ maka nchekwa, otu narị ijeri naịra na iri itolu na ụma ise (Ijeri N153.7) bụ maka ọkụ latrik, otu narị ijeri naịra na iri atọ na anọ na ụma itolu bụ maka ahụike (Ijeri N134.9) ebe otu ijer narị naịra na iri ise na atọ na ụma saa bụ maka agụmakwụkwọ (Ijeri N153.7)
Ego gọọmentị kwetara ịkwụ ndị nkuzi mahadum gbara abụbọ ọrọ ọnwa asatọ sọ n'ego agbakwunyere na bọjetị a.
Weight Loss Pill: Ọgwụ a eji ata ahụ nwereike ibutere gị Kansa - Nafdac
Ebe foto si, Nafdac/Twitter
Ngalaba na-ahụ maka nrị na ọgwụ na Naijirịa bụ National Agency for Food and Drugs Administration and Control (NAFDAC) na-agwa ndị ọha Naijirịa ka ha gbaara ọgwụ a kpọrọ 'Weight Rapid Loss Capsule' ọsọ dịka ọ nwereike ibutere mmadụ ọrịa kansa.
Nke a na-eso ọkwa nagalab ahụike nke mba Abu Dhabi mara megide ya bụ ọgwụ.
Nafdac kwuru na ndị mmadụ na-ere ya dịka ọgwụ kacha dị ire maka ịta ahụ, ma sịkwa na ọ bụ na soshal Midia ka akacha ere ya.
Nafdac depụtara na nyocha sayensi gosiri na ya bụ ọgwụ nwere ihe a na-akpọ 'Phenolphthalein' nke ngalaba na-ahụ maka nrị na ọgwụ nke mba Amerịka kwuru na ọdịghị mma maka ahụike.
Phenolphthalein na-agbanwe ahụ mmadụ n'ụzọ nwereike ima ka onye ahụ nweta ọrịa kansa.
Nafdac kwukwara na ọ bụ ụlọọrụ Ingi Oman na-emepụta ya bụ ọgwụ.
Enyi awakpoola ma mebie ọtụtụ ụlọ na mba Mozambik
Ebe foto si, Iwaria
Igwe enyi emebiela ọtụtụ ụlọ, ebe a na-edokwa nri na ubi ndị mmadụ na mba Mozambik.
Ndị ọrụ gọọmentị na mpaghara Safala na-ekwu na enyi ndị a ji ike achọ mmiri ọṅụṅụ dịka ebe ha si enweta mmiri ataala.
Ha kwuru na igwe enyi ndị a na-emebi ihe n'ụzọ dịka ha na-aga nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ ahapụla ụlọ ha gbaa ọsọ.
Ngalaba na-ahụ maka mbara ezi mba ahụ ekwuola na anụ ọhịa egbuola ihe ruru mmadụ otu narị n'ime afọ abụọ.
Ụlọikpe Senegal atụọla ndị omeiwu abụọ tiri onye otu ha nwaanyị ihe mkpọrọ
Ebe foto si, Screengarab
Ndị omeiwu abụọ na mba Senegal ga-aga mkpọrọ maka iti onye otu ha nwaanyị ihe n'ime ụlọ omeiwu n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba 2022.
Ụlọikpe dị na mba ahụ mara Mamadou Niang na Massata Samb ikpe n'ụbọchị Mọnde, Jenụwarị 2, 2023, ma tụọ ha mkpọrọ ọnwa isii maka ịma nwa ada Amy Ndiaye ụra ma gbaa ya ụkwụ n'afọ n'ihi na ọ katọrọ onye na-anaghị akwado onyeisiala Macky Sall.
Ọkaikpe ahụ kwukwara na Niang na Samb ga-akwụ Ndiaye ego dị nde francs ise ($8,100; £6,750) iji tie ya aka n'obi.
Onyonyo gosiri ebe Mazị Samb hapụrụ oche ya gakwuru nwa ada Ndiaye ma maa ya ụra n'ụlọomeiwu, nke a butere ọgbaaghara nke mere ka mazị Niang gbaa Ndiaye ụkwụ n'afọ.
Akụkọ kwuru na Ndiaye dị ime oge ya bụ ihe mere.
N'ụlọikpe, ndị ọkaiwu mmadụ abụọ a kwuru na ụlọikpe enweghị ikike ikpe ndị omeiwu ikpe maka ihe ha mere n'ime ụlọ omeiwu, mana ọkaikpe egeghị ha ntị.
Ha ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ha gbara ya bụ mkpebi, maọbụ ruo mgbe ọnwa isii ga agacha.