Lee nkwekọrịta Rọshịa na Yukren nwereike ịzọpụta mba ụwa n'ụkọ 'ọka'

Ebe foto si, gett
Mba Rọshia na Yukren enweela nkwekọrịta ka mba Yukren ree ọka na ihe ndị ọzọ yiri ya dịka ọnọdụ agha na mba Yukren gbochiri ha ịgba mgbere nri ndịa nke butere ụkọ ụfọdụ ihe eji eme achịcha na mba ụwa niile.
Nkwekọrịta a ga-enye ohere ka nde pụrụ nde nrị ndị a tọrọ atọ na mba Yukren ga-enweike gaa mba ndị ọzọ.
Kama mba Yukren ekweghị ka ha na mba Rọshịa tinyeaka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'otu ebe ma jụkwa ka ha na ndị mba Rọshịa nọrọ n'otu tebulu oge a na-akpa nkata a.














