Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Nsogbu enweghị mmanụ ụgbọelu ga-anọte aka - Hadi Sirika

    Hadi Sirika

    Ebe foto si, aviation.gov.ng

    Nkọwa foto, Hadi Sirika

    Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Hadi Sirika ekwuola na olileanya ọbụla adịghị maka mgbe nsogbu enweghị mmanụ e ji akwọ ụgbọelu ga-abịa n’isi njedebe na Naịjirịa.

    Sirika kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndị ọrụ ụgbọelu nwere n’Abụja n'ụbọchị Tuzde, ma kọwaa na nsogbu a ga-anọte aka maka na Naịjirịa anaghị emepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu.

    "Nsogbu gbasara mmepụta mmanụ agbịdị zuru ụwa nille ọnụ. E nwere ụkọ mmanụ ụgbọelu n'akụkụ ụwa niile, ma n'Amerịka ma na New Zealand," Sirika kwuru.

    "Ya bụ nsogbu ka njọ na Naịjirịa n'ihi na anyị anaghị emepụta ya bụ mmanụ e ji akwọ ụgbọelu."

    Sirika kọwakwara na ihe ọzọ mere ya bụ nsogbu ji akawanye njọ bụ maka ụkọ dọla, bụ ego e ji azụta ya bụ mmanụ ụgbọelu.

    O kwuru na gọọmentị na-agbalị ike ha ịma ihe a ga-eme maka nsogbu a, "mana ọ bụghị ihe ga-akwụsị taa maọbụ echi".

  2. A chọputala okwute Diamond kachasị kamgbe afọ 300 n'Angola

    Lucapa Diamond Co

    Ebe foto si, Lucapa Diamond Co

    Nkọwa foto, Okwute Diamond a akpọrọ Lulu Rose dị n'agba '170 karat'

    Ndị na-egwupute ihe iribama n'ala na mba Angola achọpụtala okwute diamond na-acha uhie ọcha(pink) nke ha chee kachasịnụ kamgbe afọ narị atọ.

    Onye Australia na-elekọta ya bụ ebe ngwụpụta kpọrọ okwute Diamond dị n'agba '170 karat' Lulo Rose.

    O kwuru na a ga-ele okwute ahụ n'ahịa mba ofesi ọ kpọrọ 'Angolan state diamond marketing company.'

    "Okwute Diamond a, achọpụtara na Lulo na-egosi Angola dịka ọkaibe n'igwupute ọnatarachi na mba ụwa niile, bụ ihe Diamantino Azevedo bụ ihe minista na-ahụ maka ọnatarachi egwuputere n'ala depụtara.

    E relela ụfọdụ okwute ndị a puru iche n'ọnụ ego gbalitere ọfụma.

    E rere Okwute Diamond 'Pink star' dị n'agba '59 karat' ihe karịrị nde dọla iri asaa na otu $71.2m n'afọ 2017.

  3. Ndị uweojii Abia steeti egbuola otu onye ekperima n'ime ndị kwuchiri ụgbọala e ji ebu ego

    Ndị oji egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Abia steeti agbagbuola otu onye n'ime ndị ekperima kwuchiri ụgbọla e ji ebu ego ụzọ n'ụzọ awaraawara si Port Harcourt aga Enugu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna bụ onye si na ya bụ ụgbọọla si Aba aga Umuahia kwukwara na ndị oshi ahụ gbagburu otu onye ọrụ ụlọakụ merụọ mmadụ atọ ndị uweojii ọzọ ahụ.

    Ya bụ ihe mere n'agbataụzọ Ntigha dị na ya bụ ụzọ awaraawara ebe ndị oshi ahụ gbochiri ụzọ, zoo n'ime ọhịa.

    Ogbonna sị na ndị ọrụ ha gbagawara ebe ahụ mgbe ama gbaara ha na ndị ahụ nọ ebe ahụ.

    Ọ sị na mgbe ha ruru ebe ahụ sị na "otu onyeuweojii sọ ya bụ ụgbọala kọọrọ ha na a gbagburu onye ọrụ ụlọakụ ahụ mgbe ụgbụọala ahụ nọ n'ọsọ".

    O kwuru na ndị ohi ahụ butere ụfọdụ ego ebe ya bụ ụgbọala gbalahuru ha.

    Ọ sị na mbọ niile ndị ahụ gbara ịjide ụgbụọala ahụ nara ha n'iyi agbanyeghị na ha gburu otu onye.

    Ndị uweojii sị na ha jidere egbe AK47 n'aka onye oshi ahụ ha gbagburu.

  4. Ndewonu!

    Ka anyí malite iwetere unu akụkọ dí ọkụ ka o si dị ọkụ.

  5. Enweghị mgbe gọọmentị Rivas steeti ji hiwe 'Marriage Monitoring Team' - RSG

    Ndị yi uwe

    Ebe foto si, Press Unit - Rivers State Government House/Facebook

    Gọọmentị Rivas Steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị ọkchasị na soshal midia nke na-ekwu na gọvanọ Steeti ahụ bụ Nyesom Wike ehiwela otu ndị ọrụ ha bụ ịnwuchị ndị na-ejizughị nde Naira ise chọrọ ịlụ nwaanyịọ na ihe ndị ọzọ.

    Ọ bụ onye ndụmọdụ pụruiche maka mgbasa ozi nke Gọvanọ Rivas Steeti bụ Kelvin Ebiri kwuru nke a ma sị na ya bụ akụkọ ụgha jọgburu udele ma sigbuo nkapị.

    O kwuru sị, " Agbanyeghị na akụkọ ụwa abụghị ihe ọhụrụ, kama ya bụ ihe jọrọ njọ, ọkachasị ndị ma ụma na-efesa akụkọ ụgha a".

    O kpebiri sị, " Gọọmentị Rivas steeti ga-akpụpụ ndị na-akpa mkpamkpa akụkọ ụgha a ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ajọ agwa a".

  6. Pope Francis arịọla mgbaghara maka mpụ ndị ụka fada mere mgbe gboo na Canada

    Pope Rịọrọ mgbaghara

    Ebe foto si, Reuters

    Na njem nke mbụ ọ mere na mba Canada, Pope Francis, onyeisi ndị ụka Katolik n'ụwa gbaa gburugburu arịọla ndị ọdịnala mba canada maka ya bụ mpụ ha mere ebe ahụ mgbe gboo.

    Pope kwuru n'ala ebe ahụ ndị ụka mere ya bụ mpụ na Maskwacis dịketere Edmonton, "e ji obi m niile arịọ unu mgbaghara".

    Ọ sị na mgbaghara ya rịọrọ bụ nke mbụ, na ya ga-ehiwe kọmiti ga-elebe anya na ya bụ mpụ nke ga-eme ka e nwee mgbaghara tọrọ atọ.

    Pope gara ebe ahụ ịrọ mgbaghara maka ajọ agwa ndị ụka fada mere ịme ka ụmụaka ebe ahụ chefụọ omenala ha sowe nke ụka.

    Ụlọakwọkwọ gọomentị niile ha rụrụ mgbe ahụ bụche ihe ha mere iji mebie omenala na asụsụ ha.

    Ndị nọ ebe ahụ mgbe ịhe ahụ mere kụụọrọ Pope aka mgbe ọ rịọrọ ya bụ mgbaghara.

  7. Moscow ji ụkọ gasị ebuso Europe agha - Ukraine

    Okporoụzọ gasị ndị Russia

    Ebe foto si, Reuters

    Ukraine ebola Moscow ebubo ịjị ụkọ gasị ebuso Europe agha n'ụzọ dị njọ.

    Ụlọọrụ ndị Russia na-arụpụta gasị bụ Gazprom sị na ha ga-akwụsịlatụ izipụ gasị na Germany ịjị nyere ha aka ịdozi okporo gasị ahụ si na Nord stream 1.

    Mana onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky sị na "nke ahụ bụ aghụghọ" ịmegide Europe.

    Ọ bụghị taa ka ya bụ okporo gasị Nord stream 1 na-ebuga gasị na Germany malitere ịgba ọnyụpaa.

    Na mbido ọnwaa ka okporo gasị kacha ukwuu na Russia mechiri kpamkpam ụbọchị 10 inye ohere maka ndozi, nke tụrụ ndị mmadụ ụjọ na a agaghị emeghe ya ọzọ.

    Mana ọ malitere ọrụ ụbọchị ise gara aga, mana ọ naghị arụ ọrụ ka o kwesiri,

    Ụbọchị Mọnde ka Gazprom sịkwa na ha ga-achabi gasị ole ha na-emepụta.

    Nke ugbua ha sị na ha ga-eji ọkara chabie ole ha na-emepụta iji nyere ha aka mezie ihe.

  8. Ụnụ abọọla e! Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị. Ndụ mmiri, ndụ azụ. Taa bụ Afọ. Afọ biko wetere anyị ihe ọma oo!

  9. Ka chi foo

    Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa, ka ọ dị echi

  10. Rọshịa ga-ebelata gasị ha na-eresị ndị mba EU

    Onye ọrụ ụlọọrụ gasị

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Rọshịa na-emepụta gasị bụ Gazprom ekwuola na ha ga-ebelata gasị ha na-eresi ndị mba EU ka ha were ohere ahụ mezie akụrụngwa ha.

    Nke a ga-eji passenti iri abụo belata gasị ha na-eresị mba ndị otu EU.

    N'aka nke ọzọ ka mba Jamanị na-ekwu na enweghị ihe gbasara agụrụngwa ọrụ ha nke ga-eme ka ha belata etu ha si eresị mba EU gasị.

    Cheta na ọnụ ọgụgụ gasị riri elu kamgbe mba Rọshịa wakporo mba Yukren.

    Ngalaba EU na-ahụ maka gasị na ihe ndị ọzọ bịwakwara Naijirịa nwee nzụko etu ha ga-esi ebido azụta gasị n'aka Naijirịa.

  11. Onyeisi ọrụ Tesla bụ Elon Musk agụọla na ya adịnaghị Nicole Shamahan bụ nwunye onye so nwere Google

    Elon Musk

    Ebe foto si, Getty Images

    Ide ji akụ bụ Elon Musk agọola ụkwụ na aka na ya adịnaghị nwunye Sergey Brin bụ onye so nwere Google.

    Agụgọ a na-abịa ka akwụkwọ akụkọ Wall Street Journal dere na ya bụ ebubo e boro Musk emela ka adịmnamma ya na Brin bie.

    Musk na onwe ya dere n'akara Twitter ya na-eziokwu atọgbọghị na ya bụ ebubo.

    Ọ sị na ya na Brin ka bụ oke enyị, na ha ka nọ n'ọgbakọ oriri na ọṅụṅụ n'abalị ụnyaahụ"

    Mgbe Wall Street Journal na-ede ndị ma maka ya bụ okwu ha sị na Musk na Shanahan yituru nwa ntakịrị n'afọ gara aga.

    Nke a mere Brin jiri tinye akwụkwọ alụkwaghị m n'isi nwunye ya ma bikwaa adịmnamma ya na Musk..

    Musk dere na Twitter ya sị, naanị ugbuoro abụọ n'ime afọ atọ ka m hụgoro Nicole n'ọgbọ. Ọ nweghị ihe omimi jikọrọ mụ na ya".

    Nicole Shanahan na Sergey Brin

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nicole Shanahan na Sergey Brin lụrụ onwe ha ihe dịka afọ anọ gara aga.
  12. Gọọmentị Myanmar egbuola mmadụ anọ bụ ndị na-akatọ gọọmentị ha nke gụnyere onye omeiwu ochie

    Phyno Zaya na Ko Jimmy
    Nkọwa foto, Ndí ọchcịchị ndị agha isi aba okpu Myanmar gburu Ko Jimmy (akaekpe) na Phyno Zeya Thaw (akanri)

    Gọọmentị Myaanmar egbuola mmadụ anọ bụ ndị na-akwado ọchịchị onyekwuouche ya bụ ndị na-akatọọ gọọmentị ndị isi aba okpu dị na mba ahụ.

    Nke a bụ nke mbụ gọọmentị ndị agha nọ na mba ahụ na-egbu ndị mmadụ n'ụdị a.

    Mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ e gburu bụ Ko Jimmy na onye omeiwu bụ Phyo Zeya Thaw bụ ndị ha boro ebubo na ha kpara agwa ka ndị "omekatara ihe pụọ ụjọ".

    A mara ndị a ikpe ọnwụ na nzụzọ bụ nke ndị mmadụ katọrọ nke ukwuu.

    Ezinaụlọ ndị a gbakọrọ n'ụlọnga dị na Insein ụbọchị Mọnde na-ajụ ese maka ndị nke ha.

    Nne Zayar Thaw sị na agwaghị ya mgbe e gburu nwa ya nke mere na ya akwadoghị maka olili ya.

    Ọ sị na, "mgbe mụ na ya kpara na Zoom na Fraịde, ọ na-achị ọchị nwekwaa ahụ ike. Ọ sị m wetere ya enyo anya ya, dikshọnarị, na-ego ya ga-eji egote ihe na mkpọrọ. E wegakwara m ihe ndị a na mkpọrọ ụbọchị taa". Ihe ndị a ka Khin Win Tint gwara BBC.

    Ọ sị na ọ bụ ya mere na ya ekweteghị na ha ga-egbu ya.

    Kyaw Min Yu bụ onye omeiwu na Myanmar so na ndị ha gburu

    Ebe foto si, Reuters

  13. Pope Francis atụọla ụkwụ na mba Canada ebe ọ gara njem ịrịọ mgbaghara

    Pope Francis na Canada

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ọkpụ nke mba Kanada bịara nabata Pope Francis

    Pope Francis atụọla ụkwụ na mba Canada n'ihe ọ kpọrọ "njem ịrọ mgbaghara".

    Nke a na-abịa dịka nnyocha gosiri na ndị ụkọchukwu nakwa ndị nkuzi ụka Katọlik mere ọtụtụ mpụ na mba ahụ megide ọtụtụ ụmụ ntakịrị ọtụtụ afọ gara aga.

    Malite n'afọ 1881 ruo 1996 ihe karịrị ụmụaka 150,000 gabigara mmekpa ahụ n'aka ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi ụka Katọlik na mba Kanada, ọtụtụ n'ime ụmụaka a nwụrụ.

    Otu e hibere inyocha ya bụ arụ mere ọtụtụ afọ gara aga kpọrọ ya mkochapụ agbụrụ (cultural genocide).

  14. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ asaala chi, ụmụ Igbo.

    Ya gaziere gị n'izu ụka ọhụrụ a dịka ị na-esonyere anyị na mgbasa ozi.

  15. EU na-achọ ibido ịzụta gasị n'aka Naijirịa

    Ebe a na-agbanwe mmanụ agbidi

    European Union na-achọ ibido ịzụta gasị n'aka Naijirịa.

    Nke a bụ atụmatụ ha chọrọ iji chekwa onwe ha dịka ha na-atụanya na mba Rọshịa nwereike ịkwụsị iresị ha gasị.

    Ọ bụ Mathew Baldwin bụ onyeisi otu European Commission maka mmanụ agbidi kwuru ya n'ụbọchị satọde.

    Baldwin nọ Naijirịa were kwuo nke a mgbe ọ bịara nwee nzụkọ ya na ndị ọrụ gọọmentị Naijirịa.

    Ha kwuru na Naijirịa na-emezi nchekwa na mpaghara Niger Delta ma sị na ha ga-emepe Trans Niger Pipeline n'ọnwa Ọgụst.

  16. Bayana Bayana emeriela asọmpị WAFCON

    Ndị egwu bọọlụ Bayana Bayana

    Ebe foto si, Bayaba Bayana/Twitter

    Otu egwu bọọlụ Bayana Bayana nke Saụt Afrịka emereila asọmpị Women's Africa Cup of Nations nke agbara na mba Morocco.

    Ha erula agba nke ikpeazu asompị a ugboro anọ ma ọ bụ nke afọ a 2022 ka ha meriri ya.

    Ugbua ọ bụ ha na Super Falcons na ndị nke Equatorial Guinea maburula iko a.

  17. Ọrịa Covid-19 nwereike ịselite isi ọzọ - NCDC

    Ndị nyocha sayensi

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba na-aluso ọrịa ọgụ na Naijirịa bụ NCDC ekwuola na Naijirịa nwereike ịbanye agba nke ise mfesa ọrịa covid-19 dịka ahụtara ya n’ahụ mmadụ otu puku narị atọ na iri atọ na abụọ n’ime otu izuụka.

    N'otu aka ahụ ka ngalaba WHO na-ekwu na ọkarịala mmadụ nde narị ise na iri isii na ise buterela ọrịa a n'ụwa niile ebe mmadụ nde isii na ụma atọ nwụrụ n'aka ya.

    WHO kwuwkara na agbaala ọgwụ mgbochi ijeri iri na abụọ kamgbe ụbọchị iri na itolu nke ọnwa Julai.

  18. Ị bọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị si mba ụwa niile

  19. Ọrịa monkey pox abanyela ọnọdụ gbatagbata na mbaụwa

    Monkey pox

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) ekwuola na ọrịa monkeypox abanyela ọnọdụ gbatagbata na mbaụwa.

    Nke a bụ ogogo kachasị elu WHO nwereike inye maka ọrịa a bụ nke ha kwuru na ọ rịwala elu na mbaụwa, dịka o gburula mmadụ ise n’ime ihe karịrị mmadụ 16,000 isii buterela ya na mba 75.

    Ha kwuputere nke a dịka ha mechara nzukọ nke gbatagbata abụọ ha kpọrọ n'ihi ọrịa a.

    Ka ọ dị ugbua, e nwere naanị ọrịa abụọ nwere ụdịrị ọnọdụ gbatagbata a, nke bụ ọrịa coronavirus nakwa ọrịa polio nke a na-achọ ka a chụpụ ya n'ụwa kpam kpam.

    Dkt edros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi WHO, kwuru na itinye ọnọdụ gbatagbata, ga-eme ka e nwee ike imepụta ọgwụ mgbochi ya ọsịsọ ma tinye usoro ga-eme ka e gbochinwuo ọrịa a ọ sị ji ọsọ na-agazu ụwa niile.

  20. Ahụ na-adị Joe Biden mma dịka o butere covid-19 - Dọkịnta na-agwọ Biden

    Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba ahụike obi onyeisiala mba Amerịka ekwuola na Joe Biden bụ onyeisiala mba ahụ na-agbake nke ọma dịka ahụtara ọrịa covid-19 n'ahụ ya.

    Ndị dọkịnta Biden bụ onye dị afọ iri asaa na itolu kwuru na Biden adopụla onwe ya iche agbanyeghị na ọ na-arụ ọrụ ya dịka onyeisiala.

    Biden bụ onyeisiala abụọ nke mba Amerịka buterela ọrịa covid-19 dịka Donald Trump onye ọ nọchịrị butere ya bụ ọrịa.

    Ruo taa mmadụ nde iri asatọ na itolu na ụma ebutela ọrịa covid-19 na mba Amerịka ebe ihe karịrị mmadụ otu nde anwụọla maka ya bụ ọrịa.