Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụlọikpe n'Akure akpọchiela ndị isi ụka Whole Bible Believer Church jidere mmadụ 77 n'ime ụka ha

    Ụka ndị n'Ondo steeti

    Ụlọikpe Majie dị n'Akure, Ondo steeti enyela iwu ka a tụnyegodi na nga ndị ụkọchukwu ise nke ụka Whole Bible Believer Church na steeti rue ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julaị.

    A na-ekpe ha ikpe maka ebubo ntọdịka ha ghọgburu ma jichie mmadụ iri asaa na asaa gụnyere ụmụaka n' okpuru n'ụlọ sị ha na Jesus na-abịa nke abụọ ya n'ọnwa Septemba afọ a.

  2. Roe v Wade: Biden ebinyela aka n’iwu ga-echekwa ikike ite ime ọzọ n’Amerịka, Ndị Democrats akwanyela Joe Biden ọkụ n'ike nke mere o jiri binye aka n'iwu ọhụrụ a.

    Joe Biden n'ime obi gọọmentị ya n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ebinyela aka n’iwu ga-akwalite nchekwa nye atụmatụ ite ime nke ụlọikpe kachasị mba ha machiri n’izu abụọ gara aga.

    Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Democrats bụ nke Biden nọ n’ime ya kwenyere ya ọkụ n’ike n’ihi atụmatụ mmachi ite ime nke ndị ụlọikpe kachasị mba ha machiri. Ha kwuru na mkpebi okwu esoghị n’ụkpụrụ otu pati ha.

    Mkwanye ọkụ a mere Biden jiri binye iwu ọhụrụ a aka nke mere na nchekwa ga-adịzịrị steeti dị ịcheịche na mba ahụ chọrọ inye ndị nke ha ohere ite ime.

    Iwu a nyere usoro ga-enye ọha ohere ite ime nke na-adịbughị kemgbe amachiri ite ime na mba ahụ.

    Iwu ọhụrụ a nyekwara ụmụwaanyị nchekwa nakwa ụzọ mgbapụta n’aka ntaramahụhụ ghara eso atụmatụ isi n’otu steeti gaa steeti ọzọ maka ebumnobi ite ime.

    Ihe ndị so iwu a bụkwa atụmatụ ichekwa ma zookwaa ihe gbasara onye ọbụla nwere atụmatụ ite ime.

    Ihe ọzọ bụkwa na ugbua, iwu emeela ka inweta ọgwụ maọbụ usoro ndị ọzọ mmadụ nwereike iji tee ime ga-adịkwa mfe etu ọ dị na mbụ.

    Biden nyere odeakwụkwọ nke ihe gbasara ahụike na ọdịmma ndị mmadụ iwu bụ Xavier Becerra ka ọzitere ya akwụkwọ ozi maka mmezu ihe dị n’akwụkwọ iwu ọhụrụ tupu abalị 30 eruo.

    Cheta na Biden ekwuola ugboro ugboro na ikike ihibe usoro gbochiri maọbụ kwado ite ime dịịrị ndị omeiwu mba ahụ.

    N’okwu ya, “Dịka ọ dịịrị ndị omeiwu ime iwu ndị a, nke dịịrị m bụ ịhụ na m chekwara ikike ahụike ụmụnwaanyị nakwa ikike ha ite ime n’ụzọ iwu mba anyị kwadoro na nke na-agaghị egbu ha”

    Biden na-ekwu nke ka izu abụọ gachara mgbe ụlọikpe kachasị mba ha tụharịrị iwu nyebụrụ ndị mba ahụ ikike ite ime kemgbe afọ 1973 ma mmachịe ya.

    Dịka ụlọikpe a mere mkpebi a, ọpekatampe, steeti itoolu amachịela ihe niile gbasara ite ime na steeti ha kpam kpam.

    Steeti ndị a nyere ohere iti ime ka ọ bụrụ naanị ma ndụ nne dị ime ọmụmụ anọ n’ọnọdụ ize ndụ.

    Biden nyekwara iwu ka ọkaiwu gọọmentị etiti nakwa ndị otu ikpe nke obi gọọmentị ya nyere ndị na-agba mbọ inyere ndị mkpebi ụlọikpe kachasị mere aka.

  3. Onyeisiala Buhari na ndí isi nchekwa abanyela nzukọ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari, ụfọdụ ndị gọọmentị ya na ndị isi ọrụ nchekwa banyere nzukọ n’obi gọọmentị dị n’Abuja na Fraịde.

    O dobeghi anya ma ọ bụ naanị n’ihi mwakpo ụlọmkpọrọ mere na na Kuje n’abalị Tuzde, mere ha ji gbakọọ, mana cheta na Buhari kwuru na ọ na-eche ka e wetara ya ozi doro anya maka ya bụ mwakpo mere.

  4. Ndị gọvanọ APC atọ, Fayose agaala zute Wike na Rivers steeti

    Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti steeti, Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti na Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti, agaala njem nleta na nke Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas steeti.

    Ndị gọvanọ atọ a bụ ndị pati All Progressives Congress (APC), Ayodele Fayose bụbu gọvanọ Ekiti steeti na Wike bụ onye pati Peoples Democratic Party (PDP), banyere nzukọ imeụlọ, mana amabeghi ma ọ bụ ihe gbasara ntuliaka afọ 2023 ka ha na-akpa.

    Cheta na kepu kepu fegharịri na Bola Ahmed Tinubu na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n'okpuru pati APC, zutere Wike na mba France n'izu gara aga, mana ndị mgbasaozi Tinubu ekwuola na ọ bụghị eziokwu na e nwere ụdịrị ọgbakọ a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Ndọrọndọrọ imeụlọ maka onye ga-anọchi anya Boris Johnson amalitela

    Boris Johnson

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Boris Johnson gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Tọzde

    Mmadụ atọ ekwupụtala mmasị ha ịnọchi anya Boris Johnson dịka onyeisi otu 'Conservatives Party' nakwa Praịm Mịnịsta mba UK.

    Ha gụnyere Tom Tugendhat, Suella Braverman onye ji ọkwa 'Attorney General', nakwa Steve Baker.

    Boris Johnson rituru n'ọkwa dịka onyeisi ndị pati ya n'ụbọchị Tọzde, ma kwuo na ya ga-akwụsị ọrụ dịka Praịm mịnịsta ngwangwa a họpụtara onye ga-anọchi ya.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ n'ime ndị Johnson họrọ n'ọrụ dịka mịnịsta tinyere akwụkwọ arụkwaghịm ma kwuo na ha agaghịzi akwado ya.

    Mana Johnson etinyela ndị ọhụrụ n'ọkwa ndị ahụ bụ ndị ga-anọ n'ọnọdụ nchere oge ruo mgbe a ga-eme ntuliaka n'oge 'autumn'.

  6. A gbaala Shinzo Abe nke Japan egbe

    Shinzo Abe

    Ebe foto si, Getty Image

    Onye ojiegbe awakpola Shinzo Abe bụbu Praịm Mịnịsta mba Japan.

    E burula Shinzo Abe, gawa ụlọọgwụ dịka otu onye ojiegbe gbara ya egbe.

    Abe nọ na-ekwu okwu n’ọgbakọ ịchụ nta vootu maka otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị oge otu nwoke ji egbe gbara ya egbe ugboro abụọ.

    Mgbọ tụrụ Abe n’azụ, o wee daa n’ala; mana ndị ọrụ nchekwa jichiri nwoke gbara ya egbe ahụ, bụ onye na-agbaghị ọsọ.

    Shinzo Abe bụ onye kacha nọtee aka n'ọkwa Praịm Mịnịsta na mba Japan.

    Ọ ritutu n'ọkwa ahụ n'afọ 2020 n'ihi na ahụ esichaghị ya ike; ọ na-arịa ọrịa mgbịrị afọ a kpọrọ 'ulcerative colitis'.

    Abe hafere ọchịchị n'aka Yoshidie Suga, onye mechara hafekwaa ọchịchị n'aka Fumio Kishida.

    Japan

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata gbara okiri ebe ahụ a nọrọ gbaa Shinzo Abe egbe

    Akụkọ gbasara mwakpo egbe, maọbụ ịwakpo ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ihe a na-anụ mgbe dum na mba Japan.

    Tupu mmadụ enwee ike ịzụta egbe na Japan, onye ahụ ga-eme ọtụtụ nnyocha iji mata ma isi ezukwara ha oke.

    Ọ bụrụ na onye ahụ mechaa nnyocha, naanị egbe nta Bekee kpọrọ 'shotgun' maọbụ 'air rifle' ka mmadụ nkịtị nwere ike inwe.

  7. Ndewoonụ

    Ụnụ asaala chi, Igbo ndị ọma anyị jiri biri!

    Taa maara ụnụ mma!

    Ngwa, soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa n'ụwa gbaa gburugburu taa.

  8. Mmadụ itoolu anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ Kaduna-Zaria

    Ihe mberede okporoụzọ mere na Kaduna steeti

    Mmadụ itoolu anwụọla ebe mmadụ 12 ọzọ merụrụ ahụ mgbe ụgbọala anọ kụkọtara onwe ha n'ihe mberede okporoụzọ Kaduna-Zaria.

    Hafiz Mohammed bụ onyeisi ndị nchekwa okporoụzọ (Kaduna State Road Safety Commission), gwara ndị ntaakụkọ nke a na Tọzde.

    O kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'ebe elekere ise nke isi ụtụtụ, n'elu akwammiri Rigachikun dị nso mahadum NOUN.

    Ụgbọala anọ ahụ gụnyere gwongworo abụọ, otu bọọsụ na otu ụgbọala.

    Mohammed kwuru na ọ bụ mmadụ itoolu nwụrụ, ebe e bugara mmadụ 12 ahụ merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.

    O kwukwara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na erubereghi iwu nchekwa ụzọ isi bụ ihe butere ihe mberede a.

  9. Super Falcons na Botswana ga-achịpụ ya n'abalị a

    Super Falcons nke Naịjiria na The Mares nke Botswana ga-atakọta isi taa n’Otu C n’asọmpi Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị.

    Cheta na Naịjiria enwetabeghi pọịntị ọbụla dịka Saụt Afrịka meriri ha n’egwuregwu nke mbụ ha gbara.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Ụbọchị 11 na 12 nke Julaị bụ ụbọchị ezumike maka Eid el-Kabir

    Gọọmentị Naịjiria akpọpụtala ụbọchị iri na otu na iri na abụọ nke ọnwa Julaị maka ụbọchị ezumiike.

    Ụbọchị abụọ ahụ bụ maka emume Eid el-Kabir ndị ụka alakụba na-eme kwa afọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Congo DR na Rwanda ekwọkọrịtala ibutu obi n'esemokwu dị n'etiti ha abụọ

    Félix Tshisekedi  na Paul Kagame

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndisiala mba Rụwanda na nke Kongo (DRC) enweela ọgbakọ ebe ha kwekọrịtara ibutu obi n'esemokwu ndị n'etiti mba abụọ ahụ dịka tigbuo-zọgbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwu Kongo ụbọchị Wednezde.

    Kongo na-ebo Rụwanda ebubo na ọ bụ ga na-akwado ndị agha nnupụisi Tutsi akpọrọ M23 bụ ndị na-akpa ike na mpaghara ahụ mana Rụwanda gọrọ agụgọ.

    Dịka ha nwechara ọgbakọ ahụ n'Angola, onyeisiala Kongo bụ Félix Tshisekedi na ogbo ya nke Rụwanda ekwetala ịgba mbọ hụ na ntụkwasị obi na udo lọghachiri.

    Tshisekedi kwuru na ya na Kagame ekwetela ibidokwa mmekọrịta obodo na ibe ya .

    O kwukwara maka ịkpọpụ ndị agha M23 n'ebe ha nọ na mpaghara Ọwụwa-Anyanwu Kongo.

    Ihe isii dị mkpa i kwesịrị ịma maka esemokwu dị n'etiti mba abụọ a

    1. Okeala dịka ndị ọcha chịburu ha si kee ya

    Tupu ndị ọcha achịwa ha, ndị eze bụ ndị na-achị mpaghara obodo dị iche iche na mba abụọ ahụ.

    Oge ọgbakọ Berlin n'afọ 1885,e kegharịrị okeala nke mere ka e kewaa ndị bụbu ụmụnne, kenye ụfọdụ na mpaghara ọzọ , kenye ndị ọzọ na mpaghar ọzọ.

  12. M ga na-aga n'ihu n'agbanyeghi ọkụ a na-akwanye m n'ike - Boris Johnson

    Boris Johnson

    Ebe foto si, Getty Images

    Boris Johnson bụ Praịm Minista mba UK ekwuola na ọ ka ga na-aga n’ihu n’agbanyeghi oku ụfọdụ ndị minista na-akpọ ka ọ wụsa ọwa.

    Ọ gwara ndị minista dịka ọ na-ekwu okwu n'ọgbakọ a kpọrọ "Commons Liaison Committee", na "ọ gaghị egosi ezi uche" ma ọ bụrụ na ọ gbaa arụkwaghịm ugbua.

    O kwuru na ọ gaghị adị mma ma ọ wụsa ọwa ugbua, ọkachasị n'etiti nsogbu akụnaụba obodo ha na-enwe nakwa agha na-ada na mba Yukren.

    Ndị minista gụnyere Chris Heaton-Harris bụ 'Chief whip' na Grant Shapps bụ minista na-ahụ maka Njem, so na ndị na-akwanye Johnson ọkụ n'ike ka ọ gbaa arụkwaghịm.

    Nke a na-abịa dịka ndị minista ya abụọ gbara arụkwaghịm ụnyaahụ, mere ya ndị minista na ndị enyemaka ya dị iri atọ na otu na-agba arụkwaghịm

  13. Onyeisiala Buhari eduola minista asaa n'iyi ọrụ, kpogharịa ime obi gọọmentị ya

    Ndị minista ọhụrụ e duru n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Presidency

    Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola ndị minista ọhụrụ asaa n’iyi ọrụ n’obi gọọmentị ya n’Abuja taa.

    Ndị minista ọhụrụ a gụnyere Henry Ikoh nke Abia, Umana Okon Umana, Akwa Ibom, Udi Odum, Rivers, Ademola Adegoroye, Ondo, Umar Ibrahim El-Yakub, Kano, Goodluck Nana Opiah si Imo steeti na Ekumankama Nkama si Ebonyi steeti.

    Ha bụ ndị ọ họpụtara iji tichie ndị minista ya gbara arụkwaghịm iji nwee ohere iso zọọ ọkwa na ntuliaka afọ 2023.

    O jikwa ohere ahụ kpogharịa ndị ọrụ ime obi gọọmentị ya ma tinye ụfọdụ n'ime ha na mịnịstrị dị iche iche.

    Lee mịnịstrị ebe onye nọ:

    • Sinetọ Adeleke Mamora – Minista na-ahụ maka Sayensị na Teknụzụ
    • Mu’azu Jaji Sambo – Minista na-ahụ maka Njem
    • Umana Okon Umana – Minista na-ahụ maka Niger Delta
    • Sharon Ikeozor – Minista nke Steeti na-ahụ maka Niger Delta
    • Sinetọ Gbemisola Saraki – Minista nke Steeti na-ahụ maka Mines na Steel
    • Umar Ibrahim El-Yakub – Minista nke Steeti na-ahụ maka Ọrụ na Ụlọ
    • Goodluck Nanah Opiah – Minista nke steeti na-ahụ maka Agụmakwụkwọ
    • Ekumankama Joseph Nkama – Minista onke steeti na-ahụ maka Ahụike
    • Ikoh Henry Ikechukwu – Minista nke steeti na-ahụ maka Sayensị na Teknụzụ
    • Udi Odum – Minista nke steeti na-ahụ maka Gburugburu
    • Ademola Adewole Adegoroye – Minista nke steeti na-ahụ maka Njem
  14. Ụlọikpe enyela Rochas Okorocha ohere ịga mba ofesi maka ahụike ya

    Rochas Okorocha

    Ebe foto si, Rochas Okorocha Facebook

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja enyela Rochas Okorocha ikike ịga mba ofesi nata nlekọta ahụike.

    Ọkaikpe Inyang Ekwo nọ n’isi ikpe a nyere iwu ka e nye Rochas akwụkwọ ikike ime njem ya nke ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) jichiri.

    Ọkaiwu ya bụ Ola Olanipekun tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe na Okorocha na-anọchite anya Imo Nọt n'Ụlọikpe Ukwu, na-enwe nsogbu ahụike nso nso a.

    O kwuru na ọ gaghị agba ọsọ, na ọ ga-alọghachita maka ikpe ya.

    Chile Okoroma bụ onye nọchitere anya EFCC n'ụlọikpe ahụ, gbaghara okwu a, mana o derela jụụ mgbe Ọkaikpe Ekwo nyere iwu sị na naanị ihe mere ọ ga-eji hapụ ka Okorocha gaa njem a bụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eweghachịta akwụkwọ ikike n'ụlọikpe na-akarịghị abalị atọ o si njem ya lọghachịta Naịjiria.

    Ọkaikpe Ekwo tinyere abalị asaa nke ọnwa Nọvemba maka ikpe ya ikpe maka nrụrụaka na mbupu ego gọọmentị etiti boro ya.

    BBC kpọtụrụ ndị otu Rochas, mana ha sị na enweghi ihe ha nwere ikwu gbasara ya.

  15. E liela ụmụaka 21 nwụrụ n'otu ụlọegwu dị na mba Saụt Afrịka

    Ụmụaka nwụrụ na Saụt Afrịka

    Akwamozu ụmụaka 21 nwụrụ n'ụzọ edochabeghi anya n'otu ụlọegwu dị na mba Saụt Afrịka ga-aga n'ihu taa.

    O gafeela otu izu ụka ụmụaka ahụ si afọ 13 rue afọ 17 nwụrụ.

    E hibere emume akwamozu ha n'otu ogige dị na East London na mba ahụ.

    A na-atụ anya na onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa, ndị ọru gọọmentị, ụmụakwụkọ ibe ha, ezinaụlọ ha, ndị enyi ha nakwa ndị ọzọ ruru mmadụ puku atọ ga-apụta kwanyere ndị nwụrụ ugwu ikpeazụ.

    Ụmụaka nwụrụ n'Odachi ahụ
  16. Muhammad Sanusi Barkindo bụ odeakwụkwọ kachasị n'OPEC anwụọla

    Muhammad Sanusi Barkindo

    Onye bụ odeakwụwkọ kachasị n'OPEC bụ Muhammad Sausi Barkindo anwụọla n'ebe elekere iri na otu nke abalị ụbọchị Tuusde.

    Ọnwụ ya na-abịa n'ihe erughi otu ụbọchị ya na onyeisiala Muhammadu Buhari zutechara onwe ha.

    Onyeisioche ngalaba mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ Mele Kyari bụ onye depụtara ozi ọnwụ Barkindo n'akara Twitter ya.

    Tupu ọ nwụọ, Barkindo kwesiri ịrịtụ n'ọkwa ahụ ọ nọgoro na ya afọ isii na ngwụcha ọnwa Jụlaị a.

  17. Ndị ojiegbe awakpola ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja

    Kuje Prison

    Ebe foto si, Screengrab

    Ndị ekperima wakporo ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja n’abalị Tuzde, dịka ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa mkpọrọ bụ AD Umar si kwuo.

    Umar kwuru na ndị ọrụ nchekwa busoro ndị ekperima a agha ma mee ka udo lọghachi n’ụlọ mkpọrọ ahụ.

    Akụkọ na-abịa.

  18. Nne na nna nwata dị afọ abụọ so na ndị nwụrụ n'emume ncheta nnwereonwe Amerika

    July 4th

    Ebe foto si, Reuters

    Otu nwata gbara afọ abụọ abụrụla nwa na-enweghị nne na nna dịka nne ya na nna ya so na ndị e gburu na mwakpo mere na Chicago nke mba Amerịka abalị atọ gara aga.

    Ọ bụ n'emume ncheta nnwereonwe mba Amerịka ka otu onye ojiegbe malitere ịgba egbe ma gbagbuo mmadụ asaa.

    Kevin McCarthy na nwunye ya bụ Irina McCarth kpọ nwa ha bụ Aiden gaa ọgbakọ ahụ, mana mgbọ tụgburu ha abụọ.

    Nwa ha nwoke bụ Aiden emerụghị ahụ. Papa na Mama nnukwu ya na-elekọtazi ya ugbua.

    Otu di na nwunye nọ ebe ihe a mere gwara ndị ntaakụkọ na ha hụrụ nwata ahụ ka ọ na-akpagharị, ha wee nyere ya aka.

  19. Unu asaala chi

    Igbo ndị ọma, unu asaala chi.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasa ozi nke taa.

  20. Gọọmentị Naịjirịa na-enye ụmụakwụkwọ mahadum ndị gbapụrụ Ukraine ohere agụmakwụkwọ, Ndị agha na-ada n'Ukraine metụtara agụmakwụkwọ ha enwetala ohere ọhụrụ site n'aka gọọmentị Naịjrịa.

    Unilag

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị Naịjirịa enyela ụmụafọr mba ha ndị gbara ọsọ ndụ ha n’ihi agha na-ada na mba Ukraine ohere pụrụiche ibanye mahadum ndị nke gọọmentị Naịjirịa ma gụchapụ akwụkwọ ha.

    N’akwụkwọ ozi nke ministri na-ahụ maka mba na mba na Naịjirịa bipụtara, ha kwuru na “Naịjirịa na-agba mbọ ịhụ na etinyere ụmụakwụkwọ ndị a na mahadum dị na mba a ugbua”.

    Ministri a ewepụtala usoro ndebanye aha maka nke a na websaịtị ha.

    Agbapụtara puku kwuru puku ụmụafọ ndị Naịjịrịa na-agụ akwụkwọ n’Ukraine dịka Russia malitere iwakpo mba ahụ.

    Nke a mere na ọtụtụ n’ime ha agụchapụghịzị akwụkwọ ha.

    Ọtụtụ na-ajụ ma ya bụ atụmatụ ọ ga-achịta aja n’ihi na kemgbe ọnwa Febụwarị 2022,ọtụtụ mahadum nke gọọmentị na Naịjirịa mechiri n’ihi abụbọ ọrụ ndị otu nkuzi mahadum nke Academic Staff Union of Universities (Asuu) na-agba maka okwu mbuli ụgwọ ọnwa ha nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ruo ugbua, amabeghị mgbe ya bụ abụbọ ọrụ ga-ebi n’ihi Asuu kwuru na gọọmentị etiti ekwebeghị mezuo mkpesa ha mere.