“Anyị dị njikere ịkwụsị abụbọ ọrụ anyị echi mana...” - Asuu, Otu Asuu na Gọọmentị etiti ka na-asọkata mpị n'okwu ụgwọ ọrụ ha, leekwa nke dapụtara n'izu a.

Ebe foto si, Presidency/Asuu
Otu ndị nkuzi mahadum na Naịjrịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) ekwuola na ha dị njikere ịkwụsị abụbụ ọrụ ha ugbua ma ọ bụrụ na gọọmentị kwee me ihe ha na-arịọ nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọrụ ha, iji teknụzụ na-ahazị usoro ịkwụ ha ụgwọ na ihe ndị ọzọ.
Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru na gọọmenntị etiti emezubeghị ihe ndị ha rịọrọ nke bụ na nnọgide abụbọ ọrụ ha ugbua nọ n’aka gọọmentị etiti.
Osodeke kwuru: “N'ihe gbasara, abụbọ ọrụ a, Asuu nwere nzubere ịkwụsị ya echi echi, anyị na gọọmentị etiti enwechaala mkparitaụka kemgbe, ihe anyị na-echezị ka gọọmentị kpọọ anyị ngwa ngwa ka anyị binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ọhụrụ”
Cheta na Asuu malitere abụbọ ọrụ ha kemgbe ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a iji gosi iwe ha dịka ha kwuru na gọọmentị etiti ekwebeghị gee ha ntị na mkpesa ha.

















