Otu jikọtara ndị ọrụ bekee bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ngalaba Kaduna Steetị ekwuola na ha ga-agba abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị n'ime otu izuụka malite n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Mee.
Ihe sị na nke a bụ maka ndị ọrụ bekee dị puku anọ gọvanọ Nasir El-Rufaị chụrụ n'ọrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Eprelụ.
Ha sị ka gọvanọ kpọghachị ndị a n'ọrụ ma kwụsị atụmatụ ọbụla o nwere ịchụ ndị ọrụ bekee ọzọ n'ọdịnihu.
Ngalaba ndị ọrụ bekee ga-eso n'abụbụọrụ a gụnyere;
Ndị na-ahụ maka nri na ụtaba, ndị na-ahụ maka ọkụ latrik, ndị na-ahụ maka nkuzi n'ụlọakwụkwọ, ndị ọrụ okpuruọchịchị obodo, ndị ọrụ mmanụ agbịdị na gaasị, ndị ọrụ mgbasaozi, ndị ọrụ ahụike, nọọsụ dgz.
Gọvanọ Nasir El-Rufai sị na ihe mere o ji chụọ ndị a bụ maka ọnọdụ ọjọọ nke akụnaụba steetị nakwa nnukwu ego ọ na-emefu iji akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa bụ nke steetị na-agaghị ebulizi.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Muyiwa Adekeye pụta sị ọchịchị abụghị naanị maka ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ kama na ọ gụnyere imepe obodo, ikewapụta ọrụ, ichekwa obodo maka ndị chọrọ ịbịa hiwe ụlọọrụ.