Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị agha nnupuisi na Etiopia atọrọla ndị Chaịna mmadụ atọ
Ebe foto si, AFP
N’Afrịka, ndị
agha nnupuisi na Ethiopia sị na ha atọọrọla mmadụ atọ ndị mba Chaịna na-egwu
ọlatarachi na mpaghara Oromia.
Ndị agha
nnupuisi a kpọrọ onwe ha Oromo Liberation Army sị na ha anabataghị ọrụ ngo
ọbụla gọọmenti mba ahụ nyere.
Ndị gọvanọ ndịda agaghị ala azụ n'ịmachị nchịgharị ehi na mpaghara ahụ - Wike
Ebe foto si, Governor Wike's Twitter Page
Nyesom Wike bụ aka na-achị Rivers state ekwuola na o nweghị nlaghachị azụ na mkpebi ndị gọvanọ ndịda mere gbasara ịmachị nchịgharị ehi na mpaghara ahụ.
Cheta na ndị gọvanọ ndịda gbakọrọ n'ụbọchị Tuzde gara aga ma kwekọrịta mmachị a ha kwuru ga-ebelata nsogbu na-adapụtakarị n'etiti ndị ọrụ ugbo nakwa ndị na-achị ehi.
Mkpebi a na-anata ọkpọ n'etiti ụfọdụ ụmụ Naịjirịa.
Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello kwuru na ọ ga-adị mma ka-arụpụta ọdọ ebe a na-achị ehi nke ndị bekee kpọrọ cattle raching tupu amachie nchịgharị ehi kpam kpam.
Mana n'ọgbakọ otu Ogoni "Ethnic Nationality of Rivers State" hibere ụnyaahụ (Mee 15, 2021) n'okpuru ọchịchị Khana dị na Rivers steeti ka gọvanọ Wike kwuru na ọ nweghị ihe ga-eme ka e wepụ mmachị ahụ dịka ụlọọrụ Channels si depụta.
Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi esorola Leicester City kere Chelsea ọkpọ
Ebe foto si, Press Association
Ụmụibe Leicester City amaburula iko FA site na
iji otu ọkpụ goolu merie Chelsea na be ha.
Nke a bụ nke mbụ Leicester City na-ebute ya bụ iko
kemgbe ụwa site na ya bụ goolu Youri Tielemans nyere na nkeji iri isii na atọ.
Ụmụafọ Naịjria abụọ, Kelechi Iheanchọ na Wilfred Ndidi sọ na ndị ritere uru ya bụ mmeri dịka ndị otu egwu bọolụ Leicester City.
Agbanyeghị na ha enweteghị ya, ya bụ Iko abụghịrị Chelsea ihe ọhụrụ dịka ka ha bugoro ya ihe karịri ugboro ise kemgbe ọ malitere.
Ha sikwara ya ime dịka ndị nke abụọ n'afọ 2020, mana Chi ha enyeghị ha ya.
Benjamin Netanyahu nke Isreal sị na ya agaghị ekwe ma Hamas akwụsịghị ịtụ ha ogbunigwe
Ebe foto si, Getty Images
Praịm Minista mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu
eforola ntutu taa na ya ga na-abọgwara ogbunigwe niile ndị Palistain tubatara
n’Israel.
Agbanyeghị udo niile Onyeisiala Amerika na ndi UN
na-ekpe ebe ahụ, ogbunigwe egbuola mmadu atọ ndị Palistian taa bụ Sọnde dịka ndị
Isreal zokpuchara n’ọnụ mpio maka ogbunigwe ndị Palistian.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-amapụ njem abalị anọ na mba Fransi maka ọgbakọ ọdịmma akụnaụba Afrịka
Onyeisiala
Mohammadu Buhari ga-amapụ njem abalị anọ na mba France taa bụ Sọnde dịka ọnụ
na-ekwuru ya bụ Garba Shehu dere ụnyaahụ.
Ndị isiala
mba Afrịka ga-akpa maka ọdịmma akụnaụba ha kemgbe coronavirus nyụchara ụwa ịkpakwụ
na ya bụ ọgbakọ ha na-aga.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ụnụ asaala chi ee, ụmụibe. Taa bụ Afọ. Afọ biko fọtara anyị ihe ọma.
Ihe mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweaka ataala isi mmadụ
Ebe foto si, FRSC Anambra
Ụlọọrụ n-ahụ maka e jee a lọọ bụ Road Safety nke Anambra Steetị sị ihe mberede okporoụzọ mere n'Upper Iweaka ataala isi otu nwaanyị.
Nke a dị n'akwụkọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a n'Anambra bụ Florence Edor wepụtara na Satọde.
Ọ sị na ihe kpatara nke bụ mgbe otu ụgbọala ukwu na-agba oke ọsọ enweghi ike ijide onwe ma gaa sọnye isi n'ihe e ji kewaa ụzọ ma gbuo otu nwaanyị ji ụkwụ aga.
Ebe foto si, FRSC Anambra
Ọ sị na ihe mberede a metụtara mmadụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị mana nke nwaanyị nwụrụ mgbe e bu ya gaa n'ụlọọgwụ.
Onyeisi ụlọọrụ a n'Anambra Steetị bụ Adeoye Irelewuyi ezigaarala ezinaụlọ nwaanyị ozi iti aka n'obi.
Ọ rịọrọ ka ndị ji ụkwụ aga gbalịa na-eme nke a n'okporoụzọ gọọmentị rụrụ maka ndị ji ụkwụ.
Ụlọọrụ JAMB agbatịala oge a ga-ele ule ha
Ebe foto si, Jamb/Facebook
Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye mahadum bụ JAMB
agbatịkwuola ohere idebanye aha n’ule ahụ ruo izuụka abụọ.
A na-atụ anya na ule a ga-amalite n’ụbọchị iri na
itoolu nke ọnwa Juun ruo ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị.
A sị buru na a ga-ele ule a n'ụbọchị ise ruo ụbọchị itoolu nke ọnwa Juun.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Ishaq Oloyede nọọrọ n'ụbọchị Fraịde kwuola na e nwereike ịgbatị oge ule a na mkparịtaụka ha nwere.
Ọ sị na ọ bụ n'ihi ndị ruru puku narị isii edebanyebeghi aha na-agbanyeghi mmasị ha gosiri n'ule ahụ.
Ihe ruru mmadụ otu nde na otu puku narị edebanyela aha maka ule ahụ dịka ụlọọrụ JAMB si kwuo.
Oloyede kwuru n'ụbọchị Fraịde na "ọ dị mkpa inye ọbụla ohere."
Ụlọọrụ a sị ka onye ọbụla ga-ele ule a nwee akara njirimaara onye bụ NIN tupu o debanye aha n'ule ahụ.
BBC Nkeji nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Ndị ọrụ bekee dị iche iche na Kaduna ga-ebido abụbụ ọrụ
Ebe foto si, Nigerian Labour Congress
Otu jikọtara ndị ọrụ bekee bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ngalaba Kaduna Steetị ekwuola na ha ga-agba abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị n'ime otu izuụka malite n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Mee.
Ihe sị na nke a bụ maka ndị ọrụ bekee dị puku anọ gọvanọ Nasir El-Rufaị chụrụ n'ọrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Eprelụ.
Ha sị ka gọvanọ kpọghachị ndị a n'ọrụ ma kwụsị atụmatụ ọbụla o nwere ịchụ ndị ọrụ bekee ọzọ n'ọdịnihu.
Ebe foto si, NLC
Ngalaba ndị ọrụ bekee ga-eso n'abụbụọrụ a gụnyere;
Ndị na-ahụ maka nri na ụtaba, ndị na-ahụ maka ọkụ latrik, ndị na-ahụ maka nkuzi n'ụlọakwụkwọ, ndị ọrụ okpuruọchịchị obodo, ndị ọrụ mmanụ agbịdị na gaasị, ndị ọrụ mgbasaozi, ndị ọrụ ahụike, nọọsụ dgz.
Ebe foto si, @Nasir EL-Rufai
Gọvanọ Nasir El-Rufai sị na ihe mere o ji chụọ ndị a bụ maka ọnọdụ ọjọọ nke akụnaụba steetị nakwa nnukwu ego ọ na-emefu iji akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa bụ nke steetị na-agaghị ebulizi.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Muyiwa Adekeye pụta sị ọchịchị abụghị naanị maka ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ kama na ọ gụnyere imepe obodo, ikewapụta ọrụ, ichekwa obodo maka ndị chọrọ ịbịa hiwe ụlọọrụ.
kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi ga-eso mgbe Leicester City na Chelsea ga-akwata taa bụ Satọde
Ebe foto si, Getty Images
Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi ga-eso na-egwu mgbe Leicester City and Chelsea ga-akwata n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi FA
Ya bụ egwuregwu ga-abụ n'elekere ise nke mgbede taa bụ Satọde n'ọgbọegwu Wembley.
Onye egwu ndị Chelsea bụ Mateo Kovacic ga-eso n'egwu dịka ọ gbakechegoro kemgbe o si ezumike mmeru ahụ izuụka ise bata.
A tụkwara anya na N'Golo Kante ga-eso bidoro Chelsea egwu agbanyeghị na ọ ka na-agbake.
A tụkwara anya na ochee goolu ndị Chelsea bụ Kepa Arrizabalaga ga-eso malite ebe Andreas Christensen nwereike ọ gaghị eso n'egwu.
Azọpụtala Nwaada tọrọ n'oke osimiri ebe ọ na-agba ọsọ ndụ
Ndị agha ụgbọelụ mba Span azọpụtala otu nwaada onye Ivory Coast tọrọ n'oke osimri ebe ọ na-agba ọsọ ndụ n'aga Mauritania ya na mmadụ iri ise na itoolu (59) ndị ọzọ na-apụtaghị na ya bụ njem.
Aicha gbara afọ iri na asaa sị na mmanụ injin ha gwuru n'etiti oke osimiri bụ ebe agụụ mmiri na nrị nyụrụ ha ịkpakwụ tupu ụgbọelu ndị agha Spain abịa zọpụta ha ka ha nọgoro abalị iri abụo na abụọ ebe ahụ.
Goolu zoro ka mmiri n'asọmpi New Castle United na Manchester City, 3 - 4
N’egwuregwu, goolu zoro ka mmiri ụnyaahụ n’asọmpi
Premier League mgbe New Castle zutere Manchester City na ọgbọ egwuregwu St.
James Park.
Mana Manchester City ji ọkpụ goolu anọ asatara atọ
gosi ha nkarị
Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerika agbaala ụkwụ n'Isreal maka ikpe udo n'ogu ha na Palistain
Ebe foto si, Reuters
N’ofesi, mba Amerịka atụọla ọkpa na Isreal ebe ha
gara itinye ọnụ n’okwu ọgụ na-adara ha na Palistain.
Ana atụ anya na otu United nations ga-eso tinye ọnụ na
ya bụ ikpe udo ịji mara ka mba abụọ ahụ ga-esi kwụsị ọgụ a ha malitere kemgbe
abali ise.
Mmadụ dị otu narị, iri abụọ n'isi ndị Palistain anwụọla ebe naani mmmadụ asatọ nwụrụ na Isreal.
Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ha ga-ewepụta atụmatụ ọhụrụ ha ga-eji na-eso ndị na-agba ọkada na steeti ahụ.
Kọmishọna mgbasa ozi steetị ahụ bụ onye kwuru na
mkpamkpa ndị ọkada ji ya akpa n’obodo abụghị obele ihe, ma sị na Tuzde na-abịa
ka ha ga-ewepụta ụgbọala bọs ga-anọchị anya ya.