Ndị uweojii etufuola ndị ọrụ ha mmadụ iri na atọ n'aka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ n'ime ngwụcha izuụka gara aga.
Ndị uweojii a nwụru na mwakpo dị iche iche mere n'Akwa Ibom nakwa River Steeti site n'abalị asaa ruo abalị itoolụ nke ọnwa Mee, afọ 2021.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Akwa Ibom steeti bụ Odiko Macdon bụ onye kwuru nke a.
N'Akwa Ibom, ndị oji egbe a obi pụrụ azụ wakpọrọ ụlọọrụ ndị uweojii tọgbọ chako na Mkpanak na Essien Udim n'Ikot Odon dị n'Okpuruọchịchị Abak.
N'Ikot Odon, Odiko sị na ha mgbara ụgbọala ochie dị na-ebe ahụ, ya na ọgbatumtum ọkụ.
Ụmụntọrọbịa ndị Mkpanak mere na ụlọọrụ ndị uweojii ahụ agbaghị ọkụ pịa pịa.
Mana ha gburu otu onye ụweojii MOPOL 57 Ukana ebe ahụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru.
Nke a na-eme ka ha wakpochere ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Odoro Ikpe otu abalị nke ọzọ mechere.
N'Odoro Ikpe ndị oji egbe a amaghị ndị ha bụ gburu mmadụ ise ụbọchị Satọde abalị nke asatọ nke ọnwa Mee.
Isi otu unwunye onye uweojii biakwutere ya lakwara ebe ahụ.
Na River steeti ha wakporo ọnọdụ ndị uweojii atọ bụ ebe ha gburu mmadụ asaa.na Rumuji , Emohua, Choba, Elimgbu na Obia Akpo notu ahịrị.
Ha merukwara ụfọdụ ndị uweojii ahụ, zuru egbe ha ma gbakwaa ụlọọrụ ha na ụgbọala ha ọkụ n'abalị asaa nke Ọnwa Mee.
Na steeti ahụ, n'Ozubulu dị na Okpuruọchịchi Ekwusigo, ha wekpokwara ndị uweojii n'elekere asaa abalị, ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee.
Onụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikenga Tochukwu kwetere na ndị amaghị ama waporo ụlọọrụ ndị nche dị na Ozubulu.
Ọ sị na mmadụ abụọ amataghị ndị ha bụ meruru ahụ na ya bụ mgbọ ha kwara.
O kwukwara na ndị ajọ mmadụ ahụ nwakwara ịwakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii na Ozubulu mana ha emelighị ya.