Naijiria ga-akwado Mali na nnyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị - Buhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa na Naijria ga-enyere mba Mali aka n'ọrụ inyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị.
Buhari kwuru nke a oge onyeisiala mba ahụ bụ Lt. Gen. Mahamat Idris Deby-Itno, bịara zutere Onyeisiala Muhammadu Buhari n'obi gọọmenti dị na Abuja taa bụ Fraide.
Mahamat bụ onye weghara ọchịchị dịka nna ya bụ Idris Deby nwụrụ n'ihu ọgụ na nsonso a, kelere Buhari maka nkwado o na-enye ya kemgbe ọ batara n' ọchịchị.