Ọgbaghara adapụtala na Jerusalem n'ihi ngagharị ndị ụka Kraịst
Ndị Palestine na ndị uweojii Izrel akụkọtala isi n’ihe bụ abalị nke atọ, dịka a na-atụ ụjọ na ọgbaghara ọzọ ka nwereike ịdapụta taa, na mba Jerusalem.
Nke a na-abịa ka ndị a ma dịka Zionists na-akwado ime ngagharị ha a kpọrọ Jerusalem Day Flag March, ebe ha ga-esi n’ogige ndị Alakụba agafe.