Third Mainland Bridge: Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs

Gọọmentị kwuburu na a ga-emepe akwammiri 'third mainland bridge' n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị, mana ọ gaghị enwezi isi ugbua.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ 643 ọzọ ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala n'akara twitter ha na mmadụ narị isii na iri anọ na atọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Oyo steeti kachasị dịka mmadụ iri asatọ na asatọ butere ya ọzọ na steeti ahụ.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ isii ọzọ sị n'aka ya bụ ọrịa nwụọ na Naijirịa,

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. 'Akụkọ na onyeisi uweojii nyere ego maka ndọtị oge ọrụ ya bụ asị ọcha' - Frank Mba

    Onyeisiala Naijirịa bụ Mohammad Buharị na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu

    Ebe foto si, PRESIDENCY/TWITTER

    Ndị uweojii Naijirịa etiela n'ọnụ FRank Mba bụ ọnụ na-ekwuchitere ha ekwuoola na akụkọ na-efegharị na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu kwụrụ ijeri naira abụọ ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari dọtịa oge ọrụ ya ọnwa atọ bụ okpotokpo asị.

    Akụkọ a bidoro dịka onyeisiala Naijirịa dọtịkwuru oge ọrụ Adamu na-agbanyeghị na ọruzuola afọ iri atọ na ise ọ kwesịrị ịrụ n'ọrụ ya.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi Mba depụtara ka ọ kwuru nke a.

    Mba kwuru sị," oge ndọtị a abụghị oge ịnwe aṅụrị kama ọ bụ oge itinye uchu n'ọrụ".

    Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii bụ Mohammad Dingyadi kwuru na ndọtị oge ọrụ a bu ka enwee ohere ha ga-eji chọta onye ga-anọchị onyeisi ndị uweojii na-akwdo ịpụ.

  3. Unu abọọla Chi

    Soro anyị maka akụkọ ga-amasị gị taa

  4. Etu ndị Aba si agwa arịrị maka ọnwụ Ossy Prestige

    Aha onyonyo, Ossy Prestige: Etu ndị Aba si akwa arịrị maka ọnwụ ya

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Aba South na Aba North n'ụlọomeiwu nta bụ Ossy Prestige anwụọla dịka ndị omeiwu si kwuo.

    Benjamin Kalu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọomeiwu nta gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na onye otu ha bụ Prestige anwụọla.

    Kalu sị na ezinaụlọ Prestige mere ka ndị omeiwu mata na ọ nwụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febụwarị, 2021 n'ụlọọgwụ dị na mba Jamịnị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ọ sị dị ka iwu ha si dị n'ụlọomeiwu na ha ga-eri uju ya ugbua tinyerekwara na ha ga-ekwupụta ọnwụ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tusde.

    Ihe ị kwesịrị ịma maka Ossy Prestige

    Ossy Prestige bụ nwafọ Abia Steetị si n'obodo Agboji, Abiriba dị n'okpuruọchịchị Ohafia.

    A mụrụ ya n'ụbọchị 24 ọnwa Jenụwarị afọ 1965.

    Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Abia Steetị dị n'Uturu, n'ihe banyere ọchịchị na nlekọta ọha.

    Ọ gụkwara akwụkwọ na Lloyds Maritime Academy nke Lọndọn nakwa mahadum Commonwealth dị na Belize, Saụt Amerịka.

    Ọ bụ onye achụmntaego na ngalaba ibubata na ibupụ ngwaahịa ma bụrụkwa onye omeiwu.

    Ọ malitere ọrụ dịka onye omeiwu n'afọ 2015 dịka onye nnọchiteanya mpaghara Aba South na Aba North.

    Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ n'ịnọchiteanya ndị Aba nke mere ha jiri hụ ya n'anya nke ukwuu.

    Ụfọdụ ihe o mere ha gụnyere, ibunye ndị mmadụ ụgbọala, ọgbatumtum keke, igwe e ji akwa akwa, igwe ọkụ latrik, ụgbọala ga-ebu ụmụaka gaa ụlọakwụkwọ n'efu dgz.

    Ọ lụrụ nwunye ma mụta ụmụ ise.

  5. Ndị ntoroọbịa aṅụọla iyi ịmalite ngagharịiwe ọzọ na Lekki toll gate

    Lekki Tollgate

    Site na mmepegharị a chọrọ imepe Lekki Tollgate, ọtụtụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa aṅụọla iyi na soshal midia na ha ga-amalite ngagharịwe ọzọ.

    Ndị nnọchiteanya ndị ntoroọbịa n'ikpe maka mpụ ndị uweojii mere nọọrọ n'ụbọchị Satọde jụụ ịnabata mkpebi ka e mepee Lekki Tollgate ma sị na ọ dị ngwa ngwa.

    Mana kọmitii na-ahụ maka ikpe ahụ gara n'ihu nye ikike ka ụlọọrụ 'Lagos Concession Company (LCC)' mepee Lekki Tollgate.

    Nke a mere ka ọtụtụ ndị ntoroọbịa ji gaa na soshal midia na-akatọ mkpebi ahụ ebe a ka na-eme nyocha ihe mere n'ebe ahụ.

    Ọtụtụ n'ime yiri egwu na ha ga-amalitekwa ngagharịiwe ọzọ n'ụbọchị Satọde 13 Febụwarị, 2021.

    Lee ihe ụfọdụ ha na-ekwu

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  6. Abba Moro agwala ụlọikpe Alakụba ka ha tọhapụ Elijah bụ onye ha mara ikpe maka ụdị isi ọ na-akpụ ndị ahịa ya

    Abba Moro bụ onye nnọchite anya ndị Benue South Senatorial District n'ọgbakọ ụlọ omeiwu nta akpọkụola gọọmentị etiti ka ha tọhapụ Elijah Odeh bụ nwaamadị ahụ anwụchịrị maka ịkpa ndị mmadụ isi gayị.

    A na-ebo Elijah ebubo ịgbụ ndị ahịa a isi ha sị na ọ na-ebute mkparị nye onyeisi ụka Alakụba bụ Onyeamụma Mohammed

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Kingsley Moghalụ bụ onye bụbu onyeisi n'ụlọakụ ukwu nke Naịjriịa akatọọla mmachị cryptocurrency

    Kingsley Moghalu

    Ebe foto si, Kingsley Moghalu/Twitter

    Ọtụtụ ndị nwere agba na Naịjirịa akọtọọla mmachị amachiri ego cryptocurrency na Naịjirịa.

    Kingsley Moghalụ onye nọbụ n'ọkwa isiụlọọrụ ụlọakụ ukwu Naịjrịa sị na ịmechi ya bụ usoro azụmahịa ego kpam kpam abaghị uru maka na ego ụmụ Naịjriịa were ego ruru nde dọla narị ise na ya bụ usoro azụmahịa.

  8. Ohaneze ndị ntotorobia etiela aka n'obi na ha ga-akwụsị ndị uweojii na ndị agha ịna ngarị n'ụzọ n'ọwụwa anyanwụ

    Ohaneze ndị Igbo

    Ebe foto si, Ohaneze ndị Igbo

    Ọhaneze ndị Igbo ngalaba ụmụ ntorobia etiela aka n'obi na ha ga-emesi ndị uweojii maọbụ ndị agha Naịjirịa ọbụla ha jidere na-anakọ ndị mmadụ ego n'ụzọ.

    Odeakwụkwọ otu a sị na ha ehiwela ngalaba ọrụ ọtawaike ha kpọrọ "Operation Stop Army and Police Robbery” na Bekee maka nke a.

    N'akwụkwọ ozi ọ ziputara ndị ntaakụkọ ụbọchị ụka, Comrade Igboayaka O. Igboayaka kwuru na "ndị uweojii na-enyi ndị isi ha akaazụ iji zipụ ha ọrụ n'ọwụwa anyanwụ".

    O tiri aka n'obi na ụdị agwa ọjọọ a ga-akwụsị.

  9. Ọrịa a na-amatabeghị aha ya eselitela isi na mba Tanzania

    Mapụ mpaghara Chunya

    Akụkọ na-erute anyị ntị na-ekwu na ọrịa a na-amaghị ihe ọbụ ebidola inye nsogbu na mba Tanzania.

    Ndị ọrụ ahụike na mpaghara Chunya na-ekwu na ụfọdụ ndị na-anwụ n'ime awa ole na ole ha butere ya bụ ọrịa.

    Ha na-akọwa kwa na ụfọdụ na-agbọ ọbara maka ya bụ ọrịa.

    Mịnịsta ahụike mba ahụ bụ Dorothy Gwajika ewepụla onyeisi ndị ọrụ ahụike na mpaghara ahụ n'ọrụ.

    Ngalaba gọọmentị a na-ekwu kwa na ọ bụ n'afọ 2018 ka ha nwetara mkpesa maka ya bụ ọrịa.

  10. Manchester City anyụọla Liverpool ịkpakwụ 4 - 1

    Liverpool vs Manchester

    Ebe foto si, Getty Images

    N'egwuregwu Premier League agbara ụnyahụ, Manchester City ji ọkpụ goolu anụ asatara otu nyụọ Liverpool anya na be ha ụbọchị Sọnde.

    Mmeri a mere ka Manchester city ji nọsie ike n'ọkwa nke mbụ na okpokoro Premier League.

    Ana akọwa na ọ bụ nkata golii ndị Liverpool bụ Alisson Ramses Becker chere nyere Manchester City aka imeri ụdị mmerị a.

  11. Mmadụ iri na anọ anwụọla ebe ana achọ mmadụ otu narị iri anọ na ise na idemmiri n'India

    Idemmiri na India

    Ebe foto si, Reuters

    N'ofesi, mmadụ iri na otu anwụọla maka idemmiri bụ nke mgbaze akụ mmiri igwe butere na mparagha Uttarakhand dị n'India.

    Ọtụtụ ndị ọrụ gbata gbata nọ ebe ahụ ugbua ịchọ mmadụ otu narị iri anọ na ise (145) na-efu efu ebe ahụ.

    Ọtụtụ ndị a ana achọ achọ bụ ndị ọrụ ụlọọrụ ọkụ latrịk "hydor power plant" dị ebe ahụ.

    Dịka aka na-enyocha ihe butere ya bụ ọdachi, o dobeghị anya ihe butere ya.

  12. Covid-19 egbuola mmadụ 20 ọzọ na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ iri abụọ ọzọ anwụọla site n'aka ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgu ha gosiri na mmadụ narị ise na isii ọzọ butere ya bụ ọrịa.

    Mmadụ iri abụọ na isii n'ime ha si Imo steeti, iri sị Cross Riva ebe Ondo steeti kachasị dịka mmadụ iri itolu butere ya na steeti ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Unu abọọla chi!

    Soro anyị taa maka akụko niile ga-amasị gị