Third Mainland Bridge: Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs

Gọọmentị kwuburu na a ga-emepe akwammiri 'third mainland bridge' n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị, mana ọ gaghị enwezi isi ugbua.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Tanka breki ya dara wụbara n'ụlọ mmadụ na Otolo Nnewi

    Tanka Dara n'ala

    Ebe foto si, BB

    Tanka bu mmanụ diselụ na-enweghị brekị gbabara n'ụlọ ndị mmadụ n'Akwudo junction dị n' Otolo Nnewi, Anambra steeti, ọ nweghị onye mereru ahụ.

    N'otu aka ahụ, tanka ọzọ breki ya dara gbara ọkụ n'Atoyo dị n'Ogun Steeti ebe ọ kụjara onwe ya gbaa onye na anya ya ọkụ gwo gwo.

  2. Ndị uweojii anwụchiela Mr. Macaroni na Lekki Toll Gate

    Mr. Macaroni na Lekki Toll Gate

    Ebe foto si, Mr. Macaroni/Twitter/BBC

    Ndị uweojii nwuchiri ihe karịri mmadụ iri na asatọ bụ ndị pụtara ngararịiwe na Lekki Toll Gate n'ụtụtụ Satọde. Nwaamadị ama ama na-ịkpa ụkaọchị bụ Mr. Macaroni so na ndị anwụchịrị.

    Ndị ọkaiwu mmadụ anọ ewepụtalarị onwe ha ịgbapụta ndị e jidere.

    Ha na-arịọ ndị mmadụ na Twitter ka ha zitere ha aha onye ọbụla ha ma so na ndị ejidere.

  3. Ndị Uweojii amalitela ịnwụchi ndị bịara ngagharị iwe na Toll Gate Lekki

  4. 'Ọ bụ okpotokpo asị na Trump kwanyere ndị mmadu ka ha wakpo Capitol' - Ọkaiwu

    Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Ọkaiwu Donald Trump bụ Michael van der Veen ekwuola na ọ bụ ezigbote asị ikwu na ọ bụ nwoke ahụ bụbu onyeisiala Amerịka kwanyere ndị wakporo ụlo omeiwu Capitol n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị ma gbuo otu onye uweojii.

    Ọ bụ ka ikpe ndị omeiwu nta nke mba Amerịka wetere n'ụlọ omeiwu ukwu na-aga n'ihu ka Ọkaiwu van der Veen kwuru ihe a.

    Ọ sị na ọ bụ ịkpọ asị butere ikpe a na-akpe Trump ugbua.

    Dị ka ya bụ ikpe na-aga n'ihu, ọkankụ ndị pati Repọblịkan n'ụlọ omeiwu ukwu ekwuola na ha agaghị ama Trump ikpe.

    Ọ bụ awa 16 ka e nyere ndị ọkaiwu Trump iji zara ọnụ ya, mana ha ewoghi ruo awa anọ dịka ha na-achọ ka ikpe ahụ kwụsị ọsịsọ.

  5. Nwaada na-anọchite anya ndị ntorobịa na ọgbakpọ ikpe #Endsars bụ Rinu na legọs ajụla iso gbaa akaebe na ya bụ ikpe

    Ada Naịjirịa gbara mgborogwu na ngagharịiwe #Endsars bụ Rinu bụ onye a kpọrọ ka o soro gbaa akaebe n'ọgbakọ ikpe na-elebe anya na mkpamkpa kpara na Lekki Toll gate n'ọnwa Oktoba 2020 etinyela akwụkwọ arụkwaghịm. Rinu bụ onye na anọchite anya ndị ntorobịa maka ịgbakaebe dere na Twitter ya ụbochị Fraịde na ya agaghịzị eso gbaa akaebe n'okwu ahụ ọzọ.

    Rinu bụ onye edoro n'iyi ya na onye ntorobịa ọzọ bụ Majekodunmi Temitope sị na ịhe ya hụrụ ebe ahụ bụ na Gọọmentị ji ya bụ ikpe eti epele, na ya agaghị etinye aka n'ụdị ihe ahụ.

    Ọ dere " aga ma arịtụ n'ọnọdụ m dịka onye nnọchịte anya ndị ntorobịa na ya bụ ọgbakọ ikpe nke ndị Legọs steeti hibere maka na a chọpụtara m na gọọmentị chọrọ iji ya bụ ikpa mee ihe egwu".

    O kwukwara n'ezie, na gọọmentị gbalịkwara n'ihebe ya bụ kọmitii maka ya bụ mkpa mkpa kpara maka na ọkpụrụkpụ okwu sị na ya pụta, mana na obi adịghị ya mma na ha chọrọ ịmeghe Lekki Toll Gate ebe achọpụtabeghị onye nyere ndị agha ikike ịgbawa egbe na-ebe ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Gọvanọ Enugwu ehibela mmadụ 272 ga-eso rụọ ọrụ nchekwa obodo

    Community police

    Ebe foto si, Enugu state government

    Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị ehibela ndị ọrụ nchekwa narị abụọ na iri asaa na abụọ bụ ndị e nyere ọzụzụ pụrụiche maka atụmatụ Bekee kpọrọ "Community Policing".

    Ndị nchekwa si okpuru ọchịchị 17 dị na steeti ahụ nwetere ọzụzụ na ụlọakwụkwọ ndị uweojii dị na Oji Riva.

    Ọ bụ Onyeisi ndị uweojii bụ Moammed Adamu Abubakar weputere atụmatu Community Policing a.

    Ebumnuche ha bu na atụmatu ga-eme ka nchekwa ruo ọha obodo nso ma mee ka ọ dị mfe ichekwa onye ukwu na onye nta.

    Ọ bụ na obi gọọmentị Enugwu ka Gọvanọ Ugwuanyi hibere ndị nchekwa.

    Ọ sị na ụfọdụ n'ime ha si na atụmatụ nchekwa a kpọrọ "Neighborhood Watch Associations" nakwa "Forest Guards" pụta.

    Ọrụ ndị a gunyere ị na-enwete ama na obodo dị iche iche na steeti ahụ.

  7. Unu asaala chi?

    Anyị na-asị unu nnọọ dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ụwa pụrụ iche n'ụtụtụ taa.

  8. Ndị uweojii agbaala Lekki toll gate okirikiri chebiri ndị ngagharịiwe

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Ndị Uweojii Legọs

    Nkọwa foto, Ndị uweojii na Lekki Toll Gate

    Ọtụtụ ndị uweojii agbaala mpaghara Lekki toll gate okirikiri na mgbede Fraịde a.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị ntorobịa ga-agbakọ ebe ahụ ime ngagharịiwe n'ụbọchị Satọde, abalị iri na atọ nke ọnwe Febrụwarị afọ 2021.

    Ọtụtụ ndị uweojii bucha egbe gbara ebe ahụ okirikiri iji gosi njikere ha dị igbochi ngagharịiwe ahụ.

    Cheta na ọ bụ na Lekki Toll Gate ka a nọrọ mee ngagharịiwe End SARS n'ọnwa Ọkụtoba nke afọ 2021, ebe e boro ndị agha na ndị uweojii ebubo igbu ọtụtụ ndị ntorobịa.

    Ndị ọrụ nchekwa ekwuola ugboro ugboro na ha egbughị onye ọbụla na ngagharịiwe ahụ.

    N'ụbọchị Mọnde ka ụlọikpe na-enyocha ngagharịiwe End SARS nyere iwu ka e mepekwaa Lekki Toll Gate ọzọ.

    Mana ọtụtụ ndị ntorobịa kwuru na okwesịghị ekwesị ka e mepekwaa ebe ahụ ọzọ n'ihi na ya bụ nnyocha abịabeghị n'isi njedebe.

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Ndị Uweojii Legọs

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Ndị Uweojii Legọs

  9. Nkeji Coronavirus

  10. NBA agbaala Buhari akwụkwọ maka ịgbatị oge ọrụ IGP Adamu

    Mohammed Adamu na Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa

    Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Bar Association' akpụpụla onyeisiala Muhammadu Buhari ụlọikpe maka ịgbatị oge ọrụ Mohammed Adamu dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa.

    Onyeisi NBA bụ Olumide Akpata kwuru na ihe ahụ Buhari mere ezighị ezi n'iwu Naịjirịa.

    Mohammed Adamu malitere ọrụ uweojii n'abalị mbụ nkeọnwa Febrụwarị afọ 1986, nke pụtara na o kwesịrị ịla ezumike nka n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2020.

    Iwu Naịjirịa kwuru na ihe mmadụ ga-anọ n'ọrụ uweojii tupu ọ laa ezumike nka bụ afọ iri atọ na ise, maọbụ onye ahụ gbaa afọ iri isii, nke ọbụla bu ụzọ mee.

    Mana Buhari nyere Adamu ikike ka ọ nọkwuo n'ọkwa ruo ọnwa atọ ọzọ, nke pụtara na a ga-ewepụ ya n'ọnwa Jun afọ 2020.

  11. Bayern Munich ejirila otu ọkpụ maburu iko Club World Cup agbara ụnyaahụ

    Bayern Munich and Tigres

    Ebe foto si, Reuters

    Bayern Munich amaburula iko Club World Cup site n'iji otu ọkpụ merie ndị Tigres nke mexico na ya bụ asọmpị agbara na mba Qatar ụnyaahụ.

    Nke a bụ iko nke isii Bayern na-ebute n'ọnwa isii gara aga.

    Akagbuburu ya bụ goolu Benjamin Pavard nyere site na obibi ogbuopi si na Robert Lewandowski biri.

    Mana ihe onyonyo gosiri na Lewandoski ebighị dịka ya bụ ogbuọja chere.

  12. Ụlọọrụ nọchite anya mba Amerịka dị na Chad agwala Suces Masra ya pụta na nzuzo ebe ọnọ kemgbe ụbọchị 6 nke Febụwarị

    Dr. Sucés Masra

    Ebe foto si, Dr. Sucés Masra/FB

    Ụlọọrụ nnọchịte anya mba US dị na Chad agwala Suces Masra bụ onye isi pati na-agba ndị nọ n'ọchịchị nrụ bụ nke gbabara ọsọ ndụ na embassy ha ka ha lawazia be ha.

    Masra na ndị otu ya mmadụ iri ndị ọzọ gbabara ọsọ ndụ na ụlọọrụ nọchịte anya mba US dị na be ha maka ịme mgbagharịiwe maka onyeisiala ha bụ Idriss Deby ịchọ ịba ọchịchị nke ugboro isii ya.

    Ndị ọrụ mba Amerịka ebe ahụ gwara ha na gọọmentị Chad ekwela ha nkwa na ha agaghị akpa ha aka ma ha pụta bụ ihe mere ha jị sị na pụtazịa.

  13. Onyeisiala Muhammadu Buhari akwadola ịmepe ụlọọrụ nke gọọmenti na ndị nkịtị ga-enwe

    Onyeisiala Muhammadụ Buhari akwadoola ịmepe ụlọọrụ akpọrọ Intra-Co bụ nke gọọmentị na ndị nkịtị ga-enwe. Gọomentị sị na ha ga-etinye ego dị otụ ịtarị Naịra iji mepee ya bụ ụlọọrụ nke ha na atụ anya na ọ ga-amụta uru ga-eru ịtarị iri na ise mgbe adịghị anya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Nigeria Securities and Exchange Commission akwadola mmachị CBN machiri "cryptocurrency"

    Cryptocurrency

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọọrụ Nigeria Securities and Exchange Commission (SEC) akwadola ya bụ mmachị Ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa (CBN) machịrị usoro azụmahịa "Cryptocurrency".

    Ụbọchị Tọzde ka ha dere sị na "ndị ahụ niile CBN mmachiri ọbaego ha agaghị enweike ịzụahịa na Naịjirịa rụọ mgbe ha wepụrụ ya bụ mmachị a machiri ha.

    SEC sị na ha mere ka nke a doo anya maka nghọtahie ndị sị na ha na CBN ekwekọrịtaghị na ya bụ okwu maka ịmachị ego "Cryptocurrency".

  15. Ụlọikpe kacha elụ nke mba UK enyela obodo abụọ dị na Niger Delta mmeri n'ikpe ha na Shell

    Ndị obodo Ogale na Bille dị na Niger Delta, Naịjriịa, aṅụrịala taa maka ikpe ha na Shell Petroleum Development Company bụ nke ndị obodo ahụ kpụpụrụ Shell ụlọikpe kemgbe 2015 n'ụlọikpe n'UK.

    Mmadụ puku iri anọ ndị Ogale na Bille tikoro aka gbaa Shell ya bụ akwụkwọ na-ekwu na Shell metọrọ ala ha ma gbawa ha aka.

    Mmeri a nyere obodo abụọ a ikike ịme ka Royal Dutch Shell plc na nwa ha bụ Shell Petroleum Development Company of Nigeria (SPDC) gwuo ụgwọ maka ịmetọ ala na ihe ndị mmadụ sitere na mmanụ ha na-egwu na be ha.

    Onyeisi ndị Amnesty International bụ Mark Dummett na-akọwa na ikpe a ga-akuziri ndị ọzọ ihe maka ijide ụlọọrụ ndị ọzọ na-arụ ọrụ na be ya, ịme ka ha nweeike kwụọ ụgwọ maka ihe ha mebiri na be ha mgbe ha na-arụ ọrụ.

    Ọ sịkwa na nke a ga-eme ka "'mpụnaiti' ndị ọrụ a si mba ofesi bịa n'Afrịka ịrụ ọrụ belata".

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. 'Akara NIN bụ iwu maka imepe ọba ego, ụtụ isi na ime ntuliaka' - Gọọmentị Naijirịa

    Onye na-etinye aha ya n'atụmatụ NIN

    Ebe foto si, NIMC

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na ihe gbasara akụnụba ịntaneti na Naijirịa bụ Pat Pantami ekwuola na akara National Identity Number nke bụ NIN n'aha ịchafụ bụ iwu maka mmadụ ịnwe ọba ego, ụtụ isi na ikike ime ntụliaka.

    Ọ bụ mgbe ya na ndị isi ọrụ ọhụrụ nke Association of Telecomunications Companies nwere nzụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tọzde,

    Pantami kwuru na NIN bụ iwu dịka ntuzi aka NIMC nke afọ 2007 nke ọ dị ka echefuru echefu.

    O kwuru na NIN bụ ihe kachasị egosi na mmadụ bụ nwaafọ Naijirịa.

  17. Onyeisi agha nke ndị mba Rwanda anwụọla

    Jacques Musemakweli

    Ebe foto si, Rwanda Defence Force

    Ọchịagha Jacques Musemakweli bụ onyeisi ndị agha mba Rawanda anwụọla n'ụlọọgwụ ndị agha n'ụbọchị Tọzde.

    Otu onye ọkwa ya rịrị n'otu ndị agha gwara BBC na ọ nwụrụ n'ezie dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

    Ọ banyere n'ọkwa ahụ n'ọnwa Novemba afọ 2019 mgbe dịka ahọpụtachara ya.

    Ọ bụbu onyeisi ndịagha na-echekwa onyeisiala mba ahụ tupu o rigoro n'ọkwa ọ nọ na ya were nwụọ.

  18. IS ekwuola na ọ bụ ha gbara ụlọ ụka na ọdọ ndị agha Naịjiria ọkụ n'ugwu Awụsa

    Ndị oyi egwu

    Ebe foto si, Boko Haram

    Otu Islamic State ekwuola na ọ bụ ndị agha ha wakporo ma gbaa ụlọ ụka nakwa ọdọ ndị agha Naịjiria ọkụ na Borno steeti.

    N'ozi ha tinyere n'ogige intanet a kpọrọ RocketChat, IS sị na ndị agha ya wakporo obodo Askira dị na mpaghara Askira-Uba n'ụbọchị iri nke ọnwa Febrụwarị ma gboo ndị agha Naịjiria atọ.

    IS na-ekwu na ọ bụ ha mere ọtụtụ mwakpo e mere na mpaghara ọdịda anwụ Ugwu Naịjiria na nso nso a.

  19. Ndị eche bụ ndị ọchi ehi awakpoola ma gbụọ mmadụ abụọ n'Ogun steeti.

    Mgbọegbe

    Ndị a na-eche na ha bụ ndị ochi ehi awakpoola ma gbuo mmadụ abụọ n'obodo Owode-Ketu na Ijoun ndị nọ n'okpuruọchịchị Yewa-Nọt nke Ogun steeti.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abimbola Okpeyemi kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.

    Ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na ọ bụ mgbe mmadụ abụọ aha ha bụ Isiaka Apesin na Oguntosin Adebayo na-aga ugbo ha ka ndị a chebiri ha were gbuo ha.

    Ha kwuru na onye aka ebe gwara ha na dịka egbuchara ụmụ nwoke a na ndị omekome a banyere n'ime obodo were gbawa egbe aghara aghara.

    Dịka ọ di ugbu a, emechiela ụlọakwụkwọ niile, ụlo ọgwụ na ụlọ ọrụ ndị ọzọ n'obodo ndị ahụ.

    Eze obodo ahụ bụ Baale n'asụsu Yoruba aha ya bụ Sanya Fabuyi kwuru na egbe ndị ọchiehi a jiri wakpo ha bụ 'onye bịa lere'.

  20. Mba UAE amachiela ụgbọelu si Naịjirịa abata rue ngwụcha ọnwa Febụwarị

    Ụgbọelu

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba United Arab Emirates (UAE) amachiela njem ụgbọelu isi Naịjiria bata mba ahụ rue ngwụcha ọnwa Febụwarị iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.

    Nke a na-abịa dịka ụlọ ọrụ ụgbọelu Emirates machiri njem niile si Naijiria ruo ngwụcha ọnwa Febrụwarị.

    N'ehihie Tọzdee ka ụlọ ọrụ ụgbọelu Air Peace ziri ozi gbarala ndị so ha aga njem àmà ihe a mere.

    Ndị ntị ha rụrụ n'ala na-akọwa na atụmatụ ime ndị Naịjirịa nyocha coronavirus ma ha tụọ ụkwụ na UAE makana mba ahụ ekwenyeghi na nnyocha a na-eme na Naịjiria so bute mmachi a.

    Mba UAE na-ebo ndị Naịjirịa ebubo na ha ji asambodo na-egosi ma mmadụ e bu covid-19 nke adigboroja abata be ha.

    Gọọmenti Naịjiria anabataghị ebubo a ma si na UAE ekwesịghị ịgwa ha etu ha ga-esi hasie maọbụ chekwaa ndị mba ha.

    Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-aga UAE maka nleta, ọgwụgwọ ahụike nakwa iji ego chụọ ego.

    A na-ele anya na atụmatụ a ga-awụnye àjà na garri mmekọ mba abụọ a.