Third Mainland Bridge: Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs

Gọọmentị kwuburu na a ga-emepe akwammiri 'third mainland bridge' n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị, mana ọ gaghị enwezi isi ugbua.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nzụkọ Gọọmentị na ndị otu SSANU na NASU tiri aka na tipa bu aja

    Ogbakọ ndị nkuzi mahadum na onye nnọchite anya gọọmentị

    Ebe foto si, Ministry of Education

    Nzụko gọọmentị Naijirịa na ndị otu Senior Staff Association of Nigerian Universities (SSANU) na nke ndị Non-Academic Staff Union of Universities nwere maka abụbọ ọrụ ndị otu a na-agba amụtaghị mkpụrụ.

    Nke a na-eme ya nzụko abụọ ha na Mịnịsta ọrụ bụ Chris Ngige na-enwe maka abụbọ ọrụ ha nọ n'ime ya.

    Ndị ụlọ ntaakụkọ Channels kwuru na Ngige bidoro ya bụ nzụko site na ibo ha ebubo na abụbọ ọrụ ha bidoro n'ụbọchị ise nke ọnwa Febuwarị megidere iwu Naijirịa.

    Otu abụọ a ekweghị n'ihe gọọmentị na-ekwu tutu gọọmentị emee ihe ha chọrọ nke ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ gụnyere :

    • Ka ewepụ aha ndị ọrụ ha na atụmatụ Intergrated Personnel Payrol Information System.
    • Ka a kwụọ ha ụgwọ opekete mpe eji ha.
  2. Mmadụ 938 ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

    Dịka ndị Ngalaba NCDC siri depụta, mmadụ narị itolu na iri atọ na asatọ ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa.

    Mmadụ iri atọ na otu n'ime ha si Ebonyi steeti, iri atọ si Akwa Ibom, iri na otu si Imo steeti ebe iri na abụọ si Delta steeti.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Unu abọọla chi!

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị!

  4. Chaịna amachiela BBC izisa ozi na be ha

    Ozi na eru anyị ntị ugbua bụ na Chaịna amachiela BBC ịgbasa ozi na be ha gbaa gburugburu dịka ụlọọrụ na-ahụ maka iwu mgbasa ozi obodo ahụ mere ka amata.

    Chaịna na-akọtọ usoro BBC si agbasa ozi gbasara coronavirus nakwa mkpagbu ndị obodo chọrọ inwere onwe ha ebe ahụ bụ dịka Uighurs.

    BBC sị na ya bụ ihe Chaịna mere bụ ihe mgbawa obi nye ha.

    BBC

    Ebe foto si, Getty Images

  5. Cryptocurrency: Senate kpọrọ Emefiele oku ka ọ bịa kọwa onwe ya

    Godwin Emefiele

    Ebe foto si, Central Bank of Nigeria

    Ndị omeiwu Sinite akpọọla onyeisi ndị ụlọakụ ugwu nke Naịjirịa, Godwin Emefiele, ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ịmachị usoro azụmahịa "Cryptocurrency".

    Ọ ga-akọwakwara ha uru na ọghọm dị na ya bụ usoro azụmahịa.

    Onye butere okwu a bụ Istifanus Gyang nke bụ onye nnọchite anya ndị Plateau North Senatorial District na Plateau steeti.

    Ndị omeiwu dọkwara ya aka na ntị na-ekwu na ọ bụ na-ezie na azụmahịa "cryptocurrency" nwere ọghọm mana na uru dị na ya ka nkụ maka na ọ bụ usoro azụmahịa ọgbaraọhụru kacha eto ugbua.

    Ụbọchị Fraịde ụbọchị ise nke ọnwa Febuwarị ka CBN nywereiwu ka ụlọakụ niile dị na Naịjirịa kwụsị ịnabata maọbụ zipụ ego ọbụla gbasara "cryptocurrency"

  6. Ndị otu egwu bọọlụ ederela ndị Facebook na Twitter akwụkwọ na-akwado imesi ndị ji socshal midia akpa oke agburu

    Ndị akparịgoro na soshal midia

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị akparịgoro na soshal midia

    N'egwuregwu, ndị otu na-achịkọta egwuregwu n'Inglandi e degarala Twitter na Facebook akwụkwọ na-arịọ ka ha bụrụ ọ kaa o mee gbasara nkwa ha kwere maka imesi ndị ji ọba ọzị ha akpa oke agbụrụ.

    Ndị a depụtere ihe ha na-atụ anya na ndị isi Facebook and Twitter ga-eme iji zachapụ ndị na-akpa ajọ agwa a.

    Ha gbasiri ụkwụ ike n'ala na-ekwusi ike na "ọba nzise ozi ụnụ na-enye ohere maka ịkparị mmadụ".

    "Ịgba nkịtị unu na-enye ndị na-akparị mmadụ ikike n'ụdị ha ji eche na-ọnweghị ihe ga-eme ha ma ha kparịa mmadụ". "Ọ na-enye dị mmadị mmadụ ohere ịkpa okeagbụrụ".

    Ha gwara ha ka ha gbaa mbọ hụ na ha tinyere nkwa ahụ ha kwere n'ọrụ n'ụdị ga-ebelata mkparị na ịkpa okeagburu.

    Ndị dịka Marcus Rashford na Axel Tuanzebe nke Manchester United na nkwa Romaine Sawyers, nke West Brom na Reece James nke Chelsea na ndị ọzọ anatachaala mkparị n'aka ndị soshal mida.

  7. Lai Mohammed ekwuola na ndị na-akwado ngagharịiwe ọzọ bụ ndị ihurihu

    Lai Mohammed

    Ebe foto si, MoI

    Ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa akọtọọla akụkọ na-efegharị na soshal midia maka ịmalite ngagharịiwe ọzọ na Legọs n'ụbọchị Satọde.

    Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed sị na echiche ahụ bụ aka ọrụ ndị ọnọ nkịtị enwe efe bụ na-ebighi na Naịjirịa.

  8. Otu ndị Yoruba akwadola ndị Igbo

    Ohaneze

    Ebe foto si, Ohaneze

    Ndị otu kpọrọ onwe ha Conference of Concerned Yoruba Elders akwadola Ohaneze ndị Igbo ma gbarụọ ihu etu e si kpachapụ ndị Igbo n'ọkwa ndịisi nchekwa na Naịjirịa.

    Onyeisi otu a bụ Olusegun Ajibola sị na ihe a bụ ugboro abụọ Onyeisiala Buhari mere nke a, na ọ bụ ya mere ha ji tinye ọnụ n'okwu a ugbua.

  9. Gee nkeji Coronavirus

  10. Sepụ nụ aka na ngagharịiwe ọzọ na Lekki Toll Gata - Gọọmentị etiti

    Ndị ngagharịiwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti adọla ndị na-achọ ime ngagharịiwe ọzọ na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Satọde ka ha wepu aka enwe n'ofe ka ọ ghara ịghọ aka mmadụ.

    Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed kpọrọ oku a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abụja n'ụbọchị Tọzde sị na gọọmentị agaghị anabata ọgbaghara na ngagharịiwe ọbụla.

    O kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị Naịjirịa nwere ikike ime ngagharịiwe mana ịmalite ọgbaghara n'aha ngagharịiwe bụ nke ha agaghị anabata.

    Lai Mohammed

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọ sị na ha anụla kepukepu na ndị ekperima chọrọ iji ohere ngagharịiwe ahụ a na-akwado ime na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Satọde akpa arụ dị iche iche.

    O kwukwara na gọọmentị na-ahụ ọrụ soshal midia na-arụ n'ịhazi ngaghrịiwe ahụ ma sị na ndị ọrụ nchekwa dị njikere igbochi ọgbaghara ọbụla.

  11. Aka chịburu Legọs steeti bụ Lateef Jakande anwụọla

    Lateef Jakande

    Onye bụ gọvanọ Legọs mbụ n'ime ọchịchị onyekwuouche ya bụ Lateef Jakande anwụọla.

    Nke a pụtara ihe dịka onye na-achị Legos ugbua bụ Babajide Sanwo Olu depụatara ya n'akara Twitter nke ya.

    Jakande chịrị Legos site n'afọ 1979 rue 1983. Ọ dị afọ 91 mgbe ọ nwụrụ.

    E ji ọrụ ọ rụrụ dịka gọvanọ dị ka ụlọ ọha a na-akpọ "Jakande Estate" mara ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Gịnị na-akpọtụ n'Obalende?

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ihe onyonyo na-efegharị na-egosi ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ na-azọ onwe ha n'Obalende dị na Legọs.

    O nwebeghi onye ma ihe mere mana ndị mmadụ nọ ebe ahụ kwuru na ọ bụ esemokwu ghọrọ ọgụ nke mere n'etiti ndị otu NURTW butere nke a.

    Ụda egbe na-ada ebe ndị mmadụ na-agbapụrụ mgbọ ọsọ n'ebe ahụ n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde.

    O dobeghi anya ma o nwere onye nwụrụ maọbụ onye merụrụ ahụ na ya bụ ọgụ rue ugbua.

    Mgbe BBC Igbo malitere ịnweta ndị uweojii na Legọs steeti, ọ mịtaghị mkpụrụ.

    Akụkọ ka na-abịa

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  13. Kelechi Iheanacho akwanyela otu Leicester City n'agba nke anọ n'asọmpị FA Cup

    Kelechi Iheanacho

    Ebe foto si, Reuters

    Nwaafọ Naijirịa bụ Kelechi Iheanacho akwanyela otu Leicester City n'agba nke anọ na asọmpị FA Cup.

    Ọ bụ mgbe ọ fọrọ ọkara nkeji ole na ole ka egbuchie ya bụ asọmpị ka Iheanacho nyere otu goolu otu Leicester ji merie ndị Brighton na nkeji iri itolu na anọ.

    Mmeri a gosikwara na Leicester City emeriela otu Brighton ụgboro asatọ ha zutere onwe ha n asọmpi niile nsọnsọ a.

  14. Aka m bụ onye pati PDP - Fani Kayode

    Onye bụbu Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na gọọmenti Olusegun Obasanjo bụ Femi Fani Kayode awụọla miri oyi na-atụmatụ na o denyela aha na pati All Progressives Congress (APC).

    Fani Kayode dere n'akara Facebook ya na ọ bụ eziokwu na ya so na-eme mkparịtaụka nke ndị so pati dị iche iche na-eme, mana ya ka bụ onye People Democratic Party (PDP).

    Nke a na-abịa dika aka na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello kwuru na Fani Kayode esorola na APC.

    Ya bụ akụkọ tụrụ ndị mmadụ n'anya maka Fani Kayode bụ onye a ma maka ịkatọ ọchịchị APC.

  15. Ahụtala ọrịa Covid-19 n'ahụ mmadụ 1,131 ọzọ na Naijirịa

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ngalaba NCDC edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ otu puku, otu narị na iri atọ na otu ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa.

    Ọ bụ n'akara Twitter ha ka ha depụtara ọnụ ọgụgụ ndị a nke gosiri na mmadụ otu puku , otu narị na iri na itolu esila na ya gbakee.

    Dịka o siri dị, mmadụ iri asaa na ise n'ime ha si Ebonyi steeti ebe iri na itolu ọzọ sị Delta steeti

  16. Wole Soyinka: 'Ọ bụ asị na ndị ọchịehi wakporo nna m' - Olaokun Soyinka

    Wole Soyinka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwa Ọkammụta Wole Soyinka bụ Dọkịta Olaokun Soyinka ekwuola na akụkọ na ndị Fulani na-achị ehi wakporo nna ya abụghị eziokwu.

    Dọkịta Soyinka sị na akụkọ ahụ na-efegharị bụ asị ụfọdụ mmadụ na-atụ iji tinye obodo na gbagharịa.

    Ọ sị: "Ọ bụ eziokwu na a hụrụ ehi na-agagharị nsọ nsọ na be nna m, mana o nweghị onye ọbụla wakporo ya maọbụ gburu gburu ebe ọ bi".

    Dọkịta Soyinka sị na ọ bụ n'ọnụ nna ya ka ọ nụrụ ihe ọ na-ekwu ugbua.

    Ọ sị na ọ dị mkpa ime ka ndị mmadụ mata nke bụ eziokwu.

  17. Ị bọọla Chi!

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị!

  18. Facebook ga-akụ ndị na-akparị ndị egwu bọọlụ mkpọ n'isi

    Facebook

    Ebe foto si, Reuters

    N'egwuregwu, ụlọọrụ Facebook ekwuola na ha ga-amachi akara onye ọbụla kparịrị ndị ọgba bọọlụ n'ọba nzirikọta ozi ha.

    Fadzai Madzingira bụ onye na-ahụ maka ihe e tinyere na ya bụ ọba nzirikọta ozi n'UK siri na ọ dị nwute etu ndị mmadụ si akparị ndị ọgba bọọlụ.

  19. Gọọmentị a ga-eme ihe ụlọikpe ukwu gwara ha maka ịtọhapụ ego ndị so mee ngagharị iwe #Endsars ha ji kemgbe

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka ụlọakụ etiti tọhapụ ọbaego ndị ndị nkwadoro ngagharịiwe EndSARS.

    Ọkaikpe Ahmed Mohammed gwara gọọmentị ka ha jiri obi udo kpezie ihe na-esere ha na mmadụ iri abụọ ahụ ekechiri ego ha dị n'ụlọakụ.

  20. Aka ndị uweojii akpara ndị oji egbe ezụ n'Anambra steeti

    Ndị oshi

    Ebe foto si, Haruna Mohammed

    Ndị uweoji Anambra steeti anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo ka ndị oji egbe ezu ohi n'Awka n'ụbọchị Tusde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na e jidere mkpụmkpụ egbe abụọ n'aka ha.