Third Mainland Bridge: Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs
Gọọmentị kwuburu na a ga-emepe akwammiri 'third mainland bridge' n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị, mana ọ gaghị enwezi isi ugbua.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ụlọikpe enyela CBN iwu ka ọ gbapee ọbaego ndị nkwado EndSARS

Ebe foto si, EPA
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria (CBN)' ka ọ tọhapụ ọbaego ndị nkwado EndSARS dị mmadụ iri abụọ.
Ọkaikpe Ahmed Mohammed nyere iwu a site na mkpebi ndị aka ha dị n'ikpe kpebiri ka ha mee udo n'ụzọ ọzọ banyere ikpe ahụ.
Ọkaikpe a mgbe ọ na-agwa ọkaiwu CBN na ọkaiwu na-anọchiteanya ndị ahụ okwu, ọ sị na "a kagbuola mmkpesa niile e mere n'ụlọikpe a."
Okaikpe Mohammed gara n'ihu kagbuo ikpe a chabiri n'ụbọchị 4, Nọvemba 2020 ma sị ka a tọhapụ ọbaego niile a kpachiri akpachi.
Cheta ba CBN gbara akwụkwọ ka ụlọikpe inye ha ikike ịmachi ọbaego Bolatito Rachael Oduala na mmadụ iri na itoolu ndị ọzọ so mee ngagharịiwe EndSARS n'afọ gara aga.
CBN sị na ha mere nke a iji nyochaa ndị nkwado ngagharịiwe ahụ maka ebubo iji ego akwado iyi ndụ egwu.
Covid-19: Ihe mere Saụt Afrịka jiri hapụ ọgwụ ndị AstraZeneca chụwa nke ndị Johnson & Johnson

Ebe foto si, Reuters
Mba Saụt Afrịka etinyela anya n'ebe ọgwụ mgbochi Covid-19 nke ndị ụloorụ Johnson & Johnson na-emepụta.
Nke a na-eme dịka a chọpụtara na ọgwụ mgbochi ndị AstraZeneca anaghị arụ ọrụ megid nje ọrịa covid-19 ọhụrụ achọtara na mba Saụt Afrịka.
Mịnịsta ahụike mba ahụ bụ Zweli Mkhize kwuru na ha ga-agba ndị ọru ahụike mba ha ọgwụ mgbochi nke ndị Johnson & Johnson, kama ha na-eche ka gọọmentị mba ha nye ha ikike.
O kwuru na ha ga-eji ya bụ ọgwụ mgbochi tulee atụmatụ ịkesa ọgwụ mgbochi.
Mkhize kwukwara na ha ga-enwetekwa nke ndị ụlọọrụ Pfizer.
O kwukwara na ha na-atule ma ha a ga-ere ọgwụ mgbochi nke AstraZeneca ha zụtara.
Ọrịa Covid-19 egbuola mmadụ 21 ọzọ na Naijirịa
Ngalaba NCDC edepụtala etu ọrịa covid-19 si kwụrụ na Naijirịa.
O gosiri na mmadụ iri abụọ na otu anwụọla site n'aka ọrịa Covid-19, ebe mmadụ otu puku na iri ise na isii ọzọ butere ya bu ọrịa ọhụrụ.
Mmadụ iri asaa na ise si Ebonyi steeti, ebe mmadụ iri anọ na asaa ọzọ si Rivas steeti.
Dịka ọ si dị, mmadụ otu puku, na otu narị na iri abụọ ebụrụla ndị nwerela onwe ha site n'aka ya bụ ọrịa.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nwaanyị gbara afọ 117 agbakeela n'ọrịa coronavirus
Otu sista mba Fransị gbara afọ 117 agbakeela site n'ọrịa coronavirus dịka ọ fọrọ ụfọdụ ụbọchị ka o rue ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.
Lucile Randon a ma dịka 'Sister Andre' n'ụka katọlịk n'afọ 1944 butere ọrịa ahụ n'ụbochị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị "Amaghị dị m na ebu m ya bụ ọrịa".
O kwuru na ọ nwere olileanya ịme ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke na-abịa nso nso a.

Ebe foto si, AFP
Agbachiela ụlọomeiwu mba Gana maka coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Mba Gana agbachiela ụlọomeiwu ha kpam kpam rue izuụka atọ n’ihi ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na-akawanye njọ n’etiti ndị omeiwu.
Dịka ọ dị ugbua, ndịomeiwu butere ya ruru iri na asaa ebe mmadụ otu narị na iri ise na otu ọzọ bụ ndị ọrụ nkịtị butekwara ya.
Ọnụọgụgụ ndị bu ya bụu ọrịa ugbua na Gana karịrị puku iri asaa na atọ ebe naanị mmadụ narị anọ na iri asatọ na abụọ nwụrụla kemgbe ọrịa ahụ batara mba ha mbụ.
Ndị omekome egbuola mmadụ iri abụọ na atọ na Kaduna

Akụkọ na-ekwu na ndị oji egbe egbuola opekete mpe mmadụ iri abụọ na atọ na mpaghara ugwu-ọdịda anyanwụ nke Kaduna Steeti dị na Naijirịa.
Akụkọ na-ekwu na egburu mmadụ iri na mpaghara Birmin-Gwari.
Ndị obodo ahụ jisiri ike gbuop otu onye n'ime ndị a.
Kọmịshọna nchekwa na steeti ahụ bụ Samuel Aruwan kwuru na ndị omekome ahụ wakpokwara obodo anọ ọzọ.
Aruwan kwukwara na ndị nchekwa na-achọ ndị omekome a.
Dịka o siri dị, amatabeghị ndị bụ ndị a,
Herdsmen Crisis: 'Onye ejidere ji ngwa ọgụ megidere iwu ga-aga ụlọ ikpe' - Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Femi Adesin bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ebe Buhari kwụ maka ihe gbasara ndị ọchị ehi na-awakpo ndị mmadụ bụ na goọmentị ga-akpụpụ onye ọbụla ahụrụ ngwa ọgụ megidere iwu n'aka ya ga-aga ụlọikpe ga zara ọnụ ya.
Adesian kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ Channels nwere mkparịta ụka n'ụbọchị Tuzde.
Okwu a bụ na ọsịsa ha dịka gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom kwuru na onyeisiala Naijirịa gbachịrị nkịtị maka okwu ndị ọchịehi na-ebu egbe agagharị.
Adesina kwuru sị, " Gọvanọ nwereike ikwu na ọnụbeghị ihe onyeisiala kwuru maka ndị ọchịehi kama o kwesịghị ịkwụ na-enwebeghị ihe onyeisiala kwurula maka ndị ọchị ehi bu egbe".
O gara n'ihu kwụọ sị, "Oge ole na ole onyeisiala kwurula okwu maka ndị ọchịehi, ọ bụ otu ihe ka ọ na-ekwu nke bụ na onye ejidere ji ngwa ọgụ ọ na-ekwesighị iji, ka e kpee ya ikpe dịka iwu siri dị. Onyeisiala ekwuola ya ọtụtụ mgbe".
Mgbe a jụrụ ya na ndị ọchịehi ole ka anwụchiela bụ ndị dara iwu a, Adesina zara na o bughị ọnụ ọgụgụ ha n'isi kama ọ ma na ọtụtụ ha nọ n'ikpe maka ịda iwu ahụ".
A gbapela ahịa ụgbọala Nnewi emechiburu maka inupu isi n'iwu nchekwa ọrịa covid-19

Ọ bụ na ụbọchị isii nke ọnwa Febuwarị afọ 2021 ka ngalaba gọọmentị Anambra steeti na-ahụ maka ahị nyere iwu ka a kpọchie ahịa ahụ ụgbọala nke Agbedo nke dị na Nnewe, Anambra steeti maka ịda iwu ehiwere maka nchekwa ọrịa coronavirus.
Akwụkwọ ozi Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba depụtara ka o kwuru na ewepụla mmachi amachiri ahịa ahụ nụbọchị iri nke ọnwa Febuwarị afọ 2021.
Ọ bụ dịka ndị ndụ na ndị isi ahịa ahụ biara rịọ mgbahara ma sị na ha ga-erubere iwu niile gọọmentị hiwere maka nchekwa ọrịa covid-19.
Gọọmentị kwuru na ha chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ngị butere ya bụ ọrịa bịara rịwa elu na obodo Nnewi.
Ọ bụ mgbe ndị ahịa rịọrọ mgbahara ma kwuo na ha ga-ata kwa onye otu ha ọbụla na-erubeghị isi na iwu nchekwa a ka Gọvanọ Wilie Obiano nke Anambra steeti mere ebre were nye iwu ka emepee ya bụ ọdọ ahịa.
Kama Adinuba dọrọ aka na ntị were sị na gọọmentị ga-emche ahịa Agbedo maọbụ ahịa ọzọ ndị na-achọghị irube isi na iwu nchekwa covid-19.
Unu abọọla Chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Aka akparala nwaokorobịa wakporo nwata nwaanyị akaghị aka

Nkọwa foto, Onye ndị uweojii Enugwu boro ebubo ịwakpo nwatakịrị nwaanyị akaghị aka Aka akparala otu nwaokorodịa dịnara nwatakịrị nwaanyị akaghị aka n'ike.
Ndị uweojii Enugwu gbara nwaokorobịa a n'anwụ n'ụbọchị Tuzde oge onyeisi uweojii ọhụrụ ezitere n'Enugwu steeti bụ Mohammed Aliyu na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka.
Aha nwaokorobịa a bụ Udeh Chukwuebuka onye gbara afọ iri atọ na atọ.
Oge ndị ntaakụkọ na-agba nwaokorobịa ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na o jighi anya ya mee ihe ahụ kama na ọ ṅụrụ mmanya.
O kwuru na ọ bụ ekwensu kwanyere ya n'ime ụdị ihe ahụ, ma kwukwaa na ya abanyeghị nwatakịrị ahụ ime, kama na o metụrụ ya aka n'ahụ ya nakwa ụkwụ ya.
Abịaram ikpochapụ ndị omekaome n'Enugwu - Kọmishọna uweojii ọhụrụ

Nkọwa foto, Mohammed Aliyu bụbu Kọmishọna uweojii na Borno State tupu e zite ya n'Enugwu Kọmishọna Mohammed Aliyu kwere nkwa na ọbịbịa ya bụ iweta udo n'Enugwu steeti, ma gwakwa ndị omekome na oge ha ezuola.
Aliyu jikwa ohere ahụ gosipụta ọtụtụ ndị ohi na ndị ama ndị uweojii jiderela n'ime otu izuụka ọ malitere ọrụ.
Ndị a gunyere: ndị ji egbe ezu ụgbọala, ndị otu nzuzo, ndị na-akpaka ụlọ, ndị aka n'akpa nakwa ndị na awakpo nwaanyị n'ike.
Kọmishịọna ọhụrụ ahụ rịọrọ ndị ntaakụkọ ka ha nye ya nkwado iji rụọ ọrụ oma ọ bịara ịrụ n'Enugwu Steeti.
Aliyu bụ onye jibu ọkwa Kọmishịọna uweojii n'Borno steeti tupu ezite ya Enugwu.

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị ntorobịa ndị uweojii gbara n'anwụ n'Enugu 
Nkọwa foto, Ụfọdụ ngwaọgụ na ihe ndị ọzọ ndị uweojii kwuru na ha natara ndị ekperima ahụ Lee mmadụ 100 ọzọ gọọmentị machiri ime njem na Naịjirịa
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gọọmentị etiti amachiela mmadụ otu narị ọzọ ime njem maka ịda iwu na-echekwa mgbochi coronavirus.
Site n'ozi otu ọtawaike na-ebuagha megide coronavirus wepụtara na twitter ha, ha wepụtara foto ndị a ma sị na ha agaghị eme njem ruo ọnwa isii.
Ha sị na mmachi a malitere n'ụbọchị 5 nke ọnwa Febụwarị ga-eru ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị, afọ 2021.

Ebe foto si, PTF/Twitter
Lee nne nwaanyị laghachịrị n'ụlọakwụkwọ Sekọndịrị J.S.S.1

Ebe foto si, ILORIN GRAMMAR SCHOOL
Akụkọ banyere etu otu nne nwaanyị bụ Ajayi Folasade si banye n'ụlọakwụkwọ Sekọndịrị klaasị J.S.S.1 na Kwara Steetị na-akpalite mmụọ ndị mmadụ.
Nwaanyị banyere n'ụlọakwụkwọ Ilorin Grammar dịka ọ gara mee ka mịnịstrị agụmaakụkọ na ọ chọrọ ịlọghachị gụọ akwụkwọ.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Abdulrahman Zubair Akyede gwara BBC sị na akụkọ na-ekwu na ọ dị afọ 50 ma nọrọ na klaasị nke abụọ bụ asị kama na ọ bụ klaasị nke mbụ ma dị afọ 38.
Akyede sị na ọ bụ kachasị eme okenye n'ụlọakwụkwọ ahụ, na mgbe mịnịstrị agụmaakwụkwọ zitere ya n'ụlọakwụkwọ ha na ha enweghi ike ịjụ ya maka na ọ chọrọ ịmụta ihe.
Ọ sị na o ji asambodo praịmarị ya bịa nke o nwetere n'ụlọakwụkwọ abalị ọ gara, na ha chọrọ itinye ya a klaasị JSS1 mana ọ meghi nke ọma.
Onyeisi ụlọakwụkwọ a sị na nwaanyị a malitere akwụkwọ n'izuụka gara aga, na ụmụaka ndị ọzọ anaghị enye ya nsogbu.
Ọ sị na agụmaakwụkwọ bụ n'efu na anaghị akwụ ụgwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ.
Mana ajụjụọnụ nwaanyị a bụ Ajayi zara ntaakụkọ, o kwuru na ọ dị afọ 50 na ọ banyere ụlọakwụkwọ maka na ọ chọrọ ịbụ onye nkuzi.
Mohammed Yerima abụrụla ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa
Ndị agha Naịjirịa ahọpụtala Mohammed Yerima dịka ọnụ ga na-ekwuru ha.
Yerima ga-ewere ọkwa n'aka Sagir Musa onye jibu ya bụ ọkwa kamgbe afọ abụọ gara aga.
Nke a so na-abịa dịka onyeisi ndị agha batara ọhụrụ bụ Ibrahim Attahiru malitere ịhazigharị ọnọdụ n'otu ndị agha Naịjirịa.
Yerima gụrụ akwụkwọ na Mahadu Ahmadu Bello dị na Zaria, Kaduna steeti, tupu ọ banye ọzụzụ ndị agha n'afọ 1989.
Ọ rụọla ọrụ n'ọkwa dị icheiche n'otu ndị agha Naịjirịa tupu e nye ya ọkwa nke a ugbua.
WHO adọọla aka na ntị maka ọgwụ mgbochi coronavirus AstraZeneca

Ebe foto si, Reuters
N'Africa, ọgbakọ ahụike mbaụwa bụ WHO adọọla aka na ntị maka ịtụkwasa obi n'ọgwụ mgbochi coronavirus bụ AstraZeneca nke a chọpụtara na ọ dịchaghị ire n'ụdị nje ọhụrụ ya bụ njem pụtara na Saụt Afrịka.
Onyeisi ya bụ otu bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus sị na ọ bụ maka nnwale ya bụ ọgwụ bụ nke ha sị na ndị mere ya bụ n'ahụ ndị ntotorobịa nakwa ndị ahụ siri ike ka anwalere ya.
Gọọm̀entị Naịjirịa amachiela mmadụ 100 maka ịda iwu coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị etiti amachiela mmadụ otu narị ọzọ ịme njem mba ofesi maka ịda iwu usoro mgbochị coronavirus. Ndị kọmitii ọtawaike coronavirus gọomentị etiti hiwere kpọpụtara aha ndị a ụbọchị Tuzde mgbe ọ sị na ndị ahụ agaghị e sị Naịjirịa pụọ n'ime ọnwa isii na-abịanụ.
'Gọọmentị etiti ga-amalite igwuputa mmanụ agbidi n'ugwuawụsa nso nso a' - Timipre Sylva

Ebe foto si, Timipre Sylva/Twitter
Minista na-hụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva ekwuola na gọọmentị etiti ga-amalite ịgwuputa mmanụ agbidi na mpaghara ugwuawụsa mgbe adịghị anya.
Cheta na gọọmentị etiti sị na ha achọpụtala mmanụ agbidi n'Ugwuawụsa na Febụwarị afọ 2020.
Ndị ụlọomeiwu ukwu ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ọgụ ndị ọchịehi nd ndị ọrụụgbọ

Ebe foto si, Senate
Ụlọomeiwu ukwu Naịjriịa ehiwela taa bụ Tụzde dịka ụbọchị ha ga-etinye ọnụ n'ọkwụ gbasara ọgụ ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo n'ime obodo.
Onye ndụ na Senate bụ Yahaya Abdullahi bụ onye gwara ndị ntaakụkọ nke a ụbọchị Mọnde.
Ọkaikpe aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump akwọọla aka Pontius Pilate gbasara ọgbaghara ndị nsonso Trump
N'ofesi, Ọkaikpe aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump akwọọla aka Pontius Pilate gbasara ọgbaghara ndị nsonso Trump mere na Capitol n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị.
Ọkaikpe a kwuru na ihe ndị ahụ mere agbasaghị Trump dịka ha na-achọ ịmalite okwụ maka ịkpachapụ ya ka esụ n'ọchịchị nke ugboro abụọ n'ala ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Celta Vigo akụọrọla ndị Atletico Madrid ọrụ na be ha

Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, Atletico Madrid na Celta Vigo ji ọkpụ goolu abụọ gbaa onwe ha onye nawa onye nawa n'asọmpi Spanish La Liga ha gbara ụnyaahụ.
Luis Suarez nyere goolu abụọ mana ozughị ịnye ndị Atletico mmerị na be ha.
