Etu e si gbuo ọkaiwu Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri
Ndị na-amabeghi ndị ha bụ egbuola ọkaiwu Ndionyenma Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri, Imo Steetị.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Jessica Nwankwo
Ihe gọọmentị Abia kwuru maka ntọrị, ịchị ehi nakwa mpụ dị iche iche
Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka
Gọọmentị Abia Steetị agbarụọla ihu ma katọọ etu ndị ọchị ehi na ehi ha si emebisi ihe ndị a kụrụ n'ugbo nakwa ịchịgharị ehi n'obodo.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi steetị ahụ bụ John Okiyi wepụtara n'ụbọchị Mọnde.
Ọ katọkwara ohi na mpụ ndị ọchị ehi na-eme na mpaghara Abia North ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha sie imi n'ala chọpụta ndị ohi a.
Gọọmentị gara n'ihu katọọ etu ndị mmadụ a na-amabeghi ndị ha bụ si egbusi ehi, bụ ndị na-achọ ịkpalite ọgbaghara n'obodo.
Gọọmentị nyere iwu ka ndị ọrụ nchekwa gbaa mbọ hụ na udo dapụtara na mpaghara ahụ ka ndị mmadụ nwee ike biri n'udo.
Gọọment gwara ndị mmadụ ka ha gaa mkpa dịịrị ha na ha na-agba mbọ ịhụ na udo chịrị n'ogbe ahụ.
Gere akụkọ ihe mere n'ụwa n'ime otu nkeji
Mmadụ 676 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi mfesasị ọrịa na Naịjirịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) sị na a chọpụtara coronavirus n'ahụ mmadụ narị isii na iri asaa na isii n'ụbọchị Mọnde.
Nke a bụ ọnụọgụgụ
kachasị obere a na-enwete kwa ụbọchị na Naịjirịa kamgbe ọnwa Disemba afọ 2020.
Ọnụọgụgụ a na-abịa dịka ụlọọrụ a kwuru na a chọpụtala ụdịrị coronavirus ọhụrụ a nke si mba Briten a kpọrọ "B.1.1.7 variant" n'ahụ mmadụ isii ọhụrụ na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Igbo ndị ọma anyị ekele unu n'ụtụtụ a.
Anyị ji aka na unu rahụrụ ụra nke ọma ma tetekwa n'ahụ isi ike?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Ụmụakwụkwọ
na Mahadum abụja na-eme ngagharịiwe ugbua maka ụgwọ akwụkwọ ha nke eji
pasnetị otu narị were bulie.
Mahadum ahụ kwadoro kwara ị da onye ọbụla akwụghị ụgwọ akwụkwọ ya n'oge nha.
Otu onye
gwara BBC Igbo okwu n’ekwentị kwuru na ọ bụ eziokwu na eweliri ụgwọ akwụkwọ ha.
O kwuru na ewelikwara ụgwọ ebe obibi nakwa ụgwọ ndị ọzọ ụmụ akwụkwọ kwesiri ịkwụ kemgbe afọ gara aga tupu gọọmentị amalite mmachi obodo maka coronavirus.
OjebTemi kwuru maka otu enyi ya nọ n'afọ ikpeazụ ya nna ya gwara ya kwụsị ịga akwụkwọ kemgbe ebulili ụgwọ akwụkwọ ahụ n'ihi onweghizi ego ọ ga-eji kwụ ụgwọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Ebe Coronavirus kwụ akwụ n'Afrịka taa
Tony Momoh alaala mmụọ
Ebe foto si, Twitter/Atiku
Tony Momoh, onye bụbu Mịnịsta mgbasa ozi na ọdịnala na Naịjirịa alaa mmụọ.
Akụkọ kwuru na Momoh nwụrụ n'ụbọchị Mọnde bụ abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021.
Momoh gbara afọ iri asatọ na otu tupu ọ laa mmụọ.
Ọkpụrụkpụ ihe gbasara ndụ Tony Momoh:
Ọ bụ Mịnịsta Mgbasaozi na ọdịnala n'oge Ọchịagha Ibrahim Babangida bụ Onyeisiala Naịjirịa
Momoh bụkwa onye ntaakụkọ a ma ama n'oge ya
Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta (editor) n'ụlọ ntaakụkọ Dialy Times malite n'afọ 1962 ruo 1980
Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisioche otu lekọtara ụlọọrụ ụgbọelu Naịjirịa bụ 'Nigeria Airways' malite n'afọ 1991 ruo 1993
Ọ bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Conscience for Political Change' (CPC)
Ọ bụkwa onyeisi otu ịchụ nta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari n'afọ 2011
Momoh bụ otu onye kwusiri okwu ike ịkwado ka ahaziagharịa ọchịchị Naịjirịa bụ nke a kpọrọ 'restructuring' na bekee.
'Oge ga-eru mgbe onye agbaghị ọgwụmgbochi Covid-19 agaghị emenwu njem pụọ na Naịjirịa'
Ebe foto si, AFP/Gọọmentị Naịjirịa
Ode akwụkwọ gọọmentị etiti bụ Boss Mustapha ekwuola na oge na-abịa mgbe onye agbaghị ọgwụ mgbochi Covid-19 agaghị ewne ike ịba mba ọzọ.
Mustapha, bụkwa onyeisi kọmiti na-ebuso nje Covid-19 agha na Naịjirịa, kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'Abuja iji kọwaara ndị ndu okpukperechi dị icheiche maka ọgwụ mgbochi Covid-19 nke a ga-amalite ịgba n'oge adịghị anya.
O kwuru na gọọmentị na-atụ anya na mmadụ pasentị iri asaa (70%) ga-agba ọgwụ mgbochi Covid-19 na Naịjirịa.
Ọ gara n'ihu kọwaa na mba ụwa dị icheiche anabatala ma malitekwa ịgba ya bụ ọgwụ mgbochi, "Naịjirịa agaghị apụ iche."
Mustapha gbara ụmụ Naịjirịa ume ma kwuo na onweghị ihe mmerụ ahụ ọbụla dị n'ọgwụmgbochi coronavirus.
O kwukwara na ngalaba na-enyocha nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ NAFDAC n'ịchafụ, ga-enyocha ọgwụmgbochi ndị ahụ ma ha bata iji hụ na ha tozuru oke maka ịgba ndị mmadụ.
Buhari agbanweela mana ekwenyeghị m na ọ bụ 'Jibril' onye Sudan - Obasanjo
Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Nkọwa foto, Buhari na Obasanjo
Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na o kwenyeghị na onye nọ n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa ugbua abụghị Muhammadu Buhari.
Obasanjo kwuru na Buhari nọ n'ọchịchị ugbua abụghị Buhari ya ma oge ha abụọ rụrụ ọrụ dịka ndị agha, mana ọ pụtaghị na ọ bụ onye Sudan.
"Eche m na ama m Buhari nke ọma n'ihi na mụ na ya rụkọrọ ọrụ, mana ihe na-eme ugbua na-agba m gharịị," Obasanjo na-ekwu na mkparịtaụka ya na ọkammụta Toyin Falola nwere n'ọba ozi YouTube.
"Ana m ajụ ajụjụ sị, 'ọ pụtara na aghọtaghị m ya nke ọma n'oge ahụ, ka ọ bụ na ọ gbanweela na Buhari nke m mabu?"
"Mana ekwenyeghị m ihe ụfọdụ na-ekwu na onye nọ ugbua bụ onye si mba Sudan. Mba ekweghị m nke a."
Cheta na ọ bụ Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra' malitere ikwu na onye na-achị Naịjirịa ugbua abụghị Buhari.
Nnamdi Kanu na-ekwu na onyeisiala Buhari anwụọla mana onye na-achị Naịjirịa ugbu a bụ otu nwoke yiri Buhari, aha ya bụ Jubril onye mba Sudan.
Mana Mazi Kanu enweghị otu mkpụrụ ihe akaebe iji kwado akụkọ ụgha ọ na-ebu na onye na-achị Naịjirịa ugbua abụghị Buhari.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Obasanjo, dịka Buhari, chịrị Naịjirịa dịka onye agha nakwa onye nkịtị
Obasanjo gara n'ihu kwuo na ịkpa oke agbụrụ, nke bekee kpọrọ 'nepotism', karịrị akarị n'ọchịchị Naịjirịa ugbua.
O kwuru sị:"Amaghị m na Buhari nwere agwa ịkpa oke agbụrụ dịka anyị si ahụ ugbua."
Obasanjo katọkwara etu ndị omekome si akpa ike "na-azụ ụlọ" Buhari, mana o nweghị ihe ọbụla o menwuru iji kwụsị ya.
Mana Obasanjo nyere ndụmọdụ ka obi ghara ịlọ ndị mmadụ mmiri n'ịgba mbọ ịchọ ụzọ Naịjirịa ga-esi ka mma.
Ejikọọla okporo ụgbọoloko si Apapa gawa Ibadan
Ebe foto si, CCECC
Ụlọọrụ na-arụpụta ụzọ ụgbọoloko nke Legọs na Ibadan ekwuola na ejikọọla ụzọ oloko si Ibadan na nke na-aga Apapa.
Ha kwuru n'ozi ha depụtara n'akara Twitter ha na ọ bụ n'ụbọchị 25 n'ọnwa Jenụwarị ka nke a mere.
"Ọ bụrụla ihe dị mkpa maka etu mpaghara ahụ sị ghọrọ ebe mbubata na mbupu ngwa ahịa si aga aga" ka ha kọwara.
Amabeghi mgbe njem ga-amalite ebe ahụ mana ụgbọoloko si Legọs amalitewela ịga Ibadan.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Shina Peters na-eti egwu 'afro juju' abụrụla Bishọp.
Shina Peters bụ nwaafọ Naịjirịa a ma ama na-eti egwu 'afro juju' abụrụla bishọp n'ụlọụka Cherubim and Seraphim na Legọs.
Nwamadị a dị afọ iri isii na abụọ tiri egwu ndị wuru ewu n'agbata afọ 1980 na 1990.
Peters wepụtara ihe onyonyo ebe ọ na-anara asambodo ọkwa ọhụrụ n'akara Instagram ya.
Ya mere, mgbe ọzọ ị hụrụ Shina Peters, ihe ị ga-akpọ ya bụ "Bishọp Shina Peters".
Ndị nkuzi Imo steeti akwụsịla abụbụọrụ ha na-agba
Ebe foto si, Getty Images
Ndị nkuzi Imo steeti akwụsịla abụbụọrụ ha malitere ịgba na steeti ahụ n'otu izu gara aga.
Ndị nkuzi malitere abụbụọrụ a iji gosi iwe ha maka ụgwọ ọnwa e ji ha, ụgwọ e ji ndị lara ezumike nka, nakwa ụgwọ opekatampe (₦30,000) e kwesịrị ị na-akwụ ndị ọrụ.
Ha kwụsịrị ya bụ abụbụọrụ taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Febrụwarị, dịka ha na gọọmentị nwere nkwekọrịta.
Otu onye nkuzi na-achọghị ka a kpọọ ya aha gwara BBC na gọọmentị ekwetala ịkwụwa ha ụgwọ opekatampe site n'ụgwọ ọnwa nke Jenụwarị a (mana a kwụbeghi ya).
O kwukwara na ha na gọọmentị enwekwaala nkwekọrịta na mkpebi ndị ọzọ nke mere ka ha laghachị ọrụ.
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na inye ọkwa onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa abụghị ihe gbasara agbụrụ kama ọ bụ site n'ịdị ike ichekwa ndụ na akụnaụba.
Garba Shehu bụ onye enyeamaka pụrụiche nke onyeisiala Buhari kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n'ụbọchị Mọnde.
O kwuru nke a iji katọọ ọtụtụ ndị na-akpo oku n'ịntanet ka e mee onye Igbo onyeisi ndị uweojii dịka onyeisi ugbua bụ Mohammed Adamu ga-ala ezumike nka.
Ebe foto si, Presidency
Nkọwa foto, O dobeghịanya onye Onyeisiala Buhari ga-ahọpụta iji nọchie anya Muhammed Adamu bụ onye kwesịrị ịla ezumike nka n'ọrụ uweojii n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2020.
Shehu kwuru na agbụrụ dị na Naịjirịa karịrị narị abụọ na iri ise (250), ya mere na ndị na-akpọ oku ka e nye onyeisi ndị nchekwa si ala Igbo kwesịrị iche ya eche.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ mabeghi ebumnobi onyeisiala Buhari banyere inye ọkwa onyeisi ndị uweojii kama na mgbe Buharị ga-esi si Daura lọta, na ọ ga-ekwupụta onye ọ chọrọ ka e nyee ọkwa
Onye sị na nwafọ Igbo agaghị abuli onyeisiala Naịjirịa? - Dele Mommodu
Ebe foto si, Dele Momodu Live page
Onye a ma ama n'ikwu okwu mkpalite na Naịjirịa bụ Dele Mommodu ajụọla sị " kedụ ka mmadụ ga-esi kwuo na nwafọ Igbo agaghị abụlị onyeisiala Naịjirịa?".
Mommdu onye kwuru nke a n'ihe onyonyo Instagram mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ sị na o kwenye na nke ahụ pụtara na ọ maghị ihe.
Ọ sị na ndị Igbo bụ nwere akaraka na amamihe pụrụiche karịa nke dị Chaịna, Korịa nakwa Japan.
Ọ sị na ebe Naịjiria nwere ndị dịka ndị Igbo na gịnị gọọmentị achọghị ka ha soro n'ọchịchị ma ọ bụghị n'ihi ịkpaoke.
Ọ gara n'ihu sị na ndị Igbo nwere agba na ngalaba dị iche iche n'ụwa gbaagburu mana gịnị a bịa na Naịjirịa achọghị ka ha bụrụ ndịisi uweojii, ndịagha maọbụ ọkwa onyeisiala.
Mommodu kwuru na ọ bụrụ na ọ bụ onyeisiala Naịjirịa taa, na ọ ga-agbanwe mpaghara ọwụwanyanwụ n'ụzọ pụrụiche mee ka ọ bụrụ isisekpu ntị na tekịnụzụ.
Mommodu sị na ebe ọ dị etu a na gịnị mere ndị Igbo agaghị achọ ikewapụ onwe ha site na Naịjirịa?
Mana obi adịghị gọọmentị Naịjirịa mma na ndị Igbo chọrọ ikewapụ n'ihi mmegbu a na-emegbu ha.
Lee etu o si kwụrụ n'asọmpi NPFL nke Naịjiria
Rivers United agbagokwala n'ogogo mbụ na
tebulu Nigerian Professional Football League dika ha ji otu ọkpụ goolu merie
Adamawa United na Sọnde.
Enyimba nke Aba jikwa otu ọkpụ merie
Katsina United n'otu asọmpi ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Ndị agha ewegharala ọchịchị n'ike na mba Myanmar
Ebe foto si, Reuters
Ndị agha mba Myanmar ewegharala ọchịchị n’ike
dịka ha nwụchiri Aung San Suu Kyi na ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ.
Ndị agha a kwuru na ọnọdụ a bụ site na mgbagha
ndị ndọrọndọrọ na-agbagha ntuliaka e mere, ga-adị otu a ruo otu afọ.
Mara na Mba Myanmar a makwa dịka Burma ka
si n’ọchịchị ndị agha pụta n’afọ 2011.
Mmadụ 685 ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus - NCDC
A hụrụ ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ narị
isii na iri asatọ na ise n'ụbọchị ụka dịka ụlọọrụ NCDC si kwuo.
A chọtara mmadụ 355 ọhụrụ na Legọs, ebe mmadụ 58 ọzọ butere ya na Kaduna.
Ebe mmadụ asatọ ọzọ nwụrụ n'etiti 30 na 31 nke ọnwa Jenụwarị site n'ọrịa a na Naịjiria.
Nke a na-abịa dịka onyeisiala Muhammadu
Buhari nyere iwu ka onye ọbụla
na-ekpuchi imi ya n'ebe niile na Naịjirịa maọbụ gaa nga ọnwa isii.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ịchị ehi site na mpaghara ugwu gawa ọwụwa-anyanwụ kwụsị - Ganduje
Ebe foto si, Ganduje Twitter
Gọvano Abdullahi Ganduje nke Kano steetị ekwuola ka e tinye iwu ga-amachi ndị ọchị ehi ịchịrị ehi site na mpaghara ugwu gbadata na ndịda nakwa ọwụwanyanwụ.
Ganduje bụ onye kwuru nke na Daura nke Katsina Steetị kwenyere na ọ ga-enye aka belata nsogbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo.
N'okwu ya "ana m akpọ oku ka e kpochapụ njem ndị ọchị ehi site na mpaghara ugwu Naịjirịa gawa na mpaghara ndị ọzọ.
E kwesịrị inwe ihu na-amachi ha ime nke a ma ọ bụghị ya anyị agaghị enwe ike ịchịkwa ọgụ ha na ndị ọrụ ugbo."