Etu e si gbuo ọkaiwu Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri

Ndị na-amabeghi ndị ha bụ egbuola ọkaiwu Ndionyenma Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri, Imo Steetị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo

  1. A machiela Andre Onan bụ oche goolu Kamerun iche bọọlụ otu afọ

    Andre Onana

    Ebe foto si, Getty Images

    Andre Onana bụ oche goolu ndị Ajax nakwa mba Kamerun agaghị eche bọọlụ otu afọ dịka a machiri ya mgbe a chọtara ọgwụ ekwesịghị n'ahụ ya n'ọnwa Ọktoba gara aga.

    Onana dị afọ 24 kwuru na ọ maghị ụma ṅụọ ya bụ ọgwụ (nwere furosemide) bụ nke nwunye ya oge ahụ adịghị ya, na o che na ọ bụ ọgwụ aspirin, na mkpọ ha abụọ yiri onwe ha.

    O kwuru nke a na soshal midia, ebe ọ nọ kwuo na mmachi a machiri ya karịrị ihe o mere.

    "Onye ọbụla ma na m na-ebi ndụ ezi ahụike, kemgbe m malitere ime egwuregwu, anaghị m akwado ịṅụ ọgwụ ekwesịghị maọbụ ime ihe na-dịghị mma ka onye na-eme egwuregwu mee".

    Ka ọ dị ugbua, Onana na Klọb ya na-akwado igakwu ụlọikpe na-ahụ maka egwuregwu, ịrịọ ka ha tụgharịa mmachi a Uefa machiri ya.

    Onana cherela Kamerun bọọlụ ugboro 18 agaghị esozi ha gaa asọmpi Iko Mba Afrịka nor 2021. Kamerun bụ mba a ga-eme ya bụ asọmpi a ga-eme n'ọnwa Jenụwarị 2022.

  2. Gọọmentị Naịjirịa ebuliela mmachi ha machiburu ụgbọelu Emirates isi Naịjirịa efepu

    ụgbọelu

    Ebe foto si, Emirates/Facebook

    Gọọmentị Naịjirịa ebuliela mmachi ha machiri ụgbọelu Emirates isi Naịjirịa efepu.

    Ihe mere nke a dịka mba United Arab Emirates nyere ụlọọrụ a ikike ịkwụsị nyocha coronavirus chere were ha na-eme ndị njem bụ nke megidere iwu gọọmentị Naịjirịa nyere maka mgbochi coronavirus.

    N'ihi nke a otu na-ebuagha megide coronavirus na Naịjirịa nyere ụlọọrụ njem ụgbọelu bụ Nigerian Civil Aviation Authority iwu ka ha bulie mmachi ahụ ozugbo

    Akwụkwọ ozi a nke onyeisi ụlọọrụ njem ụgbọelu bụ Musa Nuhu tinyere aka na ya na-atụ anya na ụlọọrụ Emirates ga-erubeisi n'iwu na-achịkwa coronavirus na Naịjirịa.

    Notu aka ahụ ụlọọrụ ụgbọelu Emirate gosiri mmasị ha ị na-efebata nakwa efepu na Naịjirịa ma keele gọọmentị Naịjirịa maka nkwado ha.

    Cheta na Gọọmentị Naịjiria machiburu ụgbọelu Emirates isi na Naịjiria fepụ n'ime ụbọchị atọ maka ịda iwu na-echekwa coronavirus

    Gọọmentị kwuru na ha dara iwu dịka ha na-ebu ndị mmadụ mere nnyocha ọrịa covid-19 chere were n'ụlọọgwụ ebe ndị gọọmentị amapụtaghị.

    Gọọmentị kwukwara na ihe dị ụzọ abụọ na otu ga-emerịrị, na Emirates ga-ahọrọ otu n'ime ibu ndị mmadụ na-enweghi RDT ruo mgbe e tinyechara ihe ga-enyere nke ahụ aka, maọbụ ha akwụsị ifepụ na Naịjiria ruo mgbe e tinyechara ihe ndị ahụ ga-eme ka nnyocha ọrịa a tupu e mee njem adị.

  3. SSANU na NASU ebidola abụbọ ọrụ

    SSANU na NASU

    Ndị otu Senior Staff Asociation of Nigeria bụ SSANU n'aha ịchafụ na ndị ọrụ mahadum na-abụghị ndị nkuzi bụ Non-Academic Staff of Univesities and Allied Institutions ebidola abụbọ ọrụ ha n'ụbọchi Frịde.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ndị isi otu wepụtara n'ụbọchị Tọzde ka ha nyere iwu ka ndị otu ha bido abụbọ ọrụ.

    Na-agbanyeghị na otu ndị a na ndị ọrụ gọọmentị Naijirịa nwere nzụkọ n'ụbọchị Tuzde, kama ndị otu a na-ekwu na nzụko ahụ ejughị ha afọ na gọọmentị ga-eme ihe ha chọrọ.

    Ụfọdụ ihe ndị otu a chọro ka gọọmentị mere ha bụ ka gọọmentị gbanwee atụmatụ eji akwụ ha ụgwọ ma kwụọ kwa ha ụgwọ opeketempe gọọmentị ji ha.

  4. Awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti

    Ụgbọala agbara ọkụ n'Ebonyi

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Ndị uweojii n'Ebonyi steeti ekkwuola na ndị echeere na ha bụ ndị otu Ipob awakpoola ụlọorụ ha nke dị n'Ọnịcha Isu na steeti ahụ.

    Ha gbara otu akụkụ ụlọọrụ ahụ ọkụ nakwa ụgbọala anọ ma merụkwa otu onye uweojii ahụ.

    Ha kọwara na ndị ahụ na-ebo ndị uweojii ebubo ịchekwa otu onye ọchịehi na steeti ahụ nke ha kwuru gburu otu onye nke ha.

    Ebe ndị echeere na ndị Ipob

    Ebe foto si, Nigeria Police

  5. Gere akụkọ ụtụtụ taa n'otu nkeji

  6. Joe Biden ekwuola na ya na Ọgbakọ Afrịka ga-arụkọ ọrụ maka ọdịmma mmadu niile

    Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden ekwupụtara ebumnuche ya banyere mmekọ gọọmentị ya na mba dị na Afrịka.

    O kwuru na ha na ngalaba Afrịka CDC ga-arụkọ ọrụ maka ibuso coronavirus agha ma sịkwa na ha ga-enyere Afrịka aka maka nsogbu di iche iche na-akpa mkpa mkpa na mpaghara ahụ.

    Gee ya ntị n'uju n'ala.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ndị Omeiwu Demokrat na Repọblịkan 11 achụpụla Marjorie Taylor Greene n'ọrụ kọmịtii

    Aha onyonyo, Marjorie Taylor Greene in her own words

    Ndị ụlọomeiwu mba Amerịka emeela ntuliaka wepụ omeiwu Marjorie Taylor Greene na kọmitii niile ọ nọ n'ụlọomeiwu.

    Ọ bụ maka ihe Greene kwuru na soshial midia ya nke ha si gbadoro ụkwụ na ịkpa oke agburu na ọgbahara ndị ọzọ.

    Marjorie Taylor Greene na-agbasa ozi ụgha nakwa na-akwado ịwakpo ndị patị Demokrat.

    Ndị patị Repọblịkan iri na otu so ndị Demokrat binye tụọ vootu ka ewepụ ya na kọmịtii abụo o so na ha.

    Ọ bụ mmadụ 230 kwenyere iwepu onye omeiwu a, ebe mmadụ 199 sị ka ọ nọdụ.

    Tupu a tuọ vootu a, onye omeiwu ọhụrụ a na-anọchite anya Georgia sị na ihe a mere na mbụ na-eche ya uche ugbua, dịka ọ naghị ekwenyezi na ha.

    Ihe o kwuru gunyere na ọ bụghi iziokwu na ndi oji egbe na wakpo ụmụakwụkwọ n'Amerịka. Ọ sịkwa na 9/11 bu nkata ndị Amerịka kpara.

  8. Mmadụ iri na anọ ọzọ anwụọla n'aka ọrịa coronavirus

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu puku, narị atọ na iri anọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ iri na anọ ọzọ nwụkwara site na ya bụ ọrịa.

    Iri anọ n'ime ha sị Imo steeti ebe mmadị iri na asatọ n'ime ha sị Delta steeti.

  9. Ndị omekome atọrọla onye ntaakụkọ ụlọọrụ PUNCH

    Ndị ntọ atọrọla Okechukwu Nnodim bụ onye ntaakụkọ ụlọọru Punch n'ụlọ ya dị na mpaghara Kubwa nke Abuja, n'abalị wenesde.

    Ndị a tọrọ ụmụ nwoke abụọ bụ ụmụ onye agbata obi Nnodim ma nara nwunye ya puku naira itolu.

    Nwunye ya aha ya bụ Oluchi gwara ndị ụlọntaakụkọ Punch na di ya na-arụ ọrụ n'igwe kọmputa ya mgbe ụmụ nwoke ise wụrụ aja dabata na be ha.

    "Ọ gwara m ka mụ na ụmụaka zoo n'imeụlọ. A nụkwara m ebe ndị ahụ na-ana ya ego mana ọ gwara ha na o jighi ego".

  10. Ụtụtụ ọma!

    Daalụ nụ maka isonye na peeji anyị taa.

    Akụkọ dị ọkụ n'gbe gị nakwa mpaghara ụwa niile ka anyị na-ewetara gị taa.

  11. Ụgbọ eburula Odion Ighalo gaa mba Saudi Arabia

    Odion Ighalo

    Ebe foto si, Instagram/IghaloJude

    Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Odion Ighalo esonyerela otu egwuregwu Al Shabab nke Saudi Arabia.

    Ighalo kwupụtara nke a n'ihe onyonyo nke o tinyere n'akara Twitter ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Nke a na-abịa dịka Ighalo hapụchara otu egwuregwu Manchester United ebe ọ nọrọ otu afọ.

    Ever Banega na Alfred Ndiaye bụ ndị ọgba bọọlụ a ma ama na-agbakwara Al Shabab.

    Al Shabab bụ ndị nke mbụ na asọmpi bọọlụ nke mba Saudi Arabia ugbua.

  12. Mathias Ekweremadu bụ nwanne Ike Ekweremadu anwụọla

    Mathias Ekweremadu

    Ebe foto si, Mathias Ekweremadu/Facebook

    Mathias Ekweremadu bụ kọmishọna na-ahụ maka njem n'Enugwu Steetị ma bụrụkwa nwanne Sịnetọ Ike Ekweremadu anwụọla.

    Ọnụ na-ekwuru mịnịstrị na-ahụ maka njem n'Enugwu Steetị gwara BBC Igbo na nke bụ eziokwu na ọ dara n'ụlọ omeiwu ndị Enugwu Steetị ma nwụọ.

    O kwuru na ahụ siri Ekweremadu ike n'ụtụtụ a mgbe ha kpechara ekpere n'isiụlọọrụ ha tupu ọ gawa n''ụlọomeiwu bụ ebe ọ nọ nwụọ.

    Ekweremadu bụbu onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara obodo Aninri n'ụlọomeiwu Enugwu Steetị tupu e mee ya kọmishọna n'afọ 2019.

    Ọ rụọkwala ọrụ dịka onyeisioche okpuruọchịchị Aninri ọtụtụ oge.

  13. Nkeji Coronavirus

    Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  14. BBC Nkeji

    Nchịkọta akụkọ ihe mere n'ụwa n'otu nkeji.

  15. Buhari enyela ndị isi nchekwa ọ chụrụ achụ ọrụ Ambassador

    Buhari na ndị isi ndị agha nke ochie

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa

    Nkọwa foto, O rubeghị izuụka abụọ Onyeisiala Buhari wepụrụ Abayomi Olonisakin, Tukur Buratai, Ibok-Ete Ibas, Sadique Abubakar dịka ndị isi ndị agha Naịjirịa.

    Ndị isi ọrụ nchekwa nke onyeisiala Buharị wepụrụ n'ọrụ n'ọdị nso a, ga-abụzị ndị na-anọchite anya Naịjirịa na mba dị iche iche nke a kpọrọ 'ambassador' na bekee.

    Nke a dị ni'me akwụkwọ ozi Buhari degaara ndị ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde.

    Iwu Naịjirịa kwuru na Onyeisiala ga-edegara ndị omeiwu akwụkwọ ka ha kwadoo onye maọbụ ndị ọbụla ọ chọrọ inye ọkwa 'ambassador'.

    N'ime akwụkwọ ozi Buhari zigaara ndị omeiwu n'ụbọchị Tọzde, aha mmadụ ise dị n'ime ya bụ ndị o nyere ọkwa 'ambassador' ọhụrụ.

    Ha gụnyere:

    • Abayomi Olonisakin
    • Tukur Buratai
    • Ibok-Ete Ibas
    • Sadique Abubakar
    • Marshal Mohammed S Usman
    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Cheta na ụfọdụ otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye edegarala ụlọikpe mba ụwa akwụkwọ ma kpọọ oku ka e kpee ndị isi nchekwa Naịjirịa pụrụ apụ ikpe maka ịda iwu 'ikike dịịrị mmadụ, bekee kpọrọ 'human rights'.

    Mana gọọmentị Naịjirịa kwuru na akwụkwọ mkpesa ahụ enweghị isi maka ha rụrụ ọrụ ha nke ọma.

    Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya na Twitter:

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  16. Buhari agbatiala oge ọrụ IGP Mohammed Adamu

    Mohammed Adamu na Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency

    Nkọwa foto, Mohammed Adamu na Muhammadu Buhari

    Onyeisiala Muhammadu Buhari agbatịkwuola oge ọrụ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ruo ọnwa atọ ọzọ.

    Minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Mohammed Dinyadi gwara ndị ntaakụkọ nke a n’Abuja n’ụbọchị Tọsde.

    Ọ sị na mgbatị a dị mkpa iji nye ohere ịhọpụta onye tozuruoke ga-anọchi anya ya.

  17. Ijeoma Neke: Mercy Eke ekwuola na ya na nwa agbọghọ egburu n'Enugwu gụkọrọ akwụkwọ

    Mercy Eke

    Ebe foto si, Instagram/Mercy Eke

    Dịka ihe onyonyo e setere n'Ụlọ Ikpe gọsiri ebe nne Ijeoma Neke na-ebe akwa na-akpọ ndị e boro ebubo na ha gburu ya iyi.

    Ndị a bụ ndị uweojii nwuchiri maka a na-eche na aka ha dị n'ogbugbu nwa ada Ijeoma Neke n'Enugwu n'afọ gara aga.

    Mercy Eke bụ onye ama ama dika o sonye na emume Big Brother Nigeria.

    Ọ sị na ya na nwa ada gụrụ akwụkwọ n'ofu ebe ma kwukwa na ọ pụtara dịka ndị kachasi mara akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ ahụ n'oge ha na-aga akwụkwọ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ugbua, Okwu nwa ada na-ewusike dịka ọtụtụ mmadụ na-ekwu ka enye ya ikpe ziri ezi.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ihe anyị ma maka Ijeoma Neke:

    • Ijeoma toro n'Owerri, Imo steeti ma gụọ akwụkwọ praịmarị na ụlọakwụkwọ 'police children school' Owerri.
    • Ọ gara akwụkwọ Mahadum na 'Imo state University' malite n'afọ 2010 ruo 2014
    • O nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Psychology
    • Ọ bụ onye ọrụ ntecha nke bekee kpọrọ "make up artist"
    • Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ka a malitere ịchọ Ijeoma achọ
    • Dịka akụkọ si kwuo, otu onye kpọrọ ya n'ekwentị ka ọ bịa techaa ya ihu
    • Ka ụbọchị olemole gara, a hụrụ ozu Ijeoma ka ọ tọgbọ n'okporo ụzọ
    • Ọ bụ akara ekwentị onye ahụ kpọrọ Ijeoma ọrụ ka ndị uweojii jiri jide ndị a na-ebo ebubo igbu nwata ahụ
    • Nne Ijeoma bere akwa arịrị n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde oge a malitere ikpe mmadụ abụọ eboro ebubo na ọ bụ ha gburu nwata nwaanyị ahụ
  18. Gere akụkọ ehihe taa n'otu nkeji

  19. Wales na-enyocha nje coronavirus ọhụrụ sị mba Saụt Afrịka ha hụrụ na mba ha

    Ndị ọrụ nchekwa na ba Wales

    Ebe foto si, Woking Council

    Ndị ọrụ ahụike mba Wales ekwuola na ha na-eme nyocha iji mata etu nje ọrịa coronavirus nke bidoro na mba Saụt Afrịka siri bata na mba ha.

    Mmadụ atọ ahụtara nje a n'ahụ ha emeghị njem maọbụ nwee ihe jịkọrọ ha na mba Saụt Afrịka.

    Mịnịsta ahụike mba ahụ bụ Vaughn Gething kwuru sị, "a ga-eme nyocha nke ọma iji ghọta mgbe na etu mmadụ atọ si bute ya bụ ọrịa, ọ ga-enyekwa anyị ohere ịmata ma ya bụ ọrịa agbasaala n'obodo anyị karịa etu anyị siri chee".

  20. Mmadụ ise ọzọ anwụọla n'aka ọrịa coronavirus na Naijirịa - NCDC

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu puku na otu narị na iri atọ na asatọ ọzọ ebutela ọrịa Coronavirus na Naijirịa ebe mmadụ ise ọzọ anwụọla n'aka ya bụ ọrịa.

    Ọnụ ọgụgụ gosiri na mmadụ iri anọ si Imo steeti, iri atọ na isii si Rivas ebe iri na asatọ n'ime ha si Delta steeti