Etu e si gbuo ọkaiwu Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri

Ndị na-amabeghi ndị ha bụ egbuola ọkaiwu Ndionyenma Nwankwo n'ụlọọrụ ya dị n'Owerri, Imo Steetị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo

  1. Stella Nyanzi na-ekwu okwu megide onyeisiala mba Yuganda, agbagala Kenya

    Stella Nyanzi

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye na-ekwukarị megide onyeisiala mba Yuganda bụ Stella Nyanzi eriela mbọmbọ ọsọ gbaga mba Kenya iji gbanahụ mkpagbu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Nyanzi kwuru sị, "Ọ bụ n'ọnwa Febuwarị afọ gara aga ka m si nga pụta, achọghị m ịlaghachi azụ".

    O gwara ndị ụlọ ntaakụko nke Nation Africa na ndị uweojii na-esoharị ụmụ ya ma sịkwa na oruwala oge a ga-atọrọ maọbụ nwuchie ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ọkaikpe ya bụ George Luchiri Wajackoyah gwakwara ndị ntaakụkọ Uganda Daily Monitor paper na Nyanzi eriela mbọmbọ ọsọ.

    Nyanzi kacha ekwu okwu megide Yoweri Museveni bụ onyeisiala mba Yoganda.

    Anwuchiela ya na mbụ maka ịkparị onyeisiala mba ahụ.

  2. Mberede okporo ụzọ egbuola ndị uweojii atọ si nchekwa obodo n'Ebonyi steeti

    Mberede Okporoụzọ

    Ebe foto si, ODINAKA

    Akụkọ na-erute anyị ntị na-ekwu na ihe mberede okporo ụzọ egbuola ndị uweojii atọ ma merụọ iri ọzọ ahụ n'ụzọ Abakalili - Enugwu. Ọ bụ mgbe ha na-alọhachi ebe ha na echekwa udo maka ọgbaaghara dapụtara n'etiti obodo Effium na Ezza Efium ka ihe mberede a mere.

    Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Garba Aliyu kwuru sị, " Eee, ndị uweojii atọ nwụrụ ebe iri nọ n'ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwọ dịka ha zutere ihe mberede okporo ụzọ mgbe ha sị ebe ha gara ịchjekwa udo n'obodo Effium alọta".

    O meela izuụka abụọ ndị obodo Effium na Ezza Effium nke dị n'okpuruọchịchị Ohawukwu na-alụrịta ọgụ nke tarala isi ọtụtụ mmadụ.

  3. Anyị ga-achọtarịrị ndị gbara ụlọ ndị ọchị ehi ọkụ - Onyeisi ndị Uweojii n'Ebonyi

    Herder settlement

    Ebe foto si, Screen grab/Facebook

    Ndị uweojii Ebonyi steeti aṅụọla iyi ịchọta nakwa nwụchie ndị gbara ụlọ ndị ọchị ehi ọkụ n'obodo Oshibo dị n'okpuruọchịchị Ebonyi, n'ụbọchị Mọnde.

    Aliyu Garba bụ kọmishọna uweojii na steeti ahụ kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị wenezde.

    Garba kwere ndị ọchị ehi na steeti ahụ nkwa na ha ga-achọtarịrị ndị mere ihe a, ma dọọ ndị steeti ahụ aka na ntị ka ha gbaara ime omekome ọsọ.

    Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ na-enyere ndị uweojii aka n'ụzọ gụnyere inye ha ozi ga-enye aka ịhụ na aka kpatara ndị omekome na steeti ahụ.

    Alhaji Musa Saidu, otu onye ọchị ehi ọkụ ọgbụgba a metụtara, gwara ndị ntaakụkọ na ọkụ gbara ihe ruru ụlọ ise ọkụ.

    Saidu kwukwara na o biela n'Ebonyi steeti ihe ruru afọ 30, mana ndị omekome a mụnyere ụlọ ha ọkụ ma chụsasịa ezinaụlọ ya na ndị ọzọ.

    Ndị ọzọ ọkụ a metụtara kwara arịrị maka akụnaụba na ngwongwo ha ndị ọzọ lara n'ọkụ ahụ.

  4. Unu abọọla chi Igbo ndị ọma

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  5. Igbo ndị ọma ka anyị wụsaa ọwa ebe a

    Echi anyị ga-achụ n'owere nchi. Daalụ nụ.

  6. Gọọmentị enyela ikike ka e hiwe mahadum 20 ọhụrụ ndị nkịtị nwe

    Ndịisi ọchịchị Naịjirịa

    Ebe foto si, Presidency/Twitter

    Gọọmentị etiti etinyela aka n’akwụkwọ ministrị agụmaakwụkwọ wetara nke ga-enye ikike ka e hiwe mahadum iri abụọ ọhụrụ bụ nke ndị nkịtị nwe.

    Nke a mere ka ọnụọgụgụ mahadum ndị nkịtị nwe na Naịjirịa ruo iri itoolu na itoolu.

    Ndịisi ọchịchị gọọmentị bụ 'Federal Executive Council' mere nke a n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Wenesde nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.

    A ga-enye mahadum ndị a akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ nwa mgbe nta ruo afọ atọ dịka mịnịstrị ga na-enyocha ka ha si arụ ọrụ.

    Mahadum itoolu dị na mpaghara etiti Ugwu, atọ dị na Ndịda, abụọ n'Ọwụwa Anyanwụ, ise na mgbada Ugwu ebe otu dị na Ndịda Anyanwụ.

    Mahadum ndị a gụnyere; Mahadum Top faith dị n'Akwa Ibom Steetị; Mahadum Thomas Adewumi dị na Kwara Steetị; Mahadum Maranathan dị n'Imo Steetị; Mahadum Ave Maria dị na Nasarawa Steetị; na Mahadum Al-Istiqama dị na Kano Steetị.

    Ndị ọzọ bụ Mahadum Mudiame dị n'Edo Steetị; Mahadum Havilla dị na Cross River Steetị; Mahadum Claretian dị n'Imo Steetị; Mahadum NOK dị na Kaduna Steetị; na Mahadum Karl-Kumm dị na Plateau State.

    Ha gụnyekwara Mahadum James Hope dị na Lagos Steetị; Mahadum Maryam Abacha nke Amerịka dị na Kano Steetị; Mahadum Capital City dị na Kano Steetị; Mahadum Ahman Pategi dị na Kwara Steetị; na Mahadum Offa dị na Kwara Steetị.

    Ndị ọzọkwa bụ Mahadum Mewar dị na Nasarawa Steetị; Mahadum Edusoko dị na Niger Steetị; Mahadum Philomath dị n'Abuja; Mahadum Khadija dị na Jigawa Steetị; na Mahadum Anan dị na Plateau Steetị.

  7. Nkeji Coronavirus

    Akụkọ banyere coronavirus ka o si aga n'Afrịka taa

  8. Nkeji BBC Igbo

    Gere nchịkọta akụkọ ihe mere n'ụwa n'otu nkeji.

  9. Coronavirus egbuola onyeọrụ NYSC na Kano

    NYSC

    Ebe foto si, Twitter/NYSC

    Onyeisi ngalaba na-achịkọta ndị ji otu afọ efe ala Naịjirịa bụ Shuaibu Ibrahim akọwaala etu coronavirus si gbuo otu onye ọrụ ha na Kano.

    Akụkọ na-efesasị na soshal midia na-ekwu na nwoke ahụ nwụrụ n'ime ogige ndị NYSC, mana Ibrahim kwuru na nwoke ahụ abataghị n'ime ogige ha a kpọrọ "orientation camp".

    Ibrahim kwuru na oge nnyocha gosiri na nwoke ahụ bu nje coronavirus, e dopuru ya iche n'ụlọọgwụ iji nye ya ọgwụgwọ. Mana o mechara nwụọ.

    Shuaibu Ibrahim

    Ebe foto si, Twitter/NYSC

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị NYSC Shuaibu Ibrahim mekwara nnyocha tupu ọ banye n'ogige ha

    Ibrahim kwuru na onweghị onye ọbụla nwere nje coronavirus a ga-ekwe ka ọ bata n'ime ogige ha.

    "Mụ onwe m na ndị ọrụ m niile, anyị mechara nnyocha coronavirus tupu anyị abanye n'ogige 'orientation camp'", Ibrahim kwuru.

  10. Anyị anọọla na mahadum Imo Steetị afọ 11 - ụmụakwụkwọ ngalaba dọkịta

    Ụmụakwụkwọ dọkịta IMSU

    Ebe foto si, IMSU Medical Students

    Ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mahadum Imo Steetị etiela mkpu n'oke olu etu ha si nọọrọ n'ụlọ agụchaghị agụcha kamgbe afọ iri na otu gara aga.

    Nke a mere ha jiri mee ngaghari udo n'ụlọọgwụ 'Imo State University Teaching Hospital (IMSUTH)' iji kpọọ oku ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka ka ha nwee ike soro ibe ha pụta n'ụlọakwụkwọ.

    Otu n'ime ụmụakwụkwọ so mee ngagharị udo a gwara BBC Igbo na ihe ha ka ji nọọrọ n'ụlọakwụkwọ bụ n'ihi ọtụtụ abụbọ ọrụ ndị nkuzi ha na-agba kamgbe ha malitere ịgụ akwụkwọ.

    Ọ sị dịka ọ na-ekwu okwu ugbua na ndị nkuzi ha anaghị arụ ọrụ ugbua na-agbanyeghi na ụmụakwụkwọ ibe ha na-ele ule ugbua.

    ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, IMSU Medical Students

    Ọ sị na gọọmentị Imo Steetị akwụbeghi ụfọdụ ndị nkuzi ha ụgwọ kamgbe ọnwa Maachị afọ 2020 rute ugbua nke mere ha ji gbaa abụbụ ọrụ.

    Nwata akwụkwọ a sị na ọ nọọla afọ iri na otu kamgbe ọ batara mahadum Imo Steetị na ngalaba agụmaakwụkwọ dọkịta.

    Ọ sị na mgbe ha ruru n'ụlọọrụ onyeisi ụlọọgwụ mahadum Imo Steetị na ọ gwara ha ka ha nwee obere ndidi na ha ga-eme ka gọọmentị n'ụrụ mkpu akwa ha.

    Onyeisi ụlọọgwụ a mere ka ha mata na gọọmentị ga-agba mbọ ịhụ na a kwụrụ ndị nkuzi ha ụgwọ ka ha nwee ike laghachị n'ụlọakwụkwọ.

    Nwata akwụkwọ sị na arịrịọ ha bụ ka gọọmentị gbalịa kwụọ ndị nkuzi ụgwọ n'ime otu izuụka na-abịa abịa ka laghachị n'ụlọakwụkwọ soro ibe gụchaa akwụkwọ.

  11. Joe Biden enyela iwu ka ejikọọ ụmụaka ekewapụrụ ha na nne na nna ha n'oke Amerịka.

    Ndị na-achọ ịbata mba ọzọ

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden enyela iwu atọ nke ga-ahụ na ụmụaka ha na ezinụlọ anọghị na mba Amerịka maka iwu Donald Trump tinyere ga-enwe ohere ka ndị nke ha nọnyere ha n'Amerịka.

    Trump hiwere iwu ndị a iji gbochie ndị mmadụịbata mba Amerịka.

    Oge Trump nọ n'ọchịchị ha anaghị ekwe ka nne na nna na-enwezughị akwụkwọ njem soro ụmụ ha bata Amerịka.

    Iwu ọhụrụ a Biden wepụtara ga-ehiwe nzụkọ nke ga-ahụ na ụmụaka ruru narị asaa na nne na nna ha ga-anọkọta dịka ezinụlọ n'Amerịka.

    Dịka o siri dị, ụmụaka opekete mpe puku ise na narị ise ka ekewapụrụ ha na ndị okenye du ha n'oke mba Amerịka site n'afọ 2017 ruo 2018.

  12. 'Anyị ga-agbarịrị abụbụ ọrụ anyị kwadoro ịgba' - SSANU

    Ụmụ akwụkwọ mahadum

    Otu Senior Staff Association of Nigeria Universities (SSANU) na ndị otu ndị ọrụ na-abụghị ndị nkuzi na mahadum ekwuola na abụbụọrụ ha na-akwado ime site n'ụbọchị ise nke ọnwa a ga-agarịrị ihu.

    Iwe ha bụ na ha chọrọ ka e wepụ ndị otu ha n'okpuru Integrated Personnel Payroll Information (IPPIS) bụ atụmatụ gọọmentị wepụtara maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ.

    Ha kwuru na gọọmentị erubeghi isi na nkwekọrịta ha na ha nwere n'ọnwa Ọktoba afọ gara aga gbasara ya bụ IPPIS.

    Ọzọ bụ na ha chọrọ ka gọọmentị tinye anya na ṅogharị etu e si eke ego mahadum kpatara, n'etiti ndị nkuzi na ndị na-arụ ọrụ abụghị nkuzi.

  13. Gere akụkọ ụtụtụ taa n'otu nkeji

  14. Mmadụ 160 ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na anambra steeti

    Ọnụ ọgụgụ ndị butere ọrịa covid-19 na Naijirịa

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba NCDC edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ otu puku, narị isii na iri atọ na anọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ otu narị na iri isii n'ime ha si Anambra steeti, ebe mmadụ otu narị na iri atọ na anọ si Rivas steeti, otu narị na atọ si Abia ebe mmadụ iri asatọ na otu si Enugwu steeti.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosikwara na mmadụ isii ọzọ anwụọla sịte n'aka ya bụ ọrịa.

  15. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  16. Wolves apịwaala ndị Arsenal ọnụ ka ụdara nwa nnu

    Arsenal

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Arsenal dị mmadụ iri na otu malite asọmpi a mana mmadụ itoolu ka ha dị gbachaa ya.

    Otu egwu bọọlụ Wolves emeela ndị Arsenal echeta e bewe dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie ha n'abalị Tuzde.

    Arsenal takwutere ya kọnkịrị dịka Wolves kụrụ ha ihe ka ndị e jidere n'ohi.

    Mmadụ iri na otu ka Arsenal dị malite ya bụ asọmpi, mana mmadụ itoolu ka ha dị gbachaa ya.

    David Luiz na onye ochee goolu bụ Leno natara akwụkwọ mmeemmee.

    Pepe bu ụzọ nyetere ndị Arsenal gooolu mana Nevez na João Moutinho nyere goolu abụọ Wolves ji merie.

    Arsenal nọzị na ndị nke iri na tebulu EPL ugbua.

  17. Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  18. Tom Moore, dike kpara ike iji gbochie coronavirus, alaala mmụọ

    Tom Moore

    Ebe foto si, Getty Images

    Tom Moore, nwoke mba England gbara mbọ maka ịkwụsị mfesa ọrịa coronavirus, alaala mmụọ.

    Ọ gbara afọ otu narị n'oge ọnwụ ya.

    Cheta na akụkọ pụtara n'ụbọchị Sọnde, abalị iri atọ na otu nke ọnwa Jenụwari na Tom Moore ebutela nje coronavirus.

    Ezenwanyị Elizabeth so na ndị mbụ zigaara ezinụlọ Tom Moore ozi iti aka n'obi maka ọnwụ nna ha.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Aha Tom Moore malitere ịda oke ụda oge o jiri igwe ịntaneetị tụkọta ego karịrị nde paund iri atọ na atọ (33 million pounds) nke o nyere ngalaba ahụike mba England a kpọrọ 'National Health Service'.

    Moore gara ije karịrị ọtụtụ kilomita iji tụkọta ego a, ma tinyekwa aha ya n'akwụkwọ 'Guiness Book of Records'.

    Lee ihe ọtụtụ mmadụ kwuru maka Tom Moore:

    Praịm Mịnịsta Boris Johnson kwuru na Tom Moore bụ odogwu.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Prince Charles, di Ezenwaanyị Elizabeth kwuru na Tom Moore bụ ọkụ na-enwu n'ọchịchịrị

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  19. Ndị agha Naịjirịa agbaghaala ọnwụ nzuzo ndị agha Igbo isii

    Army

    Ebe foto si, Nigeria Army

    Ndị agha Naịjirịa agọrọla isi onwe ha gbasara akụkọ na-efegharị na ha ha gburu ndị agha isii bụ ndị Igbo na nzuzo.

    Akụkọ a nke na-efesa na soshal midia na-ekwu na ndị agha ahụ bi n'ogige ndịagha a na-akpọ 'Abacha Barracks' nke dị n'Abuja.

    Mana ndị agha Naịjirịa depụtara n’akara Twitter ha ma kwuo na akụkọ ahụ bụ “akụkọ ụgha”.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Ihe mere mpụ ji akawanye njọ na Naịjiria ugbua - Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, val Obienye

    Gọvanọ Peter Obi bụ aka chịburu Anambara steeti nakwa onye zọrọ ọkwa osote onyeisiala Naịjiria ekwuola na mpụ na nrụrụaka dị na Naịjiria na-akawanye njọ.

    Obi onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ụlọntaakụkọ Arise TV nwere n’ụtụtụ Tuzde, kwuru na ndị Naịjiria ekwesịghị iche ka ụlọọrụ nnyocha a kpọrọ Transparency International buru ụzọ kwuo na Naịjiria agbadaala n’ogogo mba ndị mpụ ka njọ n’ime ya, n’ihi na o zoghi ezo.

    Obi kwuru sị “Anyị ekwesịghị iche ka Transparency International bịa gwa anyị maka mpụ na nrụrụaka na ụbịam dị na Naịjiria, anyị ji anya anyị ahụ ya.”

    Cheta na Transparency International kwuru n’izu gara aga na Naịjiria si n’ogogo 146 daruo 149 n’ime mba 180 mpụ kacha enye nsogbu na ya. Obi gara n’ihu kwuo na ịdọpụta ndị mmadụ n’ụbịam maọbụ nyere ndị mmadụ aka, na a ga-akawa ahụ hụ na a kwụgoduru ha ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra 30 (N30,000) gọọmentị kwere na nkwa.

    O kwuru na ọ baghị uru gọọmentị ịkwụ ndị mmadụ naanị puku ise na-enweghi ebe ọ gara aga, na ebe o si ka njọ bụ ịkwụ ụgwọ a naanị ọnwa isii wee kwụsị.

    A jụrụ Obi etu Naịjiria ga-esinwu nyere ụmụakwụkwọ aka n’oge mkpamkpa ọrịa ozuruụwaọnụ Covid-19 a, o kwuru sị na ọ bụ teknụzụ ga-azọpụtanwu ụmụakwụkwọ. N’okwu ya “Ọnọdụ agụmakwụkwọ anyị jọgburu onwe ya.

    Ọ taghị oke akpụ, etu ahụ ka e si akuziri ọtụtụ ndị mmadụ akwụkwọ ugbua a na mbaụwa. Ọ bụrụ na gọọmentị nye ụmụakwụkwọ mahadum nde ise kọmputa nke Bekee kpọrọ ‘android tablet’ nke agafeghi dọla 80, nke ahụ pụtara ebe nde naịra 400 (N400m).

    Anyị ga-emenwukwara ya ndị sekọndịrị nde iri. Nke a ga-enyere aka ikwalite agụmakwụkwọ nakwa mee ka ha hapụ itufucha oge.”