You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Etu NDLEA si jichie 'Cocaine' ruru 30bn naira

Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru naira billion iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Chioma Obianinwa

  1. Ụlọikpe Uganda enyela iwu ka ndị soja si na be Bobi Wine pụọ

    Ụlọikpe na mba Yuganda enyela ndị agha mba ahụ iwu ka ha pụọ n’ogige ụlọ Bobi Wine, bụ onye so zọọ ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Ndị agha gbara ụlọ Bobi Wine okirikiri kamgbe e mechara ntuliaka ahụ n'ụbọchị iri na otu gara aga.

    Ngalaba nhazi ntuliaka nke mba Uganada kwuru na ọ bụ onyeisiala Yowore Museveni meriri ya bụ ntuliaka.

    Museveni achịala Yuganda kamgbe afọ iri atọ gara aga.

    Otu onyeisi ndị agha gwara BBC na ha ga-eme ihe ụlọikpe kwuru ka ha mee.

    Ọ bụrụ na Bobi Wine newere onwe ya, ọ ga-enwe abalị anọ iji gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka nke ọ na-ebo Onyeisiala Museveni na ya bụ nrụrụaka.

    Dịka iwu Uganda si dị, ụlọikpe ga-enwe abalị iri atọ iji kpechaa ya bụ ikpe ma ọ bụrụ na Wine gbaa ya bụ akwụkwọ.

  2. Ọ bụghị iwu na mmadụ niile bi na Legọs ga-agba ọgwụmgbochi Covid - Sanwo-Olu

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na ọbụghị iwu na ndị niile bi na Legọs ga-agbarịrị ọgwụ mgbochi Covid-19.

    Sanwo-Olu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Channels TV nwere n'abalị Sọnde.

    Ọ kọwara na ihe gọọmentị na-atụ anya bụ mmadụ pasentị iri ise maọbụ iri isii ndị bi ns steeti ahụ ịgba ya bụ ọgwụ.

    O kwuru sị: "Ọ bụrụ na pasentị iri ise maọbụ iri isii gbaa ọgwụ mgbochi a, anyị ga-enweta 'herd immunity' anyị tụrụ anya ya."

    Sanwo-Olu kọwakwara na ha na ụlọọrụ abụọ na-emepụta ọgwụmgbochi Covid na-enwe mkparịtaụka ugbua iji mara ole ha ga-azụta.

    Ụlọọrụ abụọ a bụ ndị Pfizer na ndị Moderna.

    O kwukwara na ọtụtụ ndị nkịtị ọnụ na-eru n'okwu na Legọs steeti ga-enyere gọọmentị aka ịzụta ọgwụmgbochi a n'ihi na ha dara oke ọnụ ahịa.

  3. Mmadụ 964 butere nje coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa

    Ngụkọ nke ngalaba 'National Centre for Disease Control' gosiri na ọ bụe mmadụ narị itoolu na iri isii na anọ bụtere nje coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa.

    Nke a wetara ọnụọgụgụ ndị niile buterela nje Covid-19 kamgbe ọ batara na Naịjirịa ka ọ bụrụ puku iri itoolu na asaa, narị abụọ na iri abụọ na asatọ.

    Lee etu ha sị gụpụta ya na steeti dị icheiche"

  4. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Ọfọ ogologo ndụ na ahụ isi ike ka anyị na-agọrọ ụmụ Igbo niile dịka anyị na-amalite izuụka ọhụrụ a.

    Nke onye na-eme dị mma, ya gaziere ya.

    Ka anyị gbapụ ya ọsọ na mgbasa ozi nke taa, ndewo maka isonyere anyị.