You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Etu NDLEA si jichie 'Cocaine' ruru 30bn naira

Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru naira billion iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Chioma Obianinwa

  1. Ndị omeiwu Naịjirịa agbajọọla atụmatụ mmepụta ọgwụmgbochi Covid-19

    Ndị omeiwu Naịjirịa agwala mịnịstrị ahụike ka ha kwụsị atụmatụ ịrụpụta ọgwụ mgbochi covid-19 bụ nke gọọmentị kwuru na ha wepụtara ijeri naịra iri maka ya.

    Ha kwuru na nkọwa Mịnịsta ahụike bụ Osagie Ehanire nyere ha maka ya bụ atụmatụ ejughị ha afọ.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Channels si kwuo, nke a mere n'ọgbakọ e nwere n'Abụja n'ụbọchị Wenezde, n'etiti ndị isi ngalaba ahụike nakwa kọmiti na-ahụ maka okwu ahụike n'ụlọ omeiwu ukwu na nke nta.

    N'ọgbakọ ahụ, Ehanire kọwara na gọọmentị etiti na ụlọọrụ May and Baker PLC enweela nkwekọrịta maka ịrụpụta ya bụ ọgwụ.

    Mana Ibrahim Oloriegbe, onyeisi kọmiti ndị Sineti na-ahụ maka ahụike, kwuru na nkọwa Ehanire erijughị afọ.

    Oloriegbe gwara Ehanire sị: "I nyebeghị nkọwa doro anya etu ụnụ ga-esi were ijeri naịra iri a mepụta ihe, ya mere anyị ji kpebie na ị gaghị enwe ike imetụ ego ahụ aka ugbua."

    "Oge ọ bụla i nyere anyị nkọwa doro anya, anyị ga-akpọ ndị niile okwu a gbasara ka ha bịa tinye ya ọnụ."

  2. Odion Ighalo efeerela ndị Manchester United aka

    Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Odion Ighalo efeerela ndị Manchester United aka dịka ọ hapụrụ otu egwuregwu ahụ.

    Ighalo kwupụtara nke a n'akara soshal midia ya, ma kwukwaa na obi dị ya ụtọ na o mezuru nrọ ya nke bụ ịgbara ndị Man U bọọlụ.

  3. Ị nụla akụkọ ndị na-ewu ewu taa? Jiri naanị otu nkeji gere ha niile

  4. Ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ, ejikwala ịma mmadụ arụ ọrụ - Gọvanọ Wike

    Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike adọọla ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ aka na ntị ka ha gbanahụ iji ịma mmadụ so ihe gbasara nchekwa Naịjiria.

    O kwuru sị na ọ dị mma na onyeisiala emechaala gee oku ndị mmadụ kpọrọ ka e weta ndị ọhụrụ, ma kwuo ka ha gbaa mbọ ghara ị na-agba egwu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akụ.

  5. Gọvanọ Benue steeti ebutela Covid-19

    Gọvanọ na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom ebutela Covid-19.

    N'ozi Terver Akase bụ ọnụ na-ekwuchitere ya ziputere n'ụbọchị wenezde, o kwuru na Gọvanọ Ortom butere ya bụ ọrịa ka otu onye ya na ya na-arụkọ ọrụ butere ya n'ime izu ole gara aga.

    O kwuru na n'agbanyeghi na ọrịa ahụ egosiwebeghi n'ahụ gọvanọ, na ọ natawala ọgwụgwọ.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo ka ndị ha na gọvanọ nwere mmekọ gbaa mbọ mee nnyocha ịma ma ha ebu ya bụ ọrịa.

    Gọvanọ Ortom jikwa otu aka ahụ na-agwa ndị steeti ya ka ha na-eyi mkpuchi imi, na-akwọ aka nakwa na-anọsapụ anọsapụ ma gharakwa ịtụ ụjọ ime nnyocha maka ọrịa a.

  6. Ernest Asuzu alaala mmụọ

    Onye ejije Nollywood a ma dịka Ernest Asuzu anwụọla.

    Emeka Rollas bụ onyeisi ngalaba jikọrọ ndị na-eme ejije na Nollywood, gwara BBC Igbo na ọ kubiri daa ma ghara ibilite ọzọ.

    O kwuru na e buru ya gawa ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ tupu a garuo ụlọọgwụ.

    Rollas kwuru na ọ nọ na-arịabu ọrịa, mana ọ gbakere tupu ọdachi a emee.

    Akụkọ ka na-abịa

  7. Etu e si họpụta ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ na Naịjịrịa - Adesina

    Femi Adesina bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na nhọpụta ndị isi ọrụ nchekwa abụghị site n’ebe onye si, agbụrụ maọbụ okpukperechi onye kama na ọ bụ site na ntozu onye.

    Adesina kwuru nke a mgbe ọ na-azakọrọ ajụjụ gbasara kepu kepu ndị mmadụ na-ekwu maka nwebata ịma mmadụ so nhọpụta ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa.

    O kwuru na o nwere ụfọdụ nhọpụta ọrụ gọọmenti etiti a na-esite n’ebe onye si , agbụrụ maọbụ okpukperechi eme mana ọ bụghị maka ọrụ nchekwa.

    Okwu Adesina na-abịa dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari wepụrụ ndị isi ọrụ nchekwa nọbunu ma tinye ndị ọhurụ.

    Adesina kwuru na ọ bụghị maka etu ụmụ Naịjiria si akpọ oku ka a gbanwee ndị isi ọrụ nchekwa mere ka Buhari wepụ ha, kama na onyeisiala mere ya n’oge o chere dị mma.

    Cheta na Major-General Leo Irabor nọchịrị anya General Abayomi Olonisakin dịka Chief of Defence Staff; Air Vice Marshal Isiaka Oladayo Amao nọchịrị anya Air Marshal Sadique Abubakar dịka Chief of Air Staff; Rear Admiral Awwal Zubairu Gambo nọchịrị anya Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas dịka Chief of Naval Staff; ebe General Ibrahim Attahiru nọchịrị anya Lieutenant General Tukur Yusuf Buratai dịka Chief of Army Staff.

  8. Jiri otu nkeji gere akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa

  9. Mmadụ 1,303 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjiria

    Mmadụ otu puku na narị atọ na atọ ka a chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ ha na Naịjiria dịka ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC si kwuo.

    A chọtara ya bụ ọrịa n’ahụ mmadụ iri na asaa n’Ebọnyi steti, ebe mmadụ narị anọ na iri asaa na asatọ ọhụrụ butere ya na Legọs.

    Mmadụ iri na ise ọzọ anwụkwuola site n’ọrịa coronavirus na Naịjiria dịka ngalaba NCDC si kwuo.

    Ka ọ dị ugbua, ọrịa a ataala isi mmadụ otu puku na narị ise na iri abụọ na abụọ.

  10. Ị bọọla chi?

    Ị rahụkwara nke ọma n'abalị?

    Nọnyere anyị taa dịka anyị ga-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị na akụkọ ndị ị kwesịrị ịma maka ya.

    Nnọọ!

  11. Ka chi fonu!

    Igbo tụrụ ilu si na "ọ bịara ije nwe ụla"!

    Ije anyị na unu abịala na njedebe taa, ka nayị malitekwa echi.

    Yagazie.

  12. Gee ka Coronavirus si kwuru n'Afrịka taa

  13. Na Akpọtụ Ugbu A, Onyeisiala Muhammadu Buhari agbaanwela ndị isi ọrụ nchekwa niile

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na onyeisiala Muhammadu Buhari agbanweela ndị isi ọrụ nchekwa niile.

    Nke a metụtara ndị agha, ndị agha elu nakwa ndị agha mmiri.

    Ndị ọhụrụ ahụ bụ ọchịagha Leo Irabor, Ọchịagha I Attahiru, Ọchịagha AZ Gambo nakwa Ọchịagha I.O Amao

  14. Amachiela ịchị ehi akpagharị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ

    Ndị Gọvanọ steeti niile dị n’Ọdịda Anyanwụ amachiela ịchị ehi akpagharị na bụ nke bekee kpọrọ ‘open grazing’ ya na iji abalị achịgharị ehi bụ nke a kpọrọ nịght grazing, na mpaghara ahụ niile.

    Nke a bụ nkwekọrịta ha nwere n’ọgbakọ ha na ndị Miyetti Allah nwere n’Akure n’ụbọchị Mọnde.

    N'ọgbakọ ahụ, ndị gọvanọ ahụ kwukwara na onweghị onye na-achụpụ ndị ọchịehi na steeti ọbụla na Naịjirịa, kama na ihe gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu kwuru bụ ka ha si n'ime ọhịa gọọmentị nwe pụọ.

    Mkpebi ndị ọzọ bụ:

    • Miyetti Allah ga-akwado atụmatụ ọbụla ga-eme ka udo chịa
    • Miyetti Allah ga-agbaso atụmatụ ọgbara ọhụrụ e ji azụ ehi dịka itinye ha n'ime ụlọ a kpọrọ 'ranch' nakwa ebe pụrụ iche a na-achịgharị ehi nke a kpọrọ 'grazing reserves'.
    • A ga-ehibe kọmiti gọọmentị, ndị ọrụ ugbo nakwa ndị ọchịehi na steeti niile, ndị ga-ahụ na etinyere ihe niile e kpebiri n'ọrụ.
    • A ga-akwụsị ụmụaka ịchịgharị ehi iji gbochie nsogbu
  15. Onye Eze Jesus, anya ga-ahụ gị ịwa - Gọọmentị Anambra

    Gọọmentị Anambra steeti agbarụọla ihu maka otu nwoke kpọrọ onwe ya onye ụkọchukwu a na-akpọ Onye Eze Jesus, bụ onye na-akpọrọ ndị ntorobịa a ga-asa ahụ ma na-achụ aja na mmiri iji baa ọgaranya.

    Don Adinụba bụ Kọmishọna mgbasa ozi n’Anambra kwuru na gọọmentị amalitela inyocha mkpesa niile ndị mmadụ wetara gbasara nwa amadi a iji taa ya ahụhụ n’ebe ọbụla ọ dara iwu.

    Adinuba kwara arịrị etu omume onye ụkọchukwu a si ebutere Anambra steeti aha ọjọọ n'ụwa niile nakwa etu o si eduhie ndị ntorobịa ụzọ.

    O kwuru sị: "Onyeze Jesus na-akwalite akpọmasị nakwa ọgbaaghara n'obodo, site n'ịgwa ndị na-eso ya na ọ bụ ndị ezinụlọ ha kpatara ha ji daa ụbịam."

    "Ụdị ihe a nwere ike ịkpata ekworo, iwe, iro na asị, ọgụ na mgba, mmerụ ahụ nakwa ọnwụ."

    Adinuba katọkwara etu Onyeze Jesus si efesasị ego Naịjirịa n'ime mmiri oge ọ na-achụrụ ndị otu ya aja, ma kwuo na imebi naịra bụ ihe megidere iwu nke ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria'.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ịmanye ndị mmadụ ka ha gbara ọtọ na-asa ahụ na mmiri, bịakwa na-ese ha n'onyonyo, megidere iwu Naịjirịa bịakwa bụrụ ihe a ga-eji taa ụkọchukwu ahụ ahụhụ ma ọ bụrụ na e mechaa nnyocha.

    "Ndị Anambra bụ ndị e ji ịgba mbọ, agụmakwụkwọ, ịdị uchu n'ọrụ nakwa ịkwụba aka ọtọ wee mara. Ha abụghị ndị na-akpa ego n'ụzọ ọ chaa acha gbute, ọ chaghị acha gbute," Adinuba na-ekwu.

    "Gọọmentị agaghị agbachi nkịtị ka otu onye na-emechu Anambra steeti ihu ma na-emebikwu iwu anyị."

    "Anyị amalitela ileba okwu a anya, anyị ga-emekwa ihe maka ya n'oge adịghị anya."

    Mana ụkọchukwu Onyeze Jesus wepụtakwara onyonyo ebe ọ rịọrọ gọọmentị nakwa ndị mmadụ mgbaghara maka ebubo e boro ya.

  16. Ka chi fo!

    Ndewonu n'isonyere anyị taa.

    Maka akụkọ gbasara Orlu, Ebonyi steeti nakwa ebe ndị ọzọ, soronu anyị malite n'ụzụ ụtụtụ echi.

    Ka chi bọọrọ unu!

  17. Akụkọ ndị dị mkpa taa

  18. Frank Lampard: Ọ bụ Thomas Tuchel ga-anọchi Lampard?

    Ọ bụzighị akụkọ ọhụrụ na otu Chelsea chụrụ Frank Lampard n'ọrụ dịka onye nkụzi ha maka ọnyụpa ha na-agwọrị n'ime ya na nsonso a.

    Mana kepukepu na-ekwu na ọ bụ Thomas Tuchel, bụ onye kuziiri otu PSG na Dortmund n'oge gara aga, ga-anochi anya Lampard na Chelsea.

    N'aka nke ọzọ, ụfọdụ na-ekwukwa na Max Allegro maọbụ onye gbagburu Chelsea bọọlụ bu Andriy Shevchenko sokwa na ndị a na-ele anya nwereike ịnochi Lampard.

    Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nke a

    Yahya amalitelarị ịnabata Tuchel

    Mana @chubei na-ekwu na onweghị ihe Tuchel ji kara Lampard mma:

    Kenna kwuru na ya agaghị atụkwasị Tuchel obi ganye mgbe o gosiri ihe o nwere ike imenwu:

  19. Onweghị onye ga-achụpụ ụnụ - Ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ gwara ndị ọchịehi

    Ndị gọvanọ steeti isii dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ agwala ndị ọchịehi nọ na mpaghara ahụ na onweghị onye ga-achụpụ ha.

    Kayode Fayemi bụ onyeisi otu jikọrọ ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ, kwuru nke a oge ha na ndị otu Miyetti Allah nwechara ọgbakọ n'Akure n'ụbọchị Mọnde.

    Gọvanọ Jigawa nakwa Kebbi steeti sonyekwara n'ọgbakọ ahụ ebe a nọrọ kpebie ka onye ọbụla tinye mma ya n'ọbọ.

    N'ọgbakọ ahụ, onyeisi otu ndị Miyetti Allah bụ Baba Uthman kwuru na ndị otu ha sokwa ata ahụhụ n'aka ndị ekperima.

    O kwuru na e gbuola ndị isi otu ha na steeti Kogi nakwa Niger.

    Uthman gara n'ihu rịọ ka onye ọbụla ghara iweghara iwu n'aka onwe ya, kama ka ha nye ohere ka ndị ọ dị n'aka mezie esemokwu niile.

    Ụfọdụ mkpebi ekwekọrịtara n'ọgbakọ ahụ gụnyere:

    • Ndị ọchịehi ga na-erube isi n'ihe gọọmentị kwuru nakwa n'okwu ndị ọrụ nchekwa.
    • Ndị ọchịehi ga-akwụsị ịbanye n'ubi ndị mmadụ
    • Iji abalị achị ehi ga-akwụsị kpamkpam.
    • Agaghịzi ahapụ ụmụntakịrị ka ha na-achịgharị ehi.
  20. Chelsea ewerela azịza zapụ Frank Lampard

    Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea enyela onye nkuzi ha bụ Frank Lampard ọsọ ụkwụ eru ala.

    N'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Mọnde, ha kwuru na ọ dịghịrị ha mfe ikpebi na ha ga-achụ Lampard.

    Nke a na-abịa dịka Lampard na Chelsea gbarala ọtụtụ ọnyụpa n'asọmpi dị icheiche n'ọdị nso a.

    Ka ọ dị ugbua, Chelsea nọ n'ọkwa nke itoolu na tebulu 'English Premier League'.

    N'ime asọmpi asatọ gara aga ha gbara, naanị abụọ ka ha meriri.

    Cheta na Lampard gbara bọọlụ ọtụtụ afọ na Chelsea, ma bụrụkwa onye kacha nye goolu n'otu egwuregwu bọọlụ ahụ ruo taa.

    Onye nwe Chelsea bụ Roman Abramovich kwuru na ya na Lampard ka dịkwa n'ezigbo mma n'agbanyeghị ihe a merenụ.