Ndị omeiwu Naịjirịa agbajọọla atụmatụ mmepụta ọgwụmgbochi Covid-19
Ndị omeiwu Naịjirịa agwala mịnịstrị ahụike ka ha kwụsị atụmatụ ịrụpụta ọgwụ mgbochi covid-19 bụ nke gọọmentị kwuru na ha wepụtara ijeri naịra iri maka ya.
Ha kwuru na nkọwa Mịnịsta ahụike bụ Osagie Ehanire nyere ha maka ya bụ atụmatụ ejughị ha afọ.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Channels si kwuo, nke a mere n'ọgbakọ e nwere n'Abụja n'ụbọchị Wenezde, n'etiti ndị isi ngalaba ahụike nakwa kọmiti na-ahụ maka okwu ahụike n'ụlọ omeiwu ukwu na nke nta.
N'ọgbakọ ahụ, Ehanire kọwara na gọọmentị etiti na ụlọọrụ May and Baker PLC enweela nkwekọrịta maka ịrụpụta ya bụ ọgwụ.
Mana Ibrahim Oloriegbe, onyeisi kọmiti ndị Sineti na-ahụ maka ahụike, kwuru na nkọwa Ehanire erijughị afọ.
Oloriegbe gwara Ehanire sị: "I nyebeghị nkọwa doro anya etu ụnụ ga-esi were ijeri naịra iri a mepụta ihe, ya mere anyị ji kpebie na ị gaghị enwe ike imetụ ego ahụ aka ugbua."
"Oge ọ bụla i nyere anyị nkọwa doro anya, anyị ga-akpọ ndị niile okwu a gbasara ka ha bịa tinye ya ọnụ."