Gọọmentị Anambra adọọla ụlọọgwụ nakwa ụlọ ozu dị icheiche na steeti ahụ aka na ntị ka ha na otu nwoke kpọrọ onwe ya onye ụkọchukwu aha ya bụ Onyeze Jesus ghara ịmekọ ihe ọbụla.
Ha dọrọ aka na ntị a dịka Onyeze Jesusu kwuru na ya ga-akpọlite mmadụ asaa nwụrụ anwụ n'ọnwụ n'ụbochị Tọzde, abali iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Onyonyo ebe ya bụ ụkọchukwu na-etu ọnụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ agbasaala ebe niile na soshal midia.
Mana gọọmentị Anambra adọọla aka na ntị ka onye ọbụla zeere ya bụ nwa amadị.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Mazi Nwankwo Nwabueze, onye ji ọkwa 'Permanent Secretary' na ngalaba ahụike Anambra, gọọmentị kwuru na ụlọọgwụ ọbụla maọbụ ụlọ ozu ọbụla ha na Onyeze Jesus mekọrọ ihe, ga-anata ntaramahụhụ.
Nwabueze kwuru sị: "Ndụ na ahụike ndị Anambra bụ ihe kacha anyị mkpa n'oge ugbua."
"Dịka ọrịa coronavirus na-efegharị, ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ nwereike inwe ya bụ nje mana ha agaghị nnyocha tupu ha anwụọ."
"Ọ bụrụ na mmadụ metụ ozu dị otu a ahụ, nje coronavirus nwere ike ife onye ahụ. Nke a ka anyị achọghị."
Nwabueze gara n'ihu kwuo na Onyeze Jesus bụ onye "magic", nke na-aghọgbu ndị mmadụ ma na-anakọrọ ha ego.
"Gọọmentị Anambra agaghị ekwe ka e were ụlọọgwụ na ụlọ ozu dị na steeti a were mee ihe ezighi ezi n'iwu," Nwankwo Nwabueze kwuru.