Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi Novavax dị ire iji gbochie coronavirus ruo pasentị 89.
Ọgwụmgbochi a bụ Novavax dịkwa ire iji gbochie ụdị nje coronavirus a chọpụtara na ọhụrụ na UK.
E nyochakwara ọgwụmgbochi Novavax na mba South Afrịka, ebe mpụtara ya gosiri na ọ dị ire ruo pasentị iri isii (60%) iji gbochie ụdị nje coronavirus ọhụrụ a chọpụtara na mba ahụ
Praịm Mịnịsta UK bụ Boris Johnson kwuru na nke a bụ nnukwu oziọma ma kwukwaa na ngalaba ahụike mba ahụ ga-amalite nnyocha nke ha maka ya bụ ọgwụmgbochi.
Mba UK enwetalarị ihe ruru nde iri isii maka ọgwụ ahụ bụ nke a ga-arụpụta n'obodo Stockton-on-Tees na mba England.
Ọ bụrụ na ngalaba ahụike a kpọrọ 'Medicines and Healthcare Products Regulatory Agency' (MHRA) kwadoo ọgwụmgbochi a, a ga-amalite ịgba ya ndị mmadụ n'agba nke abụọ afọ 2021.
Ugbua, mba UK akwadola ọgwụmgbochi atọ maka iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus, ha gụnyere: nke ndị ụlọakwụkwọ Oxford University na ụlọọrụ Astrazeneca rụpụtara, nke ụlọọrụ Pfizer na BioNTech rụpụtara, na nke ụlọọrụ Moderna rụpụtara.