Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Igbo ndị ọma unu asaala chi?, Che! Che! Che! Igbo mmamma nụ oooo
Anyị ji ohere ọma a na-anabata unu na ngwụcha izuụka a.
Na-asị na ọnya ndị iro agaghị ama unu n'ụbọchị taa
Soro anyị maka akụkọ ọbụla gbasara coronavirus na Naịjirịa nakwa mba ụwa gbaa gburugburu.
Strange illness: O nweghị onye kwetara na ihe na-aria ya- Anambara Gọọmenti
Ebe foto si, Vincent Okpala
Dịka akụkọ na ọrịa amaghị ebe o si na-arịa ụfọdụ ndị mmadụ n'Onịcha, Anambara steeti,Komishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dkta Vincent Okpala ekwuola nchọpụta ha mere gosiri na akụkọ ahụ abụghị eziokwu.
Akụkọ na-ewu na social midia na-ekwu na ọtụtụ mmadụ bi na Ọnịcha kwuru na ha na-arịa ịba ekweghị ọgwụgwọ nke mere na ha anaghịkwa anụzi isi ihe maọbụ ụtọ nri.
Mana Dkta Okpala sịrị na O kwuru na ndị a kpọrọ ka a natara ozi ahụ sị na ọ bụghị ha.
,"Anyị kpọrọ ndị kwuru ya, o nweghị onye kwuru na o mere ya."
O kwuru na Anambara nwere ndị ọrụ ahụike ọ bụ ọrụ ha inyocha mpaghara ọbụla na steeti ahụ iji hụ nke na-eme mana "O nwebeghị onye anyị hụrụ nwere ụdị ihe a ahụ."
Ọ rịorọ ka onye ọ bụla na-arịa anụghị isi, anụghị ụtọ nri nakwa ịba anataghị ọgwụ kpọtụrụ ụlọọrụ ahụike gọọmenti sị, "Ugbua abụghị oge onye ọbụla nwere ahụọkụ ọ kpọọ ya ịba nke anwụnta."
O nwere ka o si eme gị maọbụ onye agbataobi gị , kpọọ akara ekwenti gbagbata nke steeti na : 09034728047, 09034668319, 08163594310, 09034663273, +2348145434416, +2348117567363
Whatsapp- 09033805959
SMS - 09074285546.
Onyeisiala Mba Yuganda edopụla onwe ya iche maka coronavirus
Onyeisiala mba Uganda bụ Ruhakana Rugundu edowela onwe ya n'ọnọdụ ndopụ iche maka ọrịa coronavirus dịka ụfọdụ ndị ha na ya nwere mmekọ bu ya bụ ọrịa.
Dịka ọ dị ugbu a, a ga-eme ndị Minisịta Yuganda niile nyocha maka ọrịa coronavirus.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Coronavirus alaala na Fiji kpam kpam!
Mba Fiji enwerela onwe ya n'aka ọrịa Coronavirus dịka onye ikpeazụ bu ya gbakerechara.
Praịm Minista obere mba ahụ dị n'etiti oshimiri Pacific bụ Frank Bainimarama kwuru na ọ bụ ịgba mbọ, ekpere nakwa sayensị bụ ihe ndị nyere ha aka rue ebe a.
Cheta na a chọtara onye mbụ bu ọrịa coronavirus na mba ahụ n'ọnwa Maachi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Akagbuola mmemme "Fuji Rock" na Japan
Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-ahazi mmemme akpọrọ Fuji Rock na mba Japan
akagbuola ya n’ihi ọrịa Coronavirus.
Ha rịọrọ ndị mmadụ mgbaghara ma kwuo na ha chere na ọrịa
ahụ ga-akwụsịlata tupu ọnwa Ọgọst ehiwere ya bụ mmemme a bịa.
Ha kwukwara na ha ga-ahụ na mmemme ahụ bịara na mmezu n'oge akara aka n'afọ 2021.
'Onye na-eyighi mkpuchiime ya ga-akwụ N10,000' - Gọọmentị Anambra steeti
Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano etinyela aka n'akwụkwọ nke wepụtara iwu sị na onye a hụrụ n'ezi na eyighị mkpuchiimi ya ga-akwụ puku naira iri maọbụ rụọrụ gọọmentị ọrụ awa ole na ole.
Obiano kọwara na iwu a bụ maka ichekwa ndị Anambra steeti maka ọrịa coronavirus na ọrịa ndị ọzọ.
Ebe foto si, Chief Willie Obiano/Facebook
Mmadụ narị atọ na iri ise ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa
Ọzọ emena, ọzọ a ma mee.
Nke a bụ eziokwu dịka mmadụ narị atọ na iri isii ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Legọs kacha n'ọnụ ọgụgụ dịka mmadụ otu narị na abụọ ebutela ya na steeti ahụ.
Ebonyi nwere mmadụ iri na asaa ọzọ, Rivas mmadụ iri abụọ na otu, Delta bụ mmadụ iri ebe mmaadụ asatọ ọzọ butere ya n'imo steeti.
Ụgbụ a, ọnụọgụgụ ndị bu ya na Naijirịa bụ puku iri na otu na narị ise na iri atọ na ise.
Ebe mmadụ puku atọ na narị ise na iri atọ na ise enwerela onwe ha kama mmadụ narị atọ na iri abụọ na atọ alaala mụọ.
Ebe foto si, NCDC
Kedụ etu ọrụ gị si ghere oghe nye coronavirus?
Ụtụtu ọma ụmụ Igbo
Unu asaala chị, taa ị ga emuke ka anywanwụ.
Soro anyị ka ị mara ihe ekwu na-akụ taa
Ebe foto si, Getty Images
Ọnụọgụ ndị metọrọ ụmụaka n'oge mmachi obodo rịrịelu na Kenya
Ebe foto si, European Photopress Agency
N’Afrịka, nkịta ata ọkpụkpụ a nyawara ya n’olụ na mba Ethiopia.
Dịka ministrị na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyi siri kwuo, mwakpo ụmụaka n’ime ọnwa abụọ a nọrọ na mmachi obodo na mba ahụe ruola otu narị na otu.
Gọọmenti Ebonyi steeti agbachiela ụlọọrụ maka coronavirus
Gọọmenti Ebonyi agbachiela ụlọọrụ gọọmenti
niile dị na steeti ahụ dịka ụfọdụ ndị ọrụ
so na ndị butere ọrịa coronavirus ọhụrụ na steeti ahụ.
N'okwu ya, Kọmishọna mgbasa ozi bụ Uchenna Orji kwuru na Gọvano Umahi nyere iwu ka ndị ọrụ oyibo niile, ọkachasị ndị Ministri okwu ego dị n'aka, onye ọbụla sị n'ụlọrụ kwara pụọ maka egwu nje coronavirus. Ọ gwakwara onye ọbụla n'ime ha gaa nyocha coronavirus n'ime abalị asaa.
Gọvanọ e nyeghị aha onye ọrụ ya bụtere ya bụ nje mana ọ sị na ya bụ okwu dị egwu.
Nke a pụtara na ụlọọrụ niile ga-emechi ruo ụbọchị iri nke ọnwa Juun sị n'ụlọ na-arụ ọrụ rụọ mgbe ahụ.
N'aka ọzọ ndị omekome atọrọla otu nwoke onye Chaịna
ebe ha na-arụ ọrụ n’ọhịa n’Isiagu, Ebonyi steeti.
Ebe foto si, Ebonyi state press centre
Briten enyela iwu na onye ọbụla ga-eyi 'face mask' n'ụgbọala maọbụ ụgbọoloko
Mba Briten enyela ntuziaka na malite n'abalị iri na ise nke ọnwa Juun, ọnye ọbụla ga-aba ụgbọala, ụgbọelu maọbụ ụgbọoloko ka eyi akwa mkpuchi imi.
A gaghị enye ndị eyighị mkpuchi imi ohere ịbanye ụgbọ maọbụ a gwa ha rituo maọbụ a daa gị nha.
Odeakwụkwọ maka njem bụ Grant Shapps bụ onye mara ọkwa ahụ oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Tọzde.
O kwuru sị, "Bido na Monde Mee 15,mkpuchi imi ga-abụ iwu n'ụgbọ njem ọha niile."
“Ihe akaebe na-egosi na iyi mkpuchi imi na-enyetụ nchekwa.
"E nwere ike igbochi gị ime njem ma ọbụrụ na iyighị ya maọbụ ada gị nha."
Ebe foto si, EPA
Coronavirus: Goodluck Jonathan ebunyela Anambara steeti ihe mgbadoume
Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan ebunyela Anambara steeti ihe mgbadoume maka inyere ndị o nweghị ka ọ ha ha aka n'oge coronavirus.
Dịka odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Solo Chukwulobelu si kwuo, o bunyere ha akpa osikapa, agwa na akpa ọka.
Chukwulobelu kelere Jonathan maka obiọma ya na ịgbatara ndị Anambara ọsọ enyemaka oge ọ dị na mkpa.
Gọvanọ Legọs Steeti bụ Jide Sanwo-Olu enyela ntuzaiaka ka ndị ụka na ndị ụlọaka Alakụba bidokwa okpukpere ha.
Ndị Alakụba ga-ebido n'abalị iri na Itoolu nke ọnwa Juun(June 19), ebe ndị ụka Kraistị ga-amalite n' abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun(June 21).
N'ozi ọ gbasara n'ehihie Tọzde, Sanwo-Olu nyere iwu n'ọgbaka ahụ nke nwata ọbụla erụghị afọ iri na ise agaghị esonye, ga-abụ naanị ụbọchị Fraide maka ndị ụka Alakụba nakwa ụbọchị Ụka maka ndị otu ụka Kraisti.
Ebe foto si, @Jidesanwoolu
Nkọwa foto, Jide Sanwo-Olu bụ Gọvanọ Legọs steeti
A wakporo ihe ruru ụmụnwaanyị 100 n'Ethiopia oge mmachi covid-19
Ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Walta Tv nke dị na mba Ethiopia ekwuola na awakporo ihe rụrụ ụmụnwaanyị otu nari n'isi obodo Addis Ababa.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ụmuaka nke Addis Ababa bụ Almaz Abraham kwuru na mwakpo ụmụnwaanyị na-akanwanye njọ dịka emechiri ụloakwụkwọ maka ọrịa coronavirus.
O kwukwara sị " ụmụnwoke na-apụ ma ha chọwa ịkpa agwa dị njọ na-akpasozị ụmụ ha no n'ụlọ agwa ọjọọ ndị a".
Ndị ọrụ Gọọmenti Ebonyi nọ na gbagharịa dịka a gbachiri ụlọọrụ ha n'ihi Covid-19
Ebe foto si, David Umahi/Facebook
Egwu na obi mmapụ ejidela ụfọdụ ndị mmadụ nọ n'ọrụ gọọmenti Ebonyi dịka nnyocha e mere na nsonso gosiri na ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti so na ndị butere ọrịa coronavirus.
Otu onye ntaakụkọ Eno n'Ebonyi steeti achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na, "Onye ọ bụla na-atụ egwu ugbua. Amaghị onye ya na ndị a nwerela mmekọrịta."
Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ bu ya na steeti gbalite rue 75.
Dịka Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Uchenna Orji si kwuo, iji chọta ndị niile ndị a butere ya bụ ọrịa metụtarala ahụ, gọọmenti enyela iwu ha e mechie ụlọọrụ gọọmenti niile otu izụka bido na taa bụ ụbọchị Tọzde.
Orji sị n'akwụkwọ ozi o wepụtara na , " Ndị ọrụ oyibo ga-esi n'ụlọ ha na-arụzị mana ha ga-agbape ekwenti ha maka e nwee ozi dị mkpa gbasara ọrụ."
O nyekwara ntuziaka ha ndị imeobi gọọmenti na ndị ọrụ niile ọkachasị ndị nọ na mịnịstri na0-ahụ maka ego na bọjet ga-mee nnyocha ahụ maka Covid-19 tupu otu izuụka agwụ.
Ebe foto si, Ebonyi Government
Nkọwa foto, Uchenna Orji bụ kọmishona mgbasaozi Ebonyi steeti
"Covid-19 amụtala ụmụ itoolu ọzọ" - Ndị nnyocha Kenya
Dịka ndị nnyocha na mba Kenya na-eme nyocha iji mata etu nje covi-19 sị amụbanye, ha chọpụtara na nje na-ebute ọrịa coronavirus enwetala ụmụ itolu ọzọ.
Kama ha kwuru na nje itolu ndị a adịghị iche na nke zuru ụwa niile ọnụ.
Dịka nke a na-eme ka ndị mba Kenya nwere mmadụ puku isii eweere ihe eji eme nnyocha n'ahụ ha kama ha amatabeghị ma ha ebu ọrịa coronavirus n'ihi na gọọmentị enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha.
Ebe foto si, Getty Images
Gịnị na-ewu n'ụwa niile?
George Floyd bu Coronavirus tupu ọ nwụọ
Nyocha Hennepin County wepụtara gosiri na George Floyd butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị atọ nke ọnwa Aprel.
Ha kọwara na ọrịa a nwereike ị nọ n'ahụ mmadụ ọtụtụ izuụka ma onye ahụ agaghị ama.
Dọkịta soro mee nyocha ahụ George Floyd bụ Michael Baden gwara ndị ntaakụkọ New York times na ọ dị mkpa ka onye ọbụla ya na George Floyd nwere mmekọ gaa chekwa onwe ha.