Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ 63 anwụọla n'aka coronavirus na Saụt Afrịka n'otu ụbọchị

    Saụt Afrịka akwaala arịrị taa bụ Fraịde dịka coronavirus napụrụ ha ndụ mmadụ iri isii na atọ (63) n'otu ụbọchị bụ nke wetere ọnụọgụ ndị nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa otu puku narị asaa na iri atọ na asaaa (1,737).

    Ndị butegoro nje ọrịa ahụ na ebe ahụ bụ mmadụ dị puku iri asatọ na atọ, narị asatọ na iri itoolu.

    Ndị isiọrụ na-ekwu na ọtụtụ n'ime ndị a nwụrụ sị Western cape.

    Saụt Afrịka

    Ebe foto si, AFP/Getty Images

  2. Gọvanọ Umahi enyela iwu ka-emechie ụlọikpe niile n'Ebonyi steeti

    Gọvano Ebonyi steeti bụ Dave Umahi enyela iwu ka emechie ụlọikpe niile nọ na steeti ahụ maka ọrịa coronavirus.

    Umahị kwuru nke a dịka ọ gwara ndị ntaakụko were sị na otu onye n'Ebonyi steeti anwụọla n'aka ọria coronavirus.

    Ọ kwuru na uloikpe niile ga-anọ na mmechi ụbọchi iri ka a ewere anwụru eji egbu nje chekwa ụlọikpe niile.

    Umahi rịokwara ka ndị n'arụ n'ụloikpe na ndị ezinụlọ ha ga-mee nyocha maka coronavirus.

    Cheta na ọ bụ n'ọnwa Juun ka Umahi nyere iwu ka e were a anwụrụ na-egbu nje chekwa ụlọọrụ gọọmenti niile na steeti ahụ.

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook

  3. Ụmụaka ụmụnwaanyị tụrụ ime ọkwa akarịala n'oge coronavirus a

    Ụmụagbọghọ tụrụ ime ọkwa

    Ebe foto si, AFP

    Ndị ọrụ na mba Kenya ekwuola na ịtụrụ ime ọkwa n’etiti ụmụagbọghọ nọ n’okpuru afọ iri abụọ arịala elu kamgbe mmachi maka coronavirus bidoro.

    Ozi mịnịstri ahụike ha wepụtara gosiri na ihe ruru ụmụagbọghọ puku anọ n’otu okporo ọchịchị obodo ebutela kamgbe afọ.

    E mechara ụlọakwụkwọ na mba ahụ gbaa gburugburu n'ọnwa Maachị n'ụzọ iji chekwa maka mfesị coronavirus.

    Nke a na-ewute ndị ọrụ ahụike maka na o metụtara ụmụaka ndị na-etorughi etoru. Ụjọ ha bụkwa na ọnụọgụgụ ha nwereike ịkarị nke a.

    Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ọtụtụ mpaghara Kenya agwala gọọmentị ka ha nyocha ihe mere ọnụọgụgụ a ji rịa elu ọjị.

    Kenya so na ndị kachasị nwee ụmụagbọghọ tụrụ ime ọkwa n'ụwa.

  4. Gọọmentị akpọlatala ndị Naịjirịa 15 ọzọ site na mba Ofesi

    Gọọmentị Naịjirịa akpọlatala ndị Naịjirịa dị iri na ise site na mba ndị gụnyere Jamini, Fransị, Beljọm na Estonia.

    Ndị a so na ndị debanyere aha ha dịka gọọmentị na-agba mbọ ịkpọlata ndị Naịjirịa bi n'ofesi n'ihi coronavirus.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi depụtara nke a n'akara twitter sị na ụgbọelu ha hapụrụ Fransị ga-awụchi n'ọdọụgbọelu dị na Legọs.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Ndị buterela coronavirus na Naịjirịa akarịala puku iri na asatọ, Ọnụọgụgụ a ka na-arịkwu elu kwa ụbọchị.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC n’ịchafụ sị na ọ bụ mmadụ narị asaa iri anọ na ise ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a na Naịjirịa ji karịa puku iri na asatọ ugbua dịka

    Ndị gbakerela dị mmadụ puku isii, narị atọ na asaa ebe ndị nwụrụla dị narị anọ na iri asaa na ise.

    Dịka etu ọnụọgụgụ a ji arị elu mere ka kọmitii na-ebuagha megide ọrịa na Naịjirịa ji sị na njem ụgbọelu agaghị emepe ọzọ n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun.

    N’ihi nke ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ma ‘gọọmentị ọ ga-agbachikwa obodo ọzọ dịka ha si mee na mbụ?’

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Igbo ndị ọma! Anyị na-ekele unu

    Anyị na-anabata unu n'ụbọchị nke taa dịka ị na-esonyere anyị.

    Ndụ mmiri ndụ azụ.

  7. Ị gbalịala wee nọnyere anyị taa

    Ka ụbọchị niile maara gị mma n'izu a.

    Ka chi foo.

  8. Agaghị amalitezi njem ụgbọelu n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun

    Ngalaba na-ahụ maka Njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA) ekwuola na agaghị amalite njem n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun a dịka ha si tụ anya.

    Ha kwuru na ụbọchị 21 nke Juun ahụ dị oke nso maka mmepe ha, n'ihi na ha akwadochabeghi.

    NCAA kwuru na ha agaghị amalite ime njem ruo mgbe ha kpebiri na ihe niile ga-ahụ na e chekwara ndị mmadụ, adịla etu ọ kwesịrị ịdị.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Mara na ngalaba na-achịkọta njem ụgbọelu na Naịjiria bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) wepụtara usoro ndị mmadụ ga na-agabiga tupu ha amalite ime njem.

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

  9. Minista ahụike ekwuola etu Naịjirịa nwereike isi belata ọnwụ coronavirus

    Dkt Ehanire

    Ebe foto si, Getty Images

    Dkt Osagie Ehanire bụ minista ahụike Naịjirịa kwuru na Naịjiria ga-ebelatanwu etu Covid-19 si egbu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ gbaa mbọ hụ na ha ebunyeghi ndị ruru afọ 50 ọrịa a.

    Ehanire kwuru nke a ka ya na otu pụrụiche gọọmentị họpụtara maka ibuso ọrịa coronavirus agha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọọzde, kwuru sị na ọtụtụ ndị ọrịa a gburu na Naịjirịa bụ ndị gaferela afọ 50 nakwa ndị nweburu ọrịa dịka ọrịa shuga, ọrịa akpụ (cancer), ọbara mgbali elu nakwa ndị ọzọ.

    Ehanire kwuru sị na ebe ọ bụ ndị a ka ọrịa a kacha egbu, na ọ ga-adị mma ịgba mbọ niile mmadụ pụrụ ime, iji kpuchite ha ma hụ na ha ebuteghi ya bụ ọrịa.

    O kwukwara sị na onye ọbụla ruru afọ 50 bute ya bụ ọrịa, na ọ dị ezigbo mkpa na onye ahụ ji ọsọ gawa n'ebe gọọmentị wepụtara maka nlekọta ndị bu ọrịa a.

    O kwuru sị ka ndị mmadụ gbaa mbọ hụ na ha apụghị apụ ma ọ bụghị ma e nwere ebe dị oke mkpa ha na-aga, iji belata mbute nakwa mfesa ọrịa a.

    Ọ dọkwara aka na ntị ka ndị mmadụ na-eyi mkpuchi imi na-ekpuchi imi na ọnụ ha, karịa iyi ya n'agba ha; ma na-akwọkwa aka, na-anọsapụ anọsapụ nakwa na-edebe onwe ha na gburugburu ha ezigbo ọcha.

  10. Ndị dọkịta agbaala abụbụ ọrụ na mba Tunishia

    Ndị dọkịta mba Tunishia

    Ebe foto si, AFP

    Ndị dọkịta mba Tunishia amalitela abụbụ ọrụ n'ụlọogwụ dị iche iche na mba ahụ, dịka ha na akpọ oku ka e mezie ihe gbasara ọnọdụ ahụike mba ahụ ọkachasị ugbua a coronavirus na-akpa mkpamkpa.

    Ndị dọkịta, ndị nọọsụ nakwa ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ gbakọtara n'ihu mịnịstrị ahụike dị n'isiobodo Tunis, ebe ha nọ na-akpọ oku ka e tinye anya n'ọnọdụ ha bụ ndị ọrụ ahụike si arụ ọrụ ugbua.

    Mara na ọtụtụ ndị ebuteghi ọrịa a na mba ahụ, mana mmadụ 50 anwụọla.

    N'izu a ka gọọmentị bulikwara ụfọdụ mmachi ha tinyere iji belata mfesa ọrịa a.

    Ndị ọrụ ahụike

    Ebe foto si, AFP

    Ndị ọrụ ahụike

    Ebe foto si, AFP

  11. Coronavirus egbuola nwa a mụrụ ọhụrụ

    Onye ọrụ ahụike

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ si mba Briten apụta na-akọwa na ọrịa coronavirus ataala isi otu nwatakịrị a ka mụrụ ụbọchị 13 gara aga.

    Nke a na-abịa dịka mba anọ dị n'ime UK biputara ọnụọgụgụ mmadụ ole ọrịa a gburu na mba ha nso nso a.

    Ngalaba NHS dị na mba Ịngland kwuru na mmadụ 62 ọzọ gụnyere nwa ọhụrụ ahụ, nwụrụ.

    Mmadụ ise ọzọ na mba Wales, na mmadụ abụọ ọzọ nwụrụ na mba Skọtland, butere ọnụọgụgụ ndị ọrịa gburu nso nso a ruo 69.

  12. China adọtikwuola oge ha nyere mba ndị ọzọ ịkwụghachị ego ha binyere ha

    Xi Jinping

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Chaịna agbatịala oge ha nyere ụfọdụ mba Afrịka ịkwụ ụgwọ ego ha binyere mba ndị a n’ihi coronavirus.

    Onyeisiala mba ha bụ Xi Jinping kwuru nke a n’ọgbakọ ndị Chaịna na Afrịka nwere banyere coronavirus ụbọchị Wenezde.

    Jinping gwakwara ndị ụlọọrụ akụnaụba dị na Chaịna ka ha na ndị mba Afrịka "nwee mkparịtaụka dịka enyi na enyi, were mara etu ha ga-esi mee ka mba ndịa a rite uru n'Ihazi etu a ga-esi na-agbazinye ndị azụmahịa ego.

  13. Gọomentị Abia amachiela otu ụlọụka nakwa ahịa arịrịa dị n'Aba

    Ụzọ 'Park' dị n'Aba

    Gọọmentị Abia Steeti agbachiela ụlọụka a kpọrọ 'Chapel of Answer' dị n’Aba nakwa ebe a na-ere akụrụngwa latrịk n’ahịa Arịarịa maka nnupuisi n’iwu na-echekwa coronavirus.

    Onyeisi kọmitii maka coronavirus bụ Chris Ezem sị ha chọpụtara na ndị a anọsaghị iche maọbụ yiri mkpuchi ihu.

    Ụlọụka a dị na Hospital Road nke Aba nọ na-efe ọfụfe n'ụbọchị Wenezde ebe gọọmentị sị ka ụlọụka ka efe ofufe n'ụbọchị Satọde nakwa Sọnde, ebe ndị alakụba ga-efe ofufe n'ụbọchị Fraịde.

    Na mpaghara ebe a na-ere akụrụngwa latrik bụ 'electronic plaza' dị n'ahịa Arịarịa, Ezem sị na ha chọpụtara na ndị na-ere ahịa esoghi ntuziaka gọọmentị nyere maka ire na ịzụ ahịa.

    Nke a mere o jiri nye iwu sị ka e mechie ụlọakụ a nakwa mpaghara ahịa Arịarịa ụ ndị dara iwu a.

    Ezem gbarụrụ ihu maka ọnọdụ a ma rịọ ka ndị mmadụ nyere onwe ha nakwa gọọmentị aka, iji hụ na-ebelatara mfesasị ọrịa a.

  14. Mmadụ 587 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa, Ọnụọgụgụ a ka na-arị elu ọjị kwa ụbọchị kwa ụbọchị.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ ekwupụtala na mmadụ narị ise na iri asatọ na asaa ọhụrụ butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ya ji gbagoo puku iri na asaa, narị asaa na iri atọ na ise.

    N'ime ndị a, mmadụ puku ise, narị itoolu na iri isii na asaa agbakeela ebe mmadụ narị anọ iri isii na itoolu anwụọla n'ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Ndewo Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ

    Anyị ji obi ụtọ na-anabata unu n'ụbọchị taa.

    Biko gbalịa nọnyere anyị, dịka anyị na-ewetere unu akụkọ niile gbasara coronavirus.

    Daalụ!

  16. Ka chi bọọ

    Daalụ maka isonye anyị taa!

    Nọnyekwara anyị n'ụtụtụ.

  17. Coronavirus: Buhari chọrọ ka Chaina na mba ndị ọzọ nọ n'Afrịka na-ekekọrịta mmụta

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala naijria bụ Muhammadu Buhari ekeleela onyeisiala mba Chaina bụ Xi Jinping maka nkwado pụrụ iche Chaina nyere Naijiria na Afrịka.

    Buhari kwuru nke a n'ozi o ziri n'ọgbakọ mmekọrịta dị n'etiti Chaina na Afrịka a kpọrọ Forum on China-Africa Cooperation (FOCAC) megide coronavirus.

    "Buhari kwuru na nkwado ahụ "mere ka mbọ Naijiria na-agba megide ọrịa coronavirus gbanye mgbọrọgwụ".

    Buhari kpọrọ oku ka mba nọ n'otu ahụ jịkọta ọnụ na-ekọkọrịta mmụta na nka ha n'ihe gbasara nnyocha na ịzọ ndụ n'aka coronavirus.

  18. Dan Foster anwụọla

    Dan Foster

    Ebe foto si, Twitter/Dan Foster

    Nkọwa foto, Dan Foster bụ onye mba Amerịka ji obi ya niile nabata ma na-arụ ọrụ na Naịjirịa

    Dan Foster bụ olu a ma ama n'ihe gbasara Redio na Naịjiria, anwụọla.

    Chris Ubosi bụ onye ọ na-arụburu ọrụ, kwuputara maka ọnwụ ya, bụ nke bịara dịka Foster a ma dịka 'Big Dawg' rịachara obere ọrịa.

    Nwunye ya bụ Lovina, gwara Channels TV na di ya butere ọrịa Covid-19 na mbido izu ụka a.

    Foster rụrụ ọrụ na Classic Fm, City Fm, Inspiration Fm nakwa Cool Fm dịcha na Legọs, si mba Amerịka gafete Naịjirịa n'afọ 2000.

    Ọ bụkwa oji-okwu-eri nke a kpọrọ Compere na Bekee ma bụrụkwa onye ritere ọtụtụ nturuugo n'ihi ọrụ ya.

    Ihe nrite ya gụnyere "Ọkaibe na redio" nke o ritere afọ 2003, 2004 na 2005.

    Ọnwụ ya eruola na soshal midia, dịka ndị mụtara ọrụ n'aka ya ndị na-eṅomi ya na-ekwuputa etu obi si agbawa ha.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 5

    Skip X post, 6

    End of X post, 6

    Skip X post, 7

    End of X post, 7

    Skip X post, 8

    End of X post, 8

    Skip X post, 9

    End of X post, 9

    Skip X post, 10

    End of X post, 10

  19. Gọọmenti Naịjirịa enyebeghi ikike maka iji ọgwụ Dexamethasone agwọ coronavirus

    Ọgwụ mgbochi ọrịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ sị na ha anụla maka ọgwụ Dexamethasone a sị eji agwọ coronavirus.

    Ha sị na ọ bụ eziokwu na ọgwụ a si n'aka gọọmentị mba UK kama na gọọmentị Naịjiria enyebeghi ikike maka iji ọgwụ ọbụla agwọ coronavirus.

    NCDC sị nke ọzọ bụ na ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO n'ịchafụ akwadobeghi ka e were Dexamethasone na-agwọ coronavirus.

    Ha sị ka ndị Naịjirịa nwee ndidi ka ha mee nyocha maka ọgwụ a tupu ha ekwupụta ma a ga-amalite iji ya arụ ọrụ na Naịjirịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Ndị a chọpụtara coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa akarịala puku iri na asaa, Ugbua ọnụọgụgụ dị puku iri na asaa, otu narị na iri anọ na asatọ

    Ọnụọgụgụ ndị a chọpụtara coronavirus n’ahụ ha na Naịjirịa akarịala puku iri na asaa dịka ụlọọrụ NCDC si kwuo n’ozi ha wepụtara

    Mana olileanya dị maka mmadụ karịrị puku ise na-agbakeela n'agbanyeghi na mmadụ, narị anọ iri ise na ise anwụọla n’ọrịa.