Igbo ndị nwe anyị na ndị anyị nwe, unu abọọla chi?
Igbo tụrụ ilu sị na onye a hụrụ taa ka a hụ ya eche, anyị ji aka na unu tetara ụra nke ọma taa?
Ngwa buru oche gị bịa sonyere anyị n'ụbọchị taa.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Igbo tụrụ ilu sị na onye a hụrụ taa ka a hụ ya eche, anyị ji aka na unu tetara ụra nke ọma taa?
Ngwa buru oche gị bịa sonyere anyị n'ụbọchị taa.
Ka ọ dị mgbe anyị hụrụ n'ụtụtụ.
Udo dịrị gị!

Ebe foto si, Getty Images
Ndị sayensị achọpụtala na ọgwụ dexamethasone e nwereike inweta ebe niile, nwere ike inyere aka n'ọgwụgwọ ndị ọrịa coronavirus na-anyụ anya.
Ndị ọkachamara na mba Briten kwuru na ọgwụ dexamethasone a so n'ime otu n'ime ọgwụ ndị a chọpụtara, e nwere olileanya na ọ ga-agwọnwu ọrịa a.
O so n'ọgwụ ndị a na-eji agwọ ọrịa ndị ọzọ a nọ na-enyocha ịhụ ma ọ ga-agwọnwu ọrịa a.
O ji ihe ruru otu n'ime atọ budata ụjọ ize ndụ n'isi ndị a na-eji igwe nkute ume (ventilator) enyere aka iku ume. Ndị a na-enye Ọxijin, Ọ na-eji ọkara otu n'ime ise ebudata mmadụ ole ọ na-egbu.
Ndị na-eme nnyocha na nchọpụta kwuru sị na ọ bụrụ na a chọpụtara ọgwụ a n'oge, a gaara azọtanwu ndụ ihe ruru mmadụ puku ise nwụrụ na mba Briten.
A na-atụ anya na ọgwụ a ga-enyere mba ndị enweghi etu ọ ha ha, nke ndị butere ọrịa Covid-19 a buru ibu na ya.
Gọomentị mba Briten kwuru na ha nwere ihe ruru puku narị abụọ (200,000) n'ime akpa ha, ma kwuo na ụlọọgwụ ha ga na-enye ya ndị na-arịa ọrịa a.
Mara na a na-eji ọgwụ a agwọ ọrịa Ogbu na Nkwonkwo (Arthritis), ụkwara ume ọkụ (Asthma) nakwa ụfọdụ ọrịa anụ ahụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
E mechiela ụlọoomeiwu nke Imo steeti ruo izu abụọ, dịka e kwuputere na otu onye omeiwu butere ọrịa coronavirus.
Ọkammụta Maurice Iwu bụ onyeisi otu pụrụiche gọọmentị wepụtara maka ibuso coronavirus agha na steeti ahụ, kwuputara nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Owere n'ụbọchị Tuuzde.
Iwu kwuru na a na-enyocha ndị omeiwu ndị ozọ na ndị enyemaka ha, iji mata na mmadụ ole ha na onye omeiwu nke butere ya nwere mmekọ.

Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu
Gọvanọ Babajide Sanwoolu nke Legọs steeti akwụsịla mmepe ụlọụka nakwa ụlọalakụba na Legọs steeti.
O kwuru na ha agaghị emepezi n'ihi na ọnụọgụgụ ndị na-ebute ọrịa a na steeti ahụ na-arị elu.
Mara na gọomentị Legọs steeti kwuburu na a ga-eji nwayọ nwayọ na-emepe ụlọụka bido n'ụbọchị 19 nke ọnwa Juun a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Chukwuemeka Nwajiuba
Otu gọọmentị etiti họpụtara maka ibuso ọrịa coronavirus agha na Naịjirịa ewepụtala iwu ụlọakwụkwọ ga-edebe tupu e kwe ka ha mepee.
N'okwu si n'ọnụ Chukwuemeka Nwajiuba bụ minista agụmakwụkwọ nke steeti pụta, o kwuru na a ga-emerịrị ihe isii a:
"Ụlọakwụkwọ niile ga-enwerịrị:
1) Ihe e ji akwọ aka
2) Ihe e ji enyocha mkpomọkụ ahụ mmadụ
3) Ihe nhicha e ji egbu nje, nke ga-adị n'ebe ndị e si abata ụlọakwụkwọ, ụlọndina, ụlọọrụ ndị nkuzi wdgz
4) A ga-ehicharịrị ihe niile dị n'ime ụlọakwụkwọ na gburugburu ya
5) A ga-etinye ezigbo uchu n'ihe gbasara ihicha na idebe ebe gburugburu niile ọcha
6) Ha ga-agba mbọ hụ na ụmụakwụkwọ nwere ohere ịnọsapụ anọsapụ ma n'ime ụlọakwụkwọ ma n'ebe a na-eme nzukọ.

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Kenya ebidola nyocha ịchọpụta etu ọgwụ na ihe ndị ọzọ ebubatara maka ọrịa coronavirus siri fuo na mba ahụ.
Ihe ndi a na-efu gụnyere uwe nchekwa na akụrụngwa ndị ọzọ sị mba Chaịna ego ya ruru dọlla nde abụọ.

Ebe foto si, AFP
Mba Botswana ewepụla mmachi isi obodo ha bụ Gaborone dịka nyocha ha mere nsonso a na-egosi na ndị ahu ebughị ya bụ ọrịa.
Botswana wepụrụ mmachi na mba ahụ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee kama ha weghachiri nke isi obodo dịka ha chọpụtara ndị ọzo bu ya bụ ọrịa.
Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ha ga-ewepụta atụmatụ afọ atọ ha ga-eji lụso ọrịa coronavirus ọgụ.
Dịka ọ dị ugbu a, gọọmentị Naijirịa si na oge erubeghị imepe ụlọakwụkwọ maka nchekwa coronavirus.
Minista ahụike nke Naijirịa bụ Osagie Ehanire gwara ndị ntaakụkọ na ọrịa coronavirus ga-anọte aka ma sị ka e were ya mụta ihe.
Minista gosipụtara iwe ya maka etu ndị mmadụ si enupu isi maka iwu gọọmentị nyere dịka iyi mkpuchi imi na ị nye mmadụ ohere.

Ebe foto si, NCDC
Dịka ngalaba NCDC si depụta n'akara twitter ha na mmadụ narị ise na iri asaa na atọ ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ọnụ ọgụgụ ndị bu ya bụ ọrịa ugbu a na Naijirịa bụ puku iri na isii na narị isii na iri ise na asatọ.
Ebe mmadụ anọ ọzọ anwụọla n'aka ya bụ ọrịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ekpere anyị n'ụbọchị taa bụ ka gị na ihu ọma dịka ejima oge niile...iseeee!

Ebe foto si, Getty Images
Daalụ maka iwepụta oge gị sonye anyị taa!
Ka chi bọọ.

Ebe foto si, Anambra steeti gọọmenti
Anambra steeti ewepụtala ọnụọgụgụ ndị nwere coronavirus na okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ.
Lekwa ka o si kwuru ebe ahụ.

Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'Afrịka, mmadụ anọ ebutela nje coronavirus na ụlọrụ onyeisiala Kenya na Nairobi dịka ha malitere inyocha ndị ọrụ ha niile.
Ọnụ na-ekwuru onyeisiala ha bụ Kanze Dena sị onyeisiala bụ Uhuru Kenyetha na ezi na ụlọ ya nọ mma.
Mmadụ anọ na-arụrụ onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta, ebutela Covid-19, dịka ozi si n'ụlọọrụ onyeisiala si kwuo.
Ozi ahụ kwukwara na mmadụ anọ ahụ agaala ụlọọgwụ ịnata ọgwụgwọ.
Ozi ahụ kwukwara na onyeisiala na ezinaụlọ ya ebughi ya bụ ọrịa.
Mara na a na-enyocha onyeisiala, ezinaụlọ ya nakwa ndị niile na-arụrụ ya ọrụ, kwa mgbe kwa mgbe.
Mana iji hụ na ọrịa ahụ efesaghị, ha kwuru na a ga-etinyekwu uchu na-etu e si ahapụ ndị mmadụ ọkachasị ndị na-ebighi n'ime isiụlọọrụ onyeisiala ka ha bata.
Mara na ihe karịrị mmadụ puku atọ ebutela ọrịa coronavirus na Kenya ebe ihe ruru mmadụ 80 nwụrụla.

Ebe foto si, Getty Images
Mba India ekwuola na ha ga-eji ụlọ ụgbọoloko narị ise ọzọ mere ụlọọgwụ ebe ndị bu coronavirus ga-anata ọgwụgwọ.
India na-atụ anya na ụgbooloko ndi a ga-enye ohere ka enwee akwa puku asatọ maka ọgwụgwọ ndị bu coronavirus.
N'ụwa niile, India bụ onye nke anọ kacha nwee ndị bu ọrịa coronavirus.
Dịka ọ dị ugbu a, ndị nwurula n'aka ọrịa na India dị puku itolu, otu narị na iri itolu na ise.
India bidoro ị gbanwe ụlọ ụgbọoloko ha kemgbe ọnwa Aprel dịka ha machiri njem ụgbọoloko maka ọrịa coronavirus.
Onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Addo ezigarala minista ahụike mba ahụ Kwaku Agyeman Manu ozi ekpere mgbake n'ọrịa.
Ọ bụ na mgbasa ozi onyeisiala Akufo-Addo mere ka o kwuru maka ọnọdụ Manu ma too ya dịka onye na-arụsị ọrụ ya ike.
Akufo-Addo kwuru na ọ bụ n'iru ọrụ ka o butere ya bụ ọrịa.
Manu onye dị afọ iri isii na anọ nụ ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post