Ọtụtụ mmadụ anwụola n’ọkpọrọ mmanụ agbịdị gbara ọkụ

Ebe foto si, Uchenna Onuoha
Ọnụ na-ekwuru uweojii Imo steeti bụ ASP Henry Okoye kwuru na ọkpọrọ mmanụ agbịdị nwuru ọkụ n’okpuruọchịchị Ohaji/Egbema dị n'Imo steeti gbuo ọtụtụ mmadụ.
Okoye gwara BBC na ọ bụ ndị oshi mmanụ agbịdị kpalịrị ya bụ ọkụ ka ha jere oshi mmanụ.
O kwuru na ndi uweojii, ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n’Imo steeti agbakọla aka ma malitela nyocha iji chọpụta ndị niile aka ha dị na ya bụ ihe.
Akụkọ kwuru na ọbụ ọkpọrọ mmanụ ndị ụlọ mmanụ ‘Indoroama’ gbara ọkụ.

Ebe foto si, Uchenna Onuoha
Ọtụtụ ndị ọrụgbo bere akwa na ihe ndị ha kụrụ n’ubi ha emebiela maka ọkụ gbara.
Ọnụ na-ekwuru ndị Ohaji/Egbema bụ Uzoma Francis kọwaara ndị ntaakụkọ etu ihe siri mee.
N’okwu ya, ndị nwe ọkpọrọ mmanụ agbịdị ahụ gbawara bụ ‘Indorama’, ha enchewaghị ọkpọrọ ahụ etu kwesiri , anyị ji ọhiere a ezigara ‘Indorama’ ozi ka ha lebanye anya ma nye ọkpọrọ mmanụ ndị a nchekwa kwesiri’’
O kwuru na ọbụrụ na elekọtara ọkpọrọ mmanụ ndị a anya nkeọma,ndị oshi mmanụ agaghị enwe ọhiere izu ohi ebe a hụ, agaghị enwe ndi nwụrụ anwụ.



