Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ
Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Agụụ, nnụkwụ nsọgbụ dị na Naịjirịa - Sultan

Ebe foto si, Sultan nke Sokoto
Sultanalakụba na Sọkọtọ steetị, Muhammed Abubakar, bere akwa arịrị maka ọnọdụ akụnuba Naịjirịa.
Sultan kwuru na agụụ jị ndị mmadu aka ma kwụọ na iwe na enwe ọtụtụ.
O kwụrụ nke a na ụbọchị wenezde gara aga na ọgbakọ ndị eze ọdị na ala na mkpaghara ugwu, nke akpọrọ 'Northern Traditional Rulers Council' (NTRC) na Kaduna steetị.
O kwuru na enweghị ezị nchekwa na oke agụụ bu nnukwu nsọgbụ ndị ugwu nwere.
O kwuru na “Ịme ka ịhe taa akpụ, ndị be anyị nọ na ụbiam enweghị ịhe ọrịrị. Ọtutụ n’ ịme anyị enweghị ụzọ esị enweta ịhe ọrịrị; ịrị nrị dị mma kwa ụbọchị bụ nke anyị ama mmewuzị ugbụ a.”
“E kwenyere m na enweghị ezị nchekwa nakwa ubiam ọnụ ntụ bụ ịhe abụọ anyị ama nkụchị aka nọrọ sị na ogbodo dị na mma”.
“E kwuọla m ya ugbọrọ ugbọrọ na ebe dị ịcheiche na ala adịghị mma na Naịjirịa ma na Ugwu, ihe adịghị mma.”
“I jụọ m, gọọmentị nke a na nke pụrụ na ọchịchị bụ otu ịhe; kedu ịhe bụzị nsọgbụ anyi nwere; echere m na he ndị a bụ ịhe anyị bịara ka anyị tụlee”. Ọ gara n´ịrụ gwa ndị eze ọdịnaala bịara ọgbakọ ahụ ka ha nweta atụmatụ a ga ejị gbọọ mkpa na nsọgbụ dị na Naịjirịa.
“Akwụkwọ dị mkpa, ịhe ọ bula ụnụ ga ekwụ ebe a, unnu tinye ọnụ na ịhe gbasara agụm akwụkwọ; ụnụ tinye ọnụ n’ ịhe gbasara enweghị nchekwa na ụbịam ọnụ ntụ”.
“Ka anyị hara ịjị ịhe a gwụrịegwụ, ndi mmadụ na agba nkịtị maka na ọtụtụ na enye ndụmọdụ” I “Anyị na agwa ha ọkwụ, anyị na agba mbọ na agwa ha na ịhe ga adị mma, ha ne enwe nchekwube”
“Anam arịọ chụkwụ ka ha hara ịkụlị otu ụbọchị sị na ha ekweghịzị na ndụmọdụ anyị na enye ha maka na nke a ga ebute nnukwu nsọgbụ maka na anyị ama mmechịwụ ha ọnụ rụe mgbe ebịghebị dị ka ndị ọchịchị, ndị ịsị ọkpụkperechị.”
“Anyị erụdgọ egọ ọbị ọkụ na enụ ndị mmadụ, agụụ jị ndị mmadụ, ha na enwe ịwe; mana ha ka nwere ntụkwasị ọbị na o nwere ndị ga-agwanwu ha ọkwụ, ha nwere ọrịla anya na ndị gọọvanọ ụfọdụ nakwa ndị ịsị ọkpụkpere chị ha.”
“Abubakar kwara arịri na ọtụtụ ụmụ ntọrọbịa na enweghị ọrụ bụ ịhe ọgbata-ughe dịaalụ Naịjirịa.”
O kwuru na otu ha dị njịkere ịyere ndị gọvanọ aka ịhazị ihe.
“O buru na ndị gọọvanọ chọọ ụdọ na ọganịrụ ha na ndị eze ọdịnaala ga ejịkọta aka ọnụ.”
Ihe ndị uweojii kwuru maka ọgbaghara ndị ntorobia mere na Delta steeti

Ebe foto si, Delta state police
Nkọwa foto, Odafe kwuru na ha kụwara otu onye uweojii isi, na ha anwụchiela mmadu iri n'ime ndi mere ihe ahụ. Ọnụ na-ekwuru uweojii Delta steeti bụ Bright Odafe gwara BBC na akụkọ na-efeghara kwuru na enwere ngagharịwe na-aganiru na Delta steeti maka megide ndị uweojii na-e emegide mdị mmadụ bụ akụkụ ụgha.
Odafe kọwara etu ya bụ ihe siri mee nakwa ihe mere.
N’okwu ya, ndị uweojii nọ ọru n’ Ugheli Delta steeti hụrụ ugbọala n’ebughị akara n'iru na azụ,dịka ọru ha sịrị dị, ha kwụsịri ugbọala hụ bido gbaba ụmụnwoke anọ n'ime ya ajụjụ ọnụ mana ọsịsa ndị ahụ sara ha ejughị ndị uweojii afọ nke mere ha jiri gwa ha soro ha gaa ụlọọrụ ha mana ndị ahụ ekweghị.
Dịka osiri kwu, ha bidoro iluso ndị uweojii ọgụ. Ndi obodo ahụ nuputara n'igwe ma tinye aka lusoba ndị uweojii ọgụ.
Odafe kwuru na ha kụwara otu onye uweojii isi, na ha anwụchiela mmadu iri n'ime ndi mere ihe ahụ.
Dịka osiri gbata kwụrụ, onye uweojii ahụ nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.
N’okwu ya ‘’ Ha kwuru na ha na-eme ngaghariwe maka mkpagbu ndị uweojii na-akpagbu ha mana ọbụ ụgha, ọbụ ha na-emegịde ndị uweojii.
Briten banyere ọnọdụ ọtanisi N'Ọgwụgwụ afọ 2023

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Briten banyere ọnọdụ ọtanisi N'Ọgwụgwụ afọ 2023 Briten banyere ọnọ ọtanisi n'ọgwụgwụ afọ 2023 dịka Mkpokọta ihe nrụpụta obodo ha siri gosi(GDP).
Mkpokọta nrụpụta obodo ahụ gosiri na akụnaba Britein ji 0.3% gbatu n’agbata Ọktoba na Disemba 2023.
E nwere mgbe akụnauba ha dara n’ọnwa Julai na Septemba. N’nghọta nke ha, ihe dị etua mee ugboro abụọ n’otu afọ, ihe ọpụtara bụ n’akụnuba ha nọ n’ọnodu ọtanisi nke ndị bekee kpọrọ ‘Recession’.
Ọnọdu a adighị onyeisiala ha bụ Praim Minista Rishi Sunak mma maka na otu n’ime nkwa ọ kwere ndị obodo ya mgbe ọbatara ọchịchị n’afọ 2023 bụ na ọ ga akwalite ọnọdụ akụnauba Britein.
Gịnị Ọtanisi?
Ọtanisi na-eme n’obodo ma mkpokọta ihe nrụpụta (GDP) obodo akwaliteghị n’nkeji anọ abụọ n’otu afọ.
Mkpokọta nrụpụta bụ ego niile enwetara n’ihe ndị obodo rụpụtara nakwa ndị ha na eresị mba ndị ọzọ.
Kansas City Shooting: Otu onye nwụrụ, ndị ọzọ merụrụ arụ na ngagharị emere n’akụkụ

Nkọwa foto, Ndị bịara mmemme ka ha na-agba ọsọndụ n'ogbe egbe ha bịara nkiri na Kensas Super Bowl Otu onye nwụrụ, mmadu ịrị abụọ na otu meruru ahụ na nkwakọrịta egbe mere na Missouri na oge ndị Kansas City Chiefs mere ngagharị ịgọsịpụta na ha bụtere ịkọ.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ha gwọrọ mmadụ asatọ ndị nọ n'ọnọdụ egwu ndụ ozugbo, na mmadụ asaa ndị ọzọ merụrụ ahụ nke nwere ike igbu ha.
Ụmụaka ịtọọlụ sọ na ndị merụrụ ahụ, mana ana atụ anya na ha ga enweta onwe ha. Ndị ụweọjị kwuru na ha awụchịela mmadu atọ ndị ana enyọ enyọ na aka ha dị na mkpamkpa ahụ.
A gbara egbe a n'ebe ọdịda anyanwụ n’ọdụ ụgbọ oloko dị na ogbe ndịda Kansas, bụ ebe ngagharị ahụ kwụsịrị n'ihe dị ka elekere 14:00 nke oge obodo (20:00 GMT) ngbe ọtụtụ puku ndị nkwadọ ha gbakọtara ka ha lelee mmemme ahụ.

Nkọwa foto, Ụda ndị mmadụ chere na ọ bụ ụda egbe na-ada n'azụ onyentaakụkọ E kwuru na ndị na agbala ndị Kansas City Chiefs ka nọ na ọgịge ahụ mgbe ebịdọrọ gbawa egbe ahụ.
Egbe ahụ mere ka onye ọbụla, ndị nkwadọ, onyeịsị obodo ahụ na ezịnaụlọ ya bụ ndị nọ na ọgịge ahụ ka ha gbawa asọ ndụ ha.
Onyeisi ndị uweojii Kansas City Stacey Graves kwuru na ndị ọrụ zara ozugbo ka mgbọ egbe dapụrụ, na ndị nchọpụta nọ na ebe ahụ meghere ngwa ngwa nyocha.
Ngalaba na-ahụ maka ọkụ bilitere ime ihe ka ọkụ hara ịgba ebe ahụ, na-enye ndị merụrụ ahụ aka.
Ihe karịrị ndị uwe ojii 800 bịara ebe ihe a na-eme iji leba anya na ngagharị a, ndị ọrụ kwuru.
Ndị na-ahụ maka mgbanyụ ọkụ nke obodo ahụ nọkwakwara inye nlekọta ahụike ma ọ dị mkpa.
Ndeewo ndị ọma!, Ka anya hụrụ taata ga--ahụkwa echi!
Lee akụkọ ndị dị mkpa ị kwesịrị ịma taata.
ọkụ agbaala ọdọahịa 18 na Legọs

Ebe foto si, Lagos Fire Service'
Ọdọahịa iri na asatọ gbara ọkụ n' Iju-Ishaga dị n' Legọs.
Ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ Legọs bụ'Lagos Fire Service' kwuru na ihe kpatara ọkụ ahụ bụ gaasị ebubatara n'ọdụahịa gaasị n'ime abalị.
Ha kwuru na o nweghị onye nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Ndị agboro ekposaala ntuliaka n'Enugwu-Inec

Ebe foto si, Inec
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent Electoral Commission(Inec) agbaala ama na ndị agboro ekposara ntuliaka mmegharị e mere n'Enugu-South dịka ụlọikpe si nye n'iwu.
O nweghị onye merụụ ahụ mana e mebiri akọrọngwa ntuliaka ma gbochikwaa ndị bịara ịtụ vootu ịtụ vootu ha.
N'ozi Inec wepụtara n'akara Twitter ha n'ehihie Wenezde, ụlọọrụ ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa nyere aka kpọbụ ndị ọrụ Inec ebe ahụ.
N'otu aka nke ọzọ, ntuliaka ngbakwụnye na-aga nke ọma na Jalingo/Yorro/Zingdị na Taraba State na-enweghị nsogbu ọbụla.
Aka m adịghị na $6.2m Emefiela sị ka a kwụọ ndị nleta ntuliaka - Mustapha

Ebe foto si, BBC/OTHER
Onye bubu odeakwụkwọ gọọmentị etịtị bụ Boss Mustapha n'ụbọchị Tuzde gara gbaa akaebe n'ụlọịkpe ukwu dị n'Abuja ebe a na-ekpe Godwin Emefiele bụbu onyeisi Ụlọakụ etịtị Naịjịrịa (CBN) ikpe maka nrụrụaka ego dị nde dọla isii na ụma ($6.2m).
Emefiele ka a na-ekpe ikpe n'ihu ọkaikpe Muazu maka ebubo ruru iri abụọ nke metụtara nrụrụaka, ụgha na inweta ego ruru $6,230,000 site n'aghụghọ nakwa ụgha.
Mustapha gwara ụlọikpe na aka gọọmentị etịtị adịghị n'ịkwụ ndị nleba-anya na ntuliaka si mba ofesi a kpọrọ 'foreign election observers' ego ahụ na-ese okwu.
O kwuru na mbinyeaka Onyeisiala Buhari dị n'akwụkwọ ozi ejiri nye ikike maka ịdọrọ ego ahụ dịka nke adịgboroja.
Otu onye ọrụ ụlọakụ etiti kwuru na ọ bụ Onyeka Ogbu kwuru na ọ bụ Emefiele binyere aka n'akwụkwọ ikike sị ka e buru ego ahụ kwụọ ndị a ụgwọ.
Mana Mustapha kwuru na kamgbe ya na Onyeisiala Buhari rụwara ọrụ na ọ onwetubeghi mgbe gọọmenti ji akwụ ndị nleta ntuliaka ụgwọ.
E binyela aka ka chụọ odeakwụkwọ ngalaba nchekwa ime obodo mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu nta nke mba Amerịka ebinyela aka ka a chụọ odeakwụkwọ ngalaba nchekwa ime obodo ha a kpọrọ Home land Security Secretary bụ Alejandro Mayorkas n’ọrụ.
Nke a ga-abụ onye mbụ so n’obi ọchịchị onyeisiala mba Amerịka a ga-achụ n’ọrụ kamgbe ihe ruru afọ 150.
Ọtụtụ ndị omeiwu tara Maazị Mayorkas ụta maka etu ọtụtụ ndị mbịarambịa si enubata n’obodo ha site n’okeala ha na Mexico.
Vootu ndị a omeiwu pati Repulican tụrụ ruru 214 karịa 213 bụ tụrụ ka a chụla ya, dịka ha nwara nke mbụ n’izuụka gara aga ma ọ kụọ afọ n’ala.
A ga-eburuzi okwu a gawa n’ụlọomeiwu ukwu bụ Sịneti nke ndị pati Democrat kachasị, bụ ebe o nwere ike ịkụ afọ n’ala.
Onyeisiala Joe Biden kwuru na vootu ahụ bụ “agwa ọjọọ nke iwu na-agwadoghi” ma bụrụkwa “amansị ndọrọ ndọrọ ọchịchị”.
Ndị na-ama Mayorkas aka kwuru na “ọ na-aghị arụ ọrụ ndị ọ ṅụrụ n’iyi ịrụ” site na-echekwaghị okeala ha.
E kesara vootu ndị ahụ n’etiti otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịka ndị Democrat tụtara vootu 210 megide ọchụchụ nwamadị a.
Ihe karịrị ndị mbịarambịa karịrị nde 6.3 abatala mba Amerịka n’ụzọ na-ezighi ezi kamgbe afọ 2021, nke mere o jiri bụrụ okwu a kpụụ n’ọnụ na ntuliaka nke ọnwa Nọvemba a.
Igbo ndị ọma ndewo nụ
Unu abọọla chi taa?
Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo
Ndị ekperima egbuola ndị uweojii abụọ ma tọọrọ ọtụtụ mmadụ na Zamfara

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị ekperima egbuola ndị uweojii abụọ tọọrọ ọtụtụ mmadu na Zamfara Ọgbaghara a dakwasala ndị Zamfara steeti ka ndị ekperima wakporo obodo Kasuwa-Daji dị n’okpuruọchịchị Kaura-Namoda na Zamfara steeti n’isi ụtụtụ Tuzde.
Akụkọ kwuru na ha gburu mmadu abụọ bi n’ọgbe ahụ, wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii, nara ha egbe ha ma gbuo ndị uweojii abụọ.
Dịka esiri kwu, ha gara n’ụlọ onye bụbu onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọala (NURTW) bụ Hamisu Kasuwar-Daji, tọọrọ otu nwụnye ya na ụmụ-ụmụ ya.
Akụkọ na-efegharị kwuru na ha tọọrọ mmadụ 40. Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii Zamfara bụ Yazid Abubakar gwara ụlọakụkọ ‘Channels’ na ihe dị etu a mere mana a kabeghị mata kpọmkwem mmadụ ole ha tọọrọ.
O kwuru na ndị uweojii ezipụla ndị ọrụ ha ka ha gaa n’obodo ahụ mezie ihe niile ma hụ na udo laghachi n’obodo ahụ.
Zamfara steeti bụ ebe ama ama dịka ebe ndị ekperima na-awakpo kari, ha na-ezo kaba n’ime ọhịa dị n’agbata Zamfara, Kastina, Niger na Kaduna steeti. Ha atọọrọla otụtụ mmadụ ana-gụtaghị ọnụ nke gụnyere ụmụakwụkwọ.
Ọ bụghị Sịnetọ Ndubueze ka awakporo, ọ bụ ụlọ ya - Ndị uweojii

Ebe foto si, Sen Patrick Ndubeze/Facebook
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu na ndị omekome wakporo Sinetọ Patrick Ndubueze n'Okigwe dị na steeti ahụ.
"Ọ bụghị eziokwu, ọ bụ ụlọ ya dị n'Okigwe ka ndị omekome wakporo" ka ọ zara n'ekwentị.
Cheta na akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị omekome wakporo Sinetọ Patrick Ndubueze ma gbuo otu onye ụweojii na-arụrụ ya ọrụ.
Akụkọ na-ekwukwa na ọ bụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Monde ka nke a mere.
Mana BBC Igbo ghọtara na ọ bụ mgbe ndị uweojii na ndị omekome ahụ kwatara mgbọ ka ha gburu ya bụ onye uweojii.
"Kọmịshọna enyela iwu ka amalite nyocha ozugbo ozugbo banyere ihe mere" ka Okoye kwukwara.
Ọ sị na ndị uweojii etinyela ngwa ọrụ ha niile n'isi imi n'ala nyochapụta ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ.
A gbagburu otu nwaanyị bu egbe bịa n'ụlọụka dị na Texas

Ebe foto si, TEXAS DEPARTMENT OF PUBLIC SAFETY
Otu nwaanyị bu egbe bịa n'otu ụlọụka dị n'obodo Texas nke mba Amerịka ma bido ịkwa ndị ụka mgbọ tupu ndị ọrụ nchekwa agbagbuo ya.
Ndị ụweọjịị kwụrụ na nwaanyị ahụ a na-enyọ enyọ kpọ nwa ya nwoke dị afọ ise mgbe ọ na-agba egbe n'ụlọụka ahụ.
Ha kwupụtara aha ya dị ka Genesse Ivonne Moreno dị afọ iri atọ na isii (36ys).
Ndi ọrụ nyọcha kọwara na e dere edemede "palestine” n'okpuru egbe nwaanyị ahụ jị nakwa ịhe ndị ọzọ na-emegide ndị agbụrụ Juu.
Ha kwukwara na o doghị anya ịhe mere nwaanyị ahụ jịrị kpaa mkpamkpa a.
Otu nwoke dị afọ iri ise na asaa nke mgbọ tụrụ n'ụkwụ mgbe nwaanyị ahụ na ndị ọrụ nkwekwa na-akwa mgbọ e bugara n'ụlọọgwụ, ahapula ụlọọgwụ.
Ha kwuru na mgbọ tụrụ nwa nwọke nwaanyị ahụ n’ịsị. Ha kọwara na a mabeghi aha nwa ya nwoke ahụ , mana ọ nọ n'ụlọọgwụ ebe a naazọ ndụ ya.
Ụkọchụkwụ Jorge Basave gwara ndị ntaakụkọ Houston Chronicle na mgbe mbụ ọ nụrụ ụda egbe, na ọ gara n'ihu na-agbasa ozioma ya, na ọ chọghị itinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ.
N'okwu ya “Ujọ bịara m n'ọbị, mana m mee ka ha mara, ụjọ ga-aba ọtụtụ n'ịme”
Ndekọ ndị ụweọjiị na-egọsị na mbu, a nwuchiri nwaanyị ahụ maka ebubo mwakpo, ịṅụ ọgwụ ike a ịdebe ngwagha n'ụzọ na-ez ighi ezi.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na nwaanyi ahụ nwere ọrịa akọnauche ezughi oke. A tinyere ya n'ụlọmkpọrọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ n'afọ 2016 maka ọnọdụ ahụike ahụ.
Trump chọrọ ka Ụlọikpe Kachasị gbatara ya ọsọ enyemaka n’ebubo dị n’isi ya

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump arịọla Ụlọikpe Kachasị ka ọ kwụsị ikpe ụlọikpe nta na-ekpe ya nke kwuru na o nweghi nchekwa pụrụiche n’isi ya ka a ghara ịma ya ikpe dịka onyeisiala.
O kwuru na e kwesighi ikpe ya ikpe maka ihe ndị o mere mgbe ọ bụ onyeisiala mba Amerịka.
Ndị ọkaikpe atọ jụrụ ajụ, ma kwuo na a ga-ekpe ya ikpe dịka onye nkịtị ọzọ.
Mana ọkaiwu Trump kwuru na e kwesighi ikpe ya ikpe n’oge ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha na-achụ nta vootu.
“Ikpe Trump ikpe ọtụtụ ọnwa n’ime oge achụnta vootu ntuliaka ga-emegide ikike na ohere Onyeisiala Trump nwereiji zọsị Onyeisiala Trump ọkwa,” ka onye ọkaiwu Trump dere n’akwụkwọ ha gbara.
Ụlọikpe Kachasị ga-ekpebi ma ọ ga-akwụsị ikpe ahụ iji nye Trump ohere ịgbagharị ikpe ahụ.
Ọ bụrụ na ụlọikpe a mee ihe Trump na-arịọ, ọ ga-ebute ezigbote igbu oge n’ikpe ikpe ebubo mpụ e boro Trump nke sị na ọ chọrọ iwegharị ọchịchị n’ike n’oge ntuliaka afọ 2020.
Mana ọ bụrụ na o meghi ya, ikpe ahụ bụ nke Ọkaikpe Tanya Chutkan nọ n’isi ya ga-aga n’ihu hiwe ụbọchị a ga-ama Trump ikpe maka ebubo ahụ.
Dịka Trump na-azọ ọkwa Onyeisiala ugbua, o nwere ebubo atọ ndị ọzọ cheere ya n’ihu gbakwụnyere nke a.
Igbo mma mma nụ ooo!
Kedụ ka i mere?
Daalụ maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo, biko gaa n'ihu na-anọgide ebe a.
Ndị uweojii amalitela ịchọ ndị ekperima wakporo ụlọmkpọrọ n’Imo steeti
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti bụ ASP Okoye Henry ekwuola na Kọmishọna ndị uweojii Imo steeti bụ CP Aboki Danjuma ahazịela ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-amalite ịchọ onye ọrụ ụlọmkpọrọ a tọọrọ na ndị mkpọrọ gbafuru mgbe awakporo ụlọmkpọrọ dị n’Imo steeti.
Ya bụ ihe mere n’utụtụ Tuzdee dịka e gburu otu onye uweojii, kpọpụta ndị mkpọrọ mmadụ asaa, tọrọ otu onye na-arụ n’ụlọmkpọrọ ahụ.
O kwuru na a na-enyo enyo na ọ bụ ndị ESN/IPOB mere mwakpo ahụ. Danjuma kwuru nke a mgbe ọ gara ụlọmkpọrọ ahụ ịga hụ etu ihe siri mee.
O nyere ndị ọru nchekwa iwu ị hụ na-anapụtara onye ọru atọọrọ na ndụ, chọta ndị mkpọrọ gbafuru agbafu ma hụ na ha natara ntaramaahụhụ dịka iwu ala siri dị.
Ọ gwara ndị Imo na onye ọ bụla nwere ozi ga-enye aka n’ịchọta ndị ahụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha kpọtụụrụ ndị uweojii.
N’otu aka ahụ, ọ gwara ndị Imo sị ụjọ atụla ha dịka ha, na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọsiri ike n’ọrụ nchekwa n’Imo steeti.
Danjuma kwuru na ụlọorụ ya gbadoro ụkwụ ịhụ na Imo steeti nwere nchekwa zuru oke. O kwuru na a ga-ejide ndị ekperima ahụ ma hụ na ha natara ntaramaahụhụ kwesịịrị ha.
Ndị uweojii anwụchiela ndị isi otu nzuzo n’Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Aka akparala ndịisi otu nzuzo n’Anambra steeti Ndị uweojii Anambra steeti a kparala mmadụ abụo bụ ndịisi otu nzuzo aka n’Anambra. A na-enyo na aka ha dị n’ogbugbu ndị mmadụ n’Ihiala.
Nke a mere dịka ndị uweojii rụrụ ọrụ pụrụiche n’Ihiala site na-nkwado onyeisi uweojii Anambra steeti bụ Cp Aderemi Adeoye.
Ọnụ na-ekwuru uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga kwuru nke a n'ozi o zipụrụ.
Ikenga kwuru na anwụchiri ha n'ebe nzuzo ha dị na'Okija.
Aha umụwoke a bụ, Chitana Oha bụ onye ama dịka ‘Kill and Bury’ gbara afọ iri abụọ n’ise, Emmanuel Ifeanyi Okonkwo bụ onye ama dịka ‘Good and bad’ gbara afọ iri abụọ n’anọ.
N'ozi ya, o kwuru na kọmishọna uweojii Anambra kwere ndị Anambra nkwa na ọ ga-eji ụlọọrụ ya kwụsị ihe niile gbasara otu nzuzo n’Ihiala etu o siiri mee n'Awka.
Ọ gwara ndị ọrụ uweojii nọ n’ọkpụrụ ya ka ha gbaa mbọ hụ na a gbajiri ndị otu nzụzọ nku ma ekpochapụ ha niile n’Ihiala.
Ndị nọọsụ emeela ngagharịiwe maka ọnọdụ ọjọọ ọrụ ha

Ọtụtụ ndị nọọsụ na Naịjirịa apụtala mee ngagharịiwe maka ọnọdụ ọjọọ ọrụ ha n'ụbọchị 12 nke ọnwa Febụwarị.
Iwe ha bụ na iwu ọhụrụ ebe nyocha tupu enye ha ikike ọrụ ga-amalite n'ọnwa Maachị adịghị ha mma.
Ihe ọzọ ha kwuru bụ na nyocha abụ bụbu naanị izuụka abụọ bụzị ọnwa isii nakwa ego puku narị naịra atọ dịka ha gbakọrọ n'isi ụlọorụ ngalaba jikọrọ ha n'Abuja.
Onyeisi ndị uweojii n'ụlọorụ Life Camp bụ Wunmi Yusuf pụtara sị ha gbasaa mana ha jụrụ ajụ ma na-ekwu na ọ bụ ikike ruuru ha dịka mmadụ igosi iwe ha n'udo.
Iwu ọhụrụ ahụ kwụkwara na ndị nọọsụ ọhụrụ agahị enweta ikike ịrụ ọrụ ganye ma afọ abụo agachara.
Onyeisi ngalaba ahụ jikọrọ ndị nọọsụ bụ Farouq Umar Abubakar pụtara rịọ ndị na-eme ngagharịiwe na ha laghachi n'ụlọọrụ ha dị icheiche ma kwe nkwa na a ga-elebanye anya na mkpesa ha n'abalị ole ma ole na-abịa.


