Nwada na-anwa iji ụgbọala si London rue Legos abatala Afrrịka

Ebe foto si, pELUMI nUBI/iNSTAGRAM
Pelumi Numbi bụ onye na-eme ihe onyonyo njem atụọla ụkwụ n'Afrịka dịka ọ na-anwa iji naanị ụgbọala eme ya bụ njem si London gawa Legọs.
Ọ kwadoro ịme ya bụ ihe n'ime mba 17 ma rue Legos n'ime ọnwa abụọ.
Lee etu njem ya ga-esi dị:
Ọzara Sahara - Mauritania - Senegal- Gambia - Guinea Bissau - Guinea - Sierra Leone - Liberia - Mali - Burkina Faso - Ivory Coast - Ghana - Togo - Benin na Naịjirịa n'ikpeazụ.
N'uche Nubi, ọ bụ ya bụ nwaanyị agbụrụ ojii ga-eme ụdịrị njem a mbụ.
O setere ihe onyonyo n'akara Instagram ya gosiri ebe ọ na-atụ ụkwụ na mba Morocc.



















